Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-ebute Ụzọ n’Ịsọpụrụ Ụmụnna Gị?

Ị̀ Na-ebute Ụzọ n’Ịsọpụrụ Ụmụnna Gị?

Ị̀ Na-ebute Ụzọ n’Ịsọpụrụ Ụmụnna Gị?

“N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.”—ROM 12:10.

1, 2. (a) Olee ndụmọdụ Pọl nyere anyị n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

N’AKWỤKWỌ Pọl onyeozi degaara ndị Rom, o kwusiri okwu ike na anyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị n’anya. O chetaara anyị na ịhụnanya anyị ekwesịghị “ịbụ nke ihu abụọ.” O kwukwara banyere ‘ịhụnanya ụmụnna’ ma kwuo na e kwesịrị iji “obi ọmịiko” na-egosi ya.—Rom 12:9, 10a.

2 Inwe ịhụnanya ụmụnna karịrị mmadụ inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. A na-egosipụta ụdị ịhụnanya a n’omume. A sị kwuwe, o nweghị otú ndị ọzọ ga-esi mara na anyị hụrụ ha n’anya ma ọ bụrụ na anyị anaghị egosi ya n’omume. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuokwa, sị: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Rom 12:10b) Olee ihe ndị ọ ga-abụ anyị na-eme ha egosi na anyị na-asọpụrụ ndị ọzọ? Olee ihe mere anyị ji kwesị ibute ụzọ n’inye ụmụnna anyị nsọpụrụ? Olee otú anyị nwere ike isi na-eme nke a?

Nkwanye Ùgwù na Nsọpụrụ

3. Gịnị ka “nsọpụrụ” pụtara n’asụsụ Hibru na Grik?

3 Okwu Hibru e si sụgharịta nsọpụrụ pụtara “ịnyị arọ.” A na-ewere na onye a na-enye nsọpụrụ bụ onye ukwu ma ọ bụ onye a ma ama. N’Akwụkwọ Nsọ, a sụgharịrị okwu Hibru ahụ ọtụtụ ebe ka ọ bụrụ “otuto,” bụ́ nke na-egosikwa na e ji onye ahụ a na-enye nsọpụrụ kpọrọ ihe. (Jen. 45:13) Na Baịbụl, okwu Grik e si sụgharịta ‘ịsọpụrụ mmadụ’ pụtakwara ịkwanyere mmadụ ùgwù, ma ọ bụkwanụ iji mmadụ kpọrọ ihe. (Luk 14:10) Nke a pụtara na ndị anyị na-asọpụrụ bụ ndị anyị ji kpọrọ ihe.

4, 5. Olee otú ịsọpụrụ ndị ọzọ na ịkwanyere ha ùgwù si yie? Nye ihe atụ.

4 Olee ihe ndị ọ ga-abụ anyị na-eme ha egosi na anyị na-asọpụrụ ndị ọzọ? Anyị na-amalite site n’ịkwanyere ha ùgwù. Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ nwere ike ikwu banyere “nsọpụrụ” mgbe ọ chọrọ ikwu banyere “nkwanye ùgwù” n’ihi na ha abụọ yiri. Anyị na-akwanyere onye anyị na-asọpụrụ ùgwù. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, nkwanye ùgwù pụtara otú anyị si ele ụmụnna anyị anya ebe nsọpụrụ pụtara otú anyị si emeso ha ihe.

5 Onye Kraịst agaghị enwe ike ịsọpụrụ ụmụnna ya ma ọ bụrụ na ọ naghị akwanyere ha ùgwù. (3 Jọn 9, 10) Otú ahụ osisi na-eto nke ọma ma na-adịte ndụ aka ma ọ bụrụ na a kụrụ ya n’ala dị mma ka anyị ga-anọgide na-asọpụrụ mmadụ ma ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ya ùgwù. Ọ bụrụ na ihe anyị ji asọpụrụ mmadụ abụghị n’ihi na anyị na-akwanyere ya ùgwù, ọ gaghị adị anya anyị akwụsị ịsọpụrụ ya. Ọ bụ ya mere na tupu Pọl agwa anyị ka anyị na-asọpụrụ ndị ọzọ, o kwuru, sị: “Ka ịhụnanya unu ghara ịbụ nke ihu abụọ.”—Rom 12:9; gụọ 1 Pita 1:22.

