Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Job Toro Aha Jehova

Job Toro Aha Jehova

Job Toro Aha Jehova

“Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi.”—JOB 1:21.

1. Ònye ka o yiri ka ọ̀ bụ ya dere akwụkwọ Job, oleekwa mgbe o dere ya?

MOZIS dị ihe dị ka afọ iri anọ mgbe o si n’Ijipt gbapụ gaa biri na Midia mgbe Fero chọrọ igbu ya. (Ọrụ 7:23, 29) Mgbe ọ nọ na Midia, o nwere ike ịbụ na ọ nụrụ banyere ọnwụnwa ndị bịaara Job, bụ́ onye bi n’Ọz, nke dị Midia nso. Ka ọtụtụ afọ gachara, mgbe Mozis na ụmụ Izrel rutere Ọz nso mgbe ha nọ n’ala ịkpa, ka ọ fọrọ obere ka ha banye n’ala nkwa ahụ, o nwere ike ịbụ na Mozis nụrụ ihe ndị mere n’oge Job merela agadi. Akụkọ banyere ndị Juu kwuru na ọ bụ Mozis dere akwụkwọ Job mgbe Job nwụrụla.

2. Olee otú akwụkwọ Job si agba ndị ohu Jehova ume n’oge a?

2 Akwụkwọ Job na-ewusi okwukwe ndị ohu Chineke ike n’oge a. Olee otú o si eme nke a? Akwụkwọ a mere ka anyị mara ihe ndị dị ezigbo mkpa mere n’eluigwe, meekwa ka anyị mara otu okwu dị oké mkpa banyere ma ọ̀ bụ Chineke kwesịrị ịchị eluigwe na ala ma ọ bụ na ọ bụghị ya. Ọ na-emekwa ka anyị ghọtakwuo ihe iguzosi ike n’ezi ihe pụtara, na-enyekwara anyị aka ịghọta ihe mere Jehova ji ekwe mgbe ụfọdụ ka ndị ohu ya na-ata ahụhụ. Akwụkwọ Job mekwara ka anyị mata na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu bụ Onye Iro ukwuu Jehova nwere, bụrụkwa onye iro ụmụ mmadụ. Akwụkwọ a na-egosikwa na ụmụ mmadụ na-ezughị okè dị ka Job, nwere ike ịkwụsi ike na-efe Jehova n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara ha. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị a kọrọ akụkọ ha n’akwụkwọ Job.

Setan Nwara Job

3. Gịnị ka anyị maara banyere Job, oleekwa ihe mere Setan ji nwaa ya ọnwụnwa?

3 Job bụ ọgaranya a na-akwanyere ùgwù, bụrụkwa ezigbo onyeisi ezinụlọ. O doro anya na ọ bụ ezigbo onye ndụmọdụ nakwa onye na-enyere ndị nọ ná mkpa aka. Nke kacha mkpa bụ na Job na-atụ egwu Chineke. Baịbụl kwuru na Job bụ nwoke na-enweghị ‘ihe a ga-eji taa ya ụta, bụrụkwa onye ezi omume, na onye na-atụ egwu Chineke, nakwa onye na-anaghị etinye aka n’ihe ọjọọ.’ Ihe mere Setan bụ́ Ekwensu ji nwaa Job ọnwụnwa bụ n’ihi na Job na-asọpụrụ Chineke, ọ bụghị n’ihi na ọ bara ọgaranya, bụrụkwa onye a ma ama.—Job 1:1; 29:7-16; 31:1.

4. Gịnị bụ iguzosi ike n’ezi ihe?

4 Ná mmalite nke akwụkwọ Job, a kọrọ banyere otu nnọkọ ndị mmụọ ozi na Jehova nwere n’eluigwe. Setan bịakwara nnọkọ ahụ, wee boo Job ebubo. (Gụọ Job 1:6-11.) Ọ bụ ezie na Setan kwutere okwu banyere akụnụba Job, ma, ihe bụ mkpa ya bụ igosi na Job ejighị ezigbo obi na-eguzosi ike n’ezi ihe. Okwu ahụ bụ́ “iguzosi ike n’ezi ihe” pụtara ịkwụwa aka ọtọ, mmadụ ime ihe a na-agaghị eji taa ya ụta, ime ezi omume, na enweghị ntụpọ. Mgbe e kwuru na Baịbụl na mmadụ na-eguzosi ike n’ezi ihe, ọ pụtara na onye ahụ ji obi ya dum na-efe Jehova.

