Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“Ebu M Ụlọ M Na-agagharị”

“Ebu M Ụlọ M Na-agagharị”

N’AGBATA ọnwa asatọ na ọnwa itoolu n’afọ 1929, ihe karịrị puku ndị nkwusa iri ji abalị itoolu kwusaa ozi ọma kpọtụrụ akpọtụ n’Amerịka. Akwụkwọ ha nyefere ndị mmadụ dị narị puku abụọ na iri puku ise. Ihe dị ka otu puku ndị kọpọtụa so kwusaa ozi ọma ahụ. Ọnụ ọgụgụ ha amụbaala n’oge ahụ. Akwụkwọ bụ́ Bulletin * kwuru na ‘o juru onye ọ bụla anya’ na n’afọ 1929, ndị ọsụ ụzọ ji okpukpu atọ karịa ole ha dị n’afọ 1927.

Ná ngwụcha afọ 1929, e nwere ezigbo ụkọ ego. Na Tuzdee, abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa iri n’afọ ahụ, ego ole a na-ere aka òkè dara na Niu Yọk. Ihe a merenụ kpatara oké ihe isi ike n’ụwa niile. Ọtụtụ puku ụlọ akụ̀ dara. A kwụsịrị ịrụ ọrụ n’ugbo nakwa n’ebe dị iche iche a na-akpa anụ. Nnukwu ụlọ ọrụ dị iche iche mechiri. A chụrụ ọtụtụ nde mmadụ n’ọrụ. N’afọ 1933, a na-achụpụ ihe ruru otu puku mmadụ n’ụlọ ha kwa ụbọchị n’ihi na ha akwụlighị ego ha gbazitere rụọ ya.

Olee ihe nyeere ndị ozi oge niile aka ịna-eje ozi ha n’oge ahụ ihe siri ezigbo ike? Otu ihe nyeere ha aka bụ ụgbọala e ji mere ụlọ. A naghị akwụrụ ya ụgwọ ụlọ. A naghịkwa atụrụ ya ụtụ isi. O nyeere ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ aka ịna-eje ozi ha n’emefughị nnukwu ego. * Ndị nwe ya na-ebi na ya n’oge mgbakọ n’akwụghị ụgwọ ụlọ. N’afọ 1934, akwụkwọ bụ́ Bulletin tụrụ aro otú e nwere ike isi rụọ ụdị ụlọ ahụ na-ebughị oké ibu. Ma, a ga-etinye ya ihe ndị dị mkpa dị ka ebe mmiri ga-esi na-agba, stov, àkwà a na-akwachi akwachi, na ihe ga-eme ka oyi ghara ịna-atụ mmadụ.

Ndị ọsụ ụzọ n’ụwa niile malitere ịrụ ụgbọala e ji mere ụlọ. Nwanna Victor Blackwell kwuru, sị: ‘Mgbe Chineke gwara Noa ka ọ rụọ ụgbọ, Noa arụtụbeghị ụgbọ. Mụnwa arụtụbeghị ụgbọala e ji mere ụlọ. Amaghịkwa m otú e si arụ ya.’ Ma, nwanna a mechara rụọ ya.

Ihe a bụ ụgbọala e ji mere ụlọ. A chọrọ iji ụgