Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụrụ Anya Ka Jeremaya

Mụrụ Anya Ka Jeremaya

Mụrụ Anya Ka Jeremaya

‘Jehova mụ anya imezu ihe o kwuru.’—JERE. 1:12.

1, 2. Gịnị mere e ji jiri otú Jehova si ‘mụrụ anya’ tụnyere osisi almọnd?

N’UGWU ndị dị na Lebanọn na n’Izrel, osisi almọnd so n’osisi ndị na-ama ifuru ngwa ngwa. Ọ na-ama ifuru ná ngwụcha ọnwa Jenụwarị ma ọ bụ ná mmalite ọnwa Febụwarị. Ifuru ya na-ama mma ma na-acha ọcha ma ọ bụ pinki pinki. Ihe aha Hibru ya pụtara bụ “onye na-ebili ngwa ngwa.”

2 Mgbe Jehova họọrọ Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma ya, e ji otú a osisi almọnd si ama ifuru ngwa ngwa mee otu ihe atụ dị mkpa. Mgbe Jeremaya onye amụma malitere ozi ya, e gosiri ya alaka osisi ahụ n’ọhụụ. Gịnị ka ọ pụtara? Jehova kwuru, sị: “Amụ m anya imezu ihe m kwuru.” (Jere. 1:11, 12) E nwere ike ikwu na Jehova ‘biliri n’isi ụtụtụ,’ otú ahụ osisi almọnd si ‘ebili ngwa ngwa,’ ka o wee ziga ndị amụma ya ka ha gaa gwa ndị ya ihe isi ha na-enupụrụ ya ga-akpatara ha. (Jere. 7:25) Jehova agaghịkwa ezu ike, ya bụ, ọ ‘ga-amụ anya’ ruo mgbe amụma ndị o buru mezuru. N’afọ 607 T.O.A., ikpe Jehova mara mba Juda nke dapụrụ n’ezi ofufe mezuru kpọmkwem n’oge ọ kara aka.

3. Olee ihe obi siri anyị ike na Jehova ga-eme?

3 Taakwa, Jehova mụ anya ka o wee mezuo uche ya. O nweghị ike ịhapụ imezu ihe o kwuru. Gịnị ka anya Jehova mụ ka o wee mezuo ihe o kwuru kwesịrị ime ka i mee? Ì kwetara na Jehova ‘mụ anya’ n’afọ a bụ́ 2011 ka o wee mezuo nkwa ndị o kwere? Ọ bụrụ na anyị ka na-enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ ga-emezu nkwa ndị o kwere, anyị kwesịrị isi n’ụra ime mmụọ teta ozugbo. (Rom 13:11) Ebe Jeremaya bụ onye amụma Jehova, ọ nọgidere na-amụ anya. Ọ bụrụ na anyị atụlee otú Jeremaya si mụrụ anya n’ọrụ Chineke nyere ya nakwa ihe mere o ji mụrụ anya, ọ ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-arụsi ọrụ Jehova nyere anyị ike.

Ozi E Kwesịrị Izi Ngwa Ngwa

4. Olee ihe isi ike Jeremaya nwere mgbe ọ na-ezi ozi Chineke sịrị ya zie, gịnịkwa mere o ji kwesị izi ozi ahụ ngwa ngwa?

4 Ọ ga-abụ na ọ fọrọ obere ka Jeremaya ruo afọ iri abụọ na ise mgbe Jehova mere ya onye nche. (Jere. 1:1, 2) Ma, o chere echiche ka obere nwa wee kwuo na ya erughị eru ịgwa ndị okenye obodo ahụ okwu, bụ́ ndị katara ahụ́ nakwa ndị na-edu mba ahụ. (Jere. 1:6) E dunyere ya ka ọ gaa zie ha ozi banyere ikpe a mara ha, nke bụ́kwanụ ozi na-agbakasị ahụ́ nakwa nke na-emenye ụjọ. Ndị ọ ga-ezi ya karịchaa bụ ndị nchụàjà, ndị amụma ụgha, ndị ọchịchị, nakwa ndị “na-alaghachi n’ụzọ ndị ọzọ na-eso,” bụ́ “ndị ekwesịghị ntụkwasị obi ha na-enweghị nkwụsị.” (Jere. 6:13; 8:5, 6) A ga-akwatu ụlọ nsọ ahụ mara mma Eze Sọlọmọn rụrụ, bụ́ ebe a nọ na-efe Chineke ofufe kemgbe ihe fọrọ obere ka o ruo narị afọ anọ. E nweghị onye ga-ebi na Jeruselem na Juda, a ga-adọrọ ndị bi na ha n’agha. N’eziokwu, ozi a sị Jeremaya gaa zie bụ ozi e kwesịrị izi ngwa ngwa!

