Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Abụọ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Abụọ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Abụọ

ỌBỤ na December 609 T.O.A. Eze Babilọn amalitela nnọchibido ikpeazụ ọ ga-anọchibido Jeruselem. Tupu oge a, ihe bụ́ isi Ezikiel na-agwa ndị ahụ a dọọrọ n’agha gaa Babilọn bụ banyere ọdịda na mbibi nke obodo ha ha hụrụ n’anya bụ́ Jeruselem. Ma ugbu a, ihe Ezikiel na-ekwu n’amụma ya bụzi otú Chineke ga-esi bibie mba ndị ahụ na-ekpere arụsị, bụ́ ndị ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe ọjọọ dakwasịrị ndị Chineke. Ka ọnwa iri na asatọ gasịrị ka e bibisịrị Jeruselem, amụma Ezikiel gbanwere ọzọ: ọ bụzi banyere ụzọ dị ebube a ga-esi weghachi ezi ofufe na Jeruselem.

N’Ezikiel 25:1-48:35, e buru amụma banyere mba ndị ahụ gbara Izrel gburugburu na otú a ga-esi napụta ndị Chineke. * E wezụgakwa ihe a kọrọ n’Ezikiel 29:17-20, e dekọrọ akụkọ ndị ọzọ nile n’ikwekọ n’oge na usoro ha ga-esi mee. Otú ọ dị, e deghị amaokwu anọ a n’ụzọ kwekọrọ n’oge ha ga-eji mee. Ebe ọ bụ na Akwụkwọ Ezikiel so n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ, o bu ozi ‘dị ndụ ma na-akpa ike.’—Ndị Hibru 4:12.

‘ALA AHỤ GA-AGHỌ UBI IDEN A GBARA OGIGE’

(EzIkiel 25:1–39:29)

Mgbe Jehova hụrụ otú mba Amọn, Moab, Idọm, Filistia, Taịa, na Saịdọn ga-esi achị Jeruselem ọchị n’ihi na e bibiri ya, ọ gwara Ezikiel ka o buo amụma megide ha. A ga-akwakọrọ ihe nile dị n’Ijipt. E ji ‘Fero, bụ́ eze Ijipt na ìgwè ndị ya’ tụnyere osisi cedar a ga-eji “mma agha nke eze Babịlọn” gbutuo.—Ezikiel 31:2, 3, 12; 32:11, 12.

Ihe dị ka ọnwa isii ka e bibisịrị Jeruselem na 607 T.O.A., otu onye si na Jeruselem gbapụ bịakwutere Ezikiel wee kọọrọ ya, sị: “E tikpọwo obodo anyị.” Onye amụma ahụ ‘adaghịkwa ogbi ọzọ’ n’ịgwa ndị ahụ a chụpụrụ n’ala ha okwu. (Ezikiel 33:21, 22) O nwere amụma ndị ọ ga-eburu ha banyere otú a ga-esi weghachi ha n’ala ha. Jehova ‘ga-eme ka otu onye ọzụzụ atụrụ biliere ha, nke bụ́ ohu ya bụ́ Devid.’ (Ezikiel 34:23) Idọm ga-atọgbọrọ n’efu, ma ala Juda bụ́ ala dị ya nso, ga-aghọ ubi “dị ka ubi Iden a gbara ogige.” (Ezikiel 36:35) Jehova kwere nkwa ichebe ndị ya e weghachiri n’ala ha mgbe “Gọg” ga-awakpo ha.—Ezikiel 38:2.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

29:8-12—Olee mgbe Ijipt tọgbọrọ n’efu ruo iri afọ anọ? Mgbe e bibisịrị Jeruselem na 607 T.O.A., ndị Izrel fọdụrụ na Juda gbagara Ijipt n’agbanyeghị na Jeremaịa onye amụma dọrọ ha aka ná ntị ka ha ghara ime otú ahụ. (Jeremaịa 24:1, 8-10; 42:7-22) Ijipt echebeghị ha n’ihi na Nebukadneza bịara busoo Ijipt agha ma merie ya. O nwere ike ịbụ n’oge a e merisịrị Ijipt ka ọ tọgbọọziri n’efu ruo iri afọ anọ ahụ e kwuru okwu ya. Ọ bụ ezie na e nweghị ebe e dekọrọ nke a n’akwụkwọ ndị kọrọ ihe ndị mere eme, ma obi siri anyị ike na o mere n’ihi na Jehova bụ Onye na-emezu amụma.—Aịsaịa 55:11.

