Ihe Ziri Ezi na Ihe Ọjọọ Olee Otú I Kwesịrị Isi Kpebie Ya?
Ihe Ziri Ezi na Ihe Ọjọọ Olee Otú I Kwesịrị Isi Kpebie Ya?
ÒNYE ka o ruuru isetịpụ ụkpụrụ nke ihe ziri ezi na ihe ọjọọ? Ajụjụ ahụ bilitere ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme mmadụ. Dị ka akwụkwọ Bible bụ́ Jenesis si kwuo, Chineke họpụtara otu osisi nke na-eto n’ubi Iden dị ka “osisi nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 2:9) Chineke gwara di na nwunye mbụ ahụ ka ha ghara iri mkpụrụ sitere n’osisi a. Otú ọ dị, onye iro Chineke, bụ́ Setan Ekwensu, nyere echiche na ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ sitere n’osisi a, “a ga-emeghe anya” ha, ha “ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.”—Jenesis 2:16, 17; 3:1, 5; Mkpughe 12:9.
Adam na Iv chere otu mkpebi ihu—hà ga-anakwere ụkpụrụ Chineke nke ihe ziri ezi na ihe ọjọọ, ka hà ga-agbaso nke ha? (Jenesis 3:6) Ha họọrọ inupụrụ Chineke isi na iri mkpụrụ sitere n’osisi ahụ. Gịnị ka omume a dị mfe pụtara? Site n’ịjụ ịnakwere mmachibido iwu ndị Chineke nyere ha, ha gosipụtara na ha kwenyesiri ike na ọ ga-akara ha na ụmụ ha mma isetịpụ ụkpụrụ ihe ziri ezi na ihe ọjọọ nke aka ha. Ruo ókè ha aṅaa ka ihe a kpọrọ mmadụ nweworo ihe ịga nke ọma n’ịchọ ime ihe a dịịrị Chineke?
Echiche Ndị Na-emegide Onwe Ha
Mgbe ọ tụlesịrị ozizi ndị ọkà ihe ọmụma a ma ama e nweworo eri ọtụtụ narị afọ, Encyclopædia Britannica na-ekwu na site n’oge onye ọkà ihe ọmụma Gris bụ́ Socrates ruo na narị afọ nke 20, e nwewo “arụmụka ugboro ugboro banyere ihe pụrụ nnọọ ịbụ ịdị mma na ụkpụrụ nke ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.”
Dị ka ihe atụ, ndị Sophist bụ òtù ndị nkụzi bụ́ ndị Gris a ma ama na narị afọ nke ise T.O.A. Ha kụziri na ọ bụ echiche nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ekpebi ụkpụrụ nke ihe ziri ezi na ihe ọjọọ. Otu onye nkụzi dị otú ahụ kwuru, sị: “Ihe ọ bụla obodo lere anya dị ka ihe ziri ezi ma dị mma ziri nnọọ ezi ma dị mma nye obodo ahụ ma ọ bụrụhaala na o chere otú ahụ.” Ọ bụrụ na e jiri ụkpụrụ a mee ihe, Jodie, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, kwesịrị iwere ego ahụ ebe ọ bụ na o yiri ka ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ógbè, ma ọ bụ “obodo” ya, hà ga-eme otú ahụ.
Immanuel Kant, bụ́ onye ọkà ihe ọmụma a ma ama nke narị afọ nke 18, kwupụtara echiche dị iche. Akwụkwọ bụ́ Issues in Ethics na-ekwu, sị: “Immanuel Kant na ndị ọzọ dị ka ya . . . lekwasịrị anya n’ikike mmadụ nwere ịhọrọ ihe ọ ga-eme.” Dabere na nkà ihe ọmụma Kant, ọ bụrụhaala na Jodie emebighị ihe ndị ruuru ndị ọzọ, ọ bụ ya ga-ekpebiri nnọọ onwe ya ihe ọ ga-eme. O kwesịghị ikwe ka echiche nke ihe ka ọtụtụ kpebie ụkpụrụ ọ ga-agbaso.
Ya mere, olee ihe Jodie mere banyere ọnọdụ a nke amaghị ihe a ga-eme? Ọ họọrọ ụkpụrụ nke atọ. O tinyere ozizi Jizọs Kraịst, bụ́ onye Ndị Kraịst na ndị na-abụghị Ndị Kraịst toworo ụkpụrụ omume ya, n’ọrụ. Jizọs kụziri, sị: “Ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) N’ụzọ tụrụ onye ahịa ya n’anya, Jodie nyere ya $82,000 ahụ. Mgbe a jụrụ Jodie ihe mere na o wereghị ya, ọ kọwara na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma kwuo, sị: “Ego ahụ abụghị nke m.” Jodie ji okwu Jizọs ahụ e dekọrọ na Bible na Matiu 19:18, bụ́: “Ezula ohi,” kpọrọ ihe.
