Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Mmadụ Si Abụ Onye Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe n’Ezie?

Olee Otú Mmadụ Si Abụ Onye Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe n’Ezie?

Olee Otú Mmadụ Si Abụ Onye Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe n’Ezie?

PỌL onyeozi dere, sị: “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ọnwụ, ma ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo.” (Ndị Rom 8:6) Pọl onyeozi ji ihe a o kwuru gosi na mmadụ ịbụ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe abụghị ihe mmadụ ga-eme ma ọ chọọ, kama iwu ji mmadụ ime ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ okwu metụtara ọnwụ na ndụ. Ma olee otú o si bụrụ na onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ga-enweta “ndụ na udo”? Dị ka Bible si kwuo, onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na-enwe udo n’ime onwe ya ugbu a, ya na Chineke na-adịkwa n’udo. Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. (Ndị Rom 6:23; Filipaị 4:7) Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji kwuo, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha”!—Matiu 5:3.

Na ị na-agụ magazin a na-egosi na ị bụ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe—ọ bụkwanụ ihe amamihe dị na ya na ị na-eme otú ahụ. Ma e nwere ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ si aghọta ihe mmadụ iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe pụtara, n’ihi ya i nwere ike ịjụ, sị: ‘Gịnị ka mmadụ iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe pụtara n’ezie? Oleekwa otú mmadụ ga-esi mee ya?’

“Uche nke Kraịst”

Tụkwasị n’ikwu mkpa na uru dị ná mmadụ iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, Pọl onyeozi kwuru ọtụtụ ihe banyere ihe mmadụ iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe pụtara n’ezie. Mgbe o degaara Ndị Kraịst bi n’obodo Kọrint oge ochie akwụkwọ ozi, ọ kọwaara ha ihe dị iche n’onye anụ ahụ́ na-achị, nke bụ́, onye na-eme ihe anụ ahụ́ ya chọrọ, na onye mmụọ nsọ na-achị, nke bụ́, onye ji ihe metụtara ofufe Chineke kpọrọ ihe. Pọl dere, sị: “Onye anụ ahụ́ na-achị adịghị anata ihe ndị metụtara mmụọ Chineke, n’ihi na ha bụ ihe nzuzu nye ya.” N’aka nke ọzọ, Pọl kwuru na ihe e ji ama onye mmụọ nsọ na-achị bụ na onye ahụ na-enwe “uche nke Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 2:14-16.

Inwe “uche nke Kraịst” pụtara n’ụzọ bụ́ isi inwe “otu ụzọ iche echiche ahụ nke Kraịst Jizọs nwere.” (Ndị Rom 15:5; Ndị Filipaị 2:5) Ụzọ ọzọ a pụrụ isi kwuo ya bụ na onye mmụọ nsọ na-achị bụ onye na-eche echiche otú Jizọs si eche echiche ma na-agbaso nzọụkwụ ya. (1 Pita 2:21; 4:1) Ka mmadụ na-echekwu echiche dị ka Kraịst, ọ ga-eme ka onye ahụ na Chineke dịkwuo ná mma meekwa ka onye ahụ nwee ike inweta “ndụ na udo.”—Ndị Rom 13:14.

Otú Mmadụ Si Amata “Uche nke Kraịst”

Ma, ka mmadụ wee nwee uche nke Kraịst, onye ahụ aghaghị ibu ụzọ mara ihe bụ uche nke Kraịst. N’ihi ya, ihe mbụ mmadụ ga-eme iji bụrụ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe bụ ịmata otú Jizọs si eche echiche. Ma olee otú mmadụ ga-esi mara uche onye biri ndụ n’ụwa a puku afọ abụọ gara aga? Ka anyị weregodị ihe atụ a, olee otú i si mata ndị aha ha dị n’akụkọ ihe mere eme n’obodo gị? Eleghị anya, ọ bụ site n’ịgụ banyere ha. N’otu aka ahụ, ịgụ ebe a kọrọ akụkọ banyere Jizọs bụ otu ụzọ dị mkpa isi mata uche nke Kraịst.—Jọn 17:3.

