Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere Ike Ije Ozi n’Ebe E Nwere Mkpa Ka Ukwuu?

Ì Nwere Ike Ije Ozi n’Ebe E Nwere Mkpa Ka Ukwuu?

Ì Nwere Ike Ije Ozi n’Ebe E Nwere Mkpa Ka Ukwuu?

“Ihe na-agaziri anyị mgbe anyị nọ na United States, ma, obi anyị na-agwa anyị na otú e si achụ ego n’ebe ahụ nwere ike ime ka anyị na ụmụ anyị abụọ ghara iji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Mụ na nwunye m bụbu ndị ozi ala ọzọ, anyị chọkwara ịmaliteghachi ibi ndụ na-enye obi ụtọ n’etinyeghị aka n’ịchụ ọtụtụ ihe.”

IHE a Ralph na Pam chọrọ ime mere ka ha kpebie idegara ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ n’afọ 1991 ma gwa ha na ha chọrọ ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Alaka ụlọ ọrụ dị na Mexico gwara ha na a chọrọ nnọọ ndị nkwusa Alaeze ga-abịa ikwusara ndị na-asụ Bekee na Mexico ozi ọma. Alaka ụlọ ọrụ ahụ kwuru na ubi ahụ “achaala maka owuwe ihe ubi.” (Jọn 4:35) Ọ dịghị anya, Ralph na Pam, na ụmụ ha abụọ, ndị dị afọ asatọ na afọ iri na abụọ mgbe ahụ, kweere na ha ga-aga, ha malitekwara ijikere.

Ókèala Buru Ibu

Ralph kwuru, sị: “Tupu anyị akwapụ na United States, ụfọdụ ụmụnna ndị nwere mmasị n’ebe anyị nọ gwara anyị, sị: ‘Nkwapụ a unu chọrọ ịkwapụ ga-enye unu nsogbu!’ ‘Gịnị ka unu ga-eme ma unu daa ọrịa?’ ‘Olee ihe mere unu ji chọọ ịga kwusaa ozi ọma n’ebe a na-asụ Bekee? Ndị na-asụ Bekee ebe ahụ agaghị enwe mmasị n’ozi ọma!’ Ma, anyị ekpebiela ịga. A sị kwuwe, anyị chere ya eche wee kpebie ịga. Ọ dịla anya anyị mewere atụmatụ ịga. Anyị ejighị ụgwọ ga-ewe anyị oge tupu anyị akwụchaa ya, anyị debekwara ego ụfọdụ, anyị ekwurịtakwala nsogbu ndị anyị nwere ike inwe n’ebe ahụ.”

Ihe mbụ Ralph na ezinụlọ ya mere bụ ịga n’alaka ụlọ ọrụ dị na Mexico. Mgbe ha ruru, ụmụnna nọ n’ebe ahụ gosiri ha map mba ahụ dum ma gwa ha sị, “Ebe a dum ka unu ga na-eje ozi!” Ha gara biri na San Miguel de Allende, bụ́ obodo ọtụtụ ndị si mba ọzọ bi, nke dịkwa ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri anọ site n’obodo Mexico City. Mgbe ha nọrọ afọ atọ n’obodo ahụ, e hiwere otu ọgbakọ Bekee nke nwere ndị nkwusa iri na itoolu. Nke a bụ ọgbakọ Bekee mbụ e nwere na Mexico. Ma, a ka nwere nnukwu ọrụ a ga-arụ.

E nwere ihe dị ka otu nde ndị United States bi na Mexico. E nwekwara ọtụtụ ndị Mexico gụrụ akwụkwọ nakwa ụmụ akwụkwọ, bụ́ ndị ma asụ Bekee. Ralph kwuru, sị: “Anyị kpere ekpere ka e zitekwuo ndị ọrụ. Anyị nwere ọnụ ụlọ ọ na-enweghị onye bi ya, bụ́ ebe nwanna ọ bụla bịara ‘iledo ala’ ga-anọ.”—Ọnụ Ọgụ. 13:2.

