Ogologo Oge Ha Aṅaa Ka Ụmụ Mmadụ Pụrụ Ịdịru Ndụ?
Ogologo Oge Ha Aṅaa Ka Ụmụ Mmadụ Pụrụ Ịdịru Ndụ?
NA March 3, 1513, onye Spen na-eme nchọpụta bụ́ Juan Ponce de León malitere njem dị ịrịba ama. O ji ụgbọ mmiri si Puerto Rico kwọpụ n’olileanya nke iru n’agwaetiti Bimini. Akụkọ mgbe ochie na-ekwu na ọ nọ na-achọ isi iyi nwere ikike pụrụ iche—Isi Iyi Ntorobịa. Ma, o rutere n’ebe bụ ugbu a steeti Florida, U.S.A. N’ezie, ọ dịghị mgbe ọ chọtara isi iyi ahụ na-adịghị adị.
Taa, ụmụ mmadụ n’ozuzu adịghị ebi ndụ ihe karịrị afọ 70 ma ọ bụ 80. Ọ bụ ezie na Bible kwuru banyere ndị dịrị nnọọ ogologo ndụ karịa nke ahụ, 2002 Guinness Book of World Records na-ekwu na afọ ndụ nke onye kasị dị ogologo ndụ bụ afọ 122 na ụbọchị 164. (Jenesis 5:3-32) Otú ọ dị, ọkà mmụta ụkpụrụ ndị metụtara ndụ bụ́ John Harris kwuru, sị: “Nnyocha ọhụrụ na-egosizi na ọ pụrụ ikwe omume inwe ụwa ebe ịka nká—ọbụnakwa ọnwụ—na-agaghịzi abụ ihe a na-apụghị izere ezere.” Ọtụtụ ndị nchọpụta nke narị afọ nke 21 na-ekwu banyere “anwụghị nnọọ anwụ,” “enweghị njedebe nke ndụ ụmụ mmadụ ka ọ na-erule afọ 2099,” “ikike nke mkpụrụ ndụ ịnọgide na-amụba,” na ihe ndị yiri ha.
N’akwụkwọ ya bụ́ The Dream of Eternal Life, Mark Benecke na-ekwu, sị: “A na-agbanwe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mkpụrụ ndụ nile nke ahụ́ ugboro ugboro n’oge ndụ mmadụ. . . . Mgbe ihe dị ka afọ asaa gasịrị, anyị na-aghọ mmadụ ọhụrụ n’ezie.” Otú ọ dị, nke a adịghị anọgide na-adị otú ahụ n’ihi na mkpụrụ ndụ na-akwụsị ịmụba mgbe ọ mụbasịrị ruo ugboro ole a kara aka. N’ezie, ọ bụrụ na nke ahụ adịghị otú ahụ, ka Benecke na-ekwu, “ahụ́ mmadụ pụrụ ịdị na-agbanwe onwe ya ruo nnọọ ogologo oge—ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.”
Tụleekwa ikike na-atụ n’anya nke ụbụrụ mmadụ nwere, bụ́ nke karịrị nnọọ ihe ọ bụla anyị pụrụ iji ya mee n’oge ndụ anyị dị nnọọ mkpụmkpụ. Dị ka Encyclopædia Britannica si kwuo, ụbụrụ mmadụ “nwere ikike buru nnọọ ibu karịa nke onye ahụ pụrụ iji mee ihe
n’oge ndụ ya.” (Mbipụta nke 1976, Mpịakọta nke 12, peeji nke 998) Akwụkwọ bụ́ How the Brain Learns, nke David A. Sousa dere, na-ekwu, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ikike ụbụrụ nwere ichekwa ihe ọmụma enweghị njedebe.”—Peeji nke 78, Mbipụta nke Abụọ, copyright 2001.Gịnị mere ndị nchọpụta na-apụghị iji hụ n’ahụ́ anyị ihe mere anyị ji anwụ anwụ? N’ihi gịnịkwa ka ụbụrụ ụmụ mmadụ ji nwee ikike buru ibu otú ahụ? Ọ̀ pụrụ ịbụ na e mere anyị ka anyị nọgide na-enweta ihe ọmụma ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere anyị ji nwee ike iche echiche banyere ndụ ebighị ebi?
Bible na-ekwu, sị: “Ọzọ, mgbe ebighị ebi ka [Chineke] tinyeworo n’obi ha, ma ka O si tinye ya mmadụ agaghị achọpụta ọrụ ahụ nke Chineke rụworo site ná mmalite wee ruo na nsọtụ.” (Eklisiastis 3:11) Okwu ndị a na-egosi na Chineke tinyere n’ime anyị echiche nke ịdị ndụ ebighị ebi. N’ezie, anyị ga-enwe ihe ndị anyị ga na-amụ mgbe nile banyere Chineke na ọrụ ya. Ọ bụrụ na anyị ebie ndụ ọtụtụ ijeri afọ a na-apụghị ịgụta agụta—ee, ruo mgbe ebighị ebi—anyị ga-anọgide mgbe nile na-enwe ihe ndị anyị ga na-amụta banyere ịdị ebube nke ihe ndị Chineke kere.
Okwu Jizọs Kraịst na-egosikwa na ụmụ mmadụ pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi. O kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Gịnị banyere gị? Ị̀ chọrọ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?
[Foto ndị dị na peeji nke 3]
Juan Ponce de León nọ na-achọ isi iyi ntorobịa
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ponce de León: Harper’s Encyclopædia of United States History