5, 6. (a) Olee ọrụ Jehova ji ndị e tere mmanụ na-arụ taa? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle?

5 Taa, Jehova emeerela ụmụ mmadụ ihe ọma họpụta ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị e nwere ike ikwu na ha bụ ndị nche, ka ha dọọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ikpe ọ ga-ekpe ụwa a. Ndị a e tere mmanụ nọ na-agwa ndị mmadụ kemgbe ọtụtụ iri afọ ka ha chebara oge anyị bi na ya echiche. (Jere. 6:17) Baịbụl kwuru na Jehova, bụ́ Onye Ukwu Na-edebe Oge, anaghị egbu oge. Ụbọchị ya ga-abịa kpọmkwem n’oge ọ kara aka, n’oge ụmụ mmadụ na-atụghị anya na ọ ga-abịa.—Zef. 3:8; Mak 13:33; 2 Pita 3:9, 10.

6 Buru n’obi na Jehova mụ anya nakwa na ọ ga-eweta ụwa ọhụrụ ya n’oge ọ kara aka. Ịmara nke a kwesịrị ime ka ndị e tere mmanụ na ndị enyi ha raara onwe ha nye Chineke mara na ha kwesịrị izi ndị mmadụ ozi Jehova ngwa ngwa. Gịnị ka nke a kwesịrị ime ka i mee? Ọ̀ bụ na o kwesịghị ime ka ị na-ekwusasikwu ozi ọma ike? Jizọs gosiri na anyị ikwusasikwu ozi ọma ike ga-eme ka mmadụ niile nwee ike ikpebi ma hà ga-efe Chineke ma ọ bụ na ha agaghị efe ya. Ka anyị tụlee àgwà atọ nyeere Jeremaya aka ịmụrụ anya mgbe ọ na-arụ ọrụ e nyere ya, bụ́ ndị ga-enyekwara anyịnwa aka ịmụrụ anya taa.

Ọ Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya

7. Kwuo otú ịhụnanya si mee ka Jeremaya kwusaa ozi ọma n’agbanyeghị na ọ dịrịghị ya mfe.

7 Olee ihe mere Jeremaya ji jisie ike kwusaa ozi ọma n’agbanyeghị na ọ dịrịghị ya mfe? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. Jeremaya ma na ọ bụ ndị ọzụzụ atụrụ ụgha mere ndị obodo ya ji na-ata ọtụtụ ahụhụ ha na-ata. (Jere. 23:1, 2) Nke a mere ka o jiri ịhụnanya na ọmịiko rụọ ọrụ e nyere ya. Ọ chọrọ ka ndị obodo ya nụ okwu Chineke ma dịrị ndụ. O wutere ya nke ukwuu, ya ebeedị ákwá maka ihe ọjọọ na-aga ime ha. (Gụọ Jeremaya 8:21; 9:1.) Akwụkwọ Abụ Ákwá gosiri nnọọ na Jeremaya ji obi ya dum hụ Jehova n’anya nakwa na aha Jehova na ihe na-eme ndị obodo ya churu ya ụra. (Ákwá 4:6, 9) Taa, ọ bụrụ na ị hụ ndị ‘a gbara akpụkpọ, na-achụsakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha,’ ọ́ naghị emetụ gị n’obi izi ha ozi ọma Alaeze Chineke, bụ́ nke na-akasị obi?—Mat. 9:36.

8. Gịnị gosiri na ahụhụ a tara Jeremaya emeghị ka o wewe iwe?

8 Jeremaya hụsiri anya n’aka ndị ahụ ọ chọrọ inyere aka, ma o megwaraghị ha ma ọ bụ wewe iwe. O diri ihe niile eze ọjọọ bụ́ Zedekaya mere ya, gosikwa Zedekaya obiọma. Mgbe Zedekaya nyefechara ya n’aka ndị iro ya ka ha gbuo ya, Jeremaya nọgidere na-arịọ ya ka o rube isi n’ihe Jehova kwuru. (Jere. 38:4, 5, 19, 20) Ànyị ji obi anyị niile hụ ndị mmadụ n’anya otú Jeremaya si hụ ndị mmadụ n’anya n’oge ọ nọ ndụ?