Echiche nke Ihe Ka Ọtụtụ Ọ̀ Bụ Ihe Nduzi A Pụrụ Ịtụkwasị Obi?
O yiri ka ụfọdụ hà ga-ekwu na Jodie bụ onye iberibe n’ihi ime nnọọ ihe n’eziokwu. Ma, echiche nke ihe ka ọtụtụ bụ ihe nduzi a na-apụghị ịdabere na ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i biwo n’ebe ihe ka ọtụtụ kweere na iji ụmụaka achụ àjà dị mma, dị ka ụfọdụ ndị n’oge gara aga cheworo, nke ahụ ọ̀ gaara eme ka omume ahụ zie ezie? (2 Ndị Eze 16:3) Gịnị ma ọ bụrụ na a mụrụ gị n’ebe a na-ele iri anụ mmadụ anya dị ka ihe ziri ezi? Nke ahụ ọ̀ gaara apụta na iri anụ mmadụ adịchaghị njọ? Na otu omume zuru ebe nile adịghị eme ka o zie ezie. Ogologo oge gara aga, Bible dọrọ aka ná ntị megide ọnyà ahụ, na-asị: “Esola ọtụtụ mmadụ n’azụ baa n’ihe ọjọọ dị iche iche.”—Ọpụpụ 23:2.
Jizọs Kraịst kwuru ihe ọzọ mere e kwesịrị iji kpachara anya banyere ịnakwere echiche nke ihe ka ọtụtụ dị ka ihe nduzi n’ikpebi ihe ziri ezi na ihe ọjọọ. O kpughere Setan dị ka “onye na-achị ụwa.” (Jọn 14:30; Luk 4:6) Setan na-eji ọnọdụ ya eduhie “ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Ya mere, ọ bụrụ na i setịpụ ụkpụrụ nke ihe ziri ezi na ihe ọjọọ dabere kpamkpam n’ihe ọtụtụ ndị nakweere, ị pụrụ ịdị na-anakwere echiche Setan banyere omume, o dokwara anya na nke ahụ ga-arụpụta ọdachi.
Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Obi ná Mkpebi nke Gị Onwe Gị?
Mgbe ahụ, onye ọ bụla ò kwesịrị ikpebiri onwe ya ihe ziri ezi na ihe ọjọọ? Bible na-ekwu, sị: “Adaberekwala [ná] nghọta gị.” (Ilu 3:5) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na mmadụ nile eketawo ajọ ntụpọ nke pụrụ ime ka mkpebi ha hie ụzọ. Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, ha nakweere ụkpụrụ nke onye sabo ahụ na-achọ ọdịmma onwe ya nanị bụ́ Setan ma họrọ ya dị ka nna ime mmụọ ha. Ha bufeziiri ụmụ ha otu àgwà ezinụlọ—obi dị aghụghọ nke nwere ikike ịmata ihe ziri ezi ma nwee ọchịchọ nke ịgbaso ihe ọjọọ.—Jenesis 6:5; Ndị Rom 5:12; 7:21-24.
N’ikwu banyere ụkpụrụ omume, Encyclopædia Britannica, na-ekwu, sị: “Ọ dịghị eyi ka ọ̀ bụ ihe ijuanya ma ọ bụrụ na ndị mmadụ amara ihe dị mma ha kwesịrị ime ma na-emezi ihe ga-abara ha onwe ha uru. Ụzọ a ga-esi gosi ndị dị otú ahụ ihe ndị mere ha kwesịrị iji na-eme ihe ziri ezi abụrụwo nsogbu bụ́ isi e nwere n’ụkpụrụ omume nke Ebe Ọdịda Anyanwụ.” N’ụzọ ziri ezi, Bible si otú a tinye ya: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa: ònye ga-amara ya?” (Jeremaịa 17:9) Ị̀ ga-atụkwasị onye a maara dị ka onye aghụghọ na onye na-adịghị ekwe nghọta obi?
N’ikwu eziokwu, ọbụna ndị na-ekweghị na Chineke nwere ikike nke ime omume dị mma na ịzụlite ụkpụrụ omume ndị bara uru na ndị a na-akwanyere ùgwù. Otú ọ dị, mgbe mgbe, ọmarịcha ụkpụrụ ndị ha na-agbaso na-egosipụta nnọọ ụkpụrụ omume nke Bible. Ọ bụ ezie na ndị dị otú ahụ pụrụ ịgọnahụ ịdị adị nke Chineke, echiche ha na-egosi na ha nwere ikike ebumpụta ụwa nke igosipụta àgwà Chineke. Nke a na-egosi na, dị ka Bible na-ekpughe, e kere ihe a kpọrọ mmadụ “n’onyinyo Chineke” na mbụ. (Jenesis 1:27; Ọrụ 17:26-28) Pọl onyeozi na-ekwu, sị: “Ha onwe ha bụ kpọmkwem ndị na-egosipụta isi ihe dị n’iwu ahụ ịbụ nke e dere n’obi ha.”—Ndị Rom 2:15.
