Eziokwu Banyere Chineke na Kraịst
Ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ na-efe ọtụtụ chi, ma e nwere naanị otu ezi Chineke. (Jọn 17:3) Ọ bụ “Onye Kacha Elu,” Onye kere ihe niile, nakwa Onye nyere anyị ndụ. Ọ bụ naanị ya ka anyị kwesịrị ife.—Daniel 7:18; Mkpughe 4:11.
Ònye Bụ Chineke?
Gịnị Bụ Aha Chineke? Chineke n’onwe ya kwuru, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” (Aịzaya 42:8) Aha Chineke gbara ihe ruru ugboro puku asaa na Baịbụl. Ma, ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl ji utu aha dị ka “Onyenwe anyị” dochie ya. Chineke chọrọ ka ị bụrụ enyi ya, chọọkwa ka ị ‘na-akpọku aha ya.’—Abụ Ọma 105:1.
Utu Aha Ndị Jehova Nwere. Na Baịbụl, a kpọrọ Jehova utu aha ndị dị ka “Chineke,” “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” ‘Onye kere anyị,’ “Nna,” “Onyenwe anyị,” na “Ọkaakaa.” N’ọtụtụ ekpere ndị e dere na Baịbụl, a kpọrọ Chineke aha ya bụ́ Jehova, kpọọkwa ya utu aha ndị e ji kwanyere ya ùgwù.—Daniel 9:4.
Jọn 4:24) Baịbụl kwukwara na “o nweghị mmadụ hụtụrụla Chineke.” (Jọn 1:18) Baịbụl gosiri otú obi na-adị Chineke. Ndị mmadụ nwere ike ime ka o nwee mwute, ma ọ bụkwanụ mee ya “obi ụtọ.”—Ilu 11:20; Abụ Ọma 78:40, 41.
Otú Chineke Dị. Chineke bụ mmụọ. (Àgwà Chineke Ndị Magburu Onwe Ya. Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu n’agbanyeghị mba mmadụ si na ọnọdụ onye ahụ. (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Ọ bụkwa onye “nwere ọmịiko ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya na eziokwu ya dị ukwuu.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Ma, o nwere àgwà anọ Chineke nwere ndị kacha amasị anyị.
Ike. Chineke nwere ike na-enweghị atụ ọ ga-eji emezu ihe ọ bụla o kwere ná nkwa n’ihi na ọ bụ “Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”—Jenesis 17:1.
Amamihe. Chineke ma ihe karịa onye ọ bụla. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ọ bụ onye “naanị ya ma ihe.”—Ndị Rom 16:27.
Ikpe Ziri Ezi. Chineke na-eme ihe ziri ezi mgbe niile. Ihe niile ọ na-eme “zuru okè,” ọ bụkwa “onye na-anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.”—Diuterọnọmi 32:4.
Ịhụnanya. Baịbụl kwuru na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ọ bụghị naanị na Chineke na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya, kama, ọ bụ ịhụnanya n’onwe ya. Ọ bụ ịhụnanya na-enweghị atụ Chineke nwere na-akpali ya ime ihe niile ọ na-eme, ọ na-abakwara anyị uru n’ọtụtụ ụzọ.
Otú Chineke na Ụmụ Mmadụ Nwere Ike Isi Bụrụ Enyi. Chineke bụ Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya. (Matiu 6:9) Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe na ya, anyị na ya ga-abụ enyi. (Abụ Ọma 25:14) Chineke na-agwadị gị ka ị bịaruo ya nso n’ekpere nakwa ka ị ‘na-akọrọ ya ihe niile na-echegbu gị, n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’—1 Pita 5:7; Jems 4:8.
Olee Ihe Dị Iche na Chineke na Kraịst?
Jizọs Abụghị Chineke. Jizọs pụrụ iche. Ọ bụ naanị ya ka Chineke ji aka ya kee. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji akpọ ya Ọkpara Chineke. (Jọn 20:31) Mgbe Jehova kechara Jizọs, o ji ọkpara ya a bụ́ “ọkà n’ọrụ” kee ihe niile na onye ọ bụla ọzọ.—Ilu 8:30, 31; Ndị Kọlọsi 1:15, 16.
Jọn 7:29) Mgbe Jizọs na-agwa otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya okwu, ọ kpọrọ Jehova “Nna m na Nna unu,” nakwa “Chineke m na Chineke unu.” (Jọn 20:17) Mgbe Jizọs nwụrụ, Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ gaa n’eluigwe, mee ka ọ nọrọ n’aka nri ya ma nye ya ikike dị ukwuu.—Matiu 28:18; Ọrụ Ndịozi 2:32, 33.
O nweghị mgbe Jizọs kwuru na ya bụ Chineke. Kama, o kwuru, sị: “Abụ m onye nnọchiteanya [Chineke]. O bụ ya zitere m.” (Jizọs Kraịst Nwere Ike Inyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
Jizọs bịara n’ụwa ka ọ kụziere anyị banyere Nna ya. Jehova kwuru gbasara Jizọs, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Geenụ ya ntị.” (Mak 9:7) Jizọs ma Chineke karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ sịrị: “O nweghịkwa onye ma Nna m ma e wezụga m na onye ọ bụla m chọrọ ịkụziri gbasara ya.”—Luk 10:22.
Jizọs ṅomiri Chineke nke ọma. Jizọs ṅomiri Nna ya nke ọma nke na o kwuru, sị: “Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna m.” (Jọn 14:9) Jizọs gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ka Nna ya, ma n’okwu ọnụ ma n’omume ya. Nke a dọtara ndị mmadụ n’ebe Chineke nọ. O kwuru, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. E nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụrụ na o sighị na m.” (Jọn 14:6) O kwukwara, sị: “Ndị na-efe Nna m otú ọ chọrọ ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na n’eziokwu, Nna m na-achọ ụdị ndị ahụ ka ha fee ya ofufe.” (Jọn 4:23) Chegodị ihe ọ dị ka ya na Jehova na-achọ ndị dị ka gị chọrọ ịmụta eziokwu gbasara ya.