Chineke Mere Ka O Nwee Obi Ike

9. Olee otú anyị si mara na ọ bụ Chineke mere ka obi kaa Jeremaya?

9 Mgbe Jehova gwara Jeremaya ọrụ ọ ga-arụ, Jeremaya chọwara ụzọ ọ ga-esi gbụrụ isi ya. Nke a na-egosi na obi ike o ji jee ozi ya na otú o si kwụrụ chịm abụghị ihe o bu pụta ụwa. Ihe mere obi ji kaa Jeremaya mgbe ọ na-ebu amụma bụ na ọ tụkwasịrị Chineke obi kpamkpam. N’eziokwu, otú Jehova si nọnyere onye amụma ahụ “dị ka dike dị egwu” bụ na ọ kwadoro ya ma mee ka obi kaa ya ịrụ ọrụ ya. (Jere. 20:11) Otú Jeremaya si jiri obi ike jee ozi ya mere na mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, ụfọdụ ndị chere na Jeremaya esila n’ọnwụ bilie.—Mat. 16:13, 14.

10. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na e nyefeela “mba dị iche iche na alaeze dị iche iche” n’aka ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ?

10 Ebe ọ bụ na Jehova bụ “Eze mba niile,” ọ gwara Jeremaya ka ọ gaa zie mba dị iche iche na alaeze dị iche iche ozi banyere ikpe a ga-ekpe ha. (Jere. 10:6, 7) Ma, olee otú o si bụrụ na e nyefeela “mba dị iche iche na alaeze dị iche iche” n’aka ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ? (Jere. 1:10) Ọkaakaa eluigwe na ụwa enyela ndị e tere mmanụ ọrụ otú ahụ o si nye onye amụma ya bụ́ Jeremaya ọrụ n’oge ochie. N’ihi ya, e nyela ha ikike ka ha gaa n’ụwa niile gwa mba dị iche iche na alaeze dị iche iche banyere ikpe Jehova ga-ekpe ụwa. Ndị a e tere mmanụ ji ikike Onye Kacha Ihe Niile Elu nyere ha nakwa ihe doro anya dị n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ na-agwa ndị mmadụ na Chineke ga-efopụ mba dị iche iche na alaeze dị iche iche dị taa, nakwa na ọ ga-ebibi ha n’oge ọ kara aka nakwa otú o kpebiri isi mee ya. (Jere. 18:7-10; Mkpu. 11:18) Ndị e tere mmanụ kpebisiri ike na ha ga-anọgide na-arụ ọrụ a Chineke nyere ha, ya bụ, ikwusa okwu ikpe Jehova n’ụwa niile.

11. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma mgbe ihe siiri anyị ike?

11 Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịda mbà n’ihi na a na-emegide ya, ma ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ enweghị mmasị n’ozi ọma ọ na-ekwusa, ma ọ bụkwanụ n’ihi na ihe na-esiri ya ike. (2 Kọr. 1:8) Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị a mee ka anyị kwụsị ịrụ ọrụ anyị otú ahụ Jeremaya na-ekweghị ka ha mee ka ọ kwụsị. Adala mbà. Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-ekpeku Chineke ekpere mgbe niile, dabere n’ebe ọ nọ, “nwee nkwuwa okwu,” ma nwee obi ike na ọ ga-enyere ya aka. (1 Tesa. 2:2) Ebe ọ bụ na anyị na-efe Chineke ezi ofufe, anyị kwesịrị ịmụrụ anya na-arụ ọrụ o nyere anyị. Anyị kwesịrị ikpebisi ike na o nweghị ihe ga-eme ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma banyere mbibi a ga-ebibi Krisendọm, bụ́ nke mbibi e biri Jeruselem na-ekwesịghị ntụkwasị obi na-anọchite anya ya. Ndị e tere mmanụ ga-ekwusa ma “afọ Jehova na-egosi ihu ọma ya” ma “ụbọchị Chineke anyị ga-abọ ọbọ.”—Aịza. 61:1, 2; 2 Kọr. 6:2.

O Nwere Ezigbo Ọṅụ

12. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na Jeremaya nọgidere na-enwe ọṅụ, oleekwa isi ihe nyeere ya aka ịnọgide na-enwe ọṅụ?