A bịa n’ihe banyere Jizọs, a kọrọ akụkọ banyere ya nke ọma n’Oziọma ndị ahụ Matiu, Mak, Luk, na Jọn dere. Ịgụ akụkọ ndị a nke ọma ga-enyere gị aka ịmata otú Jizọs si eche echiche, otú ihe na-emetụru ya n’obi, na ihe kpaliri ya ime ihe ndị o mere. Ọ bụrụ na i wepụta oge tụgharịa uche n’ihe ndị ị na-agụ banyere Jizọs, ị ga-enwe ike ịghọta ụdị onye Jizọs bụ. Ọ bụrụgodị na ọ dị gị ka ị maara Kraịst nke ọma, ịgụ banyere ya na ịtụgharị uche n’ihe ị na-agụ ga-enyere gị aka ‘ịnọgide na-eto eto n’obiọma na-erughịrị mmadụ na ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Jizọs Kraịst.’—2 Pita 3:18.

Ugbu a ka anyị tụlezie ụfọdụ ihe n’Oziọma ndị ahụ kọrọ banyere Jizọs iji mata ihe ndị mere Jizọs ji bụrụ onye mmụọ nsọ na-achị. Mgbe ahụzi, jụọ onwe gị otú i nwere ike isi ṅomie ihe nlereanya ya.—Jọn 13:15.

Iji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe na “Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ”

Luk onye so dee Oziọma ndị ahụ kwuru na Chineke wụsara Jizọs mmụọ nsọ ya mgbe e mere ya baptizim, Jizọs wee ‘jupụta ná mmụọ nsọ.’ (Luk 3:21, 22; 4:1) Jizọs n’onwe ya mere ka ndị na-eso ụzọ ya mara uru ọ bara mmadụ ịbụ onye mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, na-achị. (Jenesis 1:2; Luk 11:9-13) Gịnị mere nke ahụ ji dị oké mkpa? Ọ bụ n’ihi na mmụọ Chineke nwere ike inwogha obi mmadụ, nke ga-eme ka onye ahụ malite inwe uche nke Kraịst. (Ndị Rom 12:1, 2) Mmụọ Nsọ na-eme ka mmadụ malite inwe àgwà ndị dị ka “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.” Ọ bụ àgwà ndị a, bụ́ nke Bible kpọrọ “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”—ka e ji ama onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’ezie. (Ndị Galeshia 5:22, 23) N’igbu ya ná nkenke, onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe bụ onye mmụọ Chineke na-achị.

Jizọs kpara àgwà gosiri na o nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ ná ndụ ya n’oge nile ọ na-eje ozi ya. O gosipụtara àgwà ndị dị ka ịhụnanya, obiọma na ịdị mma n’otú o si mesoo ndị na-enweghị ka ọ ha há ihe. (Matiu 9:36) Dị ka ihe atụ, tụlee otu ihe merenụ nke Jọn onyeozi kọrọ. Anyị na-agụ, sị: “Ka [Jizọs] nọkwa na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site n’ọmụmụ.” Ndị na-eso ụzọ Jizọs hụkwara nwoke ahụ, ma ha lere ya anya dị ka onye mmehie. N’ihi ya ha jụrụ Jizọs, sị: “Ònye mehiere, nwoke a ka ọ̀ bụ ndị mụrụ ya?” Ndị agbata obi nwoke ahụ hụkwara nwoke ahụ ma nanị ihe ha ma banyere ya bụ na ọ bụ onye arịrịọ. Ha kwuru, sị: “Onye a bụ nwoke ahụ nke na-adị anọdụ ala arịọ arịrịọ, ka ọ́ bụghị ya?” Ma Jizọs hụrụ nwoke ahụ dị ka onye chọrọ enyemaka. Ọ gwara nwoke ahụ okwu ma gwọọ ya.—Jọn 9:1-8.

