Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Dịrị Njikere!

Dịrị Njikere!

Dịrị Njikere!

“Dịrịnụ njikere, n’ihi na ọ bụ n’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—MAT. 24:44.

1, 2. (a) Olee amụma ndị dị na Baịbụl ndị e nwere ike iji tụnyere ọgụ agụ lụsoro onye nwe ya? (b) Olee otú ọgụ anụ ọhịa ahụ ga-alụso nwaanyị akwụna ahụ si gbasa gị?

OTU nwoke a ma ama nke ya na agụ ndị ọ zụrụ nke ọma na-emere ndị mmadụ egwuregwu na agụ ya ndị ahụ mere nke a ọtụtụ afọ n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na anụmanụ atụkwasị gị obi, ọ na-adị gị ka e nyela gị onyinye kacha onyinye niile e nwere n’ụwa a.” Ma, obi agụ ndị ahụ tụkwasịrị ya kwụsịrị n’Ọktoba 3, 2003. N’ụbọchị ahụ, o nweghị onye ma ihe mere otu n’ime agụ ndị ahụ, nke buru ibu, ji bịa ya ọgụ. Ọ maghị na agụ ahụ ga-abịa ya ọgụ, o jikereghịkwa ịzọrọ isi ya.

2 Ọ dị mma ịmara na Baịbụl buru amụma na otu “anụ ọhịa” ga-alụso ndị mmadụ ọgụ, anyị kwesịkwara ịdị njikere. (Gụọ Mkpughe 17:15-18.) Ònye ka anụ ọhịa a ga-alụso ọgụ? Ọ dị ịtụnanya na ụwa Ekwensu ga-alụso onwe ya ọgụ. Anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie bụ Òtù Mba Ụwa, “mpi iri ahụ” abụrụ ọchịchị ụwa. Ha ga-alụso Babịlọn Ukwu ahụ ọgụ, bụ́ alaeze okpukpe ụgha nke zuru ụwa ọnụ, nke dị ka nwaanyị akwụna, wee laa ya n’iyi. Olee mgbe nke a ga-eme? Anyị amaghị ụbọchị na oge awa ọ ga-abụ. (Mat. 24:36) Ma, anyị ma na ọ ga-abụ n’oge anyị na-atụghị anya ya, marakwa na oge fọdụrụ tupu nke a emee dị ntakịrị. (Mat. 24:44; 1 Kọr. 7:29) Ọ bụ nke a mere o ji dị mkpa ka anyị dị njikere ka e wee nwee ike ịnapụta anyị mgbe anụ ọhịa ahụ ga-abịa ịlụso nwaanyị akwụna ahụ ọgụ, Kraịst abịakwa ibibi ndị iro ya. (Luk 21:28) Anyị ga-enwe ike ịdị njikere ma ọ bụrụ na anyị eṅomie ndị ohu Chineke, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi wee gosi na ha dị njikere, nke mere ka ha hụ otú Chineke si mezuo nkwa ya dị iche iche. Ànyị ga-eburu akụkọ ndị a mere eme n’uche?

Dịrị Njikere Ka Noa

3. Olee otú ụwa dị n’oge Noa dị ndụ nke mere ka ọ ghara ịdịrị ya mfe ife Chineke nke ọma?

3 N’agbanyeghị na ndị arụrụala juru n’ụwa n’oge Noa dị ndụ, ọ dị njikere ịhụ mgbe nkwa Chineke ga-emezu. Cheedị otú ọ ga-adị Noa mgbe ahụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi wee nwoghaa bụrụ ụmụ mmadụ ha na ndị inyom mara mma ebiri! Ndị mmụọ ozi a, ndị lụrụ ndị inyom, bụ́kwanụ ihe Chineke na-ekeghị ha ka ha na-eme, mụrụ “ndị dike,” bụ́ ndị na-emeso ndị ọzọ ihe ike. (Jen. 6:4) Chegodị ụdị arụrụala ndị dike a ga na-arụ na ihe ike ha ga na-eme n’ebe ọ bụla ha gara. Nke a mere ka arụrụala ju ebe niile, naanị ihe ụmụ mmadụ na-eche ma na-eme abụrụ omume jọgburu onwe ya. Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova wee kpebie ụbọchị ọ ga-ebibi ndị ajọ omume ahụ.—Gụọ Jenesis 6:3, 5, 11, 12. *

4, 5. Olee otú ihe ndị na-eme n’ụwa taa si dị ka ihe ndị na-eme n’ụwa n’oge Noa dị ndụ?

4 Jizọs buru amụma na ihe ndị ga na-eme n’oge anyị a ga-adị ka ihe ndị mere n’oge Noa dị ndụ. (Mat. 24:37) Dị ka ihe atụ, anyị na-ahụ na ndị mmụọ ọjọọ na-eduhie ndị mmadụ n’oge a. (Mkpu. 12:7-9, 12) Ndị mmụọ ọjọọ ndị a nwoghara wee ghọọ ndị mmadụ n’oge Noa dị ndụ. Ọ bụ eziokwu na a naghịzi ekwe ka ha nwoghaa ghọọ ndị mmadụ n’oge a, ha na-agbasi mbọ ike iduhie ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto. Ndị mmụọ ọjọọ a a na-anaghị ahụ anya, bụ́ ndị na-eme omume rụrụ arụ, na-enwe obi ụtọ ma ndị ha na-eduhie n’ụwa na-eme ihe ọjọọ.—Efe. 6:11, 12.

5 Baịbụl kwuru na Ekwensu bụ “ogbu mmadụ,” kwuokwa na o “nwere ikike ịkpata ọnwụ.” (Jọn 8:44; Hib. 2:14) Chineke anaghị ekwe ka o gbuo ndị niile ọ chọrọ igbu. Ma, mmụọ ọjọọ a obi tara miri na-eduhie ndị mmadụ, na-aghọgbukwa ha. Ọ na-eme ka ndị mmadụ nwee ọchịchọ igbu ndị ọzọ. Ebe ọ bụ na ime ihe ike juru ebe niile, ì chere na Jehova anaghị ahụ ihe ndị na-eme otú ahụ o si na-ahụ ihe ndị na-eme n’oge Noa dị ndụ? Ọ̀ ga-agbachi nkịtị?

6, 7. Olee otú Noa na ezinụlọ ya si gosi na ha nwere okwukwe na Chineke ma na-atụ egwu ka ha ghara ime ihe na-adịghị ya mma?

6 Ka oge na-aga, Chineke gwara Noa na ya ekpebiela iji iju mmiri bibie ụwa, ka o wee laa ihe niile na-eku ume n’iyi. (Jen. 6:13, 17) Jehova gwara Noa ka o wuo ụgbọ ga-adị ka nnukwu igbe. Noa na ezinụlọ ya malitere iwu ya. Gịnị nyeere ha aka irubere Jehova isi na ịdị njikere mgbe Chineke malitere ibibi ndị iro ya?

7 Ezigbo okwukwe Noa na ezinụlọ ya nwere n’ebe Chineke nọ nakwa egwu ha na-atụ ka ha ghara ime ihe na-adịghị ya mma mere ka ha mee ihe ọ gwara ha. (Jen. 6:22; Hib. 11:7) Noa, bụ́ onyeisi ezinụlọ, mụ anya, o tinyeghịkwa aka n’ihe ọjọọ ndị oge ahụ na-eme. (Jen. 6:9) Ọ ma na ezinụlọ ya kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ime ihe ike ma ọ bụkwanụ nupụrụ Jehova isi otú ndị mmadụ na-eme n’oge ahụ. Ha ekwesịghị imikpu onwe ha n’ihe dị iche iche ndị mmadụ na-eme kwa ụbọchị. Chineke nyere ha ọrụ ha ga na-arụ, ezinụlọ ahụ dum kwesịkwara itinye uche ha na ya.—Gụọ Jenesis 6:14, 18.

Noa na Ezinụlọ Ya Gosiri na Ha Dị Njikere

8. Gịnị na-egosi na ndị ezinụlọ Noa fere Chineke?

8 Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe banyere onyeisi ezinụlọ bụ́ Noa, ma, nwunye Noa na ụmụ ya na ndị nwunye ha fekwara Jehova. Ezikiel onye amụma gosiri na nke a bụ eziokwu. O kwuru na ọ bụrụ na ọ bụ n’oge ahụ yanwa dị ndụ ka Noa dị ndụ, na a gaghị eji maka na ọ bụ onye ezi omume zọpụta ụmụ ya. Ha ruru ogo ikpebi ma hà ga-erubere Chineke isi ma ọ̀ bụ na ha agaghị erubere ya. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime ha gosiri na ya hụrụ Chineke na ụzọ ya n’anya. (Ezik. 14:19, 20) Ezinụlọ Noa rubeere ya isi, kwere ihe o kweere, ha ekweghịkwa ka ihe ndị ọzọ na-eme mee ka ha kwụsị ọrụ Chineke nyere ha.