5. Gịnị ka Setan kwuru banyere Job?

5 Setan kwuru na ọ bụ n’ihi ihe Job na-erite n’aka Chineke mere o ji na-efe ya, ọ bụghị n’ihi na ọ na-eguzosi ike n’ezi ihe. Setan sịrị na naanị ihe ga-eme ka Job nọgide na-eme uche Jehova bụ ma ọ bụrụ na Chineke anọgide na-enye ya ihe ndị na-akpa ya ma na-echebe ya. Jehova kwere ka Setan nwaa nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi iji gosi na ihe Setan kwuru bụ ụgha. N’ihi ya, n’ime otu ụbọchị, Job nụrụ na e zurula ụfọdụ anụ ụlọ ya ma gbuo ndị ọzọ, nụkwa na e gbuola ndị ohu ya. Ọ nụkwara na ụmụ ya iri anwụọla. (Job 1:13-19) Ọnwụnwa ahụ Setan nwara Job ò mere ka ọ kwụsị ife Chineke? Akwụkwọ Nsọ kwuru ihe Job mere mgbe ihe ndị a dakwasịrị ya. Ọ sịrị: “Ọ bụ Jehova nyere, ọ bụkwa Jehova weere. Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi.”—Job 1:21.

6. (a) Gịnị mere mgbe e nwere nzukọ ọzọ n’eluigwe? (b) Ònye ka Setan bu n’uche mgbe o kwuru na Job ejighị ezigbo obi na-eguzosi ike n’ezi ihe?

6 E nwekwara nnọkọ ọzọ n’eluigwe. Setan boro Job ebubo ọzọ. Ọ sịrị: “Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́, ọ bụkwa ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya. Iji nwee ihe dị iche, biko, matịa aka gị metụ ọbụna ọkpụkpụ ya na anụ ahụ́ ya, lee ma ọ́ gaghị akọcha gị n’ihu gị.” Ị̀ hụrụ na ọ bụghịzi naanị Job ka Setan na-ebo ebubo ugbu a? Mgbe Ekwensu sịrị, “Ọ bụkwa ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya,” ọ bụghị naanị Job ka ọ na-ekwu na ọ gaghị anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, kama, ọ na-ekwu banyere “mmadụ” ọ bụla na-efe Jehova. Chineke kwere ka Setan tie Job ọrịa ọjọọ. (Job 2:1-8) Ma, ọ bụghị ebe a ka nsogbu Job gwụrụ.

Ihe Anyị Na-amụta n’Aka Job

7. Olee otú nwunye Job na ndị bịara ileta Job si mee ka nsogbu ya ka njọ?

7 Mgbe nsogbu Job malitere, nwunye ya so ya taa ahụhụ. Ọ ghaghị ịbụ na ọnwụ ụmụ ya na akụnụba ha nke lara n’iyi gbawara ya obi. O wutekwara ya ịhụ ka di ya na-arịa ọrịa nke na-egbu ya mgbu. Ọ gwara Job, sị: “Ị̀ ka nọ na-eguzosi ike n’ezi ihe? Kọchaa Chineke nwụọ!” Ndị enyi atọ Job, bụ́ Elifaz, Bildad, na Zofa, sịrị na ha bịara ịkasi ya obi. Ma, kama ịkasi ya obi, ha kwuru ihe ndị na-ezighị ezi ma ghọọ “ndị nkasi obi na-eweta nsogbu.” Dị ka ihe atụ, Bildad kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ ụmụ Job mere mere ha ji nwụọ. Ihe Elifaz kwuru gosiri na Job na-ata ahụhụ n’ihi mmehie ndị o mere. O kwukwara na o nweghị uru ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe baara Chineke. (Job 2:9, 11; 4:8; 8:4; 16:2; 22:2, 3) N’agbanyeghị nsogbu ndị a niile bịaara Job, ọ nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ọ bụ eziokwu na o kwuru ihe na-ezighị ezi mgbe “ọ kpọrọ mkpụrụ obi nke ya onye ezi omume kama ịkpọ Chineke onye ezi omume.” (Job 32:2) N’agbanyeghị nke ahụ, o kwesịrị ntụkwasị obi ruo n’isi.

