Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

È nwere ike ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst maka adịghị ọcha otú ahụ e si achụpụ onye kwara iko ma ọ bụ onye mere omume rụrụ arụ?

Ee, a pụrụ ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ọ na-akwa iko, na-eme omume ụfọdụ na-adịghị ọcha, ma ọ bụ na-eme omume rụrụ arụ n’enweghị nchegharị. Pọl onyeozi kpọtụchara mmehie atọ a aha mgbe ọ na-edepụtasị mmehie ndị e nwere ike iji chụọ mmadụ n’ọgbakọ bụ́ mgbe o dere, sị: “Ọrụ nke anụ ahụ́ pụtara ìhè, ha bụkwa ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, . . . Ebu m ụzọ na-adọ unu aka ná ntị . . . na ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.”—Ndị Galeshia 5:19-21.

Ịkwa iko (Grik, por·neiʹa) bụ mmekọahụ nke ndị na-anọghị n’alụmdi na nwunye kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ gụnyere ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ịgba akwụna, na mmekọahụ nke ndị na-alụghị di na nwunye, gụnyekwa isi n’ọnụ ma ọ bụ n’otule enwe mmekọahụ na ịhịọgharị onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye mmadụ aka n’akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ iji mejụọ agụụ mmekọahụ. A ga-achụpụ onye ọ bụla na-akwa iko n’enweghị nchegharị n’ọgbakọ.

Omume rụrụ arụ (Grik a.sel’gei.a) bụ “enweghị njide onwe onye n’ihe metụtara mmekọahụ; oké agụụ mmekọahụ; àgwà emeghị ihere; ịkpa àgwà ndị na-akpali agụụ mmekọahụ.” Akwụkwọ bụ́ The New Thayer’s Greek-English Lexicon kọwara okwu ahụ dị ka “agụụ ihe ọjọọ a na-achịkwaghị achịkwa, . . . ihe jọgburu onwe ya, enweghị ihere, asọghị anya.” Akwụkwọ ọkọwa okwu ọzọ kwuru na omume rụrụ arụ bụ àgwà nke “ọhaneze na-ele anya dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị.”

Dị ka nkọwa ndị ahụ gosiri, “omume rụrụ arụ” gụnyere ihe abụọ: (1) omume ahụ n’onwe ya bụ ajọ mmebi nke iwu Chineke; nakwa (2) àgwà nke onye ahụ mere ihe ọjọọ na-egosi enweghị nkwanye ùgwù na ịka anya.

N’ihi ya, “omume rụrụ arụ” abụghị obere àgwà ọjọọ. Ọ bụ omume ndị na-emebi nnọọ iwu Chineke na ndị na-egosi nnọọ ịka anya na nlelị—àgwà nke na-egosi na onye ahụ adịghị akwanyere ịbụisi, iwu, na ụkpụrụ ùgwù ọbụna na-elelị ha anya. Pọl jikọtara omume rụrụ arụ na mmekọahụ na-ezighị ezi. (Ndị Rom 13:13, 14) Ebe ọ bụ na Ndị Galeshia 5:19-21 gụnyere omume rụrụ arụ ná mmehie ndị ga-eme ka mmadụ ghara iru eru ịbanye n’Alaeze Chineke, a pụrụ ịdọ mmadụ aka ná ntị maka omume rụrụ arụ, e nwekwara ike ịchụ onye ahụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’ihi ya.

Adịghị ọcha (Grik, a·ka·thar·siʹa) bụ nke kasị gụnye ọtụtụ ihe n’okwu atọ ndị a kpọrọ “ịkwa iko,” “adịghị ọcha,” na “omume rụrụ arụ.” Ọ gụnyere ihe nile na-adịghị ọcha—n’ihe metụtara mmekọahụ, okwu, omume, na n’ihe metụtara ofufe. “Adịghị ọcha” gụnyere ọtụtụ mmehie siri ike.

Dị ka e dekọrọ ná 2 Ndị Kọrint 12:21, Pọl na-ekwu banyere ndị “meburu mmehie ma bụrụ ndị na-echegharịbeghị n’adịghị ọcha na ịkwa iko na omume rụrụ arụ ha meworo.” Ebe ọ bụ na e denyekọtara “adịghị ọcha” na “ịkwa iko na omume rụrụ arụ,” e nwere ike ikpe mmadụ ikpe n’ihi ụdị adịghị ọcha ụfọdụ. Ma adịghị ọcha bụ okwu pụtara ọtụtụ ihe ndị gụnyere ihe ndị a na-agaghị ekpe mmadụ ikpe maka ha. Dị nnọọ ka ụlọ nwere ike iru nanị unyi ma ọ bụ na-asọ nnọọ oyi, adịghị ọcha dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche.

