Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jehova Emesowo M Nnọọ Ihe n’Ụzọ Dị Mma!”

“Jehova Emesowo M Nnọọ Ihe n’Ụzọ Dị Mma!”

“Jehova Emesowo M Nnọọ Ihe n’Ụzọ Dị Mma!”

N’OTU ọmarịcha uhuruchi na March 1985, ndị ikom na ndị inyom nọ ná Ngalaba Ide Ihe n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na New York, U.S.A., chọpụtara otu ihe dị ịrịba ama. Karl F. Klein ejewo ozi oge nile mgbe ahụ ruo afọ 60. Nwanna Klein ji ịnụ ọkụ n’obi kwuo, sị: “Jehova emesowo m nnọọ ihe n’ụzọ dị mma!” O kwuru na Abụ Ọma 37:4 bụ akụkụ Bible na-amasịkarị ya. Mgbe e mesịrị, o mere ka obi dị mmadụ nile ụtọ site n’ịkpọ ụbọ cello ya.

N’ime afọ 15 sochirinụ, Nwanna Klein nọgidere na-arụ ọrụ dị ka otu n’ime ndị ọrụ ide ihe ma na-eje ozi n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Mgbe e mesịrị, na January 3, 2001, mgbe ọ dị afọ 95, Karl Klein ji ikwesị ntụkwasị obi jesịa ozi elu ala ya.

A mụrụ Karl na Germany. Ezinụlọ ya kwagara United States, Karl tolitekwara n’otu ógbè dịpụrụ adịpụ nke Chicago, Illinois. Mgbe Karl na nwanne ya nwoke ọ tọrọ bụ́ Ted ka dị obere, ha nwere mmasị dị ukwuu na Bible. E mere Karl baptism na 1918, ihe ndị na-akpali akpali ọ nụkwara ná mgbakọ nke Ndị Mmụta Bible na 1922 kpaliri ya inwe mmasị dịruru ogologo ndụ ya nile n’ebe ozi ubi dị. Ọ dịghị achọ ka otu izu gafee n’ekereghị òkè n’ọrụ nkwusa, na-eme otú ahụ ọbụna n’izu ndị ikpeazụ nke ndụ ya.

Karl sonyere ná ndị ọrụ nke isi ụlọ ọrụ na 1925, ebe mbụ ọ rụrụ ọrụ bụ n’ebe obibi akwụkwọ. O nwere ezigbo mmasị n’ịkụ egwú, ruokwa afọ ụfọdụ, ọ kpọrọ ụbọ cello n’otu ìgwè ndị na-akụ egwú n’ụlọ ọrụ redio nke ndị Kraịst. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ rụrụ ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi, na-enwe mmasị karịsịa ná mkpakọrịta ya na onye nlekọta ya, bụ́ T J. Sullivan. Ka ọ dịgodị, Ted lụrụ nwanyị, ya na nwunye ya, bụ́ Doris, malitekwara ozi ala ọzọ na Puerto Rico.

Ruo afọ 50, Karl Klein rụrụ ọrụ ná Ngalaba Ide Ihe, bụ́ ebe ọ tụnyere ụtụ pụtara ìhè n’ihi na o nwere mmasị n’ime nnyocha, nweekwa ihe ọmụma Bible n’ụzọ miri emi. Na 1963, Karl lụrụ Margareta, bụ́ onye Germany na-eje ozi ala ọzọ na Bolivia. Site n’enyemaka ịhụnanya nwunye ya, karịsịa ebe ọ bụ na o nwere nsogbu ahụ ike, ọ nọgidere na-arụpụta ihe ruo ihe karịrị afọ ndụ ihe ka ọtụtụ ji ala ezumike nká. Omume ezoghị ọnụ Karl bu pụta ụwa, tinyere ịnụ ọkụ n’obi ya dị ka ọkụ egwú, so mee ka okwu ndị o kwuru n’ọgbakọ nakwa ná mgbakọ dị iche iche bụrụ ndị a na-adịghị echefu echefu. N’oge na-adịghị anya tupu ọ nwụọ, o duziiri nnukwu ezinụlọ Betel ahụ dị na New York ihe mmụta dịịrị ụbọchị, mmadụ nile nwekwara mmasị ma rite uru na ya.

Ọtụtụ ndị na-agụchi Ụlọ Nche anya ga-echeta akụkọ ndụ Nwanna Klein, bụ́ akụkọ na-akpali akpali banyere ahụmahụ ndị o nwere, bụ́ nke e bipụtara ná mbipụta nke April 15, 1985. Ọ ga-atọ gị ụtọ ma ị gụọ ma ọ bụ gụghachi ihe ndekọ ahụ, na-eburu n’uche na onye dere ya dịrị ndụ ruo afọ iri na ise ọzọ dị ka onye Kraịst raara onwe ya nye ma kwesị ntụkwasị obi.

Dị ka otu n’ime ndị e tere mmanụ nke Onyenwe anyị, Nwanna Klein ji obi ya nile chọọ iso Kraịst chịa n’eluigwe. Anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji kwere na Jehova emezuola ọchịchọ ahụ ugbu a.—Luk 22:28-30.

[Foto dị na peeji nke 31]

Karl na T. J. Sullivan nakwa Ted na Doris na 1943

[Foto dị na peeji nke 31]

Karl na Margareta, October 2000