Na-asọpụrụ Ndị E Kere “n’Oyiyi Chineke”

6, 7. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù?

6 Ebe ọ bụ na ndị anyị na-akwanyere ùgwù ka anyị na-asọpụrụ, anyị ekwesịghị ichefu ihe dị iche iche Akwụkwọ Nsọ kwuru mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere ụmụnna anyị niile ùgwù. Ya mere, ka anyị tụlee abụọ n’ime ha.

7 Ụmụ mmadụ adịghị ka ihe ndị ọzọ e kere eke dị n’ụwa, e kere ha “n’oyiyi Chineke.” (Jems 3:9) Ọ bụ ya mere anyị ji nwee àgwà Chineke, ndị dị ka ịhụnanya, amamihe, na ikpe ziri ezi. E nwekwara ihe ọzọ Onye kere anyị nyere anyị. Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Jehova . . . , gị onye a na-akọ akụkọ ịdị ebube ya n’eluigwe! . . . “I mekwara ya ka ọ dị ala karịa ndị dị ka chi, i kpuwere ya ebube na ịma mma [ya bụ, “nsọpụrụ,” Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik] dị ka okpueze.” (Ọma 8:1, 4, 5; 104:1) * Chineke kpuwere ụmụ mmadụ ùgwù, ebube, na nsọpụrụ dị ka okpueze, o jikwa ihe ndị a chọọ ha mma. Ya mere, mgbe anyị kwanyeere mmadụ ùgwù, e nwere ike ikwu na anyị na-erubere Onye nkwanye ùgwù si n’aka ya, bụ́ Jehova, isi. Ebe ọ bụ na a gwala anyị ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịkwanyere mmadụ niile ùgwù, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịkwanyere ụmụnna anyị ùgwù karị?—Jọn 3:16; Gal. 6:10.

Anyị Si n’Otu Ezinụlọ

8, 9. Olee ihe Pọl kwuru nke mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere ụmụnna anyị ùgwù?

8 Pọl kwuru ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Tupu ya agwa anyị ka anyị na-asọpụrụ ndị ọzọ, o kwuru, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ.” Okwu Grik e si sụgharịta “obi ọmịiko” na-egosi otú ezinụlọ ịhụnanya dị si emekọ ihe ọnụ ma na-akwado ibe ha. Ya mere, mgbe Pọl kwuru okwu banyere “obi ọmịiko,” o kwusiri okwu ike na ụmụnna nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-emekọrịta ihe ọnụ otú ahụ ndị nọ n’ezinụlọ ịhụnanya dị si emekọrịta ihe ọnụ. (Rom 12:5) Chetakwa na ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka Pọl degaara akwụkwọ ozi ahụ. Jehova ghọkwara Nna ha niile. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ha si n’otu ezinụlọ dị n’otu. Ọ bụ ya mere Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị nọ n’ụwa n’oge ahụ Pọl nọ n’ụwa, ji kwesị ịkwanyere ibe ha ùgwù. Taa, ndị e tere mmanụ kwesịkwara ime otú ahụ.

9 Oleekwanụ banyere ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’? (Jọn 10:16) N’agbanyeghị na ha aghọbeghị ụmụ Chineke, ha na-akpọ ibe ha nwanna nwoke na nwanna nwaanyị n’ihi na ha si n’otu ezinụlọ Ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ. (1 Pita 2:17; 5:9) N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ ghọtara ihe mere ha ji akpọ ibe ha “nwanna nwoke” ma ọ bụ “nwanna nwaanyị,” ha kwesịkwara ịkwanyere ụmụnna ha ùgwù.—Gụọ 1 Pita 3:8.

Gịnị Mere Ịkwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù Ji Dị Ezigbo Mkpa?

10, 11. Gịnị mere ịsọpụrụ ndị ọzọ na ịkwanyere ha ùgwù ji dị ezigbo mkpa?

