Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmụọ Nsọ Na-enye Anyị Ike Idi Ọnwụnwa, Na-emekwa Ka Anyị Ghara Ịda Mbà

Mmụọ Nsọ Na-enye Anyị Ike Idi Ọnwụnwa, Na-emekwa Ka Anyị Ghara Ịda Mbà

Mmụọ Nsọ Na-enye Anyị Ike Idi Ọnwụnwa, Na-emekwa Ka Anyị Ghara Ịda Mbà

“Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu.”—ỌRỤ 1:8.

1, 2. Olee ihe Jizọs kwere nkwa inye ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa ihe mere o ji dị ha mkpa?

JIZỌS ma na ndị na-eso ụzọ ya agaghị edebeli ihe niile o nyere ha n’iwu ma ọ bụrụ na e nyereghị ha aka. O doro anya na e kwesịrị inye ha ike karịrị ike mmadụ n’ihi otú ebe ha ga-ekwusa ozi ọma hà, otú ndị na-emegide ha si dị ike, nakwa n’ihi na ha adịghị ike. N’ihi ya, tupu Jizọs arịgoo eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”—Ọrụ 1:8.

2 Jizọs malitere imezu nkwa a o kwere ndị na-eso ụzọ ya na Pentikọst nke afọ 33 O.A. bụ́ mgbe mmụọ nsọ nyere ụmụazụ Jizọs Kraịst ike iji ozi ọma gazuo Jeruselem. Ha nọgidere na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na a na-emegide ha. (Ọrụ. 4:20) Ike a Chineke na-enye dị ụmụazụ Jizọs, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, nakwa anyịnwa, oké mkpa “ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.”—Mat. 28:20.

3. (a) Kwuo otú ike si dị iche na mmụọ nsọ. (b) Olee ihe ike Jehova na-enye anyị nwere ike ime ka anyị mee?

3 Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ha ‘ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị ha.’ Okwu bụ́ “ike” na “mmụọ” apụtaghị otu ihe. Mmụọ Chineke, ya bụ, ike ya nọ n’ọrụ, bụ ike o ji arụ ọrụ n’ime mmadụ ma ọ bụ n’ihe dị iche iche iji mezuo uche ya. Ma, e nwere ike ikwu na ike pụtara “inwe ike ime ihe ma ọ bụ ịrụpụta ihe.” Mmadụ ma ọ bụ ihe ọzọ nwere ike inwe ike ma ọ gaghị eji ya arụ ọrụ ruo mgbe e nwere ihe ọ ga-eji ya eme. N’ihi ya, e nwere ike iji mmụọ nsọ tụnyere ike ọkụ eletrik nke e ji eme ka batrị nwụrụ anwụ maliteghachi ịrụ ọrụ, ma, e nwere ike iji ike tụnyere ike ahụ si n’ọkụ eletrik e tinyere na batrị ahụ. Ike Jehova ji mmụọ nsọ na-enye ndị ohu ya na-eme ka onye ọ bụla n’ime anyị na-emezu nkwa o kwere Chineke. Ọ na-emekwa ka anyị ghara ime ihe ọjọọ nke nwere ike ịgụ anụ ahụ́ anyị agụụ.—Gụọ Maịka 3:8; Ndị Kọlọsi 1:29.

4. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

4 Olee ihe na-egosi na mmụọ nsọ enyela anyị ike? Olee otú mmụọ nsọ nwere ike isi mee ka anyị na-eme ihe? Ka anyị na-agba mbọ iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi, e nwere ọtụtụ ihe na-eme ka o siere anyị ike ijere ya ozi otú anyị chọrọ. O nwere ike ịbụ Setan, ụwa ya, ma ọ bụkwanụ ezughị okè anyị na-akpata ha. Anyị kwesịrị imeri ihe isi ike ndị ahụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-abụ ezigbo Ndị Kraịst, chọọkwa ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma anyị ana-ejechikwa ozi ọma anya. Ka anyị tụlee otú mmụọ nsọ si eme ka anyị ghara ịdaba n’ọnwụnwa nakwa otú o si eme ka anyị ghara ịda mbà.