Gịnị ka akụkọ a na-akụziri gị banyere uche nke Kraịst? Nke mbụ, Jizọs elegharaghị ndị na-enweghị ka ọ há ha anya, kama o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha. Nke abụọ, ọ naghị eche ka a gwa ya agwa tupu ya enyere ndị ọzọ aka. Ọ̀ dị gị ka ị na-agbaso ihe nlereanya a Jizọs setịpụrụ? Ị̀ na-ele ndị mmadụ anya otú Jizọs si ele ha, na-enyere ha aka mgbe ọ dị mkpa, na-eme ka ndụ ha ka mma, na-emekwa ka ha nwee olileanya na ọdịnihu ga-aka mma? Ka ị̀ bụ onye na-achọkarị ka gị na ndị a na-anụ aha ha na-akpa ma leghara ndị ọ na-enweghị ka ọ há ha anya? Ọ bụrụ na ị na-achọkarị inyere ndị ọzọ aka, ị na-eme nke ọma n’ịgbaso ihe nlereanya Jizọs.—Abụ Ọma 72:12-14.

Iji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe na Ikpe Ekpere

Ndị dere Oziọma ndị ahụ gosiri na Jizọs kpegaara Chineke ekpere ọtụtụ ugboro. (Mak 1:35; Luk 5:16; 22:41) Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, ọ na-ewepụta oge o ji ekpe ekpere. Onye na-eso ụzọ bụ́ Matiu, dere, sị: ‘Ebe ọ bụ na Jizọs ezilagawo ìgwè mmadụ ahụ, ọ rịgooro n’elu ugwu nanị ya ikpe ekpere.’ (Matiu 14:23) Oge ndị a nanị Jizọs ji kpegara Nna ya nke eluigwe ekpere nyeere ya aka inweta ike. (Matiu 26:36-44) Taakwa, ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na-achọ ohere ọ bụla ha ga-eji kpegara Chineke ekpere, ha makwaara na nke a ga-eme ka ha na Onye Okike ha dịkwuo ná mma ma nyere ha aka ịdị na-eche echiche dị ka Kraịst.

Jizọs na-etinyekarị oge dị ukwuu n’ikpe ekpere. (Jọn 17:1-26) Dị ka ihe atụ, tupu Jizọs ahọrọ mmadụ iri na abụọ ga-abụ ndịozi ya, ọ “pụrụ gaa n’ugwu ikpe ekpere, o wee nọgide n’abalị ahụ dum na-ekpegara Chineke ekpere.” (Luk 6:12) Ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na-agbaso ihe nlereanya Jizọs n’agbanyeghị na ha adịghị eji abalị nile ekpe ekpere. Tupu ha emewe mkpebi ndị dị mkpa ná ndụ ha, ha na-ewepụta nnọọ ohere kpegara Chineke ekpere, na-arịọ ya mmụọ nsọ ya ka o nyere ha aka ime mkpebi ga-eme ka ha na Chineke dịkwuo ná mma.

Jizọs setịpụkwaara anyị ihe nlereanya anyị kwesịrị iṅomi n’otú o si site n’ala ala obi ya kpee ekpere. Rịba ama ihe Luk dere banyere otú Jizọs si kpee ekpere n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya. “Ka ọ malitere inwe obi erughị ala, ọ nọgidere na-ekpesi ekpere ike karị, ọsụsọ ya dịkwa ka ntapụ ọbara nke na-atapụsị n’ala.” (Luk 22:44) Nke a abụghị nke mbụ Jizọs na-ekpesi ekpere ike, ma n’oge a, mgbe ọnwụnwa kasị njọ ná ndị o nwetụrụla na-achọ ịbịara ya, o kpesiri ekpere ike “karị”—Chineke zakwara ekpere ya. (Ndị Hibru 5:7) Ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na-agbaso ihe nlereanya Jizọs. Mgbe ọnwụnwa ndị kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara ha, ha na-ekpegasiri Chineke ‘ekpere ike’ ka o nye ha mmụọ nsọ, ka o duzie ha nakwa ka o nyere ha aka.