Dị ka Ndị Efesọs 4:19 si kwuo, Pọl kwuru na ụfọdụ ndị “enwekwaghị mmetụta ime omume ọma” nakwa na ha “nyefere onwe ha n’omume rụrụ arụ iji ụdị anyaukwu ọ bụla na-arụpụta adịghị ọcha.” Nke bụ́ na Pọl lere ya anya na ‘iji anyaukwu na-eme omume na-adịghị ọcha’ na omume rụrụ arụ nọ n’otu ụgbọ. Ọ bụrụ na onye e mere baptizim anọgide ‘jiri anyaukwu na-eme omume na-adịghị ọcha,’ e nwere ike ịgbagide ụkwụ n’ajọ adịghị ọcha chụọ ya n’ọgbakọ.

Ka e were ya na mmadụ abụọ kwere onwe ha nkwa ọlụlụ mịrị onwe ha ọnụ ma dịdaa onwe ha aka n’ụzọ na-akpali agụụ mmekọahụ ọtụtụ ugboro. Ndị okenye pụrụ ikpebi na ọ bụ ezie na ndị a akpaghị àgwà ịka anya nke ga-eme ka ihe ha mere bụrụ omume rụrụ arụ, e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke anyaukwu n’ihe ha mere. N’ihi ya, ndị okenye nwere ike ihiwere ha òtù ikpe n’ihi na ihe ha mere bụ ajọ adịghị ọcha. E nwekwara ike ikpe onye na-akpọ mmadụ na telifon ugboro ugboro ma na-ekwu okwu metụtara mmekọahụ n’ezoghị ọnụ ikpe, karịsịa ma ọ bụrụ na a dụọla ya ọdụ maka ya n’oge gara aga.

Ọ dị ndị okenye mkpa iji nghọta mee ihe mgbe ha na-eme mkpebi ndị dị otú ahụ. Iji kpebie ma è kwesịrị ihiwe òtù ikpe, ha aghaghị iji nlezianya tụlee ihe merenụ na ókè e meruru ya. Ọ pụtaghị na ha ga-agwa onye ọ bụla jụrụ ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na o meela omume rụrụ arụ; ma ọ bụkwanụ gbakọọ ugboro ole mmadụ mere otu ụdị mmehie iji mara ma ò ruru ugboro ole ọ ga-eru e hiwere ya òtù ikpe. Ndị okenye kwesịrị iji nlezianya na ekpere tụlee ọnọdụ ahụ ma chọpụta ihe mmadụ mere na ugboro ole o mere ya, ụdị mmehie ọ bụ na ebumnobi nke onye ahụ mehierenụ.

Ajọ adịghị ọcha abụghị nanị mmehie ndị metụtara mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, nwata nke e merela baptizim nwere ike ise mkpụrụ sịga ole na ole n’obere oge ma gwa nne ya na nna ya ihe ọjọọ ahụ o mere. O kpebisiri ike na ya agaghị ese sịga ọzọ. Ihe ahụ o mere bụ àgwà adịghị ọcha, ma ọ ghọbeghị ajọ adịghị ọcha ma ọ bụ ‘iji anyaukwu eme omume na-adịghị ọcha.’ Nanị otu okenye ma ọ bụ ndị okenye abụọ inye nwatakịrị ahụ ndụmọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ na enyemaka ndị mụrụ ya kwesịrị izu. Ma ọ bụrụ na nwata ahụ na-ese sịga mgbe nile, nke ahụ ga-abụ ịma ụma na-emetọ ahụ́ ya, a pụkwara ihiwere ya òtù ikpe n’ihi ajọ adịghị ọcha a. (2 Ndị Kọrint 7:1) Ọ bụrụ na nwatakịrị ahụ enweghị nchegharị, a ga-achụ ya n’ọgbakọ.