Ọ Na-enyere Anyị Aka Imeri Ọnwụnwa

5. Olee otú ekpere ga-esi mee ka anyị nweta ike?

5 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa, kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Mat. 6:13) Jehova ga-enyere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi aka ma ha rịọ ya ụdị arịrịọ a. N’oge ọzọ, Jizọs kwuru na ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’ (Luk 11:13) Obi dị anyị nnọọ ụtọ na Jehova kwere nkwa na ya ga-enye anyị mmụọ nsọ, bụ́ ihe na-enyere anyị aka ime ihe ziri ezi. Ma, nke a apụtaghị na Jehova agaghị ekwe ka a nwaa anyị ọnwụnwa. (1 Kọr. 10:13) Ma, ọ bụ mgbe ọnwụnwa bịaara anyị ka anyị kwesịrị ikpesikwu ekpere ike.—Mat. 26:42.

6. Olee ebe Jizọs si nweta ihe ọ zara Setan mgbe ọ na-anwa ya?

6 Jizọs kwuru ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ na-aza Ekwensu okwu oge ọ na-anwa ya ọnwụnwa. Ọ bụ Okwu Chineke ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ gwara Setan, sị: “E dere, sị . . . E dekwara, sị . . . Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’” Ihe nyeere Jizọs aka ịjụ ihe ndị na-adọ akpịrị Onye Ọnwụnwa ahụ kwere nkwa inye ya bụ na ọ hụrụ Jehova na Okwu ya n’anya. (Mat. 4:1-10) Mgbe Jizọs jụrụ ime ihe ndị ahụ Setan gwara ya mee, Setan hapụrụ ya pụọ.

7. Olee otú Baịbụl si enyere anyị aka ka a ghara ịnwata anyị?

7 Ebe ọ bụ na Jizọs, bụ́ onye zuru okè, si n’Akwụkwọ Nsọ nweta ihe ọ zara Ekwensu mgbe ọ na-anwa ya, anyị kwesịdịrị ime otú ahụ karịa! N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị achọghị ka Ekwensu na ndị ọrụ ya nwata anyị, ihe mbụ anyị kwesịrị ikpebisi ike ime bụ ịmara iwu Chineke, rubekwa isi na ya nke ọma. Ọtụtụ ndị na-amalite ime ihe Baịbụl kwuru ozugbo ha mụrụ Baịbụl ma chọpụta na Chineke nwere amamihe nakwa na ọ na-eme ihe ziri ezi. N’eziokwu, “okwu Chineke” na-akpa ike nke nwere ike ime ka a mata “echiche na ihe mmadụ bu n’obi.” (Hib. 4:12) Ọ bụrụ na mmadụ a na-agụkwu Baịbụl ma na-echebakwuru ihe ndị ọ na-agụ echiche, onye ahụ ‘ga-aghọtakwu eziokwu Jehova.’ (Dan. 9:13) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ihe ndị na-adịghị mma anyị na-eme.

8. Olee otú anyị nwere ike isi nweta mmụọ nsọ?

8 E wezụga na Jizọs ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma, ihe ọzọ mere na Ekwensu anwataghị ya bụ na o “jupụtara na mmụọ nsọ.” (Luk 4:1) Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ike na ume ka Jizọs, anyị kwesịrị ịbịaru Jehova nso site n’ịna-eme ihe ndị o si na ha enye anyị mmụọ nsọ. (Jems 4:7, 8) Ụfọdụ n’ime ihe ndị a bụ ịmụ Baịbụl, ikpe ekpere, nakwa anyị na ụmụnna anyị imekọ ihe. Ọtụtụ ndị anaghịkwa eji ihe ọ bụla metụtara ofufe Jehova egwu egwu. Nke a na-eme ka ha na-eche banyere ihe ndị ga-eme ka ha na Chineke dịrị ná mma.

9, 10. (a) Olee ọnwụnwa ndị na-abịakarịrị ndị bi ebe i bi? (b) Olee otú ịtụgharị uche na ikpe ekpere nwere ike isi mee ka a ghara ịnwata gị ọbụna mgbe ike na-adịghị gị?

