ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE ONYINYE KACHA ONYINYE NIILE?
“Ọ Bụ Onyinye Kacha Mma E Nyetụrụla M”
Ihe a bụ ihe otu nwata nwaanyị dị afọ iri na atọ kwuru mgbe mmadụ nyere ya obere nkịta. Otu nwaanyị ịchụ nta ego doro anya kwuru na kọmputa papa ya nyere ya mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị mere ka ndụ ya ka mma. Otu nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ kwuru na onyinye kachanụ e nyetụrụla ya bụ kaadị nwunye ya ji aka ya mee, nke o nyere ya n’ụbọchị ha na-echeta otu afọ ha gbara akwụkwọ.
N’afọ ọ bụla, ndị mmadụ na-eji oge buru ibu agbalị ịchọta onyinye ha chere kacha mma ha ga-enye enyi ha ma ọ bụ nwanne ha n’oge a na-eme ememme pụrụ iche. Ọtụtụ n’ime ha ga-enwekwa mmasị ka ndị ha nyere onyinye kwuo ụdị ihe ahụ ụfọdụ ndị kwuru na paragraf bu nke a ụzọ. Gịnwa kwanụ? Ị̀ ga-achọ inye mmadụ onyinye ga-eme ya obi ụtọ ma ọ bụkwanụ ka mmadụ nye gị onyinye ga-eme gị obi ụtọ?
Ihe mere inye mmadụ onyinye ji magbuo onwe ya abụghị naanị na ọ ga-eme onye e nyere ya obi ụtọ, kamakwa, ọ na-eme ka onye nyere onyinye ahụ nweekwa obi ụtọ. A sị ka e kwuwe, Baịbụl sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) N’eziokwu, onye nyere mmadụ onyinye na-enwekwu obi ụtọ ma onye o nyere ya jiri ya kpọrọ ihe.
Oleezi ihe ị ga-eme ka onyinye i nyere mmadụ mee ma gịnwa ma onye i nyere ya ezigbo obi ụtọ? Ọ bụrụ na o siere gị ike ịmata onyinye kacha mma ị ga-enye mmadụ, gịnị ga-enyere gị aka inye onye ahụ ihe ga-eme ya obi ụtọ?