Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ìgwè Mmadụ Na-amalite Ife Jehova

Ìgwè Mmadụ Na-amalite Ife Jehova

“Inyeaka M Na-esi N’aka Jehova Bịa”

Ìgwè Mmadụ Na-amalite Ife Jehova

AMỤMA ndị Bible buru banyere oge anyị kwuru na ndị si ná mba nile ga-enubata n’ofufe Jehova e buliri elu. Dị ka ihe atụ, site n’ọnụ onye amụma bụ́ Hagaị, Jehova Chineke kpọsara, sị: “M ga-emekwa ka mba nile mee mkpọtụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube.” (Hagaị 2:7) Ma Aịzaịa ma Maịka buru amụma na n’oge anyị—“n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a”—mba nile na ndị nile ga-efe Jehova n’ụzọ ọ na-anara nke ọma.—Aịsaịa 2:2-4; Maịka 4:1-4.

Amụma ndị a hà na-emezu taa n’ezie? Ka anyị tụlee ihe ndị na-emenụ. Nanị n’ime afọ iri gara aga, ihe karịrị nde ndị ọhụrụ atọ, otu narị puku na puku iri ararawo onwe ha nye Jehova n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ. N’ezie, e mere mmadụ isii n’ime Ndịàmà Jehova iri ọ bụla na-eje ozi ugbu a n’ụwa nile baptizim n’ime afọ iri gara aga. N’afọ 2004, ná nkezi, otu onye ọhụrụ raara onwe ya nye dị ka ohu Chineke na-abata n’ọgbakọ Ndị Kraịst kwa minit abụọ! *

Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, taa ‘ọnụ ọgụgụ dị ukwuu aghọọla ndị kwere ekwe, ha echigharịkwuruwokwa Onyenwe anyị.’ Ọ bụ ezie na mmụba nke ọnụ ọgụgụ mmadụ n’onwe ya abụghị ihe àmà nke ngọzi Chineke, ọ na-enye ihe àmà na “aka Jehova” dịnyeere ndị ya. (Ọrụ 11:21) Gịnị na-akpali ọtụtụ nde mmadụ ife Jehova? Oleekwa otú nke a si emetụta gị onwe gị?

A Na-adọta Ndị Obi Ha Ziri Ezi

Jizọs kwuru hoo haa, sị: “Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.” (Jọn 6:44) N’ihi ya, ọ bụ nanị Jehova na-adọta ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Mmụọ Chineke pụrụ ime ka ndị mmadụ mata mkpa ime mmụọ ha. (Matiu 5:3) Obi amamikpe, ịchọsi olileanya ike, ma ọ bụ oké ọgba aghara pụrụ ime ka ụfọdụ malite ịchọ Chineke ma si otú a mụta ihe bụ́ nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ.—Mak 7:26-30; Luk 19:2-10.

Ọtụtụ mmadụ na-amalite ife Jehova n’ihi na usoro nkụzi Bible nke ọgbakọ Ndị Kraịst na-enyere ha aka inweta azịza nke ajụjụ ndị na-agbagwoju ha anya.

“Ya bụrụ na Chineke dị, gịnị mere a ka ji na-ekpe ndị mmadụ ikpe na-ezighị ezi?” Nke ahụ bụ ajụjụ nyere Davide, bụ́ onye na-ere ọgwụ ọjọọ n’Ịtali, nsogbu n’obi. O nweghị mmasị n’ihe metụtara okpukpe, ya mere, ọ jụrụ ajụjụ a siri ike nanị iji kpalie arụmụka. O kwuru, sị: “Ebughị m n’obi inweta ezigbo azịza na-eju afọ. Ma Onyeàmà nke mụ na ya kparịtara ụka nwere nnọọ ndidi ma jiri akụkụ dị iche iche nke Bible kwado ihe ọ na-ekwu. Mkparịta ụka ahụ nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ m.” Taa, Davide edoziela ndụ ya ma na-ejere Jehova ozi.