29:18—Olee otú e si ‘mee ihe nile ọ bụla isi nkwọcha meekwa ubu nile ọ bụla ka o chihịa echihịa’? Mgbe ndị agha Nebukadneza na-arụ ihe ha ji nọchibido obodo Taịa nke bụ́ agwaetiti, isi ha ghọrọ isi nkwọcha, ubu ha echihịasịakwa echihịasị ebe ha na-ebu osisi na ihe ndị ọzọ ha ji rụọ ihe ndị ha ji nọchibido obodo ahụ.—Ezikiel 26:7-12.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

29:19, 20. Ebe ọ bụ na ndị Taịa buuru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụ̀ na ụba ha nile gbalaga n’obodo ha nke bụ́ agwaetiti, ihe Eze Nebukadneza kwatara n’obodo Taịa dịzi nnọọ obere. N’agbanyeghị na Nebukadneza bụ onye ọchịchị dị mpako na onye na-eche nanị banyere onwe ya, Jehova menyeere ya site n’inye ya Ijipt dị ka “ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ụsụụ ndị agha ya.” Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iṅomi ezi Chineke ahụ site n’ịtụ ụtụ isi ndị ọchịchị sị tụọ maka ihe ndị ha na-arụrụ anyị? Àgwà ọjọọ ndị ọchịchị na-akpa ma ọ bụkwanụ ejighị ụtụ isi ahụ arụpụta ihe, abụghị ya ga-eme ka anyị kwụsị ime ihe a iwu ji anyị ime.—Ndị Rom 13:4-7.

33:7-9. Ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị nche nke oge a na ndị enyi ha ekwesịtụdịghị ịla azụ n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere “oké mkpagbu” ahụ na-abịanụ.—Matiu 24:21.

33:10-20. Nzọpụta anyị dabeere na anyị isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe anyị ma rube isi n’ihe ndị Chineke chọrọ. N’ezie, ụzọ nke Jehova ziri ezi.

36:20, 21. Ndị Izrel mere ka mba ndị ọzọ ghara ido aha Chineke nsọ n’ihi na ha ebighị ndụ kwekọrọ n’ihe e ji mara ha, nke bụ́ “ndị nke Jehova.” Anyị ekwesịtụghị ịdị na-aza ndị Jehova nanị n’ọnụ.

36:25, 37, 38. Ọ bụ “ìgwè ewu na atụrụ dị nsọ” mejupụtara paradaịs ime mmụọ anyị nọ na ya taa. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịhụ na anyị debere ya ọcha.

38:1-23. Ọ bụ nnọọ ihe na-emesi obi ike ịmara na Jehova ga-anapụta ndị ya mgbe Gọg nke ala Megọg ga-ebu agha megide ha. Gọg bụ aha e nyere “onyeisi ụwa nke a,” bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, mgbe e sisịrị n’eluigwe chụdata ya. Ala Megọg bụ ụwa ebe a a chụdatara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya.—Jọn 12:31; Mkpughe 12:7-12.

“TỤKWASỊ OBI GỊ N’IHE NILE MỤ ONWE M NA-EME KA Ị HỤ”

(Ezikiel 40:1–48:35)

O meela afọ iri na anọ kemgbe e bibisịrị obodo Jeruselem. (Ezikiel 40:1) Ọ ka fọrọ iri afọ ise na isii ndị Izrel ga-anọ ná mba ebe a dọọrọ ha gaa. (Jeremaịa 29:10) Ugbu a ọ fọrọ obere ka Ezikiel gbaa afọ iri ise. Mgbe ọ nọ n’ọhụụ, a kpọgara ya mba Izrel. A gwara ya, sị: “Nwa nke mmadụ, were anya gị abụọ hụ, werekwa ntị gị abụọ nụ, tụkwasịkwa obi gị n’ihe nile Mụ onwe m na-eme ka ị hụ.” (Ezikiel 40:2-4) Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ Ezikiel ụtọ nke ukwuu mgbe e gosiri ya ọhụụ ụlọ nsọ ọhụrụ ahụ.