10 Gịnị mere ịsọpụrụ ndị ọzọ na ịkwanyere ha ùgwù ji dị ezigbo mkpa? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na anyị na-asọpụrụ ụmụnna anyị, anyị na-eme ka obi dị ha mma, na-emekwa ka ọgbakọ dịrị n’otu.

11 Anyị ma na ihe kacha enye anyị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst obi ụtọ bụ anyị na Jehova ịdị ná mma, mmụọ nsọ ya ana-akwadokwa anyị. (Ọma 36:7; Jọn 14:26) Obi na-adịkwa anyị ụtọ ma ọ bụrụ na ụmụnna anyị ji anyị kpọrọ ihe. (Ilu 25:11) Anyị na-enwekwa obi ụtọ ma ọ bụrụ na mmadụ agwa anyị okwu ma ọ bụ meere anyị ihe gosiri na ọ na-akwanyere anyị ùgwù. Nke a na-eme ka anyị jirikwuo ọṅụ na-eje ije n’ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ, meekwa ka anyị kpebisie ike ije ije na ya. Ọ ga-abụ na ọ dịtụla gị otú a.

12. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi mee ka ndị nọ n’ọgbakọ dịrị n’udo, hụkwa ibe ha n’anya?

12 Ebe ọ bụ na Jehova ma na ọ dị anyị n’ọbara ịchọ ka a na-akwanyere anyị ùgwù, ọ gwara anyị n’Okwu ya ka ‘ọ na-adị anyị ọkụ n’obi ịkwanyere ibe anyị ùgwù.’ (Rom 12:10, nsụgharị bụ́ Today’s English Version; gụọ Matiu 7:12.) Ọ bụrụ na Ndị Kraịst emee ihe a Chineke kwuru, ndị nọ n’ọgbakọ ga-adị n’udo, hụkwa ibe ha n’anya. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya sị, ‘Olee mgbe ikpeazụ m gwara nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị okwu ma ọ bụ mee ihe gosiri na m na-akwanyere ya ùgwù?’—Rom 13:8.

Ihe Anyị Niile Kwesịrị Ime

13. (a) Ònye kwesịrị ibute ụzọ n’ịsọpụrụ ndị ọzọ? (b) Gịnị ka ihe ahụ Pọl kwuru ná Ndị Rom 1:7 na-egosi?

13 Ònye kwesịrị ibute ụzọ n’ịsọpụrụ ndị ọzọ? N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, o kwuru na ndị okenye ọgbakọ bụ “ndị na-edu ndú n’etiti unu.” (Hib. 13:17) Ọ bụ eziokwu na ndị okenye na-ebute ụzọ n’ọtụtụ ihe a na-eme n’ọgbakọ, ma, ebe ọ bụ ha na-azụ atụrụ Chineke, ha kwesịkwara ibute ụzọ n’ịsọpụrụ ụmụnna ha, tinyere ndị okenye ibe ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị okenye nọkọrọ iji tụlee otú ihe si aga n’ọgbakọ, ha kwesịrị ịsọpụrụ ibe ha site n’ige ntị nke ọma mgbe ibe ha na-ekwu okwu. Ha kwesịkwara ịsọpụrụ ibe ha site n’ichebara ihe ndị okenye niile bịara nnọkọ ahụ kwuru echiche tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme. (Ọrụ 15:6-15) Ma, anyị kwesịrị icheta na ọ bụghị naanị ndị okenye ka Pọl degaara akwụkwọ ozi ahụ, kama, ọ bụ ndị niile nọ n’ọgbakọ dị na Rom. (Rom 1:7) Ya mere, anyị niile kwesịrị ime ihe o kwuru, ya bụ, ibute ụzọ n’ịsọpụrụ ndị ọzọ.

14. (a) Nye ihe atụ nke na-egosi ihe dị iche n’ịsọpụrụ ndị ọzọ na ibute ụzọ n’ịsọpụrụ ha. (b) Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ onwe anyị?

