Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
Ọ̀ bụ mmadụ malitere okpukpe?
ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU na ọ bụ ndị mmadụ malitere okpukpe; ndị ọzọ chere na ọ bụ Chineke malitere ya iji nyere ndị mmadụ aka ka ha bịaruo ya nso. Gịnị ka i chere?
IHE BAỊBỤL KWURU
E nwere “okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị bụ́ Nna anyị.” (Jems 1:27, Bible Nsọ nke Union Version) Ọ bụ Chineke malitere okpukpe dị́ ọcha ma ọ bụ ezigbo okpukpe.
IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL
Okpukpe dị́ Chineke mma bụ nke na-akụzi eziokwu dị́ na Baịbụl.—Jọn 4:23, 24.
Okpukpe ndị na-akụzi ihe ndị mmadụ chepụtara na-efe Chineke n’efu.—Mak 7:7, 8.
Mmadụ ò kwesịrị inwe okpukpe ọ na-ekpe?
Ị̀ GA-ASỊ . . .
Ee?
Mba?
Ma onye ahụ chọọ?
IHE BAỊBỤL KWURU
“Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-ezukọta efe ya.
IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL
Ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-ekwu otu ihe.—1 Ndị Kọrịnt 1:10, 11.
Ndị niile nọ́ n’okpukpe dị́ Chineke mma bụ ụmụnna n’agbanyeghị ebe ha bi n’ụwa. —1 Pita 2:17.