9. Olee ihe ụmụnna anyị na-eme taa nke na-egosi na ha nwere okwukwe dị ka Noa?

9 Ọ dị nnọọ mma ịhụ taa ka ụmụnna anyị ndị bụ́ ndị isi ezinụlọ na-agbasi mbọ ike n’ụwa niile iṅomi Noa. Ha ma na inye ndị ezinụlọ ha nri, ákwà, ma ọ bụkwanụ inwe ụlọ ha ga-ebi, ma ọ bụ ịzụ ha n’ụlọ akwụkwọ abụghị naanị ihe ha kwesịrị imere ha. Ha kwesịrị ịna-eme ihe ga-eme ka ndị ezinụlọ ha na Chineke dịrị ná mma. Ọ bụrụ na ndị isi ezinụlọ na-eme otú a, ha na-egosi na ha dị njikere maka ihe Jehova ga-eme n’oge na-adịghị anya.

10, 11. (a) Olee otú ọ ga-abụrịrị na obi dị Noa na ndị ezinụlọ ya mgbe ha nọ n’ime ụgbọ ahụ? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

10 O nwere ike ịbụ na iwu ụgbọ ahụ were Noa, nwunye ya, ụmụ ya, na ndị nwunye ha iri afọ ise. Ọ ga-abụkwa na mgbe ha na-ewu ụgbọ ahụ, ha na-abanye n’ime ya ma na-apụta ọtụtụ ugboro. Ha wuru ya otú mmiri na-agaghị abanye ya, ha kwanyejuru ya nri ma chịba ụmụ anụmanụ na ya. N’ikpeazụ, ụbọchị ha na-atụ anya ya ruru. Ọ bụ n’abalị nke iri na asaa nke ọnwa abụọ n’afọ 2370 T.O.A ka nke a mere, ha banyekwara n’ụgbọ ahụ n’ụbọchị ahụ. Jehova mechiri ụzọ ya, mmiri wee malite izo. Nke a abụghị ụdị nnukwu mmiri nke na-ezo taa. E mepere nnukwu ogbu mmiri dị n’eluigwe, oké mmiri ozuzo wee na-ezokwasị ụgbọ ahụ. (Jen. 7:11, 16) Ndị na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ nwụrụ, ebe ọ na-enweghị ihe mere ndị nọ n’ime ya. Olee otú obi dị Noa na ezinụlọ ya? Obi dị ha ezigbo ụtọ maka ihe Chineke meere ha. Ọ ga-abụrịrị na ha nọ na-asị, ‘Ọ dịkwa mma na anyị so ezi Chineke jee ije wee dị njikere!’ (Jen. 6:9) Were ya na agha Amagedọn alụchaala ma o nweghị ihe mere gị, obi ọ́ gaghị adị gị ụtọ otú ahụ ọ dị Noa na ezinụlọ ya?

11 O nweghị ihe ga-eme ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ghara ime ihe o kwere anyị ná nkwa na ya ga-ebibi ajọ ụwa Setan a. Jụọ onwe gị, sị, ‘Obi ò siri m nnọọ ike na o nweghị ihe Chineke kwere ná nkwa nke na-agaghị emezu nakwa na ha niile ga-emezu n’oge ọ kara aka?’ Ọ bụrụ otú ahụ, dị njikere site n’iburu “ụbọchị Jehova” n’uche, bụ́ ụbọchị nke ga-abịa n’oge na-adịghị anya.—2 Pita 3:12.

Mozis Mụ Anya

12. Olee ihe ndị gaara eme ka Mozis ghara ịmụ anya?

12 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. E lee ya anya otú mmadụ si ele ihe anya, o yiri ka ihe ọ̀ gazierela nnọọ Mozis n’Ijipt. Ebe ada Fero ji Mozis mere nwa, ọ ga-abụ na ndị mmadụ na-akwanyere Mozis ùgwù nke ukwuu. Ọ ga-abụkwa na ọ na-eri nri kacha mma, na-eyi uwe kacha mma, birikwa n’ebe kacha mma. Ọ gụrụ oké akwụkwọ. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 7:20-22.) Ọ ga-abụ na ọ gaara eketa nnukwu ala na ụlọ.