Ndị ọzọ abatala n’akụkụ elu ala nke nzukọ Jehova n’ihi ọchịchọ ha na-achọ ịmata nzube nke ndụ. Mgbe otu dibịa Bekee na-agwọ ọrịa uche na Zagreb, Croatia, na-achọ otú ọ ga-esi gwọọ nsogbu uche nke ya onwe ya, ọ gakwuuru otu dibịa ibe ya a ma ama n’ịgwọ ọrịa uche. Ọ tụrụ ya n’anya mgbe dibịa ahụ nyere ya nọmba fon alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Zagreb, nakwa aha otu Onyeàmà ọ ma ama. Ọ gwara ya, sị: “Lee anya, echere m na ndị a ga-enyeliri gị aka. Ọ bụrụ na mụ asị gị gawa na chọọchị, nanị ihe ị ga-ahụ ebe ahụ bụ ihe a kpụrụ akpụ—o nweghị onye nọ ebe ahụ nke maara ihe ọ ga-agwa gị, ha nile nọ n’ọchịchịrị. Echeghị m na chọọchị ga-enyeliri gị aka. Agwala m ndị ọrịa ndị ọzọ ka ha gakwuru Ndịàmà Jehova, echekwara m na ọ bụ ihe ga-akacha baara gị uru.” Ndịàmà nwere obi ụtọ ileta ya, n’oge na-adịghịkwa anya, ha maliteere ya ọmụmụ Bible. N’izu ole na ole, onye ahụ na-arịa ọrịa uche ji ọṅụ kwuo na ịmata nzube Chineke emeela ka ndụ ya nwee nzube.—Eklisiastis 12:13.

Ọtụtụ achọpụtawo na mgbe ha nwere nsogbu ọ bụ nanị eziokwu Bible pụrụ inye ha ezi nkasi obi. Na Gris, otu nwata nwoke dị afọ asaa si n’elu ụlọ akwụkwọ ha daa ma nwụọ. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, Ndịàmà abụọ gakwuuru mama ya ma gbalịa ịkasi ya obi site n’iso ya kwurịta banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Ozugbo ahụ, nwanyị ahụ malitere ibe ákwá. Ụmụnna nwanyị ahụ jụrụ ya, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu ihe banyere Bible, olee mgbe anyị nwere ike ịbịa na nke gị?” Ọ zara ha, sị: “Bịanụ ugbu a.” Nwanyị ahụ duuru ha gaa n’ụlọ ya, ha malitekwaara ya ọmụmụ Bible. Taa, ndị ezinụlọ ya nile na-ejere Jehova ozi.

Ị̀ Na-ekere Òkè?

A na-enweta ahụmahụ ndị dị otú ahụ n’ụwa nile. Jehova na-akpọkọta ma na-azụ oké ìgwè nke ndị na-efe ezi ofufe, bụ́ ndị si ọtụtụ mba. Ìgwè a nke ndị si ná mba nile mejupụtara nwere atụmanya na-enye obi ụtọ nke ịlanarị mbibi nke ajọ usoro ihe a nke na-abịanụ, na ịdịrị ndụ banye n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume.—2 Pita 3:13.

N’ihi ngọzi Jehova, ọrụ a a na-arụtụbeghị ụdị ya nke ịchịkọta ndị mmadụ na-aga n’ihu n’ụzọ a na-apụghị igbochi egbochi iru n’ọgwụgwụ ya nke ga-aga nke ọma. (Aịsaịa 55:10, 11; Matiu 24:3, 14) Ị̀ na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekere òkè n’ikwusa ozi ọma Alaeze a? Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị pụrụ inwe obi ike ná nkwado Chineke, ị pụkwara ikwughachi ihe ahụ ọbụ abụ ahụ kwuru: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.”—Abụ Ọma 121:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee 2005 Calendar of Jehovah’s Witnesses, September/October.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.”—JỌN 6:44

[Igbe dị na peeji nke 8]

ÒNYE MERE E JI ENWE MMỤBA A?

“Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.” —Abụ Ọma 127:1.

“Chineke nọgidere na-eme ka ọ na-eto; nke mere na onye na-akụ mkpụrụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-akwọsa mmiri abụghịkwa, kama Chineke onye na-eme ka ọ na-eto.” —1 Ndị Kọrint 3:6, 7.