Na-eje Ije N’okwukwe, Ọ Bụghị n’Ihe Anya Na-ahụ!
Na-eje Ije N’okwukwe, Ọ Bụghị n’Ihe Anya Na-ahụ!
“Anyị na-eje ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ.”—2 NDỊ KỌRINT 5:7.
1. Gịnị na-egosi na Pọl onyeozi jere ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ?
Ọ BỤ n’afọ 55 O.A. Ihe dị ka afọ 20 agafewo kemgbe otu nwoke a na-akpọ Sọl n’oge ahụ, bụ́ onye na-akpagbu Ndị Kraịst, nabatara Iso Ụzọ Kraịst. O kwebeghị ka ogologo oge gafeworonụ belata okwukwe o nwere n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ ezie na o jibeghị anya ya nkịtị hụ ihe ndị dị n’eluigwe, o nwere okwukwe siri ike. Ya mere, mgbe Pọl onyeozi na-edegara Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị nwere olileanya eluigwe, akwụkwọ ozi, o kwuru, sị: “Anyị na-eje ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ.”—2 Ndị Kọrint 5:7.
2, 3. (a) Olee otú anyị si egosi na anyị na-eje ije n’okwukwe? (b) Gịnị ka ije ije n’ihe anya na-ahụ pụtara?
2 Ije ije n’okwukwe chọrọ ka anyị nwee ntụkwasị obi zuru ezu n’ikike Chineke nwere iduzi ndụ anyị. Anyị aghaghị ikwenyesi ike na ọ maara n’ezie ihe ga-akasị baara anyị uru. (Abụ Ọma 119:66) Ka anyị na-eme mkpebi ná ndụ anyị ma na-eme ihe ndị ahụ anyị kpebiri, anyị na-echebara “ihe ndị dị adị anyị na-adịghị ahụ anya” echiche. (Ndị Hibru 11:1, The New English Bible) Ha na-agụnye nkwa “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (2 Pita 3:13) N’aka nke ọzọ, ije ije n’ihe anya na-ahụ pụtara na anyị na-agbaso ụzọ ndụ nke nanị ihe anyị ji anya nkịtị anyị ahụ na-achịkwa. Nke a dị ize ndụ n’ihi na ọ pụrụ iduga anyị n’ileghara uche Chineke anya kpamkpam.—Abụ Ọma 81:12; Eklisiastis 11:9.
3 Ma ànyị so ‘n’ìgwè atụrụ nta ahụ,’ bụ́ ndị nwere ọkpụkpọ eluigwe, ma ànyị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iburu ndụmọdụ ahụ bụ́ ije ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ, n’uche. (Luk 12:32; Jọn 10:16) Ka anyị hụ otú ịgbaso ndụmọdụ a sitere n’ike mmụọ nsọ ga-esi chebe anyị pụọ n’ịbụ ndị dabara n’omume nke “ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge,” ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya nakwa n’ịbụ ndị na-ebughị ọgwụgwụ nke usoro ihe a n’uche. Anyị ga-atụlekwa ihe ize ndụ ndị dị n’ije ije n’ihe anya na-ahụ.—Ndị Hibru 11:25.
Ịjụ “Ịnụ Ụtọ Mmehie Ruo Nwa Oge”