14 Ka anyị tụlee ihe ọzọ Pọl gwara anyị ka anyị mee. Ihe Pọl gwara ụmụnna ya nọ na Rom abụghị naanị ka ha na-asọpụrụ ndị ọzọ, kama, ọ gwara ha ka ha na-ebute ụzọ n’ịsọpụrụ ha. Olee ihe dị iche n’ịsọpụrụ ndị ọzọ na ibute ụzọ n’ịsọpụrụ ndị ọzọ? Were dị ka ihe atụ, è nwere onye nkụzi ga-agwa ụmụ akwụkwọ ma ka e si agụ ihe ka ha mụwa otú e si agụ ihe? Mba. Ebe ọ bụ na ha amarala otú e si agụ ihe, ihe onye nkụzi ahụ ga-eme bụ inyere ha aka ka ha mara otú e si agụ ihe nke ọma. Otú ahụ ka ọ dị ezigbo Ndị Kraịst, ihe e ji mara anyị bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe ibe anyị nọ, bụ́ ihe na-enyere anyị aka ịsọpụrụ ndị ọzọ. (Jọn 13:35) Ma, anyị ga-enwekwu ọganihu site n’ibute ụzọ n’ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù otú ahụ ụmụ akwụkwọ ndị ma agụ ihe si enwekwu ọganihu site n’ime ka otú ha si agụ ihe ka mma. (1 Tesa. 4:9, 10) A gwara onye ọ bụla n’ime anyị ka o bute ụzọ n’ịsọpụrụ ndị ọzọ. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘Àna m ebute ụzọ n’ịsọpụrụ ndị nọ n’ọgbakọ anyị?’

Na-asọpụrụ “Ndị Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ha”

15, 16. (a) Olee ndị kwesịrị iso ná ndị anyị na-asọpụrụ, ọ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee ihe nwere ike igosi ma nsọpụrụ anyị na-enye ụmụnna anyị niile ò si anyị n’obi?

15 Olee ndị kwesịrị iso ná ndị anyị ga-asọpụrụ n’ọgbakọ anyị? Okwu Chineke sịrị: “Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe, ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.” (Ilu 19:17) Olee otú ihe e kwuru n’amaokwu a ga-esi nyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ka anyị na-agba mbọ ibute ụzọ n’ịsọpụrụ ndị ọzọ?

16 Ị manụ na ọtụtụ ndị na-ejisi ike asọpụrụ ndị ka ha n’ọkwá, ma, ha anaghị akwanyere ndị ha lere anya na ha ka ùgwù. Ma, Jehova anaghị eme otú ahụ. Ọ sịrị: “Ndị na-asọpụrụ m ka m ga-akwanyere ùgwù.” (1 Sam. 2:30; Ọma 113:5-7) Jehova na-akwanyere ndị niile na-ejere ya ozi ma na-asọpụrụ ya ùgwù. Ọ naghị eleghara “ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha” anya. (Gụọ Aịzaya 57:15; 2 Ihe 16:9) Anyị kwesịrị iṅomi Jehova. Ya mere, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmara ma ànyị sikwa n’obi anyị asọpụrụ ndị ọzọ, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Olee otú m si emeso ndị na-enweghị ihe ùgwù n’ọgbakọ ihe?’ (Jọn 13:14, 15) Ihe anyị zara onwe anyị n’ajụjụ a ga-egosi anyị ma nsọpụrụ anyị na-enye ndị ọzọ ò si anyị n’obi.—Gụọ Ndị Filipaị 2:3, 4.

Ịsọpụrụ Ndị Ọzọ Site n’Iwepụta Oge Nyere Ha Aka

17. Olee otu n’ime ụzọ bụ́ isi anyị kwesịrị isi bute ụzọ n’ịsọpụrụ ndị ọzọ, oleekwa ihe mere o ji dị otú ahụ?

17 Olee otu n’ime ụzọ bụ́ isi anyị nwere ike isi bute ụzọ n’ịsọpụrụ ndị niile nọ n’ọgbakọ anyị? Ọ bụ iwepụta oge nyere ha aka. Gịnị mere o ji bụrụ ya? Ọ bụ n’ihi na anyị bụ́ Ndị Kraịst na-ejikarị ọrụ n’aka, ọtụtụ ọrụ dị mkpa anyị na-arụ n’ọgbakọ anaghịkwa enye anyị ohere. Ọ bụ ihe ndị a mere na anyị anaghị eji oge egwu egwu. Anyị ekwesịghịkwa ịchọ ka ụmụnna anyị jiri nnukwu oge n’oge ha na-enyere anyị aka. N’otu aka ahụ, ọ na-adịkwa anyị mma ma ọ bụrụ na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aghọta na ha ekwesịghị ịchọ ka anyị jiri nnukwu oge na-enyere ha aka.

