Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbaasị na Ọchịchọ A Na-achọ Ezi Ọnọdụ Ime Mmụọ

Mgbaasị na Ọchịchọ A Na-achọ Ezi Ọnọdụ Ime Mmụọ

Mgbaasị na Ọchịchọ A Na-achọ Ezi Ọnọdụ Ime Mmụọ

ANYỊ nile nwere mkpa ime mmụọ nakwa nke anụ ahụ. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị nnọọ ji ajụ ajụjụ ndị dị ka, Gịnị bụ nzube nke ndụ, n’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji ahụju anya, na gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ? Ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi na-achọ azịza nye ajụjụ ndị a na ndị yiri ha ná nzukọ ndị na-eme mgbaasị, bụ́ ebe ha na-agakwuru ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, na-enwe olileanya iso mmụọ ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu. A na-akpọ omume a mgbaasị.

A na-achọta ndị na-eme mgbaasị n’ọtụtụ mba, ha na-agbakọtakwa ná nzukọ na chọọchị dị iche iche. Dị ka ihe atụ, na Brazil, e mere atụmatụ na ihe dị ka mmadụ 4,000,000 na-eme mgbaasị na-agbaso ozizi Hyppolyte Léon Denizard Rivail, bụ́ onye France bụ́ ọkà nkụzi na ọkà ihe ọmụma nke narị afọ nke 19 bụ́ onye ji aha bụ́ Allan Kardec dee ihe odide ya. Kardec nwewara mmasị n’ọrụ ndị mmụọ ọjọọ na nke mbụ ya na 1854. E mesịa, ọ jụrụ ndị na-ajụ mmụọ ase nọ n’ọtụtụ ebe ajụjụ ma detuo azịza ha n’akwụkwọ bụ́ The Book of Spirits (Akwụkwọ Ndị Mmụọ), bụ́ nke e bipụtara na 1857. Akwụkwọ abụọ ọzọ o dere bụ The Mediums’ Book (Akwụkwọ Ndị Na-ajụ Ndị Mmụọ Ase) na The Gospel According to Spiritism (Ozi Ọma Dị Ka Mgbaasị Si Dị).

E jikọtawo mgbaasị na omume okpukpe ndị dị ka voodoo, amoosu, majik, ma ọ bụ ofufe Setan. Otú ọ dị, ndị na-agbaso ozizi Allan Kardec na-ekwu na nkwenkwe ha dị iche. Akwụkwọ ha na-ehotakarị Bible, ha na-ezokwa aka n’ebe Jisọs nọ dị ka “onye nduzi na onye nlereanya dịịrị ihe nile a kpọrọ mmadụ.” Ha na-ekwu na ihe ndị Jisọs kụziri bụ “okwu ndị kasị dị ọcha nke iwu Chineke.” Allan Kardec lere ihe odide ndị mgbaasị anya dị ka mkpughe nke atọ nke iwu Chineke nye ihe a kpọrọ mmadụ, abụọ ndị mbụ bụ ihe ndị Mosis kụziri na ndị Jisọs kụziri.

Mgbaasị na-adọta ọtụtụ ndị n’ihi na ọ na-emesi ịhụnanya n’etiti ndị agbata obi na ịrụ ọrụ ebere ike. Otu nkwenkwe ndị mgbaasị bụ: “Ọ bụrụ na a rụghị ọrụ ebere, a gaghị enweta nzọpụta.” Ọtụtụ ndị mgbaasị na-arụchi ọrụ ọha na eze anya, na-enye aka n’iguzobe ụlọ ọgwụ, ụlọ akwụkwọ, na ụlọ ọrụ ndị ọzọ. Mgbalị ndị dị otú ahụ kwesịrị ịja mma. Otú ọ dị, olee otú nkwenkwe ndị mgbaasị dị n’iji ya atụnyere ihe ndị Jisọs kụziri dị ka e dekọrọ ha na Bible? Ka anyị tụlee ihe atụ abụọ: olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ na ihe mere nhụjuanya ji dịrị.

Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ?