9 Olee ihe ndị ị na-agaghị ekwe ka e jiri ha nwata gị? È nwetụla mgbe i nwere mmasị n’ebe onye na-abụghị di gị ma ọ bụ nwunye gị nọ? Ọ bụrụ na ị lụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ò nwetụla mgbe ọ dị gị ka gị lụọ onye ụwa? Mgbe Onye Kraịst na-ele televishọn ma ọ bụ na-achọ ihe n’Ịntanet, ihe ndị nwere ike ime ka ọ chọọ ile ihe ndị rụrụ arụ nwere ike ịpụta na mberede. Nke a ò metụla gị, ọ bụrụ na o metụla gị, gịnị ka i mere? Ọ ga-adị mma ka anyị chee banyere otú ime ụmụ irighiri ihe na-adịghị mma nwere ike isi mee ka anyị mee mmehie dị oké njọ. (Jems 1:14, 15) Chee banyere otú ọ ga-esi wute Jehova, ọgbakọ, na ndị ezinụlọ gị ma ọ bụrụ na i mee ihe na-adịghị mma. Ma, mmadụ ga na-enwe akọnuche dị ọcha ma ọ bụrụ na ọ na-erube isi n’iwu Chineke. (Gụọ Abụ Ọma 119:37; Ilu 22:3.) Mgbe ọ bụla ụdị ọnwụnwa a bịaara gị, kpee ekpere ka Jehova nyere gị aka ka ị ghara ịda.

10 E nwere ihe ọzọ anyị kwesịrị icheta n’ọnwụnwa ahụ Ekwensu nwara Jizọs. Setan bịakwutere Jizọs mgbe o buchara ọnụ iri ụbọchị anọ n’ịkpa. Ọ ga-abụ na Ekwensu chere na ọ bụ oge “ga-adaba adaba” ịnwa Jizọs ọnwụnwa iji mara ma ọ̀ ga-anọgide na-efe Chineke. (Luk 4:13) Setan na-achọ oge ga-adaba adaba ọ ga-eji anwa anyị ọnwụnwa. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhụ na anyị na Chineke dị n’ezigbo mma. Setan na-anwakarị mmadụ mgbe ọ hụrụ na onye ahụ adịghị ike. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ike gwụrụ anyị ma ọ bụkwanụ mgbe anyị dara mbà, anyị kwesịrị ịrịọsikwu Jehova arịrịọ ike ka o nyere anyị aka nakwa ka o nye anyị mmụọ nsọ.—2 Kọr. 12:8-10.

Ọ Na-enyere Anyị Aka Imeri Ike Ọgwụgwụ na Ịda Mbà

11, 12. (a) Gịnị mere ọtụtụ ndị ji ada mbà taa? (b) Gịnị nwere ike inye anyị ike ka anyị wee ghara ịda mbà?

11 Anyị na-ada mbà site n’oge ruo n’oge n’ihi na anyị ezughị okè. Nke a na-emekarị taa n’ihi na nsogbu juru ebe niile. Ikekwe, e nwetụbeghị mgbe ụmụ mmadụ bi n’oge tara akpụ ka oge anyị bi na ya taa. (2 Tim. 3:1-5) Ka Amagedọn na-erukwu nso, ụkọ ego na nsogbu ndị ọzọ na-akpatara ndị mmadụ nchegbu na-akakwu njọ. N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na ọ na-esiri ụfọdụ ndị ezigbo ike inye ezinụlọ ha nri na igboro ha mkpa ha ndị ọzọ. Nke a na-eme ka ike na-agwụ ha, ha ana-ada mbà, obi ana-ajọ ha njọ, ya adịkwa ha ka ha bu ibu arọ. Ọ bụrụ na ọ bụ otú a ka ọ dị gị, gịnị ga-enyere gị aka idi ya?

12 Cheta na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ya ga-enye ha ihe inyeaka, ya bụ, mmụọ nsọ Chineke. (Gụọ Jọn 14:16, 17.) Ọ bụ ike kachanụ n’eluigwe na ụwa. Jehova nwere ike iji ya nye anyị ike “nke ukwuu” ka anyị wee die ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị. (Efe. 3:20) Pọl onyeozi kwuru na ọ bụrụ na anyị atụkwasị mmụọ nsọ obi, anyị ga-enweta “ike karịrị ike nkịtị,” n’agbanyeghị na “a na-akpagide anyị n’ụzọ niile.” (2 Kọr. 4:7, 8) Jehova ekweghị anyị nkwa na ya ga-ewepụrụ anyị nchegbu, ma, ọ gwara anyị na ya ga-eji mmụọ nsọ nye anyị ike anyị ga-eji die ya.—Fil. 4:13.

