“Mmụọ Nsọ na Nwaanyị Ahụ a Na-alụ Ọhụrụ Na-asị: ‘Bịa!’”
“Mmụọ Nsọ na Nwaanyị Ahụ a Na-alụ Ọhụrụ Na-asị: ‘Bịa!’”
“Mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị: ‘Bịa!’ . . . Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa; onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—MKPU. 22:17.
1, 2. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ihe metụtara Alaeze Chineke anya, gịnịkwa mere anyị ga-eji na-eme otú ahụ?
OLEE otú anyị kwesịrị isi na-ele ihe metụtara Alaeze Chineke anya? Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke,’ na ọ bụrụ na ha emee otú a na Chineke ga-enye ha ihe dị ha mkpa. (Mat. 6:25-33) O ji Alaeze Chineke tụnyere nkume pel nke dị nnọọ oké ọnụ ahịa nke mere na mgbe onye ahịa hụrụ ya o rere “ihe niile o nwere ozugbo wee zụọ ya.” (Mat. 13:45, 46) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ kpọrọ ihe?
2 Dị ka anyị mụrụ n’isiokwu abụọ bu nke a ụzọ, anyị na-egosi na mmụọ Chineke na-eduzi anyị ma ọ bụrụ na anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’atụghị ụjọ ma na-akọwara ha Baịbụl nke ọma. Mmụọ nsọ na-enyekwara anyị aka dị ukwuu ka anyị wee na-agachi ozi ọma anya. Ka anyị hụ otú o si eme nke a.
Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!
3. Olee ụdị mmiri a na-akpọ ụmụ mmadụ òkù ka ha “bịa” ṅụọ?
3 Mmụọ nsọ na-akpọ mmadụ niile òkù. (Gụọ Mkpughe 22:17.) Òkù ahụ bụ ka ha “bịa” ṅụọ mmiri pụrụ iche ka akpịrị wee kwụsị ịkpọ ha nkụ. Mmiri ahụ abụghị mmiri nkịtị. Ọ bụ eziokwu na mmiri nkịtị na-eme ka ndụ na-aga n’ihu n’ụwa, Jizọs bu ụdị mmiri ọzọ n’uche mgbe ọ gwara nwaanyị Sameria okwu n’akụkụ olulu mmiri, sị: “Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri nke m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị, kama mmiri nke m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke mmiri na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi.” (Jọn 4:14) Mmiri ahụ pụrụ iche nke a na-akpọ ụmụ mmadụ òkù ka ha bịa ṅụọ na-enye ndụ ebighị ebi.
4. Olee ihe mere mmiri nke ndụ ji dị ụmụ mmadụ mkpa, oleekwa ihe mmiri ahụ na-anọchite anya ya?
4 Ịṅụ mmiri ahụ malitere ịdị ụmụ mmadụ mkpa mgbe nwoke mbụ, bụ́ Adam, so nwunye ya, bụ́ Iv, nupụrụ onye kere ha, bụ́ Jehova Chineke, isi. (Jen. 2:16, 17; 3:1-6) A chụpụrụ di na nwunye mbụ ahụ n’ebe obibi ha bụ́ paradaịs “ka [Adam] wee ghara isetịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ n’osisi nke ndụ rie wee dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” (Jen. 3:22) Nke a mere ka mmadụ niile si n’aka Adam bute ọnwụ n’ihi na ọ bụ nna anyị. (Rom 5:12) Mmiri ahụ nke na-enye ndụ na-anọchite anya ndokwa niile Chineke mere isi n’aka mmehie na ọnwụ napụta ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi ka o wee nye ha ndụ ebighị ebi nke zuru okè n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs. Ọ bụ àjà mgbapụta Jizọs Kraịst chụrụ mere ka nke a kwe omume.—Mat. 20:28; Jọn 3:16; 1 Jọn 4:9, 10.
5. Ònye gwara anyị ka anyị na-akpọ ụmụ mmadụ ka ha bịa “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu”? Kọwaa.
5 Ònye gwara anyị ka anyị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu”? Baịbụl kpọrọ ndokwa niile Jehova mere maka ndụ ebighị ebi, nke Jizọs ga-eme ka o rute ụmụ mmadụ aka n’ụzọ zuru ezu n’oge ọ ga-achị Ọchịchị Otu Puku Afọ, “osimiri nke mmiri nke ndụ, nke na-egbuke egbuke dị ka kristal.” Jọn hụrụ ka osimiri ahụ si “n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ na-asọpụta.” (Mkpu. 22:1) N’ihi ya, ọ bụ Jehova, bụ́ Onye Na-enye Ndụ, bụ Isi Iyi nke mmiri ahụ na-enye ndụ. (Ọma 36:9) Ọ bụ ya si n’aka “Nwa Atụrụ” ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, na-enye ụmụ mmadụ mmiri ahụ. (Jọn 1:29) Osimiri ihe atụ a bụ ihe Jehova ga-eji mee ka nsogbu niile nnupụisi Adam wetaara ụmụ mmadụ kwụsị. N’ezie, ọ bụ Jehova Chineke gwara anyị ka anyị na-akpọ ụmụ mmadụ ka ha “bịa.”
6. Olee mgbe “osimiri nke mmiri nke ndụ” malitere ịsọ?
6 N’agbanyeghị na “osimiri nke mmiri nke ndụ” ga-asọpụta n’ụzọ zuru ezu n’oge Kraịst ga-achị Ọchịchị Puku Afọ, ọ malitere ịsọ “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” nke bidoro mgbe e mere “Nwa Atụrụ” ahụ eze n’eluigwe n’afọ 1914. (Mkpu. 1:10) Nke a pụtara na ụfọdụ n’ime ndokwa Chineke mere maka ndụ ebighị ebi malitere n’oge ahụ rutewe ụmụ mmadụ aka. Nke a gụnyere Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, bụ́ nke a kpọrọ ihe e dere na ya “mmiri.” (Efe. 5:26) A na-akpọ mmadụ niile òkù ka ha bịa “nara mmiri nke ndụ,” ya bụ, ka ha nụ ma nabata ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ònye ka ọ bụ ọrụ ya ịkpọ ụmụ mmadụ òkù n’ụbọchị Onyenwe anyị?
“Nwaanyị ahụ A Na-alụ Ọhụrụ Na-asị: ‘Bịa!’”
7. “N’ụbọchị Onyenwe anyị,” olee ndị malitere ịkpọ ụmụ mmadụ òkù ka ha “bịa,” ole ndị ka ha malitere ịkpọ òkù?
7 Ọ bụ ndị so na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, ya bụ, Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, bụ ndị mbụ malitere ịkpọ ụmụ mmadụ òkù ka ha “bịa.” Ole ndị ka ha na-akpọ? Nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ anaghị asị onwe ya “bịa” Ndị ọ na-akpọ òkù bụ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ma a lụchaa “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”—Gụọ Mkpughe 16:14, 16.
8. Gịnị na-egosi na Ndị Kraịst e tere mmanụ anọwo kemgbe afọ 1918 na-akpọ ụmụ mmadụ òkù Jehova kpọrọ hanwa?
8 Ndị na-eso ụzọ Kraịst, bụ́ ndị e tere mmanụ, anọwo na-akpọ ndị ọzọ òkù a kemgbe afọ 1918. N’afọ ahụ, isiokwu okwu ihu ọha bụ́ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Pụrụ Ịbụ Ndị Na-agaghị Anwụ Anwụ” mere ka a malite inwe olileanya na ọtụtụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị Mkpughe 22:17. Otu n’ime ihe e kwuru n’isiokwu ahụ bụ: “Òtù ihe ahụ fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi [na-esonyere Onye Kasị Ihe Niile Elu] n’ọkpụkpọ òkù amara ahụ ma na-asị, ‘Bịa.’ A ga-akpọsa ozi nke a gwa ndị ahụ nwere ọchịchọ ezi omume na eziokwu. A ghaghị ime nke a ugbu a.” Òtù nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ka na-akpọ ụmụ mmadụ òkù a taa.
ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs ma a lụchaa agha Amagedọn. E ji otu okwu e kwuru ná mgbakọ Ndị Mmụta Baịbụl nwere na Sida Pọyịnt, Ọhayo, nke dị n’Amerịka, n’afọ 1922 gbaa ndị na-ege ntị ume ka ha ‘kpọsaa Eze ahụ na alaeze ya.’ Ume a a gbara ndị fọdụrụ n’òtù nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ mere ka ha jirikwuo ịnụ ọkụ n’obi na-akpọ ụmụ mmadụ òkù. N’afọ 1929, Ụlọ Nche (Bekee) nke Mach 15 nwere isiokwu bụ́ “Ọkpụkpọ Òkù nke Amara,” bụ́ nke dabeere ná“Onye Ọ bụla nke Nụrụ Ya, Ya Sịkwa: ‘Bịa!’”
