Ọchịchọ A Na-achọ Ezi Onye Ndu
Ọchịchọ A Na-achọ Ezi Onye Ndu
“Asị m gị pụọ, ka nke anyị na gị bie. N’aha Chineke, pụọ!”—Oliver Cromwell; nke Leopold Amery, bụ́ onye òtù nke Nzukọ Ndị Isi nke Britain, hotara.
Agha Ụwa nke Abụọ anọwo na-ebibi ihe ruo ọnwa asatọ, ya eyiekwa ka à ga-emeri Britain na ndị ha na ya jikọrọ aka. Nye Leopold Amery na ndị ọzọ nọ n’ọchịchị, mgbanwe nke onye ndu dị mkpa. Ya mere, na May 7, 1940, ná nzukọ nke Òtù Ndị Omeiwu nke Britain, Maazị Amery hotaara Praịm Minista, bụ́ Neville Chamberlain, okwu ndị ahụ dị n’elu. Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Maazị Chamberlain pụrụ n’ọchịchị, Winston Churchill nọchikwara ya.
INWE onye ndu bụ mkpa bụ́ isi nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma ọ bụghị nnọọ ụdị onye ndu ọ bụla. Ọbụna n’ime ezinụlọ, nna aghaghị iru eru idu ndu ma ọ bụrụ na nwunye ya na ụmụ ya ga-enwe obi ụtọ. Chezienụ echiche ihe a chọrọ n’aka onye ndu mba ma ọ bụ nke ụwa! Ka a sịkwa ihe mere ịchọta ezi ndị ndu jiworo sie nnọọ ike.
N’ihi ya, kemgbe ọtụtụ puku afọ, e nwewo ichi eze, mgbanwe ọchịchị, nkwatu ọchịchị, nhọpụta, ntụli aka, ogbugbu nke ndị ndu na mgbanwe usoro ọchịchị a na-apụghị ịgụta ọnụ. Ndị eze, ndị praịm minista, ndị isi obodo, ndị president, ndị odeakwụkwọ ukwu na ndị ọchịchị abanyewo, pụọkwa n’ọchịchị. Mgbanwe ọchịchị ndị a na-atụghị anya ha ewepụwo ọbụna ndị ọchịchị dị ike. (Lee igbe bụ́ “Ndị Ọchịchị A Chụpụrụ n’Ike,” na peeji nke 5.) N’agbanyeghị nke ahụ, inweta onye ndu ruru eru na nke ga-anọgide anọgide ekwebeghị omume.
“Anyị Aghaghị Iwere Ihe Anyị Hụrụ” —Ka Ọ̀ Dị Ihe Ọzọ Anyị Pụrụ Ime?
Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị enwekwaghị olileanya ma a bịa n’ịchọta ezi onye ndu. Ná mba ụfọdụ, enweghị mmasị na enweghị olileanya nke ndị mmadụ na-apụta ìhè karịsịa n’oge ntụli aka ọchịchị. Geoff Hill, bụ́ odeakụkọ nọ n’Africa, kwuru, sị: “A na-ahụkarị enweghị mmasị ma ọ bụ agaghị [ịtụ vootu] mgbe ndị mmadụ weere ya na ha apụghị ime ihe ọ bụla iji kwụsị ahụhụ ha na-ata. . . . N’Africa, mgbe ndị mmadụ jụrụ ịtụ vootu, ọ dịghị apụtacha na ọnọdụ ha juru ha afọ. Mgbe mgbe, ọ na-abụkarị arịrịọ nke ndị chere na ọ dịghị onye na-ege ha ntị
na-arịọ maka enyemaka.” N’otu aka ahụ, otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ na United States dere banyere ntụli aka a na-aga ime n’oge na-adịghị anya, sị: “Ọ dị m nnọọ ka ya bụrụ na onye ruru nnọọ eru na-azọ ọchịchị.” Ọ gbakwụnyere, sị: “E nweghị onye dị otú ahụ. E nwetụbeghị ya. Anyị aghaghị iwere ihe anyị hụrụ.”Ọ̀ bụ eziokwu na ọ dịghị ihe ọzọ ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ime ma ọ́ bụghị ịnọ n’okpuru ndị ndu na-ezughị okè? Eziokwu ahụ bụ́ na ndị ndu bụ́ mmadụ enwebeghị ike igbo mkpa nke ndị ha na-achị ọ̀ na-egosi na ọ dịghị mgbe anyị ga-enwe ezi onye ndu? Ee e. E nwere onye ndu kasị mma. Isiokwu na-esonụ ga-atụle onye bụ́ onye ndu kwesịrị ekwesị nke ihe a kpọrọ mmadụ na otú idu ndu ya ga-esi baara ọtụtụ nde mmadụ sitere ná nzụlite nile—tinyere gị onwe gị—uru.
[Foto ndị dị na peeji nke 3]
N’elu elu aka ekpe: Neville Chamberlain
N’elu elu aka nri: Leopold Amery
N’okpuru: Winston Churchill
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Chamberlain: Foto Jimmy Sime sere/Central Press/Getty Images; Amery: Foto Kurt Hutton sere/Picture Post/Getty Images; Churchill: The Trustees of the Imperial War Museum (MH 26392)