12 Ọrụ Jeremaya rụrụ nyere ya ọṅụ. Ọ gwara Jehova, sị: “Okwu gị ruru m aka, m wee rie ya; okwu gị wee bụrụ ihe na-enye m ọṅụ na ihe na-eme ka obi tọọ m ụtọ; n’ihi na a kpọkwasịwo m aha gị, Jehova Chineke.” (Jere. 15:16) Jeremaya weere na ịnọchite anya ezi Chineke na ikwusa ozi ọma bụ ihe ùgwù. Anyị kwesịrị icheta na Jeremaya kwụsịrị inwe ọṅụ mgbe ọ bụla o chere banyere emo a na-akwa ya. Ma, ọ na-enweghachi ọṅụ ma o cheta na ozi ọ na-ezi bụ ozi ọma, na ozi dị mkpa.—Jere. 20:8, 9.

13. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-amụ eziokwu ndị miri emi dị n’Okwu Chineke ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-enwe ọṅụ?

13 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-enwe ọṅụ n’ozi ọma anyị na-ekwusa taa, anyị kwesịrị ịna-eri “nri siri ike,” ya bụ, eziokwu ndị miri emi dị n’Okwu Chineke. (Hib. 5:14) Okwukwe anyị ga-esi ike ma ọ bụrụ na anyị na-amụ ihe nke ọma. (Kọl. 2:6, 7) Nke a na-eme ka anyị ghọta otú àgwà anyị na-akpa si emetụ Jehova n’obi. Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike iwepụta oge na-agụ Baịbụl ma na-amụ ya, anyị kwesịrị ịhazigharị oge anyị. Ọ bụrụgodị na ọ bụ naanị nkeji ole na ole ka anyị wepụtara kwa ụbọchị mụọ okwu Chineke ma chebara ihe anyị mụrụ echiche, ọ ga-eme ka anyị bịarukwuo Jehova nso, meekwa ka anyị na-enwe ‘ọṅụ, obi ana-atọkwa anyị ụtọ’ otú ahụ o si tọọ Jeremaya.

14, 15. (a) Olee ihe si n’ikwesị ntụkwasị obi Jeremaya ji rụọ ọrụ e nyere ya pụta? (b) Gịnị ka ndị Chineke ma taa banyere ozi ọma ha na-ekwusa?

14 N’agbanyeghị na Jeremaya nọgidere na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị, na-agwakwa ha banyere ikpe Jehova, o chefughị ọrụ e nyere ya ka ọ “na-ewu ihe ma na-akụ mkpụrụ.” (Jere. 1:10) Ihe ọma si n’ọrụ iwu ihe na ịkụ mkpụrụ ọ rụrụ pụta. O mere ka ụfọdụ ndị Juu nakwa ndị ọzọ na-abụghị ndị Izrel lafere mbibi e bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Rikab, Ibed-melek, na Barọk. (Jere. 35:19; 39:15-18; 43:5-7) Ndị a bụ́ ezigbo ndị enyi Jeremaya, ndị na-atụkwa egwu Chineke, na-anọchite anya ndị nwere olileanya ibi n’ụwa taa, bụ́ ndị metere ndị e tere mmanụ enyi. Ndị e tere mmanụ ji obi ụtọ na-enyere “oké ìgwè mmadụ” aka ka okwukwe ha sie ike. (Mkpu. 7:9) Ndị enyi a ndị nọsiri ike n’akụkụ ndị e tere mmanụ jikwa obi ụtọ dị ukwuu na-enyere ndị nwere ezi obi aka ịmụta eziokwu.

15 Ndị Chineke ma na ozi ọma ha na-ekwusa abụghị naanị na ha na-ejere ọhaneze ndị nụrụ ya ozi, kamakwa ha si otú a na-efe Chineke anyị. Ma ndị mmadụ hà gere anyị ntị ma ọ bụ na ha egeghị, ikwusa ozi ọma, nke bụ́ ozi dị nsọ anyị na-ejere Jehova, na-enye anyị ọṅụ dị ukwuu.—Ọma 71:23; gụọ Ndị Rom 1:9.

‘Mụrụ Anya’ Na-arụ Ọrụ Gị!

16, 17. Olee otú Mkpughe 17:10 na Habakọk 2:3 si gosi na anyị kwesịrị ime ihe ngwa ngwa n’oge a anyị bi na ya?

