Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jehova Nwe Nzọpụta”

“Jehova Nwe Nzọpụta”

“Jehova Nwe Nzọpụta”

N’OGE ndị e nwere ọgba aghara ná mba na esemokwu n’etiti mba na mba, ndị mmadụ na-elegara gọọmenti ha anya maka nchebe na ịnọ ná ntụkwasị obi. N’aka nke ha, gọọmenti na-eguzobe usoro ihe omume a haziri iji nweta nkwado nke ọha mmadụ. Ka a na-eji usoro ihe omume ahụ na-akwalitekwu mmụọ ịhụ mba n’anya, otú ahụ ka a na-emewanye ememe ịhụ mba n’anya ugboro ugboro.

Mgbe e nwere ọnọdụ mberede ná mba, mmụọ ịhụ mba n’anya na-emekarị ka ndị mmadụ nwee mmetụta nke ịdị n’otu na inwe ume, ọ pụkwara ịkwalite mmụọ imekọ ihe ọnụ na igborịta mkpa ibe ha. Otú ọ dị, “ịhụ mba n’anya dịkwa ize ndụ dị ka mmụọ ọ bụla ọzọ,” ka otu isiokwu gbara na The New York Times Magazine na-ekwu, ebe ọ bụ na “ozugbo a malitere igosipụta ya, a pụrụ ime otú ahụ n’ụzọ ndị na-adịtụghị mma.” Igosipụta ya pụrụ imesị metụta nnwere onwe nkịtị na nke okpukpe nke ụfọdụ ụmụ amaala nke mba ahụ. A na-arụgide ezi Ndị Kraịst karịsịa imebi nkwenkwe ha. Olee otú ha si eme omume mgbe e nwere ọnọdụ dị otú ahụ n’ebe ha bi n’ụwa? Ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa na-enyere ha aka iji nghọta eme ihe ma nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke?

“Gị Akpọla Isiala Nye Ha”

Mgbe ụfọdụ, ikele ọkọlọtọ mba na-aghọ ụzọ a ma ama e si egosipụta mmụọ ịhụ mba n’anya. Ma ọkọlọtọ na-enwekarị ihe osise nke ihe ndị dị n’eluigwe, dị ka kpakpando, nakwa ihe ndị dị n’ụwa. Chineke kwupụtara echiche ya banyere ịkpọrọ ihe ndị dị otú ahụ isiala mgbe o nyere ndị ya iwu, sị: “Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe: n’ihi na Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke [na-achọ ka a na-efe ya ofufe a na-ekewaghị ekewa, NW].”—Ọpụpụ 20:4, 5.

Ikele ma ọ bụ igbu ikpere n’ala n’ihu ọkọlọtọ nke na-anọchi anya ọchịchị ò megidere inye Jehova Chineke ofufe a na-ekewaghị ekewa n’ezie? N’ezie, ndị Izrel oge ochie nwere “ihe ịrịba ama,” ma ọ bụ ọkọlọtọ, bụ́ ndị ebo atọ e kewagasịrị ha gaa na-agba gburugburu mgbe ha nọ n’ọzara. (Ọnụ Ọgụgụ 2:1, 2) N’ikwu okwu banyere okwu Hibru ndị na-akọwa ụkpụrụ ndị dị otú ahụ, akwụkwọ bụ́ Cyclopedia nke McClintock na Strong dere na-ekwu, sị: “Otú ọ dị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha na-egosipụta echiche ‘ọkọlọtọ’ na-enye anyị, ya bụ ọkọlọtọ [mba].” Ọzọkwa, e leghị ọkọlọtọ ndị Izrel anya dị ka ihe ndị dị nsọ, o nweghịkwa ememe ndị e jikọtara ha na ha. Ha rụrụ ọrụ dị ka ihe ịrịba ama nanị, na-egosi ndị ahụ ebe ha ga-ezukọ.

Ihe ọkpụkpụ nke ndị cherub bụ́ ndị dị n’ụlọikwuu nzute na n’ụlọ nsọ Solomọn wuru bụ n’ụzọ bụ́ isi ihe na-egosipụta ndị cherub nọ n’eluigwe. (Ọpụpụ 25:18; 26:1, 31, 33; 1 Ndị Eze 6:23, 28, 29; Ndị Hibru 9:23, 24) Na a gaghị efe ihe ọkpụkpụ a yiri ndị cherub ofufe pụtara ìhè site n’eziokwu ahụ bụ́ na ọ dịghị mgbe ndị ahụ n’ozuzu ha hụrụ ha anya nakwa na a gaghị efe ndị mmụọ ozi n’onwe ha ofufe.—Ndị Kọlọsi 2:18; Mkpughe 19:10; 22:8, 9.

Tụleekwa ihe oyiyi nke agwọ ọla nke Mozis onye amụma mere n’oge ndị Izrel nọrọ nwa oge n’ọzara. Ihe oyiyi ahụ rụrụ ọrụ dị ka ihe nnọchianya ma nwee ihe ọ pụtara n’ụzọ amụma. (Ọnụ Ọgụgụ 21:4-9; Jọn 3:14, 15) E feghị ya ofufe ma ọ bụ jiri ya fee ofufe. Otú ọ dị, ọtụtụ narị afọ ka oge Mozis gasịrị, ndị Izrel malitere ife otu ihe oyiyi ahụ ofufe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, ọbụna na-esurere ya ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. N’ihi ya, Eze Hezekaịa nke Juda mere ka e tipịa ya.—2 Ndị Eze 18:1-4.

Ọkọlọtọ mba ọ̀ bụ nanị ihe ịrịba ama nke na-arụ ọrụ ụfọdụ bara uru? Gịnị ka ha na-anọchi anya ya? “Ihe atụ okwukwe nke bụ́ isi, na isi ihe ofufe nke ịhụbiga mba n’anya ókè bụ ọkọlọtọ,” ka onye edemede bụ́ J. Paul Williams kwuru. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-asị: “Ọkọlọtọ, dị ka obe, dị nsọ.” Ọkọlọtọ bụ ihe nnọchianya nke ọchịchị. N’ihi ya, ịkpọ isiala nye ya ma ọ bụ ikele ya bụ ememe okpukpe nke na-enye ọchịchị nsọpụrụ ofufe. Omume dị otú ahụ na-ekwu na ọ bụ ọchịchị ka nzọpụta dị n’aka, o kwesịghịkwa ekwesị n’ihi ihe Bible na-ekwu banyere ikpere arụsị.

Akwụkwọ Nsọ kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Jehova nwe nzọpụta.” (Abụ Ọma 3:8) A gaghị asị na ọ bụ òtù ọ bụla nke ụmụ mmadụ ma ọ bụ ihe nnọchianya ha nwe nzọpụta. Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, gbanahụnụ ikpere arụsị.” (1 Ndị Kọrint 10:14) Ndị Kraịst oge mbụ ekereghị òkè n’ife ọchịchị ofufe. N’akwụkwọ bụ́ Those About to Die, Daniel P. Mannix na-ekwu, sị: “Ndị Kraịst jụrụ . . . ịchụrụ mmụọ onye ọchịchị alaeze ukwu [Rom] àjà—nke yitụrụ taa ka ịjụ ikele ọkọlọtọ.” Otú ahụ ka ọ dịkwa ezi Ndị Kraịst taa. Iji na-efe Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa, ha na-ajụ ikele ọkọlọtọ nke mba ọ bụla. Site n’ime otú ahụ, ha na-ebute Chineke ụzọ ka anyị na-anọgide na-akwanyere gọọmenti na ndị ọchịchị ha ùgwù. N’ezie, ha na-aghọta na ọ bụ ọrụ dịịrị ha ido onwe ha n’okpuru “ikike ndị ka elu” nke ọchịchị. (Ndị Rom 13:1-7) Otú ọ dị, gịnị bụ echiche Akwụkwọ Nsọ banyere ịbụ abụ na-egosi ịhụ mba n’anya, dị ka ukwe ndị e ji eto mba?

