Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe Jizọs Kraịst zipụrụ ndịozi ya iri na abụọ ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ọ̀ gwara ha ka ha were mkpara ma ọ bụkwanụ ka ha yiri akpụkpọ ụkwụ?

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe Matiu, Mak, na Luk kwuru na Jizọs gwara ndịozi ya mgbe ọ na-ezipụ ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma na-emegiderịta ibe ha. Ma, ọ bụrụ na anyị atụlee ihe ha kwuru nke ọma, anyị ga-achọpụta na ha anaghị emegiderịta ibe ha. Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe Mak na Luk dere. Akwụkwọ Mak sịrị: ‘Jizọs nyere ha iwu ka ha ghara iwere ihe ọ bụla maka njem ahụ ma e wezụga naanị mkpara, ka ha gharakwa iwere achịcha na obere akpa ihe oriri, ka ha gharakwa itinye ego n’obere akpa ego a na-eke n’úkwù, kama ka ha yiri akpụkpọ ụkwụ, ka ha gharakwa iyi uwe ime abụọ.’ (Mak 6:7-9) Luk dere, sị: “Unu ewerela ihe ọ bụla maka njem a, unu ejila mkpara ma ọ bụ obere akpa, ma ọ bụ achịcha ma ọ bụ ego ọlaọcha; unu achịkwala uwe ime abụọ.” (Luk 9:1-3) N’ebe a, ha yiri ka hà na-emegide ibe ha. Mak kwuru na Jizọs gwara ndịozi ya ka ha were mkpara, yirikwa akpụkpọ ụkwụ, ebe Luk kwuru na ọ gwara ha ka ha ghara iji ihe ọ bụla, ọbụnadị mkpara. Luk ekwuteghị okwu akpụkpọ ụkwụ dị ka Mak kwuru.

Iji ghọta ihe Jizọs gwara ndịozi ya n’oge ahụ, ka anyị hụ otu ihe nke ma Matiu ma Mak ma Luk kwuru. Ebe ndị ahụ anyị gụrụ na Mak na Luk nakwa na Matiu 10:5-10 kwuru na Jizọs gwara ndịozi ya ka ha ghara iyi ma ọ bụ ịchịrị “uwe ime abụọ.” O yiri ka onyeozi nke ọ bụla ò yi otu uwe ime. Ya mere, ihe Jizọs gwara ha bụ ka onye nke ọ bụla n’ime ha ghara ịchịrị uwe ime abụọ. N’otu aka ahụ, onye ọ bụla n’ime ha yi akpụkpọ ụkwụ eyi. Ha ekwesịghị iwere ọzọ. Oleekwanụ maka mkpara e kwuru okwu ya? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru, sị: “Ọ dị ka ndị Hibru na-ejikarị mkpara n’aka.” (Jen. 32:10) Mak kwuru na Jizọs gwara ndịozi ya ka onye ọ bụla n’ime ha “ghara iwere ihe ọ bụla maka njem ahụ” ma e wezụga mkpara o ji n’aka mgbe ọ gwara ha okwu ahụ. Ya mere, ihe Matiu, Mak, na Luk mere ka ọ pụta ìhè bụ ihe ahụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, ya bụ, na ha ekwesịghị ịnọ ebe ha na-enweta ihe ndị ọzọ gbuo oge ịga ozi ọma e dunyere ha ka ha gaa kwusaa.

Matiu, bụ́ onye nụrụ mgbe Jizọs nyere iwu a ma dee ihe ahụ Jizọs kwuru, mekwuru ka nke a pụta ìhè. Jizọs sịrị: “Unu ewerela ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ ọla kọpa unu ga-etinye n’obere akpa ego unu na-eke n’úkwù, unu ewerela obere akpa nri maka njem unu, unu achịrịla uwe ime abụọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ, unu ewerekwala mkpara; n’ihi na onye ọrụ kwesịrị ka e nye ya nri.” (Mat. 10:9, 10) Oleekwanụ maka akpụkpọ ụkwụ ndịozi ahụ yi nakwa mkpara ha ji? Jizọs asịghị ha tụfuo ndị nke ha nwere enwe, kama, ihe ọ gwara ha bụ ka ha ghara inweta ọzọ tinye ná ndị nke ha nwere. Gịnị mere o ji nye ha iwu a? Ọ bụ n’ihi na “onye ọrụ kwesịrị ka e nye ya nri.” Nke a bụ ihe Jizọs bu n’obi nye iwu ahụ, bụ́kwanụ nke kwekọrọ na ndụmọdụ o nyere ndị na-eso ụzọ ya n’Ozizi Elu Ugwu ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha maka ihe ha ga-eri, ma ọ bụ ihe ha ga-aṅụ, ma ọ bụkwanụ maka uwe ha ga-eyi.—Mat. 6:25-32.