18. Dị ka ihe osise dị na peeji nke iri na asatọ gosiri, olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị chọrọ iwepụta oge nyere ụmụnna anyị aka?

18 Ma, anyị makwa na ọ bụrụ na anyị (karịchaa ndị okenye ọgbakọ) agbalịa hapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme ka anyị wee nwee ike iwepụta oge nyere ụmụnna anyị aka, anyị na-egosi na anyị na-akwanyere ha ùgwù. Olee otú o si bụrụ eziokwu? E nwere ike ikwu na ihe anyị na-agwa nwanna anyị ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ihe ndị anyị na-eme ka anyị wee nyere ya aka bụ́, ‘Ị dị m oké mkpa nke mere na ọ kara m mma iwepụta oge ka mụ na gị nọrọ karịa ịga na-eme ihe m na-eme.’ (Mak 6:30-34) Ọ bụrụkwanụ na ọ na-esiri anyị ike ịhapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme ka anyị wee nwee ike inyere nwanna anyị aka, anyị nwere ike ime ka o chewe na anyị ejighị ya kpọrọ ihe. O doro anya na e nwere mgbe ụfọdụ nsogbu nwere ike ịdapụta nke anyị na-enweghị ike ịhapụ mewe ihe ọzọ. Ma, ihe na-egosi otú anyị na-akwanyeruru ụmụnna anyị ùgwù bụ ma ànyị dị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme iji nyere ha aka, ma ọ bụkwanụ na ọ na-esiri anyị ike ime otú ahụ.—1 Kọr. 10:24.

Kpebisie Ike Ibute Ụzọ

19. E wezụga iwepụta oge anyị nyere ụmụnna anyị aka, olee ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị na-asọpụrụ ha?

19 E nwere ụzọ ndị ọzọ dị mkpa anyị nwere ike isi na-asọpụrụ ụmụnna anyị. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-ewepụta oge anyị iji nyere ha aka, anyị kwesịkwara ige ha ntị. Jehova na-eme nke a. Ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ, ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.” (Ọma 34:15) Anyị na-eṅomi Jehova ma ọ bụrụ na anyị dị njikere ige ụmụnna anyị ntị, karịchaa ndị nke bịakwutere anyị ka anyị nyere ha aka. Anyị na-asọpụrụ ha ma ọ bụrụ na anyị emee nke a.

20. Olee ihe a gwara anyị banyere ịsọpụrụ ndị ọzọ nke anyị na-ekwesịghị ichefu?

20 Dị ka anyị tụlerela, anyị ekwesịghị ichefu ihe mere anyị ji kwesị iji obi anyị dum na-asọpụrụ ụmụnna anyị. Ihe ọzọ bụ na anyị kwesịrị ịchọ ụzọ ndị anyị ga-esi na-ebute ụzọ n’ịsọpụrụ mmadụ niile, tinyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, ịhụnanya ga-adịkwu n’ọgbakọ anyị, mmadụ niile ga-adịkwukwa n’otu. Ya mere, ka anyị niile nọgide na-ebute ụzọ n’ịsọpụrụ ibe anyị, ọ bụghị naanị ịsọpụrụ ha. Ì kpebisiri ike ime nke a?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ihe ndị ahụ Devid kwuru n’Abụ Ọma nke asatọ bụkwa amụma banyere nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jizọs Kraịst.—Hib. 2:6-9.

Ì Chetara?

• Olee otú nsọpụrụ na nkwanye ùgwù si yie?

• Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị ịsọpụrụ ụmụnna anyị?

• Gịnị mere ịsọpụrụ ndị ọzọ ji dị mkpa?

• Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi na-asọpụrụ ụmụnna anyị?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Olee otú anyị nwere ike isi na-asọpụrụ ụmụnna anyị?