N’ezie, ọ bụ otu ihe ịmata ihe ziri ezi; ọ bụkwa nnọọ ihe ọzọ inwe ikike ime ihe ziri ezi. Olee otú mmadụ si enweta ikike ahụ dị mkpa nke ime ihe ziri ezi? Ebe ọ bụ obi mmadụ na-akpali ya ime ihe, ịzụlite ịhụnanya maka Onye chepụtara Bible, bụ́ Jehova Chineke, pụrụ inyere mmadụ aka ịzụlite ikike ahụ.—Abụ Ọma 25:4, 5.
Ịchọta Ike Iji Mee Ihe Ziri Ezi
Nzọụkwụ mbụ n’ịmụta ịhụ Chineke n’anya bụ ịchọpụta otú ihe ndị o nyere n’iwu si bụrụ ndị ezi uche dị na ha na ndị bara uru. “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara,” ka Jọn onyeozi na-ekwu, “ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) Dị ka ihe atụ, Bible nwere ndụmọdụ ndị dị irè bụ́ ndị pụrụ inyere ndị na-eto eto aka ịghọta ọdịiche dị n’etiti ihe ziri ezi na ihe ọjọọ mgbe ha na-ekpebi ma hà kwesịrị ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye. Bible pụrụ inyere di na nwunye aka ịghọta otú e si edozi nghọtahie, ọ pụkwara inye ndị nne na nna ụkpụrụ nduzi maka ịzụlite ụmụ ha. * Mgbe e tinyere ya n’ọrụ, ụkpụrụ omume nke Bible na-abara ma nwata ma okenye uru n’agbanyeghị ọnọdụ ha n’obodo, agụmakwụkwọ ha ma ọ bụ nzụlite ha.
Dị nnọọ ka iri nri ndị na-edozi ahụ́ na-enye gị ike ịrụ ọrụ, ịgụ Okwu Chineke na-enye gị ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya. Jizọs ji okwu na-esi n’ọnụ Chineke apụta tụnyere achịcha nke na-enyere ndụ aka. (Matiu 4:4) O kwukwara, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche nke onye ahụ zitere m.” (Jọn 4:34) Ịnụrụ okwu Chineke nyere aka kwadebe Jizọs iguzogide ọnwụnwa na ime mkpebi ndị amamihe dị na ha.—Luk 4:1-13.
Na mbụ, ọ pụrụ isiri gị ike iji Okwu Chineke zụọ uche gị na ịnakwere ụkpụrụ ya. Ma cheta na mgbe ị bụ nwata, ọ pụrụ ịbụwo na nri ndị ga-enye gị ihe n’ahụ́ adịghị atọ gị ụtọ. Iji too nke ọma ma gbasie ike, ị ghaghị ịmụta iri ezigbo nri ndị dị otú ahụ. N’otu ụzọ ahụ, ọ pụrụ iwe oge tupu ụkpụrụ Chineke amalite ịtọ gị ụtọ. Ọ bụrụ na ị nọgide na-etinye ya n’ọrụ, ịhụnanya i nwere maka ya ga-eto, ị ga-agbasikwa ike n’ụzọ ime mmụọ. (Abụ Ọma 34:8; 2 Timoti 3:15-17) Ị ga-amụta ịtụkwasị Jehova obi, bụrụkwa onye a kpaliri ‘ime ezi ihe.’—Abụ Ọma 37:3.
Ọ pụrụ ịbụ na ị gatụghị eche ọnọdụ yiri nke Jodie ihu. Ka o sina dị, kwa ụbọchị, ị na-eme mkpebi ndị metụtara ụkpụrụ, ma ndị nta ma ndị ukwu. N’ihi ya, Bible na-agba gị ume, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” (Ilu 3:5, 6) Ọ bụghị nanị na ịmụta ịtụkwasị Jehova obi ga-abara gị uru ugbu a, ọ ga-emeghekwara gị ohere nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na okporo ụzọ nke irubere Jehova Chineke isi na-eduga ná ndụ.—Matiu 7:13, 14.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 18 A na-achọta ndụmọdụ dị irè sitere na Bible n’okwu ndị a na ndị ọzọ dị mkpa n’akwụkwọ ndị bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè na Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Ikike ndị a na-adịghị ahụ anya pụrụ ịdị na-emetụta echiche nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị ọkà ihe ọmụma arụwo ụka n’okwu ndị metụtara ihe ziri ezi na ihe ọjọọ
SOCRATES
KANT
CONFUCIUS
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Kant: Site n’akwụkwọ bụ́ The Historian’s History of the World; Socrates: Site n’akwụkwọ bụ́ A General History for Colleges and High Schools; Confucius: Mahadum Sung Kyun Kwan, Seoul, Korea
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ọ bụghị nanị na Bible na-enyere anyị aka ịmata ihe ziri ezi na ihe ọjọọ, kamakwa ọ na-akpali anyị ime ihe ziri ezi