4. Nhọrọ dị aṅaa ka Mozis mere, n’ihi gịnịkwa?
4 Cheedị echiche ụdị ndụ Mozis, bụ́ nwa Amram, pụrụ ibiwo. Ebe a zụlitere ya dị ka otu n’ime ụmụ eze Ijipt oge ochie, Mozis pụrụ inweta ikike, akụ̀ na ụba, na ùgwù. Mozis pụrụ ichewo, sị: ‘E nyere m ọzụzụ n’amamihe dị elu nke Ijipt, adịkwa m ike n’okwu na n’omume. Ọ bụrụ na mụ anọgide n’obí eze, apụrụ m iji ọkwá m meere ụmụnne m bụ́ ndị Hibru a na-emegbu emegbu ihe ọma!’ (Ọrụ 7:22) Kama nke ahụ, Mozis họọrọ ka “a na-emeso ya na ndị Chineke n’ụzọ ọjọọ.” N’ihi gịnị? Gịnị kpaliri Mozis ịjụ ihe nile ọ pụrụ inweta n’Ijipt? Bible na-aza, sị: “Site n’okwukwe [Mozis] hapụrụ Ijipt, ma ọ tụghị egwu iwe nke eze ahụ, n’ihi na ọ nọgidere na-eguzosi ike dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.” (Ndị Hibru 11:24-27) Okwukwe Mozis nwere na Jehova ga-akwụghachi ya ụgwọ maka ezi omume ya nyeere ya aka ịjụ mmehie na imebiga ihe ókè na ihe ụtọ ya na-adịghị adịte aka.
5. Olee otú ihe nlereanya Mozis si agba anyị ume?
5 Mgbe mgbe, ọ na-adị mkpa na anyị onwe anyị kwa ga-eme mkpebi ndị siri ike banyere okwu ndị dị ka: ‘Èkwesịrị m ịkwụsị omume
ma ọ bụ àgwà ụfọdụ ndị na-ekwekọchaghị n’ụkpụrụ Bible? Èkwesịrị m ịnara ọrụ nke yiri ka ọ̀ ga-ewetara m uru ihe onwunwe ma gbochie ọganihu ime mmụọ m?’ Ihe nlereanya Mozis na-agba anyị ume ịghara ime nhọrọ ndị na-egosi elepụghị anya n’ihu bụ́ nke e ji mara ụwa a; kama nke ahụ, anyị kwesịrị igosipụta okwukwe n’amamihe nke “Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya”—Jehova Chineke—bụ́ nke na-eme ka mmadụ na-elepụ anya n’ihu. Dị ka Mozis, ka anyị jiri ọbụbụenyi anyị na Jehova kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ụwa a pụrụ inye.6, 7. (a) Olee otú Ịsọ si gosi na ya họọrọ ije ije n’ihe anya na-ahụ? (b) Ihe atụ ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Ịsọ bụụrụ anyị?
6 Lee ọdịiche dị n’etiti Mozis na Ịsọ, bụ́ nwa nna ochie bụ́ Aịzik. Ịsọ họọrọ imejụ agụụ ihe ụtọ ya ozugbo. (Jenesis 25:30-34) Ịsọ ‘ejighị ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe,’ o ji ọnọdụ ya dị ka diọkpara “gbanweta otu nri.” (Ndị Hibru 12:16) Ọ tụleghị otú mkpebi o mere ire ọnọdụ ya dị ka diọkpara ga-esi metụta mmekọrịta ya na Jehova ma ọ bụ otú ihe ahụ o mere ga-esi metụta ụmụ ya. O nweghị anya ime mmụọ. Ịsọ leghaara nkwa ndị dị oké ọnụ ahịa Chineke kwere anya, o lere ha anya dị ka ihe na-adịchaghị mkpa. O jere ije n’ihe anya na-ahụ, ọ bụghị n’okwukwe.
7 Ịsọ bụụrụ anyị ihe atụ ịdọ aka ná ntị taa. (1 Ndị Kọrint 10:11) Mgbe anyị nwere mkpebi anyị ga-eme, ma nke ukwu ma nke nta, anyị agatụghị ekwe ka echiche na-eduhie eduhie nke ụwa Setan na-agbasa, bụ́ nke na-ekwu na ị ghaghị inweta ihe ị chọrọ ugbu a, duhie anyị. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àna m egosipụta ọchịchọ yiri nke Ịsọ ná mkpebi ndị m na-eme? Ịchụso ihe ndị m chọrọ ugbu a ọ̀ ga-eme ka m tinye ihe ime mmụọ n’ọnọdụ nke abụọ? Nhọrọ ndị m na-eme hà na-etinye ọbụbụenyi mụ na Chineke na nkwụghachi ụgwọ ndị m ga-enweta n’ọdịnihu n’ihe ize ndụ? Ihe nlereanya dị aṅaa ka m na-esetịpụrụ ndị ọzọ?’ Ọ bụrụ na nhọrọ anyị na-egosi na anyị ji ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe, Jehova ga-agọzi anyị.—Ilu 10:22.
