Ụlọ Akwụkwọ nke Ndị Si na Ya Pụta Na-enyere Ndị madụ Aka Gburugburu Ụwa
Ụlọ Akwụkwọ nke Ndị Si na Ya Pụta Na-enyere Ndị madụ Aka Gburugburu Ụwa
N’IHE karịrị ọgbakọ puku iri itoolu na asatọ nke Ndịàmà Jehova dị n’ihe karịrị narị ala abụọ, Chineke na-akụziri ndị nọ n’ọnọdụ nile ná ndụ ihe. Akwụkwọ bụ́ isi e ji akụziri ha ihe bụ Bible, nzube nke ọzụzụ a bụkwa iji nyere ndị mmadụ aka imeziwanye mmekọrịta ha na Chineke n’otu n’otu site n’ịmụta ihe bụ́ uche ya na otú ha ga-esi mee ya emee. Ndị natara ọzụzụ a na-erite uru dị ukwuu. Ha na-erube isi n’iwu ahụ Jizọs Kraịst nyere ha bụ́ ime ka ndị ọzọ ghọọ ndị na-eso ụzọ ya site n’ịkụziri ndị mmadụ ihe ndị ha mụtara.—Matiu 28:19, 20.
E wezụga ndokwa Ndịàmà Jehova mere izi ihe n’ọgbakọ ha, ha ehiwela ọtụtụ ụlọ akwụkwọ iji nye ndị mmadụ ọzụzụ n’akụkụ ụfọdụ kpọmkwem. Otu n’ime ha bụ Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. A malitere ya n’October 1987 na Pittsburgh, Pennsylvania, U.S.A. Klas mbụ ya nwere ụmụ akwụkwọ 24 na-asụ Bekee. A kụziela ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ ahụ n’asụsụ 21 nakwa n’ala 43. Ka ọ dị ugbu a, a zụọla ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-ejighị nwanyị sitere ná mba 90 n’ụlọ akwụkwọ a. Mgbe ụmụ akwụkwọ ahụ natasịrị ọzụzụ ahụ na-ewe izu asatọ, a na-eziga ha n’ebe e nwere mkpa, ná mba ha ma ọ bụ ná mba ọzọ. Ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ afọ 2005, ihe karịrị iri puku Ndịàmà Jehova abụọ na abụọ agaala ụlọ akwụkwọ a. A gọziela ha n’ụba maka mgbalị ha ji ịdị umeala n’obi eme ime ka ihe ndị metụtara Alaeze ahụ gaa n’ihu na iji nyere ndị ọzọ aka.—Ilu 10:22; 1 Pita 5:5.
Ime Atụmatụ Ịga
Iji gaa Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, ọtụtụ ụmụ akwụkwọ aghaghị ịrịọ ndị ha na-arụrụ ọrụ ka ha nye ha oge iji gaa. Nke a na-abụ nsogbu mgbe ụfọdụ. Ná mba Hawaii, Ndị Kraịst abụọ a kpọrọ ịga ụlọ akwụkwọ a aghaghị ịrịọ ka ụlọ akwụkwọ ebe ha na-akụzi ihe nye ha oge iji gaa. Ha ji okwukwe rịọ ka e nye ha oge iji gaa, kọwaa ihe mere ha ji chọọ ịga na uru ha ga-erite na ya. E nyere ha abụọ oge iji gaa.
A gwala ọtụtụ Ndịàmà rịọrọ ka e nye ha oge iji gaa na a ga-achụ ha n’ọrụ ma ha gaa. Ha họọrọ ịnara ọzụzụ a nzukọ Jehova na-enye, n’agbanyeghị na ọ ga-eme ka a chụọ ha n’ọrụ. A kpọghachiri ụfọdụ n’ime ha n’ọrụ ha mgbe ha gasịrị ụlọ akwụkwọ ahụ. A pụrụ iji okwu ole na ole kọwaa mkpebi dị otú ahụ ndị mmadụ na-eme ịga ụlọ akwụkwọ ahụ site n’ikwu, sị: Gwa onye ị na-arụrụ ọrụ ka o kwe gị gaa, kpegara Jehova ekpere maka enyemaka, hapụziere ya nke fọrọ afọ.—Abụ Ọma 37:5.
“Ndị Mmụta Jehova”
A na-eji izu asatọ ahụ a na-anọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ amụru Bible ala. Ụmụ akwụkwọ ahụ na-amụta otú e si hazie ndị Jehova ime uche Ya na otú ha nwere ike isi jiri Bible na-eme ihe n’ụzọ dị irè karị n’ozi ubi ha, n’ọmụmụ ihe ọgbakọ, nakwa ná mgbakọ dị iche iche.