9, 10. Olee otú e si agwa ndị na-anụ òkù ahụ ka ha gwa ndị ọzọ ka ha “bịa”?
9 Oleekwanụ maka ndị nke nụrụ òkù a na-akpọ ha ka ha “bịa”? A gwara ha ka ha na-asị ndị ọzọ “bịa.” Dị ka ihe atụ, Ụlọ Nche (Bekee) nke Ọgọst 1, 1932, kwuru na peeji nke 232, sị: “Ka ndị ahụ e tere mmanụ gbaa ndị nile ga-achọ ikere òkè ume ikwusa ozi ọma nke alaeze ahụ. Ọ bụghị iwu na ha aghaghị ịbụ ndị e tere mmanụ nke Onyenwe anyị ka ha wee kwusaa ozi Onyenwe anyị. Ọ bụ ihe oké nkasi obi nye ndịàmà Jehova ịmara ugbu a na e nyere ha ikike iburu mmiri nke ndụ bujere òtù ụmụ mmadụ ndị a pụrụ iduru gabiga Amagedọn, nyekwa ha ndụ ebighị ebi n’elu ala.”
10 Ụlọ Nche (Bekee) nke Ọgọst 15, 1934, peeji nke 249, kwuru banyere ọrụ dịịrị onye nụrụ òkù ahụ, ya bụ, ịsị ndị ọzọ “bịa.” Ọ sịrị: “Ndị so n’òtù Jonadab ahụ aghaghị isonyere ndị ahụ so n’òtù ahụ Jihu sere onyinyo ha, ya bụ, ndị e tere mmanụ, wee kpọsaa ozi nke alaeze ahụ, ọ bụ ezie na ha abụghị ndịàmà e tere mmanụ nke Jehova.” N’afọ 1935, a kọwara ndị bụ́ “oké Mkpughe 7:9-17. Nke a nyekwuru aka dị ukwuu n’ịhụ na a kpọrọ ọtụtụ ndị òkù ahụ Chineke kpọrọ ha. Kemgbe ahụ, oké igwe mmadụ, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha na-arịwanye elu nke mere ka ha ruo ihe karịrị nde mmadụ asaa ugbu a, anọwo na-aza òkù ahụ. Obi ụtọ ha na-enwe mgbe ha nụrụ òkù ahụ na-eme ka ha rara onwe ha nye Chineke, e meekwa ha baptizim. Nke a na-eme ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi soro òtù nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-akpọ ndị ọzọ òkù ka ha ‘bịa nara mmiri nke ndụ n’efu.’
ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị e kwuru okwu ha ná“Mmụọ Nsọ” Na-asị, “Bịa!”
11. Olee otú mmụọ nsọ si nyere ndị kwusara ozi ọma na narị afọ mbụ nke Oge Anyị aka?
11 Mgbe Jizọs nọ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, o meghere akwụkwọ mpịakọta nke Aịzaya onye amụma wee gụọ, sị: “Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma, o zitere m ikwusara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha, na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ, na ịtọhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha lawa, ikwusa afọ Jehova na-anabata ndị mmadụ.” Mgbe Jizọs gụchara ya, o gosiri na ihe ahụ ọ gụrụ mezuru n’ahụ́ ya, wee sị: “Taa ka ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ unu nụrụ ugbu a mezuru.” (Luk 4:17-21) Tupu Jizọs arịgoo n’eluigwe, ọ gwara, ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Mmụọ nsọ nyeere ndị kwusara ozi ọma na narị afọ mbụ aka dị ukwuu.
12. Olee otú mmụọ nsọ Chineke si enyere anyị aka ịkpọ ndị mmadụ òkù n’oge a?
12 Olee otú mmụọ nsọ Chineke si enyere ndị na-akpọ ụmụ mmadụ òkù n’oge anyị a aka? Ọ bụ Jehova na-enye mmụọ nsọ. Ọ na-enye òtù nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ mmụọ nsọ ka ha wee ghọta Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Mmụọ nsọ na-emekwa ka ha nwee ọchịchọ ịkpọ ndị ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs òkù, ha na-akọwakwara ha eziokwu dị iche iche dị n’Akwụkwọ Nsọ. Oleekwanụ maka ndị nke na-aza òkù ahụ wee ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst wee malite ịkpọ ndị ọzọ òkù? Mmụọ nsọ na-enyekwara hanwa aka. Ha na-erube isi n’ihe mmụọ nsọ kwuru ma na-anabata aka ọ na-enyere ha n’ihi na e mere ha baptizim ‘n’aha nke mmụọ nsọ.’ (Mat. 28:19) Chegodị echiche banyere ozi ọma nke ndị ahụ e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ ahụ na-abawanye ụba na-ezi. Ozi ọma ahụ ha na-ezi si na Baịbụl, bụ́ akwụkwọ e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee. Ihe a niile na-egosi na ọ bụ mmụọ nsọ na-enyere ndị na-akpọ òkù ahụ aka. N’ezie, ọ bụ mmụọ nsọ na-enyere anyị aka. Olee otú nke a ga-esi nyere anyị aka ịmata otú oge anyị kwesịrị iji na-akpọ ndị mmadụ òkù ga-aha?
Ha “Na-asị: “Bịa!’”
13. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị: “Bịa!’” pụtara?
13 “Mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ” anaghị asị “bịa” otu ugboro wee kwụsị. Okwu Grik e si sụgharịta okwu a na-egosi ihe a na-eme kwa mgbe kwa mgbe. Ọ bụ ya mere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, ji sị: “Mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị: “Bịa!’” Nke a na-egosi na ndị na-akpọ òkù ahụ Chineke nyere anyị iwu ka anyị na-akpọ anaghị ezu ike. Oleekwanụ maka ndị nke nụrụ òkù ahụ wee za ya? Hanwa na-asịkwa, “Bịa!” Baịbụl kwuru na oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị ohu Jehova, ‘na-ejere ya ozi dị nsọ ehihie na abalị n’ụlọ nsọ ya.’ (Mkpu. 7:9, 15) Olee otú ha si ‘ejere ya ozi ehihie na abalị’? (Gụọ Luk 2:36, 37; Ọrụ 20:31; 2 Tesalonaịka 3:8.) Otú Ana onye amụma nwaanyị merela agadi, na Pọl onyeozi siri fee Chineke na-egosi na ‘ijere Chineke ozi ehihie na abalị’ pụtara iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere ya ozi n’esepụghị aka.
14, 15. Olee otú Daniel si gosi na ife Jehova mgbe niile dị mkpa?
14 Daniel onye amụma gosikwara na ife Jehova n’esepụghị aka dị mkpa. (Gụọ Daniel 6: 4- 10, 16.) Ọ gbanweghị otú o si efe Chineke, ya bụ, ikpeku Chineke ekpere “ugboro atọ n’ụbọchị, dị ka ọ na-eme mgbe niile,” ọbụna ruo otu ọnwa, n’agbanyeghị na ọ ga-eme ka a tụba ya n’olulu ọdụm. Ihe ahụ o mere gosiri nnọọ ndị mmadụ na o nweghị ihe dị ya mkpa karịa ife Jehova mgbe niile.—Mat. 5:16.
15 Mgbe Daniel nọchara otu ụbọchị n’olulu ọdụm ahụ, eze gara ebe ahụ n’ụtụtụ wee jiri olu dara ụda kwuo, sị: “Daniel, ohu nke Chineke dị ndụ, Chineke gị, onye ị na-efe mgbe niile, ọ̀ napụtaliri gị n’ọnụ ọdụm?” Daniel zara ya ozugbo, sị: “Eze, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Chineke m zitere mmụọ ozi ya wee mechie ọnụ ọdụm ndị a, ha adọgbughị m n’ihi na, n’anya ya, aka m dị ọcha; n’anya gị kwa, eze, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere.” Jehova gọziri Daniel n’ihi na ọ na-efe ya “mgbe niile.”—Dan. 6:19-22.
16. Olee ajụjụ ndị anyị ga-ajụ onwe anyị banyere otú anyị si aga ozi ọma ma anyị cheta otú Daniel si fee Chineke mgbe niile?
