Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Lusifa ọ̀ bụ aha Bible ji eme ihe maka Setan?

Aha ahụ bụ́ Lusifa pụtara otu ugboro n’Akwụkwọ Nsọ, ọ bụkwa nanị ná nsụgharị ụfọdụ nke Bible. Dị ka ihe atụ, Bible Nsọ nke Union Version si otú a sụgharịa Aịsaịa 14:12: “Lee, otú i siworo n’eluigwe daa, gị Lusifa, nwa chi ọbụbọ!”

Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “Lusifa” pụtara “onye na-egbuke egbuke.” Septuagint ji okwu Grik nke pụtara “onye na-eweta chi ọbụbọ” mee ihe. N’ihi ya, ụfọdụ nsụgharị na-asụgharị okwu Hibru mbụ ahụ ịbụ “kpakpando ụtụtụ.” Ma Vulgate Latin nke Jerome dere ji “Lusifa” (onye na-enye ìhè) mee ihe, nke a na-akọwakwa ihe mere okwu ahụ ji dịrị ná nsụgharị dị iche iche nke Bible.

Ònye bụ Lusifa a? A na-ahụ okwu ahụ bụ́ “onye na-egbuke egbuke,” ma ọ bụ “Lusifa,” n’ihe Aịzaịa nyere ụmụ Izrel iwu n’ụzọ amụma ịkpọsa dị ka ‘ilu ha ga-atụ megide eze Babilọn.’ N’ihi ya, o so n’ilu nke ọ bụ usoro ndị eze Babilọn bụ ndị bụ́ isi a tụụrụ ya. Na ọ bụ mmadụ ka a kpọrọ “onye na-egbuke egbuke,” ọ bụghị mmụọ e kere eke, ka a na-ahụkwu site n’okwu bụ́: “Ruo [Shiol, NW] ka a ga-eme ka ị rịdaa.” Shiol bụ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ—ọ bụghị ebe Setan bụ́ Ekwensu bi. Ọzọkwa, ndị na-ahụ ka e mere ka Lusifa nọrọ n’ọnọdụ a na-ajụ, sị: “Ọ̀ bụ nke a bụ nwoke ahụ nke na-eme ka ụwa maa jijiji?” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’ụzọ doro anya, “Lusifa” na-ezo aka n’ebe mmadụ nọ, ọ bụghị n’ebe mmụọ e kere eke nọ.—Aịsaịa 14:4, 15, 16.

N’ihi gịnị ka e ji nye usoro ndị eze Babilọn nkọwa dị ùgwù otú ahụ? Anyị aghaghị ịghọta na a gaje ịkpọ eze Babilọn onye na-egbuke egbuke nanị mgbe ọ dasịrị nakwa n’ụzọ ịkwa emo. (Aịsaịa 14:3) Mpako nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akpali kwaliri ndị eze Babilọn ibuli onwe ha elu karịa ndị nọ ha gburugburu. Mpako nke usoro ndị eze ahụ dị nnọọ ukwuu nke na e gosipụtara ha dị ka ndị na-etu ọnụ, sị: ‘N’eluigwe ka anyị ga-arịgo, n’elu kpakpando nile nke Chineke ka anyị ga-ebuli ocheeze anyị; anyị ga-anọkwasịkwa n’ugwu nzukọ, na nsọtụ nile nke Ugwu: . . . anyị ga-eyi Onye kachasị ihe nile elu.’—Aịsaịa 14:13, 14.

“Kpakpando nile nke Chineke” bụ ndị eze nọ n’usoro ndị eze Devid. (Ọnụ Ọgụgụ 24:17) Site na Devid gawa, “kpakpando” ndị a nọ n’Ugwu Zaịọn chịa. Mgbe Solomọn wusịrị ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, a bịara na-akpọ obodo ahụ dum Zaịọn. N’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, e nyere ndị ikom nile nke Izrel iwu ịga Zaịọn ugboro atọ n’afọ. N’ụzọ dị otú a, ọ ghọrọ ‘ugwu nzukọ.’ Site n’ikpebi imeri ndị eze Juda ma wepụzie ha n’ugwu ahụ, Nebukadneza na-ekwupụta ọchịchọ ya ime ka ya dị elu karịa “kpakpando” ndị ahụ. Kama inye Jehova ekele maka mmeri e meriri ha, o ji mpako debe onwe ya n’ọnọdụ Jehova. N’ihi ya, ọ bụ mgbe a kwaturu ya n’ala ka e ji ịkwa emo kpọọ usoro ndị eze Babilọn “onye na-egbuke egbuke.”

N’ezie, mpako nke ndị ọchịchị Babilọn na-egosipụta àgwà nke “chi nke usoro ihe a”—Setan bụ́ Ekwensu. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ya onwe ya na-enwe oké ọchịchọ maka ikike, ọ na-agụsikwa ya agụụ ike ibuli onwe ya elu karịa Jehova Chineke. Ma Lusifa abụghị aha Akwụkwọ Nsọ nyere Setan.

N’ihi gịnị ka 1 Ihe E Mere 2:13-15 ji zoo aka n’ebe Devid nọ dị ka nwa nwoke nke asaa nke Jesi, ebe 1 Samuel 16:10, 11 na-egosi na ọ bụ nke asatọ?

Mgbe Eze Sọl nke Izrel oge ochie sisịrị n’ezi ofufe dapụ, Jehova Chineke zigara Samuel onye amụma ite otu n’ime ụmụ ndị ikom Jesi mmanụ dị ka eze. Ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke banyere ihe omume a, bụ́ nke Samuel n’onwe ya dere na narị afọ nke 11 T.O.A., kwuru na Devid bụ nwa nwoke nke asatọ nke Jesi. (1 Samuel 16:10-13) Ma, ihe ndekọ onye nchụàjà bụ́ Ezra dere ihe dị ka afọ 600 mgbe e mesịrị na-asị: “Jesi mụọ ọkpara ya, bụ́ Elaịab, na Abinadab, bụ́ nke abụọ, na Shimea, bụ́ nke atọ; na Netanel, bụ́ nke anọ, na Radaị, bụ́ nke ise; na Ozem, bụ́ nke isii, na Devid, bụ́ nke asaa.” (1 Ihe E Mere 2:13-15) Gịnị mere otu n’ime ụmụnne Devid, n’ihi gịnịkwa ka Ezra na-ejighị dee aha ya?

Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na Jesi ‘nwere ụmụ ndị ikom asatọ.’ (1 Samuel 17:12) Ihe àmà na-egosi na otu n’ime ụmụ ya ndị ikom adịteghị ndụ aka iji lụọ nwanyị ma mụta ụmụ. Ebe ọ bụ na ọ mụghị ụmụ, ọ gaghị enwe ihe nketa n’ebo ya, ọ dịghị uru ọ ga-aba n’ihe ndekọ usoro ọmụmụ nke eriri Jesi.

Ugbu a, ka anyị chee echiche banyere ụbọchị Ezra. Tụlee ọnọdụ ọ nọ na ya dee Ihe E Mere. Ndị Juu si ná ndọrọ n’agha Babilọn lọta ihe dị ka afọ 77 tupu mgbe ahụ, e meekwa ka ha birighachi n’ala ha. Eze Peasia enyewo Ezra iwu ịhọpụta ndị ikpe na ndị ozizi nke Iwu Chineke na ịchọ ụlọ Jehova mma. E nwere mkpa maka idepụta usoro ọmụmụ ziri ezi iji mee ka ihe nketa nke ebo ọ bụla doo anya na iji jide n’aka na ọ bụ nanị ndị e nyere ikike ije ozi n’òtù ndị nchụàjà na-eje ya. N’ihi ya, Ezra deturu akụkọ ihe mere eme nke mba ahụ n’ụzọ zuru ezu, gụnyere ihe ndekọ doro anya a pụrụ ịdabere na ya nke usoro ọmụmụ nke Juda nakwa nke Devid. Aha nwa Jesi nke nwụrụ n’amụtaghị nwa agaghị aba uru ọ bụla. N’ihi ya, Ezra edenyeghị aha ya.