Otu onye nwere ekele maka ihe ọ mụtara n’ụlọ akwụkwọ ahụ degaara onye ka na-achọ ịga ụlọ akwụkwọ ahụ aga akwụkwọ ozi, sị: “Ka m gwa gị eziokwu, ihe ị ga-amụta n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ ihe ị na-amụtatụbeghị. Ọ ga-eme nnọọ ka ị ghọta akụkụ Bible ahụ kwuru na ‘anyị ga-abụ ndị mmụta Jehova’ nke ọma karị. Ọ ga-akpụgharị ma nụchaa obi na àgwà gị n’ụzọ ga-eme ka ị gbasochikwuo ihe nlereanya Kraịst Jizọs anya. Ị gaghị echefu ihe ị mụtara n’ụlọ akwụkwọ ahụ echefu ná ndụ gị.”—Aịsaịa 54:13.
Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma, Ndị Ọzụzụ Atụrụ, na Ndị Nkụzi
Ndị si n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi pụta na-eje ozi ugbu a n’otu narị ala na iri na asaa. Ala ndị a gụnyere ndị Oké Osimiri Atlantic, Caribbean, na Pacific gbara gburugburu nakwa ihe ka ọtụtụ ná mba ndị nwere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Alaka dị iche iche na-akọ na ezi ọzụzụ e nyere ụmụ akwụkwọ ahụ na-apụta ìhè n’otú ha si ekwusa ozi ọma, otú ha sị arụ ọrụ ọzụzụ atụrụ ha, na n’otú ha si ezi ihe. Ọzụzụ ha natara na-akwado ha iji Bible eme ihe nke ọma karị n’ozi ubi. (2 Timoti 2:15) Mgbe ha na-aza ajụjụ ndị nwe ụlọ jụrụ ha, ha na-ezokwa aka ugboro ugboro n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible * ma na-azụ ndị nkwusa Alaeze ndị ọzọ imekwa otú ahụ. Ịnụ ọkụ n’obi nke ndị si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta na-efe efe, ọrụ ha na-ewusikwa ọgbakọ ike.
Ndị okenye ọgbakọ nwere ihe ùgwù nke ‘ịzụ ìgwè atụrụ ahụ,’ na-enye aka ịkụziri ha okwu Chineke. (1 Pita 5:2, 3) Otu okenye kwuru banyere ndokwa ahụ, sị: “Anyị na-ekele alaka ụlọ ọrụ maka izitere anyị ụmụnna nwoke a zụrụ nke ọma inyere anyị aka n’ịzụ ìgwè atụrụ Chineke.” Otu alaka dị n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa kwukwara ihe yiri nke ahụ, sị: “Ndị si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta na-adị nnọọ ọmịiko. Ha na-arụsi ọrụ ike, nke ahụ na-emekwa ka ọgbakọ na-akwanyere ha ùgwù. Onye ọ bụla maara ha dị ka ndị dị umeala n’obi, ndị nwere ihu ọchị na ndị dị njikere ịrụ ọrụ, nke ahụ na-emekwa ụmụnna obi ụtọ. Ha na-eji obi ha nile ewepụta onwe ha ma jiri obi ụtọ gaa n’ọgbakọ ndị chọrọ ndị ọzụzụ atụrụ.” (Ndị Filipaị 2:4) Ndị ikom dị otú ahụ na-eme ka ahụ́ ruo ndị kwere ekwe ibe ha ala, e kwesịkwara ịja ha mma.—1 Ndị Kọrint 16:18.
Ndị nkụzi nke Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na-enyekwara ụmụ akwụkwọ ha aka imeziwanye nkà ha n’ikwu okwu n’ihu ọha. Ka ndị si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta na-etinye aro na ndụmọdụ ndị e nyere ha n’ọrụ, n’oge na-adịghị anya, ọtụtụ n’ime ha nwere ike iru eru ime ihe omume ná mgbakọ sekit na nke distrikti. Otu onye nlekọta sekit kwuru na “okwu 1 Timoti 4:13.