Ọtụtụ ndị mgbaasị kweere n’ịlọ ụwa. Otu akwụkwọ ndị mgbaasị na-ekwu, sị: “Ịlọ ụwa bụ nanị ozizi nke na-eme ka a ghọta echiche anyị banyere ikpe ziri ezi Chineke; ọ bụ nanị ozizi nke pụrụ ịkọwa ọdịnihu ma wusikwuo olileanya anyị ike.” Ndị mgbaasị na-akọwa na n’ọnwụ, mkpụrụ obi, ma ọ bụ “mmụọ lọrọ ụwa,” na-esi n’ahụ apụ—dị ka urukurubụba nke si n’ime ihe ọ nọ gbaa ábụ́bà na-apụta. Ha kweere na mmụọ ndị a na-emesị lọ ụwa dị ka ụmụ mmadụ iji wepụsịa mmehie ndị ha mere ná ndụ mbụ. Ma ha adịghị echeta mmehie ndị mbụ ahụ. “Chineke lere ya anya dị ka ihe dabara adaba ka e chefuo mmehie ndị e mere ná ndụ mbụ,” ka akwụkwọ bụ́ The Gospel According to Spiritism na-ekwu.

“Ikwu na ịlọ ụwa adịghị bụkwa ịjụ okwu ndị Kraịst kwuru,” ka Allan Kardec dere. Otú ọ dị, Jisọs ekwughị okwu ahụ bụ́ “ịlọ ụwa” ma ọlị, ọ kpọtụghịkwa ozizi dị otú ahụ aha. (Lee “Bible Ọ̀ Na-akụzi Ịlọ Ụwa?” nke dị na peeji nke 22.) Kama nke ahụ, Jisọs kụziri banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ. N’oge ozi elu ala ya, ọ kpọlitere mmadụ atọ n’ọnwụ—nwa nke otu nwanyị di ya nwụrụ nke bi na Nain, ada nke onyeisi ụlọ nzukọ, na ezi enyi ya bụ́ Lazarọs. (Mak 5:22-24, 35-43; Luk 7:11-15; Jọn 11:1-44) Ka anyị tụlee otu n’ime ihe omume ndị ahụ dị ịrịba ama ma hụ ihe Jisọs bu n’uche mgbe o kwuru banyere “mbilite n’ọnwụ.”

Mbilite n’Ọnwụ Lazarọs

Jisọs nụrụ na enyi ya bụ́ Lazarọs na-arịa ọrịa. Mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enyi anyị Lazarọs adawo n’ụra; ma ana m aga, ka M wee kpọtee ya n’ụra.” Ndị na-eso ụzọ Jisọs aghọtaghị ihe o bu n’uche, ya mere o kwuru hoo haa, sị: “Lazarọs nwụrụ anwụ.” Mgbe Jisọs mesịrị bịa n’ili Lazarọs, nwoke ahụ anwụwo kemgbe ụbọchị anọ. Ma, Jisọs nyere iwu ka e bupụ nkume e ji kpuchie ọnụ ili ahụ. Mgbe ahụ, o tiri mkpu, sị: “Lazarọs, pụta n’èzí.” Mgbe o kwusịrị nke ahụ, ihe ebube mere. “Onye nwụrụrịị anwụ pụtara, e wereworị ákwà ozu kee ya ụkwụ na aka; werekwa ịchafụ kechie ya ihu. Jisọs sị ha, Tọpụnụ ya, gharakwa ya ka ọ laa.”—Jọn 11:5, 6, 11-14, 43, 44.

N’ụzọ doro anya, nke a abụghị ịlọ ụwa. Jisọs kwuru na Lazarọs ahụ nwụrụ anwụ nọ n’ụra, n’amaghị ihe ọ bụla. Dị ka Bible si kwuo ya, “echiche ya nile alawo n’iyi.” Ọ ‘maghị ihe ọ bụla.’ (Abụ Ọma 146:4; Eklisiastis 9:5) Lazarọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie abụghị onye ọzọ nke nwere mmụọ lọrọ ụwa. O nwere àgwà mbụ ya, nọrọ n’afọ ndụ ọ nọbu, nweekwa ikike ncheta ahụ o nweburu. Ọ maliteghachiri ihe omume ya otú o sibu eme ya tupu ọ nwụọ ọnwụ mberede, ma laghachikwuru ndị ọ hụrụ n’anya bụ́ ndị ruworo újú ọnwụ ya.—Jọn 12:1, 2.

Mgbe e mesịrị, Lazarọs nwụrụ ọzọ. Ya mere, nzube dị aṅaa ka mbilite n’ọnwụ ya mezuru? Ya na ọrụ mbilite n’ọnwụ ndị ọzọ Jisọs rụrụ na-ewusi ntụkwasị obi anyị ike ná nkwa Chineke kwere na a ga-eme ka ndị ohu Ya na-ekwesị ntụkwasị obi si n’ọnwụ bilie n’oge Ọ kara aka. Ọrụ ebube ndị ahụ Jisọs rụrụ na-eme ka okwu ya ndị a dịkwuo ịrịba ama: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.”—Jọn 11:25.