16 Daniel họọrọ ịnwụ kama ịkwụsị ife Jehova. Oleekwanụ maka anyị? Olee ihe ndị anyị na-ahapụ ma ọ bụkwanụ ihe ndị anyị dị njikere ịhapụ ka anyị wee na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke mgbe niile? Anyị ekwesịghị ịgbachi nkịtị ọnwa agwụ n’agwaghị ndị ọzọ banyere Jehova. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe anyị omume, anyị kwesịrị ịgba mbọ na-aga ozi ọma kwa izu. Ọ bụrụgodị na ọrịa na-arịasi anyị ike, ma anyị enwee ike izi ozi ọma naanị nkeji iri na ise n’ọnwa, anyị kwesịrị inye ya onye anyị na-enye akụkọ ozi n’ọgbakọ anyị. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị nwere mmasị isoro mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime iji na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke mgbe niile.
17. Olee ohere ndị anyị kwesịrị iji na-akpọ ụmụ mmadụ òkù ahụ Jehova kpọrọ ha?
17 Kama ichere ruo naanị mgbe anyị nọ n’ozi ọma, anyị kwesịrị iji ohere ọ bụla dapụtara na-akpọ ụmụ mmadụ òkù Jehova kpọrọ ha. Ọ bụụrụ anyị nnukwu ihe ùgwù ma anyị na-akpọ ndị akpịrị na-akpọ nkụ òkù ka ha ‘bịa nara mmiri nke ndụ n’efu’ mgbe anyị gara ahịa, mgbe anyị na-eme njem, mgbe anyị nọ ezumike, mgbe anyị nọ ọrụ, ma ọ bụkwanụ n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị amachibido ozi anyị iwu, anyị ga-eji akọ na-ezi ya, ikekwe, anyị agaghị na-abanyecha n’ụlọ niile dị n’ókèala anyị gara ozi ọma n’otu ụbọchị, anyị nwekwara ike tinyekwuo uchu n’ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi.
Na-asị, “Bịa!”
18, 19. Olee otú i si egosi na i ji ihe ùgwù nke ịbụ onye ya na Chineke na-arụkọ ọrụ kpọrọ ihe?
18 Kemgbe ihe karịrị narị afọ itoolu, mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ anọwo na-asị ndị akpịrị mmiri nke ndụ na-akpọ nkụ “bịa.” Ị̀ nụla òkù ahụ nke na-emetụ n’ahụ́ nke ha na-akpọ ụmụ mmadụ? Ọ bụrụ na ị nụla ya, a na-agba gị ume ka ị kpọọ ndị ọzọ.
19 Anyị amaghị mgbe Jehova ga-akwụsị ịkpọ ụmụ mmadụ òkù a o ji ịhụnanya na-akpọ ha, ma, ọ bụrụ na anyị azaa òkù a site n’ịsị ndị ọzọ “bịa,” anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ. (1 Kọr. 3:6, 9) Nke a bụ nnukwu ihe ùgwù. Ka anyị gosi na anyị ji ihe ùgwù a kpọrọ ihe nakwa na anyị “na-achụrụ Chineke àjà otuto mgbe niile” site n’izi ozi ọma mgbe niile. (Hib. 13:15) Ka anyị, bụ́ ndị nwere olileanya iketa ụwa, na òtù nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị “bịa.” Anyị na-ekpe ekpere ka ọtụtụ ndị bịa “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”
Gịnị Ka Ị Mụtara?
• Olee ndị a kpọrọ òkù ka ha “bịa”?
• Olee ihe mere a ga-eji kwuo na ọ bụ Jehova ziri anyị ka anyị na-akpọ ụmụ mmadụ ka ha “bịa”?
• Olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka ịkpọ ụmụ mmadụ òkù ka ha “bịa”?
• Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agba mbọ na-ezi ozi ọma mgbe niile?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Chaatị/Foto dị na peeji nke 16]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Na-asị, “Bịa”
Afọ 1914
Puku ndị nkwusa ise na otu narị
Afọ 1918
Ọtụtụ ndị ga-enweta ndụ n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs
Afọ 1922
“Kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya”
Afọ 1932
A gwara ndị na-abụghị ndị e tere mmanụ ka ha na-asị ndị ọzọ “bịa.”
Afọ 1935
A mata ndị bụ “oké ìgwè mmadụ” ahụ
Afọ 2009
Nde ndị nkwusa asaa, narị puku atọ na iri na atọ na otu narị na iri asaa na atọ
Afọ 1929
Ndị ahụ fọdụrụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, na-asị, “Bịa!”
Afọ 1934
A gwa ndị òtù Jonadab ka ha ziwe ozi ọma