Ụlọ nsọ ahụ dị ebube Ezikiel hụrụ nwere ọnụ ụzọ ama isii, ime ụlọ iri atọ, ebe nsọ, ebe nsọ kachasị ebe nsọ, ebe ịchụàjà e ji osisi mee, na ebe ịchụàjà maka àjà nsure ọkụ. Mmiri na-esi n’okpuru mbata ụzọ nke ụlọ nsọ ahụ ‘apụta’ ghọrọ osimiri. (Ezikiel 47:1) Ezikiel hụkwara ọhụụ ọzọ ebe a na-ekenye ebo nke ọ bụla ala—ala nke ọ bụla e kenyere si n’ebe ọwụwa anyanwụ gbadaruo ebe ọdịda anyanwụ. E kewapụtakwara ala ebe a ga-anọ na-achị achị n’agbata Juda na Benjamin. “Ebe nsọ nke Jehova” na “obodo” ahụ a kpọrọ Jehova-Shama (ma ọ bụ Jehova nọ n’ebe ahụ) nọ n’ala a e kewapụtara.—Ezikiel 48:9, 10, 15, 35.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

40:3–47:12—Gịnị ka ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-anọchi anya ya? Ọ dịghị mgbe a rụrụ nnukwu ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ọ nọchiri anya ụlọ nsọ ime mmụọ Chineke, nke bụ́ ndokwa Jehova mere maka ife ya ofufe dị ọcha n’oge anyị a. (Ezikiel 40:2; Maịka 4:1; Ndị Hibru 8:2; 9:23, 24) Ọhụụ ụlọ nsọ ahụ na-emezu “n’ụbọchị ikpeazụ” a, mgbe a na-anụcha òtù ndị nchụàjà ahụ. (2 Timoti 3:1; Ezikiel 44:10-16; Malakaị 3:1-3) Ma ọ ga-enwe mmezu ikpeazụ ya na Paradaịs. Otú ọ dị, ụlọ nsọ ahụ a hụrụ n’ọhụụ mere ka ndị Juu ahụ a kpụgara n’ala ọzọ nwee olileanya na a ga-emesị maliteghachi ife Jehova ofufe n’Izrel nakwa na a ga-eme ka ezinụlọ ọ bụla nke ndị Juu keta ala n’ala ha.

40:3–43:17—Gịnị dị ịrịba ama banyere iji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ tụọ ụlọ nsọ ahụ? Iji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ tụọ ụlọ nsọ ahụ bụ ihe ama na-egosi na a ga-emezurịrị ihe Jehova zubere banyere iweghachi ezi ofufe.

43:2-4, 7, 9—Gịnị bụ “ozu nile nke ndị eze ha” bụ́ ndị a ga-esi n’ụlọ nsọ ahụ bupụ? O yiri ka ozu ndị ahụ hà na-ezo aka n’arụsị. Ndị isi Jeruselem na ndị Juu ndị ọzọ ejirila arụsị metọọ ụlọ nsọ Chineke—dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha ji ha mere ndị eze ha.

43:13-20—Olee ihe ebe ịchụàjà ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-anọchi anya ya? Ebe ịchụàjà ihe atụ ahụ na-anọchi anya ihe bụ́ uche Chineke banyere àjà mgbapụta Jizọs Kraịst. N’ihi àjà mgbapụta a, a gụrụ ndị e tere mmanụ dị ka ndị ezi omume gụọkwa “oké ìgwè mmadụ” ahụ dị ka ndị dị ọcha n’anya Chineke. (Mkpughe 7:9-14; Ndị Rom 5:1, 2) Eleghị anya ọ bụ ya mere na e nweghị “oké osimiri a wụrụ awụ,” nke bụ́ nnukwu ọkwa e ji etinye mmiri, nke ndị nchụàjà ji asa ahụ́, n’ụlọ nsọ a Ezikiel hụrụ n’ọhụụ dị ka e nwere ya n’ụlọ nsọ ahụ Solomọn rụrụ.—1 Ndị Eze 7:23-26.