Ọ bụrụ na anyị elee ihe ahụ Matiu, Mak na Luk dere anya elu elu, anyị nwere ike chee na ha na-emegide ibe ha, ma, ha niile na-ekwu otu ihe. Ndịozi Jizọs kwesịrị iji ihe ndị ha nwere gawa ozi ọma otú ahụ n’ekweghị ka inweta ọzọ megharịa ha anya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova ga-egboro ha mkpa ha.

Ole ndị bụ “nwaanyị, ọbụna ụmụ nwaanyị” Sọlọmọn kwuru banyere ha?—Ekli. 2:8.

O dochaghị anyị anya, ma, ọ ga-abụ na ha bụ ụmụ nwaanyị ndị a ma ama ndị bịara n’obí Sọlọmọn.

N’Ekliziastis isi abụọ, Sọlọmọn kwuru ọtụtụ ihe o mere, tinyere ọtụtụ ihe ndị o wuru. O kwukwara, sị: “Akpakọbaara m onwe m ọlaọcha na ọlaedo, kpakọbakwa ihe onwunwe e ji amata ndị eze na ógbè dị iche iche a na-achị achị. Enwetara m ndị ikom na-abụ abụ na ndị inyom na-abụ abụ nakwa ihe na-enye ụmụ mmadụ obi ụtọ dị ukwuu, ya bụ, nwaanyị, ọbụna ụmụ nwaanyị.”—Ekli. 2:8.

Ọtụtụ ndị na-akọwa Baịbụl kwuru na “ụmụ nwaanyị” Sọlọmọn kwuru banyere ha bụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị si mba ọzọ o mechara lụọ nakwa ọtụtụ ndị iko o nwere, bụ́ ndị mere ka o kpeere arụsị. (1 Eze 11:1:1-4) Ma, ihe a ha kwuru eyighị ka ọ bụ eziokwu. Mgbe Sọlọmọn dere na ya nwetara nwaanyị, ọbụna ụmụ nwaanyị, ọ marala “nwaanyị, ọbụna ụmụ nwaanyị” ndị a o kwuru okwu ha amara. N’oge ahụkwa, ya na Jehova ka dị ná mma, n’ihi na Chineke nyere ya mmụọ nsọ ka o dee akwụkwọ ụfọdụ dị na Baịbụl. Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’ikpeazụ mgbe ọ lụrụ ọtụtụ ndị nwaanyị si mba ọzọ, nweekwa ọtụtụ ndị iko, wee malite ikpere arụsị.

N’akwụkwọ Ekliziastis, Sọlọmọn kwuru na ya “gbara mbọ ịchọta okwu dị ụtọ na ide okwu ziri ezi bụ́ eziokwu.” (Ekli. 12:10) O doro anya na ọ ma ndị a na-akpọ “nwunye,” “nwunye eze,” na “iko nwaanyị,” n’ihi na o kwutere okwu ha mgbe ọ na-ede akwụkwọ ụfọdụ dị na Baịbụl. (Ilu 5:18; 12:4; 18:22; Ekli. 9:9; Abụ Sọlọ. 6:8, 9) Ma o kwuteghị okwu ha n’Ekliziastis 2:8.

Ọ bụ naanị n’ebe a ka e ji okwu Hibru a sụgharịrị ka ọ bụrụ “nwaanyị, ọbụna ụmụ nwaanyị,” kọwaa otu onye na ọtụtụ ndị n’otu mgbe na Baịbụl. Ndị na-akọwa Baịbụl kwuru na ihe ọ pụtara edoghị anya. Ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl sụgharịrị ihe ahụ e kwuru n’Ekliziastis 2:8 ka ọ bụrụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị ma ọ bụkwanụ ndị nwaanyị bara ụba nke ukwuu n’ọnụ ọgụgụ. Ọ bụ ihe a ka “nwaanyị, ọbụna ụmụ nwaanyị” pụtara.

A ma nnọọ Sọlọmọn ama nke na otu eze nwaanyị si n’obodo Shiba bara ọgaranya nụrụ banyere ya wee bịa ka o ji anya ya hụ, ihe ọ hụrụ masịkwara ya. (1 Eze 10:1, 2) O yiri ka ò so n’ihe Sọlọmọn bu n’uche mgbe o kwuru banyere “nwaanyị, ọbụna ụmụ nwaanyị.” O nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu banyere ụmụ nwaanyị ndị a ma ama ha na ya mekọrọ ihe mgbe ya na Chineke ka dị ná mma.