8. Olee otú Elaịhu si setịpụ ezigbo ihe nlereanya ndị na-enye ndụmọdụ taa kwesịrị iṅomi?

8 Onye ọzọ a kọrọ banyere ya bụ Elaịhu, bụ́ onye bịakwara ileta Job. Elaịhu bu ụzọ gee ntị n’ihe Job na ndị enyi ya atọ nọ na-ekwu. Ọ bụ ezie na ha anọ tọrọ Elaịhu, o mere ihe gosiri na ya ka ha mara ihe. O ji nkwanye ùgwù gwa Job okwu. Elaịhu jara Job mma maka otú o si akwụwa aka ọtọ. Ma, o kwuru na ihe Job nọ nnọọ na-ekwusi ike bụ igosi otú o si bụrụ onye ezi omume. Elaịhu mere ka obi sie Job ike na ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Chineke ga-enweta ụgwọ ọrụ. (Gụọ Job 36:1, 11.) Nke a bụ ezigbo ihe nlereanya nke ndị na-enye ndụmọdụ taa kwesịrị iṅomi. Elaịhu nwere ndidi, gee ntị nke ọma, jaa onye ọ chọrọ inye ndụmọdụ mma n’ebe ọ na-eme nke ọma, wee nye ya ndụmọdụ ga-enyere ya aka.—Job 32:6; 33:32.

9. Olee otú Jehova si nyere Job aka?

9 N’ikpeazụ, Job chọpụtara ihe dị ịtụnanya mgbe Jehova gwara ya okwu. Akwụkwọ Job kwuru, sị: “Jehova wee si n’oké ifufe zaa Job.” Jehova ji obiọma jụọ Job ọtụtụ ajụjụ gbaziri echiche ya. Job ji obi ya dum nabata ndụmọdụ ahụ ma kweta na ya mejọrọ Chineke. Ọ sịrị: “O nwekwaghị ihe m bụ . . . Echegharịwo m n’ájá na ntụ.” Mgbe Jehova gwachara Job okwu, ọ baara ndị enyi atọ Job mba, n’ihi na ha “ekwughị ihe bụ́ eziokwu.” Job kpeere ha ekpere. “Jehova wee gbanwee ọnọdụ Job, nke ọ nọ na ya dị ka onye a dọọrọ n’agha, mgbe o kpere ekpere maka ndị enyi ya. Jehova wee nyeghachi Job ihe niile o nwere, okpukpu abụọ.”—Job 38:1; 40:4; 42:6-10.

Olee Otú Anyị Hụruru Jehova n’Anya?

10. Gịnị mere Jehova elegharaghị Setan anya ma ọ bụkwanụ gbuo ya egbuo?

10 Ọ bụ Jehova kere eluigwe na ụwa, ọ bụkwa ya bụ Ọkaakaa ihe niile e kere eke. Gịnị mere o legharaghị aka Ekwensu mara ya anya? Chineke maara na ileghara Setan anya, ma ọ bụkwanụ igbu ya egbu, agaghị eme ka a mara na aka ahụ Setan mara ya abụghị eziokwu. Ekwensu kwuru na Job, bụ́ ohu Jehova nke kwesịrị ntụkwasị obi, ga-akwụsị ife Jehova ma ihe siere ya ike. Ma, Job akwụsịghị ife Jehova mgbe Setan nwara ya. Setan kwukwara na ọ dịghị onye ga-anọgide na-efe Chineke ma ọ bụrụ na onye ahụ ataa ahụhụ. Job tara ahụhụ, ma ọ nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe. Nwoke a na-ezughị okè, onye kwesịrị ntụkwasị, si otú a gosi na Setan bụ onye ụgha. Oleekwanụ maka ndị ọzọ na-efe Chineke?