Jisọs kwuru banyere mbilite n’ọnwụ ahụ a ga-enwe n’ọdịnihu, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu [m], ha ga-apụtakwa; ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị mere ihe na-adịghị mma ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:28, 29) Dị ka ọ dị n’ebe Lazarọs nọ, nke ahụ ga-abụ mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ. Ọ gaghị abụ njikọghachi nke mmụọ maara ihe na ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie bụ́ nke reworo ere na nke pụrụ ọbụna ịghọwo akụkụ nke ihe ndị ọzọ dị ndụ. Ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ akarịghị ike Onye Okike nke eluigwe na ala, bụ́ onye nwere amamihe na ike na-enweghị nsọtụ.

Ozizi mbilite n’ọnwụ, nke Jisọs Kraịst ziri, ọ́ dịghị ekpughe ịhụnanya miri emi Chineke nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ n’otu n’otu? Ma gịnị banyere ajụjụ nke abụọ a kpọtụrụ aha na mbụ?

Gịnị Mere Nhụjuanya Ji Dịrị?

Ihe dị ukwuu ná nhụjuanya ụmụ mmadụ na-abịa n’ihi ihe ndị na-amaghị ihe, ndị na-enweghị ahụmahụ, ma ọ bụ ndị ajọ omume na-eme. Otú ọ dị, gịnị banyere ọdachi ndị a na-apụghị ịta ụmụ mmadụ ụta maka ha kpọmkwem? Dị ka ihe atụ, n’ihi gịnị ka e ji enwe ihe mberede na ọdachi ndị na-emere onwe ha? N’ihi gịnị ka e ji amụ ụmụaka ụfọdụ nwere nkwarụ? Allan Kardec lere ihe ndị dị otú ahụ anya dị ka ntaramahụhụ. O dere, sị: “Ọ bụrụ na a na-ata anyị ahụhụ, mgbe ahụ, ọ ghaghị ịbụ na anyị emewo ihe na-ezighị ezi. Ọ bụrụ na ọ bụghị ná ndụ ugbu a ka anyị mere ihe ahụ na-ezighị ezi, mgbe ahụ, ọ ghaghị ịbụ ná ndụ anyị dịrị n’oge gara aga.” A na-akụziri ndị mgbaasị ikpe ekpere, sị: “Onyenwe anyị, Ọ bụ gị kasị ekpe ikpe ziri ezi. Nrịanrịa nke ị họọrọ izitere m aghaghị ịbụ nke kwesịrị m . . . Ana m anakwere ya dị ka ihe m ji kwụọ ụgwọ mmehie m mere n’oge gara aga nakwa dị ka ule nke okwukwe m na ido onwe m n’okpuru uche Gị dị ngọzi.”—The Gospel According to Spiritism.

Jisọs ọ̀ kụziri ihe dị otú ahụ? Ee e. Jisọs maara nke ọma ihe Bible kwuru: “Mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” (Eklisiastis 9:11) Ọ maara na mgbe ụfọdụ ihe ọjọọ na-emere onwe ha. Ọ bụghị iwu na ha ga-abụrịrị ntaramahụrụ maka mmehie.

Tụlee ihe a mere ná ndụ Jisọs: “Mgbe [Jisọs] na-agabiga, Ọ hụ otu nwoke nke kpuru ìsì site n’ọmụmụ ya. Ndị na-eso ụzọ Ya wee jụọ Ya, sị, Rabaị, ònye mehiere, onye a, ma ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere ka a mụọ ya n’ìsì?” Ihe Jisọs zara na-akụzi nnọọ ihe: “Onye a emehieghị, ndị mụrụ ya emehieghịkwa: kama ka ọrụ Chineke wee pụta ìhè n’ahụ ya. Mgbe O kwusịrị ihe ndị a, Ọ bụọ ọnụ mmiri n’ala, were ọnụ mmiri ahụ gwọọ ájá, were ájá ahụ tee n’anya ya abụọ, sị ya, Jee saa mmiri n’ọdọ mmiri nta nke Saịloam . . . Ya mere O jere, saa mmiri, bịakwa na-ahụ ụzọ.”—Jọn 9:1-3, 6, 7.

