ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Jenụwarị 2017

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Febụwarị 27 ruo Eprel 2, 2017.

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha

Ọtụtụ ụmụnna nwaanyị ndị jerela ozi ná mba ọzọ nweburu obi abụọ ma hà ga-emelikwa ya. Gịnị nyeere ha aka ịkata obi? Gịnịkwa ka ha mụtarala?

“Tụkwasị Jehova Obi, Na-emekwa Ihe Ọma”

Jehova na-emere anyị ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Ọ chọrọ ka anyị mee nke anyị ga-emeli. Olee otú isiokwu afọ 2017 si enyere anyị aka n’okwu a?

Jiri Ikike Chineke Nyere Gị Ịna-ekpebi Ihe Ị Ga-eme Kpọrọ Ihe

Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche Mach 6-12, 2017: Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere onyinye Chineke nyere ya? Olee otú anyị ga-esi akwanyere akọnuche ndị ọzọ ùgwù?

Ihe Mere Anyị Ka Ji Kwesị Ịna-adị Umeala n’Obi

Gịnị ka e ji ama onye dị umeala n’obi na onye na-adịghị, oleekwa otú onye dị umeala n’obi si akpa àgwà?

Ị Ga-adịli Umeala n’Obi ma Mgbe O Siri Ike Ime Otú Ahụ

Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche Mach 20-26, 2017: Olee otú obi umeala si eme ka ị rụọ ọrụ gị nke ọma, jide onwe gị n’ọnọdụ ọ bụla, kpebie ihe dị mma?

“Nyefee Ya n’Aka Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi”

Olee otú ndị agadi ga-esi azụ ụmụ okorobịa ịrụkwu ọrụ ọgbakọ? Olee otú ụmụ okorobịa ga-esi egosi na ha ji ndị jeterela ozi aka kpọrọ ihe?

Ị̀ Maara?

Olee otú e si esi otu ebe ewere ọkụ aga ebe ọzọ n’oge ochie?