11. Olee otú Jizọs si gosi n’ụzọ doro anya na Setan bụ onye ụgha?

11 Ihe a na-ekwu bụ na onye ọ bụla nke na-efe Chineke, nke na-eguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị nsogbu Setan wetaara ya, na-egosi na ebubo onye iro ahụ na-enweghị nchegharị boro ụmụ mmadụ bụ ụgha. Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o gosiri n’ụzọ doro anya na Setan bụ ezigbo onye ụgha. Jizọs bụ mmadụ zuru okè ka nna anyị mbụ, bụ́ Adam. Otú Jizọs si kwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ gosiri nnọọ na Setan bụ onye ụgha nakwa na ebubo ya bụ ụgha.—Mkpu. 12:10.

12. Olee ohere onye ọ bụla na-efe Jehova nwere, oleekwa ihe o kwesịrị ime?

12 Ma, Setan akwụsịbeghị ịnwa ndị na-efe Jehova. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ohere igosi na ya na-eguzosi ike n’ezi ihe, kwesịkwa ime nke a. Anyị kwesịkwara igosi na anyị na-efe Jehova n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, ọ bụghị n’ihi ihe anyị na-erite n’aka ya. Olee otú anyị si ele ihe a anyị kwesịrị ime anya? Mmadụ ịnọgide na-efe Jehova bụ ihe ùgwù. Ọmụma anyị ma na Jehova na-enye anyị ume anyị ji edi ihe ndị na-abịara anyị, nakwa na ọ gaghị ekwe ka a nwaa anyị karịa ka anyị ga-edili, dị ka o meere Job, na-akasi anyị obi.—1 Kọr. 10:13.

Setan Bụ Ajọ Onye Iro na Onye Dapụrụ n’Ezi Ofufe

13. Gịnị ka akwụkwọ Job kọọrọ anyị banyere Setan?

13 Akwụkwọ Nsọ Hibru kọọrọ anyị otú Setan si jiri nkamanya maa Jehova aka, nakwa otú o si na-eduhie ụmụ mmadụ. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a kọwakwuuru anyị otú Setan si na-emegide Jehova. Akwụkwọ Mkpughe gwakwara anyị otú Jehova ga-esi gosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị nakwa otú a ga-esi laa Setan n’iyi kpamkpam. Akwụkwọ Job mekwuru ka anyị ghọta otú Setan si bụrụ onye nnupụisi. Mgbe Setan bịara nzukọ ahụ e nwere n’eluigwe, ihe o bu n’uche bịa abụghị ito Jehova. O bu ihe ọjọọ n’obi bịa. Mgbe Setan boro Job ebubo ma nata ikike ịga nwaa ya, o “wee si n’ihu Jehova pụọ.”—Job 1:12; 2:7.

14. Olee otú Setan si mesoo Job ihe?

14 Akwụkwọ Job si otú a mee ka anyị mata na Setan bụ onye iro ụmụ mmadụ, nakwa na obi tara ya mmiri. E lere Job ule jọrọ oké njọ n’agbata oge e nwere nzukọ n’eluigwe, bụ́ nke e kwuru okwu ya na Job 1:6, nakwa nke ahụ e kwuru okwu ya na Job 2:1. E kwughị oge nke a mere. Otú Job si kwesị ntụkwasị obi mere ka Jehova nwee ike ịgwa Setan, sị: “Ọ [ya bụ, Job] ka na-eguzosi ike n’ezi ihe, ọ bụ ezie na ị na-akpali m imegide ya ka m loda ya n’enweghị ihe o mere.” Ma Setan ekwetaghị na ebubo o boro Job bụ ụgha. Kama ikweta, ọ gwara Jehova ka o kwe ka ya lee Job ule ọzọ siri ike. N’ụzọ dị otú a, Ekwensu nwara Job mgbe ọ bụ ọgaranya, nwaakwa ya mgbe ihe siiri ya ike. O doro anya na Setan anaghị emere ndị ogbenye na ndị ọdachi dakwasịrị ebere. Ọ kpọrọ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe asị. (Job 2:3-5) Ma, otú Job si kwesị ntụkwasị obi gosiri na Setan bụ onye ụgha.