44:10-16—Olee ndị ka ndị nchụàjà ahụ na-anọchi anya ha? Òtù ndị nchụàjà a na-anọchi anya Ndị Kraịst nile e tere mmanụ n’oge anyị a. A nụchara ha n’afọ 1918 mgbe Jehova nọdụrụ “dị ka onye nnụcha” n’ụlọ nsọ ime mmụọ ya. (Malakaị 3:1-5) Ndị dị ọcha ma ọ bụ ndị chegharịrịnụ nwere ike ịnọgide n’ozi a pụrụ iche ha na-eje. E mesịakwa, ha ga-anọgide na-agba mbọ ịhụ na ha debere onwe ha “n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị,” si otú a ghọọrọ “oké ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị agbụrụ ndị ahụ na-abụghị ndị nchụàjà na-anọchi anya ha, ihe nlereanya.—Jems 1:27; Mkpughe 7:9, 10.

45:1; 47:13–48:29—Gịnị ka “ala” ahụ na ikenye ya dị ka ihe nketa na-anọchi anya ya? Ala ahụ na-anọchi anya ógbè ndị Chineke nọ na ya na-eje ozi ha. Ebe ọ sọkwara onye na-efe Jehova ya nọrọ, onye ahụ nọ n’ala ahụ e weghachiri eweghachi ma ọ bụrụhaala na ọ nọgidere na-efe Jehova ezi ofufe. Ikenye ndị mmadụ ala ahụ ga-enwe mmezu ikpeazụ ya n’ime ụwa ọhụrụ ahụ mgbe onye ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi nye Chineke ga-eketa ebe nke ya.—Aịsaịa 65:17, 21.

45:7, 16—Gịnị ka àjà mbuli ahụ dịịrị ndị nchụàjà na onyeisi na-anọchi anya ya? N’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ, nke a na-ezo aka n’ụzọ bụ́ isi n’inye nkwado ime mmụọ, nke bụ́ inye aka mgbe e nwere mkpa na ịkwado ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ.

47:1-5—Gịnị ka mmiri nke osimiri ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-anọchi anya ya? Mmiri ahụ na-anọchi anya ndokwa ndị Jehova mere iji zụọ ndị ya n’ụzọ ime mmụọ ka ha wee dị ndụ, nke gụnyere àjà mgbapụta Kraịst Jizọs na ihe ọmụma Chineke nke dị na Bible. (Jeremaịa 2:13; Jọn 4:7-26; Ndị Efesọs 5:25-27) Osimiri ahụ na-eji nke nta nke nta na-emiwanye emi ka o nwee ike ịbacha ndị ọhụrụ na-enubata n’ezi ofufe Chineke. (Aịsaịa 60:22) Mmiri nke ndụ ahụ ga na-eruda n’osimiri ahụ n’ime Otu Puku Afọ ahụ Kraịst ga-achị, mmiri ya ahụ ga-agụnye nghọta ọhụrụ ndị a ga-enweta site ‘n’akwụkwọ mpịakọta’ ndị ahụ a ga-emeghe mgbe ahụ.—Mkpughe 20:12; 22:1, 2.

47:12—Gịnị ka osisi ndị ahụ na-amị mkpụrụ oriri na-anọchi anya ha? Osisi ihe atụ ndị a na-anọchi anya ndokwa ime mmụọ ndị Chineke mere iji mee ka ụmụ mmadụ zughachi okè.

