ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Jenụwarị 2016

Ihe dị́ n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Febụwarị 29 ruo Eprel 3, 2016.

Kpebisienụ Ike na ‘Ịhụnanya Ụmụnna Unu Ga-adịgide’

Isiokwu afọ 2016 ga-enyere anyị aka ịkwadebe maka ihe ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya.

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka ‘Onyinye Chineke Na-enye n’Efu’

Olee otú ịhụnanya Chineke si eme ka anyị na-esochi nzọụkwụ Jizọs anya, na-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, na-agbaghakwara ha?

Mmụọ Nsọ Na-agbara Mmụọ Anyị Àmà

Gịnị ka mmadụ ịbụ onye e tere mmanụ pụtara? Olee otú e si ete mmadụ mmanụ?

“Anyị Ga-eso Unu”

Gịnị ka anyị kwesịrị icheta banyere otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ?

Anyị na Chineke Ịrụkọ Ọrụ Na-eme Anyị Obi Ụtọ

Olee otú ọrụ anyị na Jehova na-arụkọ si eme ka anyị nwee obi ụtọ, na-emekwa ka Setan ghara inweta anyị?