Okwu Jisọs gosiri na ma nwoke ahụ ma ndị mụrụ ya adịghị nke ụta dịịrị maka ìsì o kpuru site n’ọmụmụ. Ya mere, Jisọs akwadoghị echiche bụ́ na a na-ata nwoke ahụ ahụhụ n’ihi mmehie ndị o mere ná ndụ mbụ ya. N’eziokwu, Jisọs maara na mmadụ nile na-eketa mmehie. Ma, ọ bụ mmehie Adam ka ha na-eketa, ọ bụghị mmehie ha mere tupu a mụọ ha. N’ihi mmehie Adam, a na-amụ mmadụ nile n’ezughị okè n’anụ ahụ, na-abụ ndị nwere ike ịrịa ọrịa na ịnwụ anwụ. (Job 14:4; Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12; 9:11) N’ezie, ọ bụ ọnọdụ ahụ ka e zitere Jisọs idozi. Jọn Onye Na-eme Baptism sịrị na Jisọs bụ “Nwa atụrụ Chineke, Nke na-ebupụ mmehie nke ụwa!”—Jọn 1:29. *

Rịbakwa ama na Jisọs asịghị na Chineke ma ụma mee ka a mụọ nwoke ahụ n’ìsì ka Jisọs wee nwee ike ịbịa gwọọ ya otu ụbọchị. Lee omume obi ọjọọ na nke arụrụala nke ahụ gaara abụwo! Nke ahụ ọ̀ gaara ewetaworo Chineke otuto? Ee e. Kama nke ahụ, ọgwụgwọ e ji ụzọ ọrụ ebube gwọọ nwoke ahụ kpuru ìsì mere “ka ọrụ Chineke wee pụta ìhè.” Dị ka ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ Jisọs gwọrọ, o gosipụtara ezi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụju anya nọ ma kwado na nkwa Ya iweta ọrịa na nhụjuanya nile nke ụmụ mmadụ ná njedebe n’oge Ọ kara aka bụ nke kwesịrị ka a tụkwasị ya obi.—Aịsaịa 33:24.

Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe na-akasi obi ịchọpụta na kama ịkpata nhụjuanya, Nna anyị nke eluigwe ‘na-ewere ezi ihe nye ndị na-arịọ ya?’ (Matiu 7:11) Lee otuto ọ ga-ewetara Onye Kasị Ihe Nile Elu mgbe a ga-emeghe anya ndị ìsì, meghee ntị nke ndị ntị chiri, ndị ngwụrọ ejee ije, wụlie elu, gbaakwa ọsọ!—Aịsaịa 35:5, 6.

Igbo Mkpa Ime Mmụọ Anyị

Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” (Matiu 4:4) Ee, a na-egbo mkpa ime mmụọ anyị mgbe anyị gụrụ Okwu Chineke, bụ́ Bible, ma bie ndụ anyị n’ụzọ kwekọrọ na ya. Ịjụ ndị mmụọ ase adịghị egbo mkpa ime mmụọ anyị n’ezie. N’ezie, a katọrọ omume dị otú ahụ hoo haa n’ime ihe Allan Kardec zoro aka na ya dị ka mkpughe mbụ nke iwu Chineke.—Deuterọnọmi 18:10-13.

Ọtụtụ ndị, gụnyere ndị mgbaasị, na-aghọta na Chineke bụ Onye Kachasị Elu, na-adịru mgbe ebighị ebi, onye izu okè, obiọma, ịdị mma, na izi ezi ya na-enweghị nsọtụ. Ma Bible na-ekpughekwu ihe ndị ọzọ. Ọ na-ekpughe na o nwere aha aka, bụ́ Jehova, bụ́ nke anyị na-aghaghị ịsọpụrụ dị ka Jisọs mere. (Matiu 6:9; Jọn 17:6) Ọ na-egosi Chineke dị ka onye dị adị n’ezie bụ́ onye ụmụ mmadụ pụrụ iso nwee mmekọrịta chiri anya. (Ndị Rom 8:38, 39) Site n’ịgụ Bible, anyị na-amụta na Chineke bụ onye ebere nakwa na “ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka O meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka O mesoworo anyị.” (Abụ Ọma 103:10) Site n’Okwu ya e dere ede, Eze Onyenwe anyị Jehova na-ekpughe ịhụnanya, ọkaaka, na ezi uche ya. Ọ bụ Onye na-eduzi ma na-echebe ụmụ mmadụ na-erube isi. Ịmara Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, “bụ ndụ ebighị ebi.”—Jọn 17:3.