[ndị si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta] na-amagbu onwe ya, ha na-ejikwa okwu ndị na-eme nnọọ ka ndị mmadụ chee echiche egosi otú a ga-esi tinye ihe ha na-ekwu n’ọrụ.”—N’otu mba dị n’Africa, mgbe a malitere Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ebe ahụ ma zipụ ndị a zụrụ na ya ije ozi n’ọgbakọ dị iche iche, ọmụmụ ihe ọgbakọ ndị ahụ bịara nnọọ ka mma. Ndị okenye e si n’ụlọ akwụkwọ ahụ zipụ na-enye aka n’ikwusa ozi ọma, n’ọrụ ọzụzụ atụrụ, nakwa n’izi ihe, si otú ahụ na-ewuli ọgbakọ dị iche iche elu n’ofufe ha na-efe Chineke.—Ndị Efesọs 4:8, 11, 12.
A Na-elekọta Ọgbakọ Anya nke Ọma Karị
N’ọtụtụ ebe, e nwere mkpa inwekwu ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Ụfọdụ ọgbakọ agaraghị enwe otu mkpụrụ okenye ma a sị na e zigaraghị ha onye gara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. N’ihi ya, a na-eziga ọtụtụ ndị si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta ije ozi n’ebe e nwere mkpa dị otú ahụ.
Ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ na-akọ na ndị ikom a “maara ụkpụrụ ọgbakọ nke ọma,” “na-eji ọrụ ha akpọrọ ihe,” “na-enyere ndị ọzọ aka ịghọta nzukọ Jehova na ịkwanyere ya ùgwù,” nakwa na ha “na-enyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka iji ihu ọchị arụ ọrụ ha na iji mmekọrịta ha na Chineke kpọrọ ihe.” Ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na ndị ahụ si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta na-agbaso ihe ndị dị n’Okwu Chineke e dere ede, ha anaghịkwa adabere ná nghọta nke ha ma ọ bụ bụrụ ndị maara ihe n’anya onwe ha. (Ilu 3:5-7) Ndị ikom dị otú ahụ na-aghọrọ ọgbakọ ebe ndị e zigara ha onyinye sitere n’aka Chineke.
Ije Ozi n’Ókèala Ndị Dịpụrụ Adịpụ
Ụfọdụ ndị si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta bụ́ ndị e mere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-enyere ìgwè ndị dị n’ebe dịpụrụ adịpụ aka ịghọ ọgbakọ. Otu okenye nọ n’otu ebe dị n’ime ime obodo Guatemala gosiri obi ụtọ ya maka enyemaka ha ma kwuo, sị: “Ruo afọ 20, echegburu m onwe m banyere otú a ga-esi rụzuo ókèala a buru ibu. Ekpere m ekpere ugboro ugboro banyere ya. A zụrụ ụmụnna si n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi nke ọma n’ikwu okwu nakwa n’ụkpụrụ ọgbakọ, obi dịkwa m ụtọ ịhụ na e ji ịhụnanya na-enyere ndị bi n’akụkụ nile nke ókèala a aka ugbu a.”
Ndị si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta amụtala inwe ihe ịga nke ọma n’ókèala ebe ha na-aghaghị ịrị ọtụtụ ugwu iji ruo n’obere obodo ndị dịsasịrị adịsasị. Ha na-ehiwe ìgwè ndị dịpụrụ adịpụ n’ebe ndị ahụ n’oge na-adịghị anya ma hazie ha, ọbụna mgbe nke ahụ na-ekweghị ndị ọzọ omume. Dị ka ihe atụ, otu okenye ná mba Niger rịọrọ ka ndị si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta bịa nyere ha aka n’ihi na o chere na ha ga-arụ ọrụ dị egwu n’ebe o bi. N’ebe ndị dịpụrụ adịpụ karịsịa, o nwere ike ịka mfe ndị na-alụbeghị nwanyị ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na ndị nlekọta sekit. Dị ka Pọl onyeozi, ha aghaghị ịgabiga ‘ihe ize ndụ n’osimiri na n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe n’okporo ụzọ, ihe ize ndụ n’ọzara,’ na ihe isi ike ndị ọzọ, na-echegbukwa onwe ha banyere ọgbakọ ndị ha na-eje ozi na ha.—2 Ndị Kọrint 11:26-28.
Inyere Ndị Na-eto Eto Aka
Akwụkwọ Nsọ gbara ndị na-eto eto ume ka ha cheta Onye kere ha. (Eklisiastis 12:1) Ndị si n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi pụta bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi bụ ezi ihe nlereanya nye ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst. Mgbe mmadụ abụọ a zụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ batara n’otu ọgbakọ dị na United States, oge ndị nọ n’ọgbakọ ahụ na-eji aga ozi ọma mụbara okpukpu abụọ. Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ ndị na-ekwusa banyere Alaeze ahụ oge nile, mụbara site ná mmadụ 2 ruo mmadụ 11. Ụdị ihe a emeela n’ọtụtụ ọgbakọ.