13. (a) Olee otú e si nyere otu nwa agbọghọ aka idi otu nsogbu tara akpụ? (b) È nwere ndị ị ma ụdị ihe a merela?

13 Ka anyị tụlee ihe mere Stephanie, bụ́ ọsụ ụzọ oge niile dị afọ iri na itoolu. Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, ọrịa strok bịara ya. A chọpụtakwara na o nwere akpụ n’ụbụrụ. Kemgbe ahụ, a waala ya ahụ́ ugboro abụọ, chakpọọ akụkụ ahụ́ ya ụfọdụ, ọ dakwaala ọrịa strok ugboro abụọ ọzọ, bụ́ nke mere ka akụkụ ahụ́ ebe aka ekpe ya ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma, meekwa ka ọ ghara ịna-ahụ ụzọ nke ọma. Stephanie anaghị eme ọtụtụ ihe ka o wee nwee ume ọ ga-eji mee ihe ndị ka mkpa, dị ka ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. N’agbanyeghị nke a, ọ ma na mmụọ nsọ Jehova na-enyere ya aka n’ụzọ dị iche iche idi nsogbu ya. Ihe ndị a kọrọ banyere ụmụnna ya n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na-agba ya ume mgbe ọ bụla ọ dara mbà. Ụmụnna na-akwado ya site n’izigara ya akwụkwọ ozi ma ọ bụkwanụ site n’ịgba ya ume tupu a malite ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ mgbe a gbasara. Ndị Stephanie na-amụrụ Baịbụl na-egosikwa na obi dị ha ụtọ n’ihe ọ na-akụziri ha site n’ịga n’ụlọ ya ka ọ mụọrọ ha ihe. Stephanie na-ekele Jehova nke ukwuu maka ihe a niile. Amaokwu Akwụkwọ Nsọ kacha atọ ya ụtọ bụ Abụ Ọma 41:3, bụ́ nke o kwuru na Jehova na-emere ya ihe e kwuru ebe ahụ.

14. Olee ihe anyị na-ekwesịghị ime mgbe anyị dara mbà, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

14 Mgbe ike gwụrụ anyị ma ọ bụ mgbe anyị nwere nsogbu, anyị ekwesịghị iche na otú anyị ga-esi nwere onwe anyị bụ ịkwụsịlata ime ihe ndị metụtara ife Chineke. Nke a bụ ihe kacha njọ anyị nwere ike ime. Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ndị dị ka ọmụmụ ihe onwe onye, ọmụmụ ihe ezinụlọ, ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe bụ ụzọ ndị anyị si enweta mmụọ nsọ. Ime ihe ndị metụtara ofufe Chineke na-eme ka anyị na-enweta ume mgbe niile. (Gụọ Matiu 11:28, 29.) Ọtụtụ mgbe, ike na-agwụ ụmụnna mgbe ha bịara ọmụmụ ihe, ma, ha na-enweta ume tupu ọmụmụ ihe agbasaa.

15. (a) Jehova ò kwere Ndị Kraịst nkwa na ha agaghị enwe ihe isi ike? Jiri Akwụkwọ Nsọ kọwaa nke a. (b) Olee ihe Chineke kwere anyị nkwa ya, oleekwa ajụjụ nke a na-akpata?

15 Ma, ihe anyị na-ekwu abụghị na ọ dị mfe mmadụ ịbụ Onye Kraịst. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. (Mat. 16:24-26; Luk 13:24) Ma, Jehova nwere ike iji mmụọ nsọ mee ka onye ike gwụrụ nweghachi ume. Aịzaya onye amụma dere, sị: “Ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enwetaghachi ike. Ha ga-eji nku fegoo n’elu dị ka ugo. Ha ga-agba ọsọ ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-eje ije ma ha agaghị ada mbà.” (Aịza. 40:29-31) Ọ bụrụ otú ahụ, anyị kwesịrị ịjụ onye anyị sị, Oleedị ihe ndị na-eme ka ike na-agwụ anyị ime ihe ndị metụtara ofufe Jehova?

16. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji zere ihe ọ bụla nwere ike ịkpatara anyị ike ọgwụgwụ ma ọ bụ mee ka anyị daa mbà?