Ha Hapụrụ Ọtụtụ Ihe Ndị Ga Na-ewekọrọ Oge Ha Iji Nwee Ike Iji Oge Buru Ibu Na-aga Ozi Ọma

N’oge na-adịghị anya, e nwere ọtụtụ ụmụnna ndị bịaranụ, bụ́ ndị chọkwara ịmụba ozi ha. Bill na Kathy, ndị si United States, so ná ndị bịara. Ha ejeela ozi afọ iri abụọ na ise n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ha nọ na-achọ ịmụ asụsụ Spanish, ma ha gbanwere obi ha mgbe ha kwagara n’otu obere obodo a na-akpọ Ajijic, nke dị Ọdọ Mmiri Chapala nso, bụ́ ebe ndị United States larala ezumike nká na-enwekarị mmasị ibi. Bill kwuru, sị, “Mgbe anyị ruru Ajijic, anyị chọwara ndị na-asụ Bekee, bụ́ ndị chọrọ ịmụta eziokwu ahụ.” Mgbe ha nọrọ afọ abụọ n’obodo ahụ, Bill na Kathy nwere ọṅụ ịhụ ka e hiwere otu ọgbakọ n’ebe ahụ, ya bụ, ọgbakọ Bekee nke abụọ e nwere na Mexico.

Ken na Joanne, bụ́ ndị si Canada, chọrọ iwepụ aka n’ịchụ ọtụtụ ihe ka ha wee nwee ike itinyekwu oge n’ọrụ Alaeze Chineke. Ha kwagakwara Mexico. Ken kwuru, sị, “Ọ ga-ewe oge tupu ya amara mmadụ ahụ́ ibi n’ebe a na-enweghị ihe na-esi mmiri ọkụ, ebe ọkụ eletrik na-adịghị, ma ọ bụ n’ebe ọtụtụ ụbọchị ga-agacha onye ahụ aghara ịkpọ mmadụ na fon.” Ma, ikwusa ozi ọma na-enye ọṅụ. Ọ dịghị anya, e mee Ken ohu na-eje ozi, meekwa ya okenye mgbe afọ abụọ gafere. Ná mmalite, o siiri nwa ha nwaanyị bụ́ Britanny ike ịnọ n’obere ọgbakọ Bekee, bụ́ ebe ndị na-eto eto ibe ya dị ole na ole. Ma, mgbe ọ malitere iso na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, o metere ọtụtụ ezigbo ndị enyi na mba ahụ.

Patrick na Roxanne, bụ́ ndị si Texas nke dị na United States, nwere obi ụtọ mgbe ha nụrụ na e nwere mba dị ha nso, bụ́ ebe a na-asụ Bekee, nke chọrọ ndị ozi ala ọzọ. Patrick kwuru, sị: “Mgbe anyị gara n’obodo Monterrey, nke dị n’ebe ugwu Mexico, obi anyị gwara anyị na Jehova chọrọ ka anyị nye aka n’ebe ahụ. N’ime ụbọchị ise, ha rere ụlọ ha dị na Texas ma ‘gafee Masedonia’ ihe atụ. (Ọrụ 16:9) Ọ dịghịrị ha mfe ịkpata ego na Mexico, ma naanị n’ime afọ abụọ, ha nwere ọṅụ ịhụ ka Ndịàmà iri na asaa e nwere ebe ahụ mụbara ghọọ ọgbakọ nwere ndị nkwusa iri anọ.

Jeff na Deb bụ di na nwunye ọzọ hapụrụ ịchụ ọtụtụ ihe iji nwee ike ịmụba ozi ha. Ha rere nnukwu ụlọ ha nke dị na United States ma kwaga n’otu obere ụlọ dị na Cancún, nke bụ́ obodo dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Mexico. Mgbe ha nọ na United States, ha na-enwe mgbakọ n’ụlọ nwere ntụoyi, ebe ha na-aga mgbakọ dịkwa nso. Ugbu a, ha na-eji awa asatọ agaru mgbakọ Bekee kacha dịrị ha nso, ha na-enwekwa mgbakọ ha n’ebe ghere oghe. Ha nwere nnọọ obi ụtọ ịhụ ka e hiwere ọgbakọ nwere ndị nkwusa iri ise na Cancún.