Bible na-enye ihe ọmụma nile dị anyị mkpa banyere nzube Chineke, ọ na-agwakwa anyị ihe anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe na-atọ ya ụtọ. Iji nlezianya na-enyocha Bible na-eme ka anyị nweta azịza ndị bụ́ eziokwu ma na-eju afọ nye ajụjụ anyị dị iche iche. Bible na-enyekwa anyị nduzi banyere ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ, ọ na-enyekwa olileanya siri ike. Ọ na-emesi anyị obi ike na n’ọdịnihu dị nso, Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya [ihe a kpọrọ mmadụ]; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ; ihe mbụ nile [ga-agabigawo].” (Mkpughe 21:3, 4) Site n’aka Jisọs Kraịst, Jehova ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ya pụọ ná mmehie na ezughị okè o ketara eketa, ụmụ mmadụ na-erube isi ga-eketakwa ndụ agwụghị agwụ n’ụwa paradaịs. N’oge ahụ, a ga-egbo ma mkpa anụ ahụ ma nke ime mmụọ ha kpam kpam.—Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Ilu 2:21, 22; Matiu 5:5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 Iji gụkwuo banyere otú mmehie na ọnwụ si malite, lee isi nke 6 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 22]

BIBLE Ọ̀ NA-AKỤZI ỊLỌ ỤWA?

Ọ̀ dị akụkụ Bible ọ bụla na-akwado ozizi ịlọ ụwa? Tụlee ụfọdụ n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kweere n’ozizi a jiworo mee ihe:

“N’ihi na ndị amụma nile na iwu Chineke buru amụma ruo ụbọchị Jọn. . . . Nwoke ahụ bụ Elaịja, nke gaje ịbịa.”—Matiu 11:13, 14.

Jọn Onye Na-eme Baptism ọ̀ bụ Elaịja a mụghachiri? Mgbe a jụrụ ya: “Gị onwe gị [ị̀] bụ Elaịja?” Jọn zara n’ụzọ doro anya, sị: “Abụghị m.” (Jọn 1:21) Otú ọ dị, e buwo n’amụma na Jọn ga-ebu Mesaịa ahụ ụzọ ‘na-eji mmụọ na ike Elaịja.’ (Luk 1:17; Malakaị 4:5, 6) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jọn Onye Na-eme Baptism bụ Elaịja n’echiche bụ́ na ọ rụrụ ọrụ yiri nke Elaịja.

“Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya. Ka ọ ghara iju gị anya na M sịrị gị, A ghaghị ịmụ unu ọzọ.”—Jọn 3:3, 7.

Otu n’ime ndị ozi mesịrị dee, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Onye mụrụ anyị ọzọ, dị ka oké ebere Ya si dị, ka anyị wee nwee olileanya dị ndụ, site ná mbilite ahụ nke Jisọs Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilite.” (1 Pita 1:3, 4; Jọn 1:12, 13) N’ụzọ doro anya, ịmụ ọzọ ahụ Jisọs zoro aka na ya bụ ahụmahụ ime mmụọ nke ga-ewere ọnọdụ mgbe ndị na-eso ụzọ ya ka dị ndụ, ọ bụghị ịlọ ụwa n’ọdịnihu.

“Mgbe mmadụ nwụrụ, ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi: mgbe oge ịdị adị m n’Ụwa gwụsịworo, m ga-echere, ebe ọ bụ na m ga-alọghachi ọzọ.”—“Nsụgharị Grik” nke Job 14:14 bụ́ nke e hotara na The Gospel According to Spiritism.

Revised Standard Version si otú a sụgharịa amaokwu a: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ? M ga-echere ụbọchị nile nke ije ozi m, ruo mgbe a ga-atọhapụ m.” Gụọ ihe a na-ekwu banyere ya n’amaokwu ahụ. Ị ga-ahụ na ndị nwụrụ anwụ nọ n’ili na-echere maka “ntọhapụ” ha. (Amaokwu nke 13) Ka ha na-echere, ha adịghị adị. “Mmadụ nke nwụworo anwụchaala; mgbe onye na-anwụ anwụ nwụrụ, ọ dịghịzi adị.”—Job 14:10, nsụgharị Septuagint nke Bagster.

[Foto dị na peeji nke 21]

Olileanya mbilite n’ọnwụ na-ekpughe mmasị miri emi Chineke nwere n’ebe anyị nọ n’otu n’otu

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Chineke ga-eme ka nhụjuanya nile nke ụmụ mmadụ kwụsị