16 Okwu Jehova na-agba anyị ume ka anyị “chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Fil. 1:10) Pọl onyeozi ji ndụ Ndị Kraịst tụnyere ọsọ mmadụ gba na-aga ebe dị anya. O kwuru n’ike mmụọ nsọ, sị: “Ka anyị yipụkwa ihe ọ bụla dị arọ . . . , ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e debere n’ihu anyị.” (Hib. 12:1) Ihe Pọl na-ekwu bụ na anyị ekwesịghị ịna-achụ ihe ndị na-enweghị isi, nakwa na anyị ekwesịghị ịga buru ibu arọ na-enweghị isi, bụ́cha ihe ndị ga-eme ka ike gwụ anyị. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime anyị na-achọ iji obere oge ha nwere rụpụta ọtụtụ ihe. N’ihi ya, ọ bụrụ na ike na-agwụkarị gị ma ọ bụkwanụ na ị naghị enwe ohere, ihe nwere ike inyere gị aka bụ ịtụle awa ole i ji arụ ọrụ ego, ugboro ole ị na-aga ebe ị na-atụrụ ndụ, nakwa awa ole ị na-eji egwuri egwu. Anyị niile ga-egosi na anyị ma ihe nakwa na anyị dị obi umeala ma ọ bụrụ na anyị amara otú ike anyị hà ma beleta nnọọ oge anyị ji eme ihe ndị na-adịchaghị mkpa.

17. Gịnị nwere ike ịbụ ya mere ụfọdụ ji ada mbà, ma, olee otú Jehova si mesie anyị obi ike na nke a?

17 O nwekwara ike ịbụ na ihe mere ụfọdụ n’ime anyị ji ada mbà mgbe ụfọdụ bụ na ọgwụgwụ ụwa a abịabeghị ọsọ ọsọ otú ha tụrụ anya ya. (Ilu 13:12) Ma, ihe e kwuru na Habakọk 2:3 nwere ike ịgba ndị nwere ụdị echiche a ume. Ebe ahụ sịrị: “Ọhụụ a bụ maka oge a kara aka, o jikwa ọsọ na-eru ọgwụgwụ ya, ọ gaghị agha ụgha. Ọ bụrụgodị na o gbuo oge, na-atụ anya ya; n’ihi na ọ ga-emezurịrị. Ọ gaghị anọ ọdụ.” Jehova mesiri anyị obi ike na ọgwụgwụ ụwa a ga-abịa mgbe o kwesịrị.

18. (a) Olee nkwa ndị na-agba gị ume? (b) Olee uru anyị ga-erite n’isiokwu na-esonụ?

18 N’eziokwu, ndị niile ji obi ha dum na-ejere Jehova ozi na-atụ anya mgbe ike na-agakwaghị na-agwụ ha nakwa mgbe ha na-agaghị na-ada mbà, ya bụ, mgbe ndị niile dị ndụ ga-enwe “ike okorobịa.” (Job 33:25) Ka ọ dịgodị, mmụọ nsọ nwere ike ime ka anyị dị ike n’ime ma ọ bụrụ na anyị esoro na-arụ ọrụ ndị metụtara ofufe Jehova, bụ́ ndị na-enye ume. (2 Kọr. 4:16; Efe. 3:16) Ekwela ka ike ọgwụgwụ mee ka ị ghara inweta ihe ọma ndị ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ihe isi ike niile anyị na-enwe, ma ọ̀ bụ ọnwụnwa kpatara ha, ike ọgwụgwụ, ma ọ bụkwanụ ịda mbà, ga-akwụsị. Ọ bụrụgodị na ha akwụsịghị ugbu a, ha ga-akwụsịrịrị n’ụwa ọhụrụ Chineke. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú mmụọ nsọ si enye Ndị Kraịst ike idi mkpagbu, na otú ha ga-esi ghara ime ihe ọjọọ ndị ọgbọ ha chọrọ ka ha mee, nakwa otú ha ga-esi die ihe isi ike ndị ọzọ.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú ịgụ Baịbụl si enye anyị ike?

• Olee otú ikpe ekpere na ịtụgharị uche si enye anyị ike?

• Olee otú i nwere ike isi zere ihe ndị nwere ike ime ka ị daa mbà?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 24]

Ọmụmụ ihe nwere ike ime ka anyị nweghachi ume