Gịnị Bụ Ukwe Ndị E Ji Eto Mba?

“Ukwe ndị e ji eto mba bụ nkwupụta nke ịhụ mba n’anya, ọ na-agụnyekarịkwa arịrịọ ka Chineke na-eduzi ma na-echebe ndị mmadụ ma ọ bụ ndị na-achị ha,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ukwe ito mba bụ uri a na-agụ n’aha mba ma ọ bụ ekpere a na-ekpe n’isi ya. Ihe a na-arịọkarị na ya bụ ka mba na-enwe ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe ma nọtee aka. Ezi Ndị Kraịst hà kwesịrị iso na-ekwupụta echiche ndị dị otú ahụ dị n’ụdị ekpere?

Jeremaịa onye amụma biri ndụ n’etiti ndị sịrị na ha na-ejere Chineke ozi. Ma Jehova nyere ya iwu, sị: “Ekpela ekpere banyere ndị nke a, ebulikwala iti mkpu na ikpe ekpere banyere ha, arịọkwala m arịrịọ: n’ihi na M gaghị na-anụ olu gị.” (Jeremaịa 7:16; 11:14; 14:11) N’ihi gịnị ka e ji nye Jeremaịa iwu a? Ọ bụ n’ihi na obodo ha jupụtara n’izu ohi, igbu mmadụ, ịkwa iko, ịṅụ iyi ụgha, na ikpere arụsị.—Jeremaịa 7:9.

Jizọs Kraịst setịpụrụ ụkpụrụ mgbe ọ sịrị: “M na-arịọ, ọ bụghị banyere ụwa, kama banyere ndị i nyeworo m.” (Jọn 17:9) Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ” ma “na-agabiga.” (1 Jọn 2:17; 5:19) Oleezi otú ezi Ndị Kraịst pụrụ isi kpachara anya na-ekpe ekpere maka ọganihu na ịdịte aka nke usoro ihe dị otú ahụ?

N’ezie, ọ bụghị ukwe ito mba nile na-agụnye arịrịọ nye Chineke. “Echiche ndị a na-ekwupụta n’ukwe dị iche iche e ji eto mba na-adị iche,” ka Encyclopædia Britannica na-ekwu, “site n’ekpere maka eze ruo n’ịrụtụ aka n’agha ma ọ bụ nnupụisi ụfọdụ dị mba mkpa . . . ruo n’okwu ndị e ji egosipụta na a hụrụ mba n’anya.” Ma ndị na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ hà pụrụ n’ezie ịdị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi agha na nnupụisi nke mba ọ bụla? Banyere ndị na-efe ezi ofufe, Aịzaịa buru amụma, sị: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.” (Aịsaịa 2:4) “Ọ bụ ezie na anyị na-eje ije n’anụ ahụ́,” ka Pọl onyeozi dere, “anyị adịghị ebu agha dị ka ihe anyị bụ n’anụ ahụ́ si dị. N’ihi na ngwá ọgụ nke anyị ji ebu agha abụghị nke anụ ahụ́.”—2 Ndị Kọrint 10:3, 4.

Ukwe ito mba na-egosikarị mmụọ iji mba etu ọnụ ma ọ bụ mmụọ ịka ndị ọzọ elu. Echiche a enweghị ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ. N’okwu o kwuru n’Ariopagọs, Pọl onyeozi sịrị: “[Jehova Chineke] sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.” (Ọrụ 17:26) “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu,” ka Pita onyeozi kwuru, “kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

N’ihi nghọta ha ghọtara Bible, ọtụtụ ndị na-eji aka ha kpebie izere ikere òkè n’ikele ọkọlọtọ na n’ịbụ abụ na-egosi ịhụ mba n’anya. Ma olee otú ha si eme omume mgbe ha zutere ọnọdụ ndị na-eme ka ha chee ihe ndị a ihu?

Jiri Nkwanye Ùgwù Jụ Ya

Ná mgbalị iwusi ịdị n’otu nke alaeze ukwu ya ike, Eze Nebukadneza nke Babilọn oge ochie guzobere akatamkpo ihe oyiyi ọlaedo na ndagwurugwu Dura. O meziri ndokwa maka ememe ịrara ya nye bụ́ nke ọ kpọrọ ndị nnọchianya ya, ndị isi ya, ndị ọchịchị ya, ndị ikpe ya, na ndị ọzọ nọ n’ọkwá dị elu òkù ịbịa. Ozugbo ha nụrụ ụda egwú, ndị nile gbakọtara n’ebe ahụ ga-akpọ isiala ma fee ihe oyiyi ahụ ofufe. Ndị so ná ndị na-aghaghị ịnọ n’ebe ahụ bụ ndị Hibru atọ na-eto eto—Shedrak, Mishak, na Abed-nego. Olee otú ha si gosi na ha adịghị ekere òkè n’ememe okpukpe a? Ka egwú ahụ malitere, ndị zukọtara n’ebe ahụ akpọọkwa isiala n’ihu ihe oyiyi ahụ, ndị Hibru atọ ahụ nọgidere guzoro ọtọ.—Daniel 3:1-12.

Taa, a na-ekelekarị ọkọlọtọ site n’ịgbatịpụ aka n’ihu ma ọ bụ site n’idebe aka n’egedege ihu ma ọ bụ n’obi. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ ịnọ n’ụzọ pụrụ iche. N’ala ụfọdụ, a na-atụ anya ka ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ gbuo ikpere n’ala ma sutu ọkọlọtọ ọnụ. Site n’iguzo ọtọ ma gbachie nkịtị ka ndị ọzọ na-ekele ọkọlọtọ, ezi Ndị Kraịst na-eme ka o doo anya na ha bụ ndị ji nkwanye ùgwù na-ekiri ihe na-emenụ.

Gịnị ma ọ bụrụ na e duziri ememe ikele ọkọlọtọ n’ụzọ ga-eme ka nanị iguzo ọtọ bụrụ ihe àmà nke ikere òkè? Dị ka ihe atụ, were ya na a họpụtara otu nwata akwụkwọ n’otu ụlọ akwụkwọ ịnọchite anya ụlọ akwụkwọ ahụ dum, ya ekeleekwa ọkọlọtọ n’èzí n’ebe a kwụnyere ọkọlọtọ ahụ, ebe a na-atụ anya ka ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ guzoro kwem n’ime klas. N’ọnọdụ a, nanị iguzo ọtọ na-egosi na e kwenyere ka nwa akwụkwọ ahụ nọ n’èzí rụọ ọrụ dị ka onye nnọchianya n’ikele ọkọlọtọ. Iguzo ọtọ n’ụzọ ọ bụla ga-apụtazi isonye n’ememe ahụ. Ọ bụrụ na ọ dị otú a, ndị na-achọ iji nkwanye ùgwù na-ekiri ihe na-emenụ ga-anọ ọdụ n’oche ma gbachie nkịtị. Gịnị ma ọ bụrụ na ndị klas guzo ọtọ tupu ememe dị otú ahụ amalite? N’ọnọdụ a, ọ gaghị egosi na anyị na-ekere òkè ma ọ bụrụ na anyị anọgide guzoro ọtọ.

Ka e were ya na a gwaghị mmadụ ka o kelee ọkọlọtọ kama nanị ka o jide ya mgbe a na-eje ije n’ahịrị ma ọ bụ n’ọnụ ụlọ klas ma ọ bụkwanụ n’ebe ọzọ, ka ndị ọzọ wee nwee ike ikele ya. Kama ‘ịgbanahụ ikpere arụsị,’ dị ka Akwụkwọ Nsọ nyere n’iwu, nke ahụ ga-apụta n’ezie ịnọ n’isi ememe ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ịga ije ahịrị nke ịhụ mba n’anya. Ebe ọ bụ na ime nke a ga-apụta ịkwado ihe e ji ịga ije ahịrị ahụ na-asọpụrụ, ezi Ndị Kraịst na-ajụ n’ihi akọ na uche ha.

Mgbe a malitere ikwe ukwe ito mba, dị ka ọ na-adịkarị, nanị ihe mmadụ ga-eme iji gosi na o kwenyere n’ihe a na-ekwe n’ukwe ahụ bụ iguzo ọtọ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, Ndị Kraịst na-anọdụ ọdụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha guzo ọtọ tupu a malite ikwe ukwe ito mba, ọ dịghị mkpa ha ime ihe pụrụ iche bụ́ ịnọdụ ọdụ. Ha ahọọrọghị nnọọ iguzo ọtọ kpọmkwem maka ukwe ahụ. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na a chọrọ ka otu ìgwè guzoro ọtọ ma kwewe ukwe, mgbe ahụ, nanị iguzo ọtọ iji kwanye ùgwù ma ghara ịbụ abụ agaghị apụta ikwenye n’ihe a na-ekwe n’ukwe ahụ.

“Nweenụ Ezi Akọ na Uche”

Mgbe ode abụ ahụ kọwasịrị adịghị irè nke ihe ndị aka mere bụ́ ndị a na-efe ofufe, o kwuru, sị: “Ndị na-eme ha ga-adị ka ha; ee, onye ọ bụla nke na-atụkwasị ha obi.” (Abụ Ọma 115:4-8) Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, onye na-efe Jehova ofufe agaghị anakwere ọrụ ọ bụla nke metụtara kpọmkwem imepụta ihe ndị a na-efe ofufe, gụnyere ọkọlọtọ mba. (1 Jọn 5:21) Ọnọdụ ndị ọzọ pụkwara ịdapụta n’ebe ọrụ bụ́ ndị Ndị Kraịst ga-anọ na ha jiri nkwanye ùgwù gosi na ha adịghị efe ma ọkọlọtọ ma ihe ọ na-anọchi anya ya, kama nanị Jehova.

Dị ka ihe atụ, onye were mmadụ n’ọrụ pụrụ ịgwa onye o were n’ọrụ ka ọ kwụnye ma ọ bụ wetuo ọkọlọtọ n’elu ụlọ. Ma onye ahụ ọ̀ ga-eme nke ahụ ma ọ bụ na ọ gaghị eme ya dabeere n’otú o si lee ọnọdụ ahụ anya. Ọ bụrụ na ịkwụnye ma ọ bụ iwetu ọkọlọtọ ahụ bụ akụkụ nke ememe pụrụ iche, nke ga-eme ka ndị mmadụ guzoro kwem ma ọ bụ na-ekele ọkọlọtọ ahụ, mgbe ahụ, ime nke a bụ ikere òkè n’ememe ahụ.

N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ọ dịghị ememe ya na ịkwụnye na iwetu ọkọlọtọ so, mgbe ahụ ime nke a adịghị ihe ọzọ ọ bụ karịa ịrụ ọrụ ndị dị ka ịkwadebe ụlọ maka iji ya mee ihe, ịkpọghe na ịkpọchi ụzọ, na imeghe na imechi windo. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọkọlọtọ bụ nanị ihe nnọchianya nke ọchịchị, ịkwụnye ma ọ bụ iwetu ya, tinyere ịrụ ọrụ ndị ọzọ, bụ ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya na-adabere n’ihe akọ na uche ya e ji Bible zụọ gwara ya. (Ndị Galeshia 6:5) Akọ na uche nke otu onye pụrụ ịkpali ya ịgwa onye na-elekọta ọrụ ya ka ọ gwa onye ọrụ ọzọ ka ọ kwụnye ma ọ bụ wetuo ọkọlọtọ ahụ. Onye Kraịst ọzọ pụrụ iche na akọ na uche ya ga-ekwe ya imetụ ọkọlọtọ ahụ aka ma ọ bụrụhaala na ọ dịghị ememe ya na ya so. N’agbanyeghị ihe bụ mkpebi e mere, ndị na-efe ezi ofufe kwesịrị ‘inwe ezi akọ na uche’ n’ihu Chineke.—1 Pita 3:16.

Ọ dịghị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru megide ịrụ ọrụ ma ọ bụ ịnọ n’ụlọ ọha, dị ka n’ụlọ kansụl ime obodo na n’ụlọ akwụkwọ, bụ́ ebe ndị a na-akwụnye ọkọlọtọ. A pụkwara ise ọkọlọtọ na stamp e ji ezipụ akwụkwọ ozi, nọmba ụgbọala, ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ gọọmenti na-emepụta. Iji ihe ndị ahụ eme ihe adịghị eme ka ndị ji ha eme ihe bụrụ ndị na-ekere òkè n’ife ofufe. Ihe dị mkpa n’ebe a abụghị ọkọlọtọ ma ọ bụ ihe yiri ya, kama ọ bụ otú mmadụ si eme ihe banyere ya.

A na-edebekarị ọkọlọtọ na windo, n’ọnụ ụzọ, n’ụgbọala, n’elu tebụl, ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ. A pụkwara ịzụ ákwà ndị e biri ihe ndị e ji mara ọkọlọtọ na ha. Ná mba ụfọdụ, iwu megidere iyi ihe ndị dị otú ahụ. Ọ bụrụgodị na ime otú ahụ emegideghị iwu, gịnị ka ọ pụrụ igosi banyere ọnọdụ onye ahụ n’ebe ụwa dị? Banyere ụmụazụ ya, Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:16) E kwesịghị ileghara mmetụta omume dị otú ahụ pụrụ inwe n’ahụ́ ndị kwere ekwe ibe anyị anya. Ọ̀ pụrụ imebi akọ na uche nke ụfọdụ ndị? Ọ̀ pụrụ ime ka mkpebi ha iguzosi ike n’okwukwe ghara isikwa ike? Pọl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: ‘Unu jide ihe ndị ka mkpa n’aka, ka unu wee bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ, gharakwa ịbụ ndị na-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.’—Ndị Filipaị 1:10.

“Na-emeso Mmadụ Nile n’Ụzọ Dị Nro”

Ka ọnọdụ ụwa na-aka njọ ‘n’oge ndị a pụrụ iche,’ o yiri ka mmụọ ịhụ mba n’anya ọ ga-esikwu ike. (2 Timoti 3:1) Ka ndị hụrụ Chineke n’anya ghara ichefu ma ọlị na ọ bụ nanị Jehova nwe nzọpụta. O ruuru ya ịbụ onye a na-efe ofufe a na-ekewaghị ekewa. Mgbe a gwara ndịozi Jizọs ka ha mee ihe na-ekwekọghị n’uche Jehova, ha sịrị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

“Ọ dịghị mkpa ka ohu nke Onyenwe anyị na-alụ ọgụ,” ka Pọl onyeozi dere, “kama ọ dị mkpa ka ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro.” (2 Timoti 2:24) N’ihi ya, Ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịdị na-eme udo, na-egosi nkwanye ùgwù, ma na-adị nro ka ha na-adabere n’akọ na uche ha e ji Bible zụọ na-eme mkpebi ndị metụtara ikele ọkọlọtọ na ikwe ukwe e ji eto mba.

[Foto dị na peeji nke 23]

Site n’ịkwụsi ike ma na-egosi nkwanye ùgwù, ndị Hibru atọ họọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ

[Foto dị na peeji nke 24]

Olee otú Onye Kraịst kwesịrị isi mee omume mgbe a na-eme ememe ịhụ mba n’anya?