Ebe ọ bụ na Jizọs bụ nnọọ onye na-ejighị ekpere egwuri egwu, ọ bụghị ihe iju anya na ndị na-eso ụzọ ya chọrọ iṅomi ya n’akụkụ a. Ọ bụkwa ya mere ha ji rịọ ya, sị: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.” (Luk 11:1) N’otu aka ahụ taa, ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ma chọọ ka mmụọ nsọ Chineke na-edu ha na-agbaso ihe nlereanya Jizọs n’otú ha si ekpegara Chineke ekpere. Onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’ezie ejighị ekpere egwuri egwu.

Iji Ihe Mmụọ Kpọrọ Ihe na Ikwusa Ozi Ọma

N’oziọma Mak, anyị na-agụta ebe Jizọs gwọgidere ndị ọrịa ruo n’ime abalị. N’ụtụtụ echi ya, mgbe nanị ya nọ na-ekpe ekpere, ụmụazụ ya bịakwutere ya ma gwa ya na ọtụtụ ndị na-achọ ya, ikekwe ha na-achọ ya ka ọ bịa gwọọ ha. Ma, Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Ka anyị gaa ebe ọzọ, n’obodo nta ndị dị nso, ka m wee kwusaakwa ozi ọma n’ebe ahụ.” Mgbe ahụ Jizọs kọwara ihe mere o ji kwuo ihe a, sị: “Ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Mak 1:32-38; Luk 4:43) Ọ bụ ezie na Jizọs maara na ịgwọ ndị mmadụ ọrịa ha dị mkpa, ma ikwusa ozi ọma bụ isi ihe mere o ji bịa n’ụwa.—Mak 1:14, 15.

Taa, ikwusara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke ka bụkwa otu ihe e ji ama ndị nwere uche nke Kraịst. Jizọs gwara ndị nile chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Tụkwasị na nke a, Jizọs buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ebe ọ bụ na Okwu Chineke kwuru na ọ bụ site n’ike mmụọ nsọ ka a ga-ekwusa ozi ọma ahụ, mmadụ ikerechi òkè anya na ya na-egosi na onye ahụ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’ezie.—Ọrụ 1:8.

Ikwusa ozi ọma ahụ n’ụwa nile chọrọ mgbalị nke ọtụtụ nde mmadụ jikọrọ aka mee. (Jọn 17:20, 21) Ọ bụghị nanị na ndị na-arụ ọrụ a kwesịrị ịbụ ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe kamakwa ha kwesịrị ịhụ na ha haziri ọrụ a ha na-arụ n’ụwa nile nke ọma. Ị̀ maara ndị na-agbaso nzọụkwụ Kraịst ma na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ụwa nile?

Ị̀ Bụ Onye Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe?

N’eziokwu, e nwere ihe ndị ọzọ e ji ama onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’ezie, ma site n’ihe ndị anyị tụlere, ọ̀ dị gị ka i ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe? Iji chọpụta, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agụchi Okwu Chineke, bụ́ Bible anya, ma na-atụgharị uche n’ihe m na-agụ? Àna m egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ná ndụ m? Àna m ekpechi ekpere anya? Ọ̀ na-agụ m agụụ isonyere ndị na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa nile?’

Ịgwa onwe gị eziokwu mgbe ị na-aza ajụjụ ndị a nwere ike inyere gị aka ịmata otú ị na-ejiru ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Anyị na-agba gị ume ka i mee ihe nile i kwesịrị ime ugbu a ka i nwee ike inweta “ndụ na udo.”—Ndị Rom 8:6; Matiu 7:13, 14; 2 Pita 1:5-11.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

IHE NDỊ E JI AMA ONYE JI IHE IME MMỤỌ KPỌRỌ IHE

◆ Ọ na-ahụ Okwu Chineke n’anya

◆ Ọ na-akpa àgwà ndị na-egosi na o nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ ná ndụ ya

◆ Ọ na-eji obi ya nile na-ekpechi ekpere anya

◆ Ọ na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze ahụ

[Foto dị na peeji nke 5]

Bible ga-enyere gị aka ịmara ihe bụ “uche nke Kraịst”