Izere Ọnyà nke Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya
8. Ndụmọdụ dị aṅaa ka e nyere Ndị Kraịst nọ na Leodisia, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji adọrọ mmasị anyị?
8 Ná mkpughe e nyere Jọn onyeozi ná ngwụsị narị afọ mbụ, Jizọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube ziri ọgbakọ dị na Leodisia, Asia Minor, ozi. Ọ bụ ozi ịdọ aka ná ntị megide ịhụ ihe onwunwe n’anya. Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst nọ na Leodisia bara ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe, ha dara ogbenye n’ụzọ ime mmụọ. Kama ịnọgide na-eje ije n’okwukwe, ha kwere ka ihe onwunwe kpuchie anya ime mmụọ ha. (Mkpughe 3:14-18) Ịhụ ihe onwunwe n’anya na-enwe mmetụta yiri nke ahụ taa. Ọ na-ebelata okwukwe anyị ma na-eme ka anyị kwụsị ‘iji ntachi obi na-agba ọsọ ndụ.’ (Ndị Hibru 12:1) Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, “ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ” pụrụ ịdị na-ebelata oge anyị na-etinye n’ihe ime mmụọ ruo n’ókè nke ‘ịkpagbu ha kpam kpam.’—Luk 8:14.
9. Olee otú inwe afọ ojuju na ekele maka nri ime mmụọ si echebe anyị?
1 Ndị Kọrint 7:31; 1 Timoti 6:6-8) Mgbe anyị na-eje ije n’okwukwe, n’abụghịkwa n’ihe anya na-ahụ, anyị na-enweta ọṅụ na paradaịs ime mmụọ anyị nwere ugbu a. Ka anyị na-eri nri ime mmụọ na-edozi ahụ́, ọ̀ bụ na a dịghị akpali anyị ‘iti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma’? (Aịsaịa 65:13, 14) Ọzọkwa, anyị na-enwe obi ụtọ ná mkpakọrịta nke anyị na ndị na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Lee otú o si dị nnọọ mkpa ka anyị na-enweta afọ ojuju na ume ọhụrụ site n’ihe ndị Jehova na-enye anyị n’ụzọ ime mmụọ!
9 Ihe bụ́ isi na-eme ka mmadụ nweta nchebe ime mmụọ bụ inwe afọ ojuju kama ịbụ iji ụwa a eme ihe n’uju na inwetara onwe anyị akụ̀ na ụba. (10. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
10 Ụfọdụ ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị bụ: ‘Olee ọnọdụ m na-etinye ihe onwunwe ná ndụ m? Àna m eji ihe onwunwe m ebi ndụ ihe ụtọ ka m̀ na-eji ya akwalite ezi ofufe? Olee ihe kasị enye m afọ ojuju? Ọ̀ bụ ọmụmụ Bible na mkpakọrịta mụ na ndị kwere ekwe ibe m ná nzukọ Ndị Kraịst, ka ọ̀ bụ ịhapụ ibu ọrụ m dị ka Onye Kraịst ná ngwụsị izu iji tụrụ ndụ? Àna m ewepụta ọtụtụ ngwụsị izu maka ntụrụndụ kama itinye oge ndị dị otú ahụ n’ozi ubi na ihe omume ndị ọzọ metụtara ezi ofufe?’ Ije ije n’okwukwe pụtara na anyị na-arụsi ọrụ Alaeze ahụ ike, nwee ntụkwasị obi zuru ezu ná nkwa Jehova.—1 Ndị Kọrint 15:58.