48:15-19, 30-35—Gịnị ka obodo ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-anọchi anya ya? “Jehova-Shama (ma ọ bụ Jehova Nọ n’Ebe Ahụ)” dị n’ala “na-adịghị nsọ,” nke na-egosi na ọ na-anọchi anya ihe dị n’ụwa. O yiri ka obodo ahụ ọ na-anọchi anya ndokwa Jehova mere maka ndị ga-emejupụta “ụwa ọhụrụ” ahụ. (2 Pita 3:13) Na obodo ahụ nwere ọnụ ụzọ ama n’akụkụ ya nile na-egosi na onye ọ bụla chọrọ ịbata nwere ohere ime otú ahụ. Ndị bụ́ ndị nlekọta n’etiti ndị Chineke kwesịrị ịbụ ndị ọ na-adịrị ndị ọzọ mfe ịbịakwute.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

40:14, 16, 22, 26. Osisi nkwụ ndị ahụ a tụrụ n’ahụ́ ọnụ ụzọ ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ na-egosi na ọ bụ nanị ndị ụzọ ha si ebi ndụ kwụ ọtọ ka a ga-ekwe ka ha bata n’ime ụlọ nsọ ahụ. (Abụ Ọma 92:12) Nke a na-akụziri anyị na nanị ihe ga-eme ka Jehova nabata ofufe anyị na-efe ya bụ ma ụzọ anyị si ebi ndụ ọ̀ kwụ ọtọ.

44:23. Anyị kwesịrị inwe ekele maka ozi ndị nchụàjà nke oge a na-ejere anyị. “Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ebute ụzọ n’ịhụ na anyị nwetara nri ime mmụọ na-abịa n’oge ya, bụ́ nke na-enyere anyị aka ịmata ọdịiche dị n’ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha n’anya Jehova.—Matiu 24:45.

47:9, 11. Ihe ọmụma—nke bụ́ otu akụkụ dị oké mkpa nke mmiri ihe atụ ahụ—agwọọla ọtụtụ mmadụ n’ụzọ dị ịtụnanya n’oge anyị a. N’ebe ọ bụla a ṅụrụ ya, ọ na-eme ka ndị mmadụ nwee ndụ n’ụzọ ime mmụọ. (Jọn 17:3) N’aka nke ọzọ, a ga-arara ndị jụrụ ịṅụ mmiri ahụ na-enye ndụ nye nnu, nke pụtara na a ga-ebibi ha kpamkpam. Leenụ ka o si dị oké mkpa na ‘anyị ga-eme ike anyị nile n’ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi’!—2 Timoti 2:15.

“M Ga-edokwa Aha Ukwu M Nsọ”

Mgbe e wepụsịrị eze ikpeazụ si n’agbụrụ Devid, ezi Chineke ahụ kwere ka ogologo oge gafee tupu “onye o ruru aka” abịa were ocheeze ahụ. Ma Chineke echefughị ọgbụgba ndụ ya na Devid gbara. (Ezikiel 21:27; 2 Samuel 7:11-16) Amụma Ezikiel na-ekwu banyere “ohu m, bụ́ Devid,” bụ́ onye ga-abụ “onye ọzụzụ atụrụ” na “eze.” (Ezikiel 34:23, 24; 37:22, 24, 25) Onye a abụghị onye ọzọ ma ọ bụghị Jizọs Kraịst, mgbe ọ nọ dị ka eze nke Alaeze ahụ. (Mkpughe 11:15) Jehova ga-ejikwa Alaeze Mezaịa ahụ ‘doo aha ukwuu ya nsọ.’—Ezikiel 36:23.

N’oge na-adịghị anya, a ga-ebibi ndị nile na-ekwutọ aha nsọ Chineke. Ma ndị na-edo aha ahụ nsọ site n’ife Jehova n’ụzọ ọ na-anara nke ọma ga-enweta ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, ka anyị jiri mmiri nke ndụ ahụ na-erudasi ike n’oge anyị a mee ihe ma na-ebute ezi ofufe Jehova ụzọ ná ndụ anyị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 2 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ebe a tụlere Ezikiel 1:1–24:27, lee “Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke mbụ,” nke gbara n’Ụlọ Nche July 1, 2007.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ụlọ nsọ ahụ dị ebube Ezikiel hụrụ n’ọhụụ

[Foto dị na peeji nke 10]

Gịnị ka osimiri ahụ na-enye ndụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-anọchi anya ya?

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.