15. Olee otú ndị si n’ezi ofufe dapụ taa si yie Setan?

15 Setan bụ onye mbụ si n’ezi ofufe dapụ. Ndị si n’ezi ofufe dapụ n’oge a na-eme ka Ekwensu. Ha na-eji obi ọjọọ akatọ ndị nọ n’ọgbakọ, ndị okenye, ma ọ bụ Òtù Na-achị Isi. Ụfọdụ ndị si n’ezi ofufe dapụ anaghị achọ ka a na-akpọ aha ahụ bụ́ Jehova. Ha anaghị achọ ịmụ banyere Jehova ma ọ bụkwanụ ife ya ofufe. Dị ka nna ha bụ́ Setan na-eme, ha na-achọ ime ka ndị ọzọ kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe. (Jọn 8:44) Ọ bụ ya mere ndị ohu Jehova ji kwesị ịna-eze ihe niile metụtara ha eze.—2 Jọn 10, 11.

Job Ji Aha Jehova Kpọrọ Ihe

16. Olee otú Job si were Jehova?

16 Job na-akpọ aha Jehova mgbe ọ na-ekwu banyere ya, ọ na-etokwa aha ahụ. Ọbụna mgbe e ziri ya ozi na-agbawa obi na ụmụ ya anwụọla, Job ekwujọghị Chineke. N’agbanyeghị na Job chere na ọ bụ Chineke ka ihe na-eme ya si n’aka, ọ nọgidere na-eto aha Jehova. N’otu n’ime ilu ndị Job tụrụ, ọ sịrị: “Lee! ịtụ egwu Jehova—ọ bụ ya bụ amamihe, mmadụ isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya bụkwa nghọta.”—Job 28:28.

17. Gịnị nyeere Job aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe?

17 Gịnị nyeere Job aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe? O doro anya na ihe nyeere ya aka bụ na ya na Jehova dị n’ezigbo mma tupu nsogbu ya amalite. Ọ bụ ezie na e nweghị ihe gosiri anyị na Job ma na Setan mara Jehova aka, o kpebisiri ike ịnọgide na-efe Jehova. Ọ sịrị: “Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!” (Job 27:5) Olee otú Job na Chineke si malite ịdị ná mma? O doro anya na ihe ọ nụrụ banyere otú Chineke si mesoo Ebreham, Aịzik, na Jekọb, ndị bụ́ ndị ikwu ya, masịrị ya. Job si n’ihe dị iche iche Jehova kere mata ọtụtụ àgwà ya.—Gụọ Job 12:7-9, 13, 16.

18. (a) Olee otú Job si gosi na ya na-asọpụrụ Jehova? (b) Olee otú anyị si eṅomi ezigbo ihe nlereanya Job setịpụrụ?

18 Ihe Job mụtara mere ka ọchịchọ ya bụrụ ime ihe na-amasị Jehova. Ọ na-achụ àjà mgbe niile, a naghị ama ama ndị ezinụlọ ya emee ihe na-adịghị Chineke mma ma ọ bụkwanụ “kọchaa Chineke n’obi ha.” (Job 1:5) Ọbụna mgbe ahụhụ nọ na-echi Job ọnụ n’ala, o kwuru ihe ndị ziri ezi banyere Jehova. (Job 10:12) Nke a bụ nnọọ ezigbo ihe nlereanya! Anyị kwesịkwara ịma ihe banyere Jehova na nzube ya nke ọma. Anyị kwesịrị ịna-emechi ihe ndị ga-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma anya. Ihe ndị a gụnyere inwe ọmụmụ ihe onwe onye, ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, ikpe ekpere, na ikwusa ozi ọma. Anyị ga-emekwa ihe niile anyị nwere ike ime iji mee ka a mara aha Jehova. Dịkwa nnọọ ka Jehova nwere obi ụtọ n’ihi na Job guzosiri ike n’ezi ihe, otú ahụkwa ka obi ya ga-aṅụrị ma ndị ohu ya taa na-eguzosi ike n’ezi ihe. Anyị ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ì Chetara?

• Gịnị mere Setan bụ́ Ekwensu ji lekwasị Job anya?

• Olee ule ndị Job diri, oleekwa otú o si die ha?

• Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe dị ka Job mere?

• Gịnị ka akwụkwọ Job na-akụziri anyị banyere Setan?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 4]

Akụkọ banyere Job na-eme ka anyị mata ihe na-ese ezigbo okwu banyere ma ọ̀ bụ Chineke kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa ma ọ bụ na ọ bụghị ya

[Foto dị na peeji nke 6]

Olee ihe ndị nwere ike ile gị ule ma ị̀ na-eguzosikwa ike n’ezi ihe?