Iburu Ọgwụgwụ n’Uche
11. Olee otú ije ije n’okwukwe si enyere anyị aka iburu ọgwụgwụ n’uche?
11 Ije ije n’okwukwe na-enyere anyị aka ịjụ echiche nkịtị bụ́ na ọgwụgwụ ka dị anya ma ọ bụ na ọ gaghị abịa ma ọlị. N’adịghị ka ndị na-arụ ụka bụ́ ndị na-ekweghị n’amụma Bible, anyị na-aghọta otú ihe ndị na-eme n’ụwa si emezu ihe Okwu Chineke buru n’amụma banyere ụbọchị anyị. (2 Pita 3:3, 4) Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ na akparamàgwà na omume ndị mmadụ n’ozuzu adịghị egosi na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ”? (2 Timoti 3:1-5) Anyị na-eji anya nke okwukwe ahụ na ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a abụghị nanị ihe ndị na-emebu eme. Kama nke ahụ, ha bụ “ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [Kraịst] nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a.”—Matiu 24:1-14.
12. Olee otú okwu Jizọs e dere na Luk 21:20, 21 si mezuo na narị afọ mbụ?
12 Tụlee otu ihe mere na narị afọ mbụ nke Oge Anyị bụ́ nke nwere ihe ya na ya yiri n’oge anyị. Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jizọs Kraịst dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị, sị: “Mgbe unu hụrụ Jeruselem ka usuu ndị agha mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso. Mgbe ahụ, ka ndị Luk 21:20, 21) Ná mmezu nke amụma a, ndị agha Rom nọ n’okpuru Cestius Gallus nọchibidoro Jeruselem n’afọ 66 O.A. Ma ndị agha ahụ lara na mberede, na-agbara Ndị Kraịst nọ ebe ahụ àmà na oge eruola ka ha gbapụ ma nye ha ohere “ịgbaga n’ugwu.” Na 70 O.A., ndị agha Rom lọghachiri, wakpoo obodo Jeruselem ma bibie ụlọ nsọ ya. Josephus kọrọ na ihe karịrị otu nde ndị Juu nwụrụ, a dọrọkwa puku mmadụ iri itoolu na asaa n’agha. E mezuru ihe Chineke kpere n’ikpe megide usoro ihe ndị Juu. Ndị jere ije n’okwukwe ma ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs lanahụrụ ọdachi ahụ.
nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya wezụga onwe ha.” (13, 14. (a) Olee ihe omume ndị ga-ewere ọnọdụ n’oge na-adịghị anya? (b) Gịnị mere anyị ga-eji mụrụ anya iji hụ mmezu nke amụma Bible?
13 Ihe yiri nke ahụ na-aga ime n’oge anyị. A ga-eji ndị so n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu mee ihe iji mezuo ihe Chineke kpere n’ikpe. Dị nnọọ ka e hiwere ndị agha Rom na narị afọ mbụ iji hụ na e nwere Pax Romana (Udo nke Rom), e bu n’obi ka òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke e nwere taa bụrụ ndị na-eme udo. Ọ bụ ezie na ndị agha Rom gbalịrị ịhụ na e nwetụrụ udo gburugburu ụwa a maara mgbe ahụ, ha bibiri Jeruselem. N’otu aka ahụ taa, amụma Bible na-egosi na ọchịchị dị iche iche na-ebu agha so n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu ga-ele okpukpe anya dị ka ihe na-eweta nsogbu ma bibie Jeruselem nke oge a—Krisendọm—tinyekwara akụkụ ndị ọzọ nke Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe 17:12-17) Ee, mbibi nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha na-eru nso.