Ụfọdụ ụmụnna ndị bụ́ ndị Mexico malitere inye aka na-ekwusara ndị na-asụ Bekee ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe Rubén na ezinụlọ ya nụrụ na e hiwela ọgbakọ Bekee mbụ na San Miguel de Allende, nụkwa na Mexico dum bụ ókèala ọgbakọ ahụ, ha kpebiri ozugbo inye aka. Nke a pụtara na ha ga-amụ asụsụ Bekee, mụta otú ndị Bekee si eme ihe, dịkwa njikere ịga ebe dị ezigbo anya, ya bụ, ịga ọmụmụ ihe kwa izu ebe dị narị kilomita asatọ. Rubén kwuru, sị: “Anyị nwere ọṅụ izi ndị mba ọzọ nọrọla ọtụtụ afọ na Mexico ozi ọma, bụ́ ndị nke a bụ mbụ ha na-anụ ozi ọma n’asụsụ ha. Anya mmiri na-agba ụfọdụ n’ime ha mgbe ha na-ekele anyị.” Mgbe Rubén na ezinụlọ ya nyechaara ọgbakọ dị na San Miguel de Allende aka, ha jere ozi ịsụ ụzọ na Guanajuato, bụ́ obodo dị n’ebe etiti Mexico, bụ́ ebe ha nyere aka hiwe ọgbakọ Bekee nke nwere ihe karịrị ndị nkwusa iri atọ. Taa, ha nọ n’otu ìgwè na-asụ Bekee nke dị n’obodo Irapuato, bụ́ obodo dị Guanajuato nso.

Ikwusara Ndị Na-esi Ike Nnweta Ozi Ọma

E wezụga ndị si esi bịa, e nwere ọtụtụ ndị Mexico na-asụ Bekee. Ọ na-esikarị ike ikwusara ha ozi ọma Alaeze n’ihi na ha bi n’ógbè ndị ọgaranya, bụ́ ebe ndị na-apụta ma a kụọ aka n’ụzọ bụ ndị odibo. Ọ bụrụkwanụ na ha apụta apụta, ha anaghị achọ ige anyị ntị n’ihi na ha chere na o nweghị ebe ọzọ Ndịàmà Jehova nọ. Ma, ụfọdụ na-ege ntị ma Ndịàmà si mba ọzọ bịakwute ha.

Tụlee ihe banyere Gloria, bụ́ onye bi na Querétaro, bụ́ obodo dị n’ebe etiti Mexico. O kwuru, sị: “Ndịàmà ndị na-asụ asụsụ Spanish abịabuola na nke m ma egeghị m ha ntị. Ma, mgbe ezinụlọ m na ndị enyi m malitere nwewe nsogbu, enwere m nkụda mmụọ wee kpekuo Chineke ekpere, rịọkwa ya ka o nyere m aka. Mgbe obere oge gafere, otu nwaanyị na-asụ Bekee bịara na nke m. Ọ jụrụ ma ò nwere onye na-anụ Bekee n’ụlọ anyị. Achọrọ m ịmata ihe ọ chọrọ ikwu n’ihi na o si mba ọzọ bịa. Agwara m ya na m na-asụ Bekee. Ka ọ na-ekwu ihe o ji bịa, m nọ na-eche sị, ‘Isi ọ̀ dịkwa onye America a mma, olee ihe ọ na-eme n’ebe a?’ Ma, ekpekuola m Chineke ekpere ka o nyere m aka, eleghị anya, ọbịbịa onye a si mba ọzọ bịara bụ otú Chineke si na-aza ekpere m.” Gloria kwere ka a mụwara ya Baịbụl. N’agbanyeghị na ndị ezinụlọ ya megidere ya, o nwere ọganihu ngwa ngwa, e wee mee ya baptizim. Taa, Gloria bụ ọsụ ụzọ oge niile, di ya na nwa ha nwoke na-efekwa Jehova.