13. Olee otú Mozis si lekwasị anya ná nkwa dị iche iche Chineke kwere?

13 Ọ ga-abụ na ọzụzụ nne na nna Mozis nyere ya mgbe ọ bụ nwata mere ka ọ mata na arụsị ndị Ijipt na-efe abaghị uru. (Ọpụ. 32:8) Agụmakwụkwọ ndị Ijipt na ọmarịcha ihe onwunwe ndị juru n’obí Fero emeghị ka Mozis hapụ ezi ofufe. Ọ ga-abụrịrị na ọ na-atụgharị nnọọ uche ná nkwa dị iche iche Chineke kwere ndị nna nna ya, ọ dịkwa nnọọ njikere ime uche Chineke. Ọ bụ ya mere Mozis ji gwa ụmụ Izrel, sị: “Jehova bụ́ Chineke . . . Ebreham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb, ezitewo m ka m bịakwute unu.”—Gụọ Ọpụpụ 3:15-17.

14. Olee otú e si lee Mozis ule iji mara ma ò nwekwara okwukwe na obi ike?

14 Mozis ma na Jehova, bụ́ ezi Chineke, dị adị, na ọ dịghị ka arụsị niile na-adịghị ndụ ndị Ijipt na-efe. O biri ndụ dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ “Onye a na-apụghị ịhụ anya.” Mozis nwere okwukwe na ndị Izrel ga-enwere onwe ha, ma, ọ maghị mgbe nke a ga-abụ. (Hib. 11:24, 25, 27) Otú o si dị ya ọkụ n’obi ka ndị Hibru nwere onwe ha mere ka o gbuo onye Ijipt nke na-eti onye Izrel ihe. (Ọpụ. 2:11, 12) Ma, oge Jehova chọrọ ka a napụta ụmụ Izrel erubeghị, nke a mere Mozis ji gbaga ọsọ ndụ n’obodo ọzọ nke dị anya. O doro anya na ihe siiri ya ike mgbe ahụ o bi n’ala ịkpa kama ibi n’obí eze Ijipt, bụ́ ebe ihe niile zuuru ya. N’agbanyeghị nke a, Mozis mere ihe niile Jehova gwara ya, si otú a gosi na ya dị njikere. Ọ bụ ya mere Chineke ji jiri ya napụta ụmụnna ya mgbe o birila iri afọ anọ na Midian. Mozis mere ihe Chineke gwara ya wee laghachi Ijipt. Oge eruola ka Mozis rụọ ọrụ Chineke ga-enye ya, ọ ga-arụkwa ya otú Chineke si chọọ. (Ọpụ. 3:2, 7, 8, 10) N’eziokwu, okwukwe na obi ike dị Mozis, bụ́ nwoke ‘dị umeala n’obi karịa mmadụ niile,’ ezigbo mkpa mgbe o rutere Ijipt ka o wee nwee ike ịhụ Fero. (Ọnụ Ọgụ. 12:3) Ọ gara n’ihu Fero, ọ bụghị otu ugboro, kama, ugboro ugboro mgbe a na-eti Ijipt ihe otiti. Ọ maghịkwa ugboro ole ọ ka ga-aga n’ihu ya ka ihe otiti ahụ na-abịakwasị Ijipt, otu bịapụ, ọzọ esochie.

15. N’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara Mozis, gịnị nyeere ya aka inwe mmasị ime ihe ga-adị Nna ya nke eluigwe mma?

15 N’ime iri afọ anọ sochirinụ, ya bụ, malite n’afọ 1513 T.O.A. ruo n’afọ 1473 T.O.A., e nwere ihe ndị mere ka Mozis nwee mwute. Ma, ọ masịrị ya ime ihe ga-adị Jehova mma, o jikwa obi ya dum gwa ndị Izrel ibe ya ka ha na-emekwa otú ahụ. (Diut. 31:1-8) Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ aha Jehova na ọchịchị ya n’anya karịa aha nke ya. (Ọpụ. 32:10-13; Ọnụ Ọgụ. 14:11-16) N’agbanyeghị na e nwere ike inwe ihe ndị ga-eme ka anyị nwee mwute ma ọ bụkwanụ nsogbu abịara anyị, anyịnwa kwesịrị ịkwado ọchịchị Chineke, nweekwa obi ike na otú o si eme ihe na-egosi na o nwere amamihe karịa onye ọ bụla ọzọ, kwerekwa na ezi omume ya enweghị atụ, nakwa na ọ ka onye ọ bụla ọzọ mma. (Aịza. 55:8-11; Jere. 10:23) Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị?

Mụrụ Anya!

16, 17. Gịnị mere i ji kwesị ichebara ihe Mak 13:35-37 kwuru echiche?

