Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Ịnọ ná Nchebe n’Ụwa A Nsogbu Juru na Ya!

Ị Pụrụ Ịnọ ná Nchebe n’Ụwa A Nsogbu Juru na Ya!

Akwụkwọ Ịkpọ Oku Maka Okwu Ihu Ọha Pụrụ Iche

Ị Pụrụ Ịnọ ná Nchebe n’Ụwa A Nsogbu Juru na Ya!

A ga-ekwu okwu ihu ọha a dabeere na Bible n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri atọ gburugburu ụwa. N’ọtụtụ ebe, a ga-ekwu okwu ihu ọha a na Sunday, April 15, 2007. Gịnị ka ị ga-amụta n’okwu ihu ọha ahụ? Were dị ka ihe atụ:

Gịnị mere ụjọ ji na-atụ ọtụtụ ijeri mmadụ?

Olee mgbe kpọmkwem ka obi malitere ikoro ụmụ mmadụ n’elu?

Olee ebe ụmụ mmadụ pụrụ inweta ezi nchebe, gịnịkwa ga-eme ka ha nweta ya?

Ị ga-amata azịza nke ajụjụ ndị a site n’ịbịa gere okwu a dị mkpa dabeere na Bible bụ́ nke a ga-anọ n’ọtụtụ puku ebe dị iche iche kwuo. A na-anọkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova ekwu ya. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ụtọ ịgwa gị oge na ebe a ga-anọ kwuo ya. Anyị ji obi anyị nile na-akpọ gị oku ka ị bịa gere okwu a dabere na Bible bụ́ nke bịara n’oge ya nakwa nke na-agba ume.