Uru Ndị Mụbara Ozi Ha Na-erite

Ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu nwere ihe isi ike nke ya, ma uru a na-erite ya dị ọtụtụ. Ralph, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, sịrị: “Anyị mụụrụ ndị si Britain, China, Jamaica, Sweden, na ọbụna ndị Ghana ọnụ na-eru n’okwu, Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ndị a anyị mụụrụ Baịbụl amalitela ije ozi oge niile. N’ime afọ ndị gara aga, ezinụlọ anyị ahụla ka e hiwere ọgbakọ Bekee asaa. Ụmụ anyị abụọ sokwa anyị rụọ ọrụ ịsụ ụzọ, ha na-ejekwa ozi ugbu a na Betel dị na United States.”

Ka ọ dị ugbu a, e nwere ọgbakọ Bekee iri asatọ na asatọ na ọtụtụ ìgwè na-amụ ihe n’asụsụ Bekee na Mexico. Gịnị mere e ji nwee ọganihu dị otú a? Ndịàmà Jehova ezitụbeghị ọtụtụ ndị na-asụ Bekee nọ na Mexico ozi ọma. Ndị ọzọ na-ege ntị n’ihi na ọ dịghị onye na-egbochi ha ime otú ahụ, dị ka e nwere ike na-egbochi ha mgbe ha nọ n’obodo ha. Ma, ndị ọzọ kwere ka a mụwara ha Baịbụl n’ihi na ha alaala ezumike nká ma nwee ohere ịmụ Baịbụl. Ihe ọzọkwa bụ na ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ Bekee bụ ndị ọsụ ụzọ, nke a mekwara ka ọgbakọ ndị a na-ekpo ọkụ ma na-amụba n’ike n’ike.

Ị Ga-enweta Ọtụtụ Ngọzi

O doro anya na ọtụtụ ndị nọ n’ụwa ga-aṅa ntị n’ozi ọma Alaeze Chineke ma ọ bụrụ na e zie ha ya n’asụsụ ha. N’ihi ya, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na ọtụtụ ụmụnna ndị ji ofufe Jehova kpọrọ ihe, ma ndị agadi ma ụmụaka, ma ndị lụrụla di na nwunye, ma ndị nke na-alụbeghị, dị njikere ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ọ bụ eziokwu na ihe nwere ike isitụrụ ha ike, ma ha na-echefu ihe isi ike ndị ha nwere mgbe ọ bụla ha hụrụ onye nwere ezi obi nke nabatara eziokwu dị na Baịbụl. Ì nwere ike ịhazigharị ihe ndị ị na-eme iji nwee ike ịga n’ókèala ebe e nwere mkpa ka ukwuu ná mba gị ma ọ bụ ná mba ọzọ? * (Luk 14:28-30; 1 Kọr. 16:9) Ọ bụrụ na i mee otú a, ị ga-enweta ọtụtụ ngọzi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 21 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere otú ị ga-esi eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, gụọ akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 111 ruo 112.

[Igbe dị na peeji nke 21]

Ndị Lara Ezumike Nká, Bụ́ Ndị Nwere Obi Ụtọ, Adọta Mmasị Ndị Ọzọ

Beryl si Britain kwaga Canada. Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ bụ manịja n’ọtụtụ ụlọ ọrụ ndị mba ọzọ nwe. Ọ bụkwa aka ochie n’ịgba ịnyịnya, nke mere e ji họpụta ya ka ọ nọchite anya mba Canada n’egwuregwu Olimpik e mere n’afọ 1980. Mgbe ọ lara ezumike nká na Chapala, nke dị na Mexico, ya na di ya na-agakarị eri nri n’otu ụlọ nri dị ebe ha bi. Mgbe ọ hụrụ ndị larala ezumike nká na-asụ Bekee, bụ́ ndị nwekwara obi ụtọ, ọ gwara ha onye ọ bụ ma jụọ ha ihe ha na-eme na Mexico. Ndị na-abịa ebe ahụ eri ihe, bụ́ ndị nwere obi ụtọ na-abụkarị Ndịàmà Jehova. Beryl na di ya kwuru na ọ bụrụ na ịmara Chineke na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ ná ndụ, meekwa ka ndụ onye ahụ nwee isi, na ha chọkwara ịmara Chineke. Mgbe Beryl gara ọmụmụ ihe ọtụtụ ọnwa, o kwere ka a mụwara ya Baịbụl, ọ ghọkwara Onyeàmà. Beryl rụrụ ọrụ ịsụ ụzọ ọtụtụ afọ.