16 “Na-elenụ anya, mụrụnụ anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ.” (Mak 13:33) Jizọs nyere ndụmọdụ a mgbe ọ na-ekwu ihe ndị ọ ga-abụ ha na-eme anyị amara na ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a adịla nso. Tụlee ihe Jizọs kwuru ná ngwụcha nke amụma ahụ dị mkpa nke dị n’akwụkwọ Mak. Ọ sịrị: “Na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị mgbe nna nwe ụlọ ga-abịa, ma ọ̀ bụ n’uhuruchi ka ọ̀ bụ n’etiti abalị ka ọ̀ bụ mgbe oké ọkpa ji akwa ka ọ̀ bụ n’isi ụtụtụ; ka o wee ghara ịhụ unu ka unu na-ehi ụra mgbe ọ lọtara na mberede. Ma ihe m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ niile, Na-echenụ nche.”—Mak 13:35-37.

17 Anyị kwesịrị ichebara ndụmọdụ a Jizọs nyere echiche. O kwuru banyere oge anọ e ji eche nche n’abalị. Ọ na-esiri ndị nche ike ịmụrụ anya n’oge nche nke ikpeazụ n’ihi na ọ na-amalite n’ihe dị ka elekere atọ n’isi ụtụtụ ruo mgbe anwụ wara. Ndị ịlụ agha doro anya ma na ọ bụ oge ahụ ka ịlụso ndị iro agha kacha mma n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ha ga “na-ehi ụra.” N’otu aka ahụ, ugbu a, bụ́ mgbe ụwa nọ n’oké ụra ihe atụ, o nwere ike ịna-esiri anyị ezigbo ike ịmụrụ anya. Ọ̀ na-eme anyị obi abụọ ma ànyị kwesịrị ‘ịmụrụ anya’ ma “na-ele anya” n’ihi ọgwụgwụ ahụ Jizọs buru amụma ya na nnapụta a ga-anapụta anyị?

18. Olee ihe ùgwù na-enweghị atụ anyị bụ́ Ndịàmà Jehova nwere?

18 Agụ ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a egbughị nwoke ahụ ya na ụmụ anụmanụ ya na-eme ndị mmadụ obi ụtọ. Ma, amụma Baịbụl kwuru hoo haa na ma okpukpe ụgha ma ihe fọdụrụ n’ajọ usoro ihe a agaghị alanahụ ọgwụgwụ nke ga-abịa n’oge na-adịghị anya. (Mkpu. 18:4-8) Ka ndị niile, bụ́ ndị ohu Chineke, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, cheta na ha kwesịrị ime ike ha niile iji dịrị njikere maka ụbọchị Jehova dị ka Noa na ezinụlọ ya mere. Anyị bi n’ụwa nke na-enupụrụ Chineke isi, bụ́ ebe ndị na-ezi ozizi ụgha n’okpukpe dị iche iche nakwa ndị na-amaghị ma Chineke ọ̀ dị, nakwa ndị na-ekweghị na ọ dị, na-eji okwu ọnụ ha akwa Onye kere anyị emo. Ma, anyị agaghị ekwe ka ha duhie anyị. Ka anyị na-echeta ndị gosiri na ha dị njikere, bụ́ ndị anyị tụlere n’isiokwu a, ka anyị mụrụkwa anya wee mara mgbe anyị ga-egosi na ọ bụ ọchịchị Jehova kacha mma nakwa mgbe anyị ga na-erubere ya isi n’ihi na ọ bụ “Chi kasị chi niile.” N’eziokwu, ọ bụ “Chineke ukwu, onye dị ike ma dị egwu.”—Diut. 10:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe “otu narị afọ na iri abụọ” e kwuru okwu ya na Jenesis 6:3 pụtara, gụọ Ụlọ Nche Disemba 15, 2010, peeji nke 30.

Ì Chetara?

• Gịnị mere Noa ji bute adịm ná mma ndị ezinụlọ ya na Chineke ụzọ?

• Olee otú oge anyị si yie oge Noa dị ndụ?

• N’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara Mozis, gịnị mere o ji lekwasị anya ná nkwa dị iche iche Jehova kwere?

• Olee amụma Baịbụl ndị na-eme ka ị mụrụ anya?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 25]

Noa na ezinụlọ ya ji ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ Jehova

[Foto dị na peeji nke 26]

Nkwa dị iche iche Chineke kwere, bụ́ ndị Mozis ma na ha ga-emezurịrị, nyeere ya aka ịmụrụ anya