Ụfọdụ Ndị Kraịst ekiriwo ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Chineke kpọrọ nke a asị, ọ pụkwara ịwụ ndị okenye akpata oyi n’ahụ́ na onye kwere ekwe ibe ha mere ihe dị otú a. Ma ọ bụghị ihe nile na-akpali agụụ mmekọahụ mmadụ kiriri ruru eru iji hiwere ya òtù ikpe. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na otu nwanna kiriri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, bụ́ nke a sị na a naghị agbacha ihe nile n’anwụ na ya. Ihere onwe ya emewe ya, ya agwakwa otu okenye ihe o mere ma kpebisie ike na ya agaghị emeghachi mmehie ahụ. Okenye ahụ nwere ike ikpebi na ihe nwanna nwoke ahụ mere erubeghị n’ịsị na o ji ‘anyaukwu na-eme omume na-adịghị ọcha’; o gosipụtabeghịkwa àgwà nke asọghị anya, bụ́ nke gaara egosi na omume ya bụ omume rụrụ arụ. Ọ bụ ezie na ọ gaghị adị mkpa ihiwere ya òtù ikpe, e kwesịrị inye ya ndụmọdụ rijuru afọ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ n’ihi ụdị adịghị ọcha a, ikekwe, ndị okenye emekwuokwa ihe ndị ọzọ iji nyere ya aka.

Otú ọ dị, ka e were ya na Onye Kraịst ekiriwo ihe nkiri na-egosi mmekọahụ nke na-awụ akpata oyi n’ahụ́ na nzuzo ruo ọtụtụ afọ, o mewokwa ihe nile o nwere ike ime iji kpuchie mmehie ya. Ihe ahụ na-akpali agụụ mmekọahụ pụrụ ịgụnye ebe ọtụtụ ụmụ nwoke dinara otu nwanyị n’ike, ebe e jichiri nwanyị ejichi ma na-edina ya, iji obi ọjọọ ata ụmụ nwanyị ahụhụ, itirụsị ha ahụ́, ma ọ bụ ọbụna ebe a na-edina ụmụaka. Mgbe ndị ọzọ matara ihe ọ na-eme, nnukwu ihere emee ya. O jighị ịka anya mee ya, ma ndị okenye nwere ike ikpebi na o ‘nyefere àgwà a ruru unyí onwe ya’ nakwa na o ‘ji anyaukwu mee omume na-adịghị ọcha,’ ya bụ, ajọ adịghị ọcha. A ga-ehiwere ya òtù ikpe n’ihi ajọ adịghị ọcha. A ga-achụ onye mmehie ahụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na o chegharịghị n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Chineke ma kpebie na ya agaghị anwa anwa lee ihe nkiri ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ọzọ. Ya bụrụ na ọ kpọrọ ndị ọzọ n’ụlọ ya ka ha bịa lee ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ—si otú ahụ na-akwalite ya—nke a ga-egosi na ọ kara anya nke bụ́ ihe e ji amata omume rụrụ arụ.

Okwu ahụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ “omume rụrụ arụ” na-agụnye mmehie dị oké njọ mgbe nile, mgbe mgbe, ọ na-abụ mmehie metụtara mmekọahụ. Mgbe ndị okenye na-achọ ịchọpụta ma è meela omume rụrụ arụ, ha kwesịrị ịchọpụta ma è nwere ihe na-egosi asọghị anya, enwekwaghị njide onwe onye n’ihe metụtara mmekọahụ, emeghị ihere, na ihe na-awụ ọha mmadụ akpata oyi n’ahụ́, n’omume ahụ. N’aka nke ọzọ, onye mebiri nnọọ iwu Jehova n’akaghị anya nwere ike inwe “anyaukwu.” A ga-ekpe ndị mere ihe ndị dị otú a ikpe n’ihi na ihe ndị ha mere gụnyere ajọ adịghị ọcha.

Ọ bụ ibu ọrụ dị ukwuu ikpebi ma ihe mmadụ mere ò ruru ịkpọ ya ajọ adịghị ọcha ma ọ bụ omume rụrụ arụ, n’ihi na o metụtara ndụ ndị mmadụ. Ndị na-ekpe ikpe ndị dị otú ahụ kwesịrị ikpesi ekpere ike, rịọ Chineke ka o nye ha mmụọ nsọ ya na nghọta ya. Ndị okenye kwesịrị idebe ọgbakọ ọcha, ha aghaghịkwa ime ka mkpebi ha dabere n’Okwu Chineke nakwa ná nduzi nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 18:18; 24:45) N’oge ọjọọ ndị a kwa, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ndị okenye kwesịrị iburu okwu ndị a n’obi: “Leenụ ihe unu onwe unu na-eme: n’ihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe, kama ọ bụ Jehova.”—2 Ihe E Mere 19:6.