16 Ọ bụrụ na anyị agụọ amụma e buru ná Mkpughe 17:10, anyị ga-achọpụta na anyị kwesịrị imekwu ihe ngwa ngwa n’ihi oge anyị bi na ya. Eze nke asaa, ya bụ, Briten na Amerika, na-achịzi ụwa. Anyị na-agụ banyere ya, sị: “Mgbe ọ [ya bụ, eze nke asaa ga-achị ụwa] ga-abịa, ọ ghaghị ịnọru nwa oge.” Ọ fọrọ obere ugbu a ka “nwa oge” ahụ gwụchaa. Habakọk onye amụma mere ka obi sie anyị ike na a ga-ebibi usoro ihe ọjọọ a mgbe ọ sịrị: “Ọhụụ a bụ maka oge a kara aka . . . Na-atụ anya ya; n’ihi na ọ ga-emezurịrị. Ọ gaghị anọ ọdụ.”—Hab. 2:3.

17 Jụọ onwe gị, sị: ‘Otú m si ebi ndụ ọ̀ na-egosi na m ma na oge a anyị bi na ya agwụla agwụ? Otú m si ebi ndụ ọ̀ na-egosi na m chọrọ ka ọgwụgwụ bịa ngwa ngwa? Ka mkpebi ndị m na-eme na ihe ndị m na-ebute ụzọ ná ndụ m hà na-egosi na m naghị atụ anya na ọgwụgwụ ga-abịa ngwa ngwa ka hà na-egosi na obi akaghị m na ọ ga-abịa?’

18, 19. Gịnị mere na ugbu a abụghị oge anyị kwesịrị ịda mbà?

18 Ndị e tere mmanụ arụchabeghị ọrụ e nyere ha. (Gụọ Jeremaya 1:17-19.) Obi dị anyị nnọọ ụtọ na ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ kwụ chịm, dị ka “obodo e wusiri ike na ogidi ígwè.” Ha weere “eziokwu kee úkwù” ha, ya bụ, ha kwere ka Okwu Chineke na-ewusi ha ike ruo mgbe ha ga-arụcha ọrụ Chineke nyere ha. (Efe. 6:14) Oké ìgwè mmadụ kpebisikwara ike ime otú ahụ. Ha na-akwadosi ndị e tere mmanụ ike n’ọrụ Chineke nyere ha.

19 Ugbu a abụghị oge anyị kwesịrị ịda mbà n’ozi anyị na-ejere Chineke kama ọ bụ oge anyị kwesịrị ichebara ihe e kwuru na Jeremaya 12:5 echiche. (Gụọ.) Anyị niile nwere ọnwụnwa anyị ga-edi. E nwere ike iji ọnwụnwa ndị a tụnyere “ndị ji ụkwụ,” bụ́ ndị anyị na ha ga-agbarịrị ọsọ. Ma, ka “oké mkpagbu” na-eru nso, anyị ga-atụ anya na ihe ga-esikwuru anyị ike. (Mat. 24:21) E nwere ike iji otú anyị si agbasi mbọ ike ka anyị wee merie ihe isi ike ndị tara akpụ anyị na-enwe tụnyere iso “ịnyịnya gbaa ọsọ.” Onye so ịnyịnya nke na-awụ awụ na-agba ọsọ kwesịrị inwe ezigbo ntachi obi. N’ihi ya, ọ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị edie ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ugbu a, n’ihi na ọ ga-eme ka anyị nwee ike idi ndị ka ga-abịara anyị.

20. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

20 Anyị niile nwere ike ime ka Jeremaya ma rụọ ọrụ ikwusa ozi ọma e nyere anyị nke ọma. Àgwà ndị dị ka ịhụnanya, obi ike, na ọṅụ mere ka Jeremaya nwee ike iji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi nke were ya iri afọ isii na asaa. Ifuru ahụ mara mma osisi almọnd na-ama na-echetara anyị na Jehova ‘ga-amụ anya’ ka o wee mezuo ihe o kwuru. N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịmụrụ anya. Jeremaya ‘mụ anya’ n’oge ya, anyị ga-emelikwa otú ahụ.

Ì Chetara?

• Olee otú ịhụnanya si nyere Jeremaya aka ‘ịmụrụ anya’ mgbe ọ na-arụ ọrụ e nyere ya?

• Gịnị mere o ji dị mkpa ka Chineke mee ka anyị nwee obi ike?

• Gịnị nyeere Jeremaya aka ịnọgide na-enwe ọṅụ?

• Gịnị mere i ji kwesị ịnọgide ‘na-amụ anya’?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ị̀ ga-anọgide na-ekwusa ozi ọma ọ bụrụgodị na a na-emegide gị?