[Igbe dị na peeji nke 22]

“Ọnụnọ Ha Bụụrụ Anyị Ngọzi”

Ụmụnna ndị bi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu na-enwe ekele dị ukwuu maka ndị kwatara n’obodo ha ịbịa nyere ha aka. Otu alaka ụlọ ọrụ dị na Caribbean dere, sị: “Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị mba ọzọ na-eje ozi ebe a alaa, ọ ga-akpa ọgbakọ ndị e nwere n’ebe a aka ọjọọ. Ọnụnọ ha bụụrụ anyị ngọzi.”

Okwu Chineke sịrị na “ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.” (Ọma 68:11) N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na e nwere ọtụtụ ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di na-eje ozi ná mba ọzọ. Nhapụ ha hapụrụ ọtụtụ ihe ndị na-amasị ha iji nwee ike inye aka, bara nnọọ ezigbo uru. Otu alaka ụlọ ọrụ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe kwuru, sị: “E nwere ọtụtụ ụmụnna nwaanyị n’ọtụtụ ọgbakọ anyị nwere ebe a. Ihe karịrị ọkara ndị nkwusa niile e nwere n’ọgbakọ ụfọdụ bụ ụmụnna nwaanyị. Ọtụtụ n’ime ha ka ghọrọ ndị Jehova ọhụrụ, ma ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di, bụ́ ndị ọsụ ụzọ si mba ọzọ, na-enye aka azụ ndị ọhụrụ a. Ụmụnna nwaanyị ndị a si mba ọzọ bụ onyinye pụrụ iche e nyere anyị!”

Olee otú ije ozi ná mba ọzọ dị ụmụnna nwaanyị ndị a? Angelica, bụ́ nwaanyị dị afọ iri atọ na ụma, nke na-alụghị di, onye jere ozi ịsụ ụzọ ruo ọtụtụ afọ, kwuru, sị: “Enwetara m ọtụtụ ihe isi ike. N’otu ebe m jere ozi, m na-eji ụkwụ aga n’okporo ụzọ ndị bụ́ apịtị apịtị, na-ahụkwa ọtụtụ ndị na-ahụsi anya. Ihe ndị a na-emekwa m obi ọjọọ. Ma, inyere ndị m hụrụ n’ozi ọma aka na-eme m obi ụtọ. Ekele ọtụtụ ụmụnna nwaanyị nọ ebe a na-ekele m maka ịbịa nyere ha aka na-emetụ m n’ahụ́. Otu nwanna nwaanyị gwara m na otú m si si ihe ha ka obodo m bịa ná mba ha ịrụ ọrụ ịsụ ụzọ akpaliela ya ịmalite ozi oge niile.”

Sue, bụ́ onye ọsụ ụzọ dị afọ iri ise na ụma, kwuru, sị: “Ị ga-enwe ọtụtụ ihe isi ike, ma ihe isi ike ndị a adịghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ngọzi ndị ị ga-enweta. Ikwusa ozi ọma na-atọ ụtọ! Ebe ọ bụ na mụ na ụmụnna nwaanyị ndị na-eto eto na-anọkarị n’ozi ọma, m na-akọrọ ha ihe m mụtara na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ anyị banyere otú e si edi ihe isi ike. Ha na-agwakarị m na otú m si edi nsogbu ndị na-abịara m ma ka na-eje ozi ịsụ ụzọ kemgbe ọtụtụ afọ n’alụghị di na-enyere ha aka ịgbalị idi ihe isi ike ndị na-abịara ha. Inyere ụmụnna nwaanyị ndị a aka na-enye m obi ụtọ dị ukwuu.”

[Map dị na peeji nke 20]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

MEXICO

Monterrey

Guanajuato

Irapuato

Ajijic

Chapala

Ọdọ Mmiri Chapala

San Miguel de Allende

Querétaro

MEXICO CITY

Cancún

[Foto dị na peeji nke 23]

Ụfọdụ ndị na-enwe ọṅụ site n’ịgbara ndị mba ọzọ, bụ́ ndị na-anụ ozi ọma nke mbụ ya, àmà