14 Oké mkpagbu ahụ ga-eji mbibi nke okpukpe ụgha malite. A ga-ebibi ihe fọdụrụ n’ajọ usoro ihe a n’akụkụ ikpeazụ nke oké mkpagbu ahụ. (Matiu 24:29, 30; Mkpughe 16:14, 16) Ije ije n’okwukwe na-eme ka anyị mụrụ anya iji hụ mmezu nke amụma Bible. A dịghị eduhie anyị iche na e nwere òtù ụmụ mmadụ hiwere dị ka òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke bụ́ ihe Chineke ga-eji weta ezi udo na nchebe. Mgbe ahụzi, ọ̀ bụ na otú anyị si ebi ndụ ekwesịghị igosi na anyị kwetara na “oké ụbọchị Jehova dị nso”?—Zefanaịa 1:14.
Ije Ije n’Ihe Anya Na-ahụ —Olee Ihe Ize Ndụ Dị na Ya?
15. N’agbanyeghị na ha nwetara ngọzi Chineke, n’ọnyà dị aṅaa ka Izrel dabara?
15 Ahụmahụ Izrel oge ochie na-egosi ihe ize ndụ ndị dị ná mmadụ ikwe ka ije ije n’ihe anya na-ahụ belata okwukwe ya. N’agbanyeghị na ha hụrụ ihe otiti iri ahụ wedara chi ụgha dị iche iche nke Ijipt n’ala nakwa nnapụta dị ịtụnanya a napụtara ha site n’Oké Osimiri Uhie, ụmụ Izrel nupụrụ isi ma kpụọ nwa ehi ọlaedo, malitekwa ife ya ofufe. Iche Mozis, bụ́ onye “nọrọ ọdụ isi n’ugwu ahụ rịdata,” gbakasịwara ha ahụ́ ma gwụ ha ike. (Ọpụpụ 32:1-4) Enweghị ndidi dugara ha n’ife arụsị ha pụrụ iji anya nkịtị ha ahụ. Ha kparịrị Jehova site n’ije ije n’ihe anya na-ahụ, nke ahụ mekwara ka e gbuo ‘ihe dị ka puku ndị ikom atọ.’ (Ọpụpụ 32:25-29) Lee ihe mwute ọ bụ mgbe onye na-efe Jehova taa mere mkpebi na-egosi na ọ tụkwasịghị Jehova obi nakwa na o nweghị obi ike n’ikike o nwere imezu nkwa ndị o kwere!
16. Olee otú ihe ndị anya na-ahụ si metụta ụmụ Izrel?
16 Ihe anya na-ahụ nwekwara mmetụta dị njọ n’ahụ́ ụmụ Izrel n’ụzọ ndị ọzọ. Ije ije n’ihe anya na-ahụ mere ka ha maa jijiji n’ihi Ọnụ Ọgụgụ 13:28, 32; Deuterọnọmi 1:28) O mere ka ha maa ikike Chineke nyere Mozis aka ma mee mkpesa banyere ụdị ndụ ha biri. Enweghị okwukwe a dugara ha n’ịhọrọ ịlaghachi n’Ijipt ndị mmụọ ọjọọ na-achị karịa ịgawa n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 14:1-4; Abụ Ọma 106:24) Lee ka ọ na-aghaghị isiwo wute Jehova ịhụ mkparị ndị ya na-akparị Eze ha a na-adịghị ahụ anya!
ụjọ ndị iro ha. (17. Gịnị mere ụmụ Izrel ji jụ nduzi Jehova n’ụbọchị Samuel?
17 Ọzọkwa, n’ụbọchị Samuel onye amụma, ọnyà ije ije n’ihe anya na-ahụ makwara mba Izrel ahụ nwere ihu ọma Chineke. Ndị ahụ malitere ịchọ inwe eze nke ha pụrụ ịhụ anya. Ọ bụ ezie na Jehova egosiwo ha na ya bụ Eze ha, nke a emeghị ka ha jee ije n’okwukwe. (1 Samuel 8:4-9) Ha ji nzuzu jụ nduzi na-agbaghị ọrụ nke Jehova ma họrọ ịdị ka mba ndị gbara ha gburugburu, nke a kpatakwaara ha ọdachi.—1 Samuel 8:19, 20.
18. Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ize ndụ ndị dị n’ije ije n’ihe anya na-ahụ?
18 Dị ka ndị ohu Jehova nke oge a, anyị na-eji ezi mmekọrịta anyị na Chineke akpọrọ ihe. Anyị na-adị njikere ịmụta ihe site n’ihe ndị mere n’oge ndị gara aga na itinye ha n’ọrụ ná ndụ anyị. (Ndị Rom 15:4) Mgbe ụmụ Izrel jere ije n’ihe anya na-ahụ, ha chefuru na Chineke si n’aka Mozis na-edu ha. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị onwe anyị pụrụ ichefu na ọ bụ Jehova Chineke na Mozis ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, na-edu ọgbakọ Ndị Kraịst taa. (Mkpughe 1:12-16) Anyị aghaghị ịnọ na nche ịghara ịdị na-ele akụkụ elu ala nke nzukọ Jehova anya dị ka mmadụ si ele ihe anya. Anyị ime otú ahụ pụrụ ime ka anyị nwee mmụọ nke ime mkpesa ma gharazie inwe ekele maka ndị na-anọchite anya Jehova nakwa maka nri ime mmụọ nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye.—Matiu 24:45.
Kpebie Ije Ije n’Okwukwe
19, 20. Gịnị ka i kpebiri ime, n’ihi gịnịkwa?
19 Bible na-ekwu, sị: “Anyị nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị, megide ikike, megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Onye iro anyị bụ́ isi bụ Setan Ekwensu. Ebumnobi ya bụ imebi okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ. Ọ ga-eme ihe ọ bụla o nwere ike ime iji mee ka anyị hapụ mkpebi anyị mere ijere Chineke ozi. (1 Pita 5:8) Gịnị ga-echebe anyị pụọ n’ịbụ ndị ihe a na-ahụ anya nke usoro ihe Setan duhiere? Ọ bụ ije ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ! Ntụkwasị obi na obi ike anyị nwere ná nkwa Jehova ga-echebe anyị pụọ n’ịbụ ndị ‘ụgbọ ha kpuru n’ihe banyere okwukwe anyị.’ (1 Timoti 1:19) Ya mere, ka anyị kpebisie ike ịnọgide na-eje ije n’okwukwe, na-enwe obi ike ná ngọzi Jehova. Ka anyị nọgide na-ekpe ekpere ka anyị gbanahụ ihe nile a kara aka na ha ga-ewere ọnọdụ n’isi nso.—Luk 21:36.
20 Ka anyị na-eje ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ, anyị nwere Onye Nlereanya magburu onwe ya. Bible na-ekwu, sị: “Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) Isiokwu na-esonụ ga-atụle otú anyị pụrụ isi nọgide na-eje ije dị ka o jere.
Ị̀ Na-echeta?
• Gịnị ka ị mụtara site n’ihe atụ Mozis na Ịsọ n’ihe banyere ije ije n’okwukwe, n’abụghị n’ihe anya na-ahụ?
• Olee ihe bụ́ isi ga-enyere mmadụ aka izere ịhụ ihe onwunwe n’anya?
• Olee otú ije ije n’okwukwe si enyere anyị aka izere ile ọgwụgwụ anya dị ka ihe dị anya?
• Gịnị mere ije ije n’ihe anya na-ahụ ji dị ize ndụ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 17]
Mozis jere ije n’okwukwe
[Foto dị na peeji nke 18]
Ntụrụndụ ọ̀ na-eme mgbe mgbe ka ị ghara ikere òkè n’ihe omume ọchịchị Chineke?
[Foto dị na peeji nke 20]
Olee otú ige ntị n’Okwu Chineke si echebe gị?