Ndị si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta na-agbakwa ụmụ okorobịa ume ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. Nke a akpaliela ụfọdụ ndị na-abụbeghị ohu na-eje ozi ịrụ ọrụ iji ruo eruo inweta ihe ùgwù ahụ. Alaka ụlọ ọrụ dị na Netherlands kpọrọ ndị si n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi pụta “ezi ihe nlereanya maka ndị na-eto
eto na-eche ihe ha ga-eji ndụ ha mee.”Ije Ozi n’Ọgbakọ Ndị Na-asụ Asụsụ Mba Ọzọ
N’ọtụtụ ala, e mesiwela mgbalị ike izi ndị mmadụ ozi ọma n’asụsụ ala nna ha. Mgbe mgbe, ndị si n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi pụta na-amụta asụsụ ndị ọzọ ma na-eje ozi n’ókèala ebe ndị e nwere ọtụtụ ndị si mba ọzọ kwabata. Dị ka ihe atụ, na Belgium, e nwere mkpa inwekwu ndị nkwusa Alaeze na-asụ Albanian, Persian, na Russian.
Ọgbakọ na ìgwè ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ na Britain, Germany, Ịtali, Mexico, United States, nakwa n’ala ndị ọzọ eritewelarị nnọọ uru site n’aka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi si n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi pụta. Alaka ụlọ ọrụ dị na Korea na-akọ na “ihe karịrị narị mmadụ abụọ si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta na-arụ ọrụ dị mkpa n’inyere ọgbakọ na ìgwè ndị na-asụ asụsụ ọzọ aka.”
Iji Obi Umeala Eje Ozi Ndị Ọzọ
E wezụga ije ozi n’ìgwè na n’ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ, ndị si n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi pụta na-ejekwa ozi dị ka ndị okenye, ndị ohu na-eje ozi, na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ụfọdụ na-ekwere ije ozi n’ala ọzọ, ikekwe gaa gboo mkpa e nwere ná Ngalaba Ije Ozi n’alaka ụlọ ọrụ. Ndị mụrụ otú e si ewu ụlọ nwere ike inye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Mmụba ọgbakọ na sekit na-amụba n’ụwa nile na-eme ka a na-achọkwu ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị mgbe nile. Iji nye aka gboo mkpa a, a na-ahọrọ ụfọdụ ndị si n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi pụta ma nye ha ọzụzụ na-ewe izu iri maka ịrụ ọrụ njegharị, mgbe nke ahụ gasịkwara, a na-ekenye ha ọrụ inyere ndị nlekọta sekit aka ma ọ bụ ịbụ ndị nlekọta sekit. Ihe dị ka otu puku mmadụ na narị atọ si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta na-eje ozi ugbu a dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ná mba 97. N’otu mba dị n’Africa, pasent 55 nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ha bụ ndị si n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi pụta. Ná mba ọzọ dị n’Africa, pasent 70 nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ha agaala ụlọ akwụkwọ ahụ.
N’Australia, Canada, Europe, n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, nakwa na United States, e zigala ọtụtụ narị ndị si n’ụlọ akwụkwọ ahụ pụta ịga jee ozi n’ebe e nwere mkpa ụfọdụ n’ala ndị ọzọ. Ụlọ akwụkwọ ahụ na-esi otú a abara ụwa nile uru.
Jehova esitewo n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst kpọlite ndị nkwusa ozi ọma, ndị ọzụzụ atụrụ, ndị nkụzi, na ndị ọzọ iji mee ka ihe ndị metụtara Alaeze ahụ gaa n’ihu n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. È nwere ihe na-egosi na ọnụ ọgụgụ ndị Chineke ka ga-amụba? Eenụ! N’ihi ya, ọ na-adịwanye mkpa ka ndị ikom raara onwe ha nye rụọ ọrụ iji ruo eruo maka ihe ùgwù ndị ka ukwuu. (Aịsaịa 60:22; 1 Timoti 3:1, 13) Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na-enye ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ohere iji dịkwuo njikere ịmụba ozi ha, bụ́ nke ga-abara ha onwe ha na ndị ọzọ nọ gburugburu ụwa ezigbo uru.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na-eme ka ozi Alaeze ahụ na-aga n’ihu n’ụwa nile
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
Ị̀ na-eme atụmatụ ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ma nyere ndị ọzọ aka?