Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ezi Ndị Senti Pụrụ Isi Nyere Gị Aka?

Olee Otú Ezi Ndị Senti Pụrụ Isi Nyere Gị Aka?

Olee Otú Ezi Ndị Senti Pụrụ Isi Nyere Gị Aka?

N’AKWỤKWỌ NSỌ, a pụrụ ịsụgharị okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “onye senti” ná nsụgharị ụfọdụ ịbụ “onye nsọ.” Ònye ka okwu ahụ na-ezo aka n’ebe ọ nọ? “N’ụdị ụbara ya, dị ka mgbe e ji ya eme ihe maka ndị kwere ekwe,” ka akwụkwọ bụ́ An Expository Dictionary of New Testament Words na-ekwu, “ọ na-ezo aka n’ebe ndị nile dị otú ahụ nọ, e jighịkwa ya eme ihe nanị n’ebe ndị dị nsọ n’ụzọ pụrụ iche nọ, ma ọ bụ n’ebe ndị e ji omume ịdị nsọ ndị pụrụ iche mara mgbe ha nwụsịrị nọ.”

N’ihi ya, Pọl onyeozi kọwara Ndị Kraịst oge mbụ nile dị ka ezi ndị senti, ma ọ bụ ndị nsọ. Dị ka ihe atụ, o degaara “ọgbakọ Chineke nke dị na Kọrint, ya na ndị nsọ nile nọ n’Akea dum [nke dị na Rom],” akwụkwọ ozi na narị afọ mbụ O.A. (2 Ndị Kọrint 1:1) Mgbe e mesịrị, Pọl degaara “ndị nile nọ na Rom dị ka ndị Chineke hụrụ n’anya, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nsọ” akwụkwọ ozi. (Ndị Rom 1:7) O doro anya na ndị nsọ a anwụbeghị n’oge ahụ, e dobeghịkwa ha iche karịa ndị ọzọ kwere ekwe n’ihi omume ọma ha pụrụ iche. Gịnị ka a dabeere na ya wee doo ha iche dị ka ndị senti?

Ndị Chineke Doro Nsọ

Okwu Chineke na-egosi na ọ bụghị mmadụ ma ọ bụ òtù na-eme mmadụ senti. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “[Chineke] zọpụtara anyị ma kpọọ anyị ọkpụkpọ dị nsọ, ọ bụghị n’ihi ọrụ anyị, kama n’ihi nzube na obiọma na-erughịrị mmadụ nke ya.” (2 Timoti 1:9) A na-edo onye nsọ nsọ n’ihi ọkpụkpọ Jehova kpọrọ ya, dị ka obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke si dị nakwa n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Ya.

Ndị nsọ nke ọgbakọ Ndị Kraịst so ‘n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ’ ahụ. Ọbara Jizọs Kraịst wụsịrị na-eme ka ọgbụgba ndụ a dị irè ma na-edo ndị so na ya nsọ. (Ndị Hibru 9:15; 10:29; 13:20, 24) N’ịbụ ndị e mere ka ha dị ọcha n’anya Chineke, ha bụ ‘òtù ndị nchụàjà dị nsọ, ha na-achụkwa àjà ime mmụọ ndị Chineke na-anara nke ọma site n’aka Jizọs Kraịst.’—1 Pita 2:5, 9.

Ịrịọ Ndị Senti Arịrịọ na Ha Ịrịọchite Arịrịọ

Ebe ọ bụ na ha kweere na “ndị senti” pụrụ inye ndị kwere ekwe ike pụrụ iche, ọtụtụ nde mmadụ na-enye ha nsọpụrụ ofufe site n’iji ihe onwunwe ha eme ihe ma ọ bụ site n’ịkpọku ha ka ha rịọchitere ha arịrịọ. Nke a ọ̀ bụ ozizi dabeere na Bible? N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jizọs kụziiri ụmụazụ ya otú e si abịaru Chineke nso, na-asị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’” (Matiu 6:9) Ọ bụ nanị Jehova Chineke ka e kwesịrị ikpegara ekpere.

Ná mgbalị iji kwado “ndị senti” ịrịọchitere mmadụ arịrịọ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe na-ehota Ndị Rom 15:30, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ana m agba unu ume, ụmụnna m, site n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na site n’ịhụnanya nke mmụọ nsọ, ka unu soro m na-ekpesi ekpere ike nye Chineke maka m.” Pọl ọ̀ na-agba ndị ahụ kwere ekwe ume ikpeku ya ekpere ma ọ bụ iji aha ya na-agakwuru Chineke? Ee e. Ọ bụ ezie na a gbara ume na Bible ikpe ekpere maka ezi ndị senti, ma ọ bụ ndị nsọ, ọ dịghị ebe ọ bụla Chineke nyere anyị iwu ikpe ekpere nye ndị nsọ dị otú ahụ ma ọ bụ isi n’aka ha na-ekpe ekpere.—Ndị Filipaị 1:1, 3, 4.

Otú ọ dị, Chineke ahọpụtawo onye anyị ga na-esi n’aka ya ekpe ekpere. “Abụ m ụzọ na eziokwu na ndụ,” ka Jizọs Kraịst sịrị. “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” Jizọs kwukwara, sị: “Ihe ọ bụla unu rịọrọ n’aha m, m ga-eme nke a, ka e wee nye Nna ahụ otuto n’ihe metụtara Ọkpara ya. Ọ bụrụ na unu arịọ ihe ọ bụla n’aha m, m ga-eme ya.” (Jọn 14:6, 13, 14) Obi pụrụ isi anyị ike na Jehova dị njikere ịnụ ekpere ndị e kpere n’aha Jizọs. Banyere Jizọs, Bible na-ekwu, sị: “O nwekwara ike ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ́ ndị na-abịaru Chineke nso site na ya, n’ihi na ọ na-adị ndụ mgbe nile ịrịọ arịrịọ maka ha.”—Ndị Hibru 7:25.

Ọ bụrụ na Jizọs dị njikere ịrịọchitere anyị arịrịọ, n’ihi gịnị ka ndị na-efe ofufe na Krisendọm jikarị akpọku “ndị senti” n’ekpere? N’akwụkwọ ya bụ́ The Age of Faith, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant chọpụtara ebe omume a si malite. Ka ọ na-ekwu na a tụrụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile egwu, Jizọs eyiekwa onye a pụrụ ịbịaru nso karị, Durant sịrị: “Ọ na-esiri mmadụ ike ịgwa [Jizọs] okwu ihu na ihu mgbe onye ahụ na-emezughị ma ọlị ihe ndị dị n’Okwu Ngọzi Ya. O yiri ihe amamihe dị na ya karị ikpegara onye senti ekpere bụ́ onye o doro anya na ọ nọ n’eluigwe n’ihi na e chiri ya senti, ma rịọ ya ka ọ rịọchitere anyị arịrịọ n’ihu Kraịst.” Nchegbu ndị a hà ziri ezi?

Bible na-akụziri anyị na site n’aka Jizọs, anyị pụrụ inwe ‘nkwuwa okwu ma jiri obi ike bịaruo Chineke nso’ n’ekpere. (Ndị Efesọs 3:11, 12) Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile anọghị ihe a kpọrọ mmadụ n’ebe dị nnọọ anya ịnụ ekpere anyị. Ode abụ bụ́ Devid ji obi ike kpee ekpere, sị: “Gị Onye na-anụ ekpere, Gị ka anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịakwute.” (Abụ Ọma 65:2) Kama isite n’ihe onwunwe “ndị senti” nwụrụ anwụ na-enye ike, Jehova na-awụkwasị mmụọ nsọ ya n’ahụ́ ndị ji okwukwe na-arịọ maka ya. Jizọs chere echiche, sị: “Ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”—Luk 11:13.

Ọrụ Ndị Nsọ Na-arụ

Ndị nsọ Pọl degaara akwụkwọ ozi nwụrụ ọtụtụ narị afọ gara aga, ka oge na-agakwa, ha gaje ịnata “okpueze bụ́ ndụ,” mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe. (Mkpughe 2:10) Ndị na-efe Jehova Chineke ofufe maara na inye ezi ndị senti a nsọpụrụ ofufe ekwekọghi n’Akwụkwọ Nsọ, nakwa na ọ pụghị ichebe mmadụ pụọ n’ọrịa, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọnọdụ akụ̀ na ụba a na-ejighị n’aka, ịka nká, ma ọ bụ ọnwụ. N’ihi ya, ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ndị nsọ Chineke hà na-eche banyere anyị n’ezie? Ànyị kwesịrị ịtụ anya ka ha na-eme ihe maka ọdịmma anyị?’

A kpọtụrụ ndị nsọ aha ugboro ugboro n’otu amụma Daniel dekọrọ. Na narị afọ nke isii T.O.A., ọ hụrụ otu ọhụụ na-akpali akpali, bụ́ nke nọgidere na-emezu ruo n’oge anyị. N’oké osimiri ka anụ ọhịa anọ dị egwu si pụta, bụ́ ndị na-anọchi anya ọchịchị ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-enweghị ike igbo mkpa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ezie. Mgbe ahụ, Daniel buru amụma, sị: “Ma ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu ga-anata alaeze ahụ, nwee alaeze ahụ ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Daniel 7:17, 18.

Pọl gbara akaebe banyere ihe a e nyere “ndị nsọ dị ka ihe nketa,” ya bụ, iso Kraịst chịa n’eluigwe. (Ndị Efesọs 1:18-21) Ọbara Jizọs meghere ụzọ maka ndị nsọ 144,000 ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ gaa n’ebube eluigwe. Jọn onyeozi kwupụtara, sị: “Onye obi ụtọ na onye dị nsọ ka onye ọ bụla nke nwere òkè ná mbilite n’ọnwụ mbụ bụ; ọnwụ nke abụọ enweghị ikike n’ebe ndị a nọ, kama ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst ahụ, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ ahụ.” (Mkpughe 20:4, 6; 14:1, 3) N’ọhụụ, Jọn nụrụ ka ìgwè ihe ndị e kere eke nọ n’eluigwe nọ n’ihu Jizọs ahụ e mere ka ọ dị ebube na-abụ abụ, sị: “I jikwa ọbara gị zụtara Chineke ndị mmadụ site n’ebo na asụsụ na ndị na mba ọ bụla, i mekwara ka ha bụrụ otu alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị, ha gajekwa ịchị ụwa dị ka ndị eze.” (Mkpughe 5:9, 10) Lee ihe na-emesighachi obi ike ọ bụ! Jehova Chineke n’onwe ya ejiriwo nlezianya họrọ ndị ikom na ndị inyom a. Ọzọkwa, ha ejiwo ikwesị ntụkwasị obi jee ozi n’ụwa, chee ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nsogbu nile ụmụ mmadụ na-enwe ihu. (1 Ndị Kọrint 10:13) Ya mere, anyị pụrụ inwe obi ike na ndị nsọ, ma ọ bụ ndị senti a e si n’ọnwụ kpọlite, ga-abụ ndị ọchịchị dị obi ebere ma dị ọmịiko, na-echebara adịghị ike na erughị eru anyị echiche.

Ngọzi Ndị A Ga-enweta n’Okpuru Ọchịchị Alaeze

Ọchịchị Alaeze ahụ ga-eme ihe n’isi nso iji wepụ ajọ omume na nhụjuanya nile n’ụwa. N’oge ahụ, ndị mmadụ ga-abịarukwu Chineke nso karịa ka ha metụworo. Jọn dere, sị: “M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: ‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha.’” Nke a ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi dị ukwuu, n’ihi na amụma ahụ gara n’ihu, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Lee oge ọṅụ nke ahụ ga-abụ! A kọwakwuru ihe ga-esi n’ọchịchị zuru okè nke Kraịst Jizọs na ndị nsọ 144,000 pụta n’okwu ndị a e dekọrọ na Maịka 4:3, 4, sị: “[Jehova] ga-ekpekwa ikpe n’etiti ọtụtụ ndị dị iche iche, doziekwara mba dị iche iche nwere ume okwu ha ruo ebe dị anya; ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ. Ma ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”

Ọ bụ ndị nsọ na-akpọ òkù ịbịa nweta ngọzi ndị dị otú ahụ. N’ịbụ ndị nwanyị a na-alụ ọhụrụ nọchiri anya ha, ezi ndị senti nọgidere na-asị: “Bịa!” Ihe odide ahụ gara n’ihu, sị: “Ka onye ọ bụla nke na-anụ sịkwa: ‘Bịa!’ Ka onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ bịakwa; ka onye ọ bụla nke chọrọnụ nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) Gịnị ka “mmiri nke ndụ” na-agụnye? Tinyere ihe ndị ọzọ, ọ bụ ezi ihe ọmụma banyere nzube Chineke. N’ekpere o kpekuru Chineke, Jizọs sịrị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) A na-enweta ihe ọmụma a site n’ịmụchi Bible anya. Lee ka obi si dị anyị ụtọ na site n’Okwu Chineke, anyị pụrụ ịmata n’ezie ndị ndị nsọ bụ ma mụta otú ọ ga-esi jiri ha mee ihe n’ụzọ ga-abara ihe a kpọrọ mmadụ uru ruo mgbe ebighị ebi!

[Foto dị na peeji nke 4]

Pọl degaara ezi ndị senti akwụkwọ ozi ndị sitere n’ike mmụọ nsọ

[Foto dị na peeji nke 4, 5]

Ndịozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Jizọs ghọrọ ezi ndị senti, ma ọ bụ ndị nsọ

[Foto dị na peeji nke 6]

Obi pụrụ isi anyị ike isi n’aka Jizọs Kraịst na-ekpegara Chineke ekpere

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị senti, ma ọ bụ ndị nsọ, e si n’ọnwụ kpọlite ga-eji ọmịiko chịa ụwa