ỤLỌ NCHE Nke 2 n'Afọ 2018 | Olee Otú Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?
OLEE OTÚ IHE GA-ADỊ N’ỌDỊNIHU?
Ò nwetụla mgbe i chere otú ihe ga-adịrị gị na ezinụlọ gị n’ọdịnihu? Baịbụl kwuru, sị:
“Ndị ezi omume ga-enweta ụwa. Ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
Ụlọ Nche a ga-enyere gị aka ịmata ihe Chineke bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ. Ọ ga-enyekwara gị aka ịmata ihe ị ga-eme ka i rite uru na ya.
Ikwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu
Ọtụtụ ndị ekwuola ihe nwere ike ime ọtụtụ puku afọ tupu ha emee. Ụfọdụ ihe ha kwuru mere, ụfọdụ emeghị.
Ndị Na-agụ Kpakpando na Ndị Na-akọ Ọdịnihu Hà Na-ahụ Ọdịnihu n’Eziokwu?
È nwere ike ịtụkwasị ụzọ ndị a e si akọ ọdịnihu obi?
Amụma Ndị Mezurulanụ
Ihe ndị Baịbụl kwuru ga-eme mezuru nnọọ otú o si kwuo ha.
Ihe Na-egosi na Amụma Baịbụl Bụ Eziokwu
Otu ihe a kpụrụ akpụ n’oge ochie nke na-egosi na amụma Baịbụl bụ eziokwu.
Nkwa Ndị Ga-emezu n’Ọdịnihu
Ọtụtụ amụma Baịbụl emezuola, ma ndị ọzọ ga-emezu n’ọdịnihu.
Ị Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa
Baịbụl kwuru ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ.
Ọdịnihu Gị Dị Gị n’Aka
Ụfọdụ ndị kwetara na mmadụ agaghị ekwuli otú ọdịnihu ya ga-adị, kama na ọ dabeere n’akara aka onye ahụ. Ma, ihe a ọ̀ bụ eziokwu?
“Ndị Dị Umeala n’Obi Ga-enweta Ụwa”
Baịbụl kwuru na e nwere mgbe ikpe na-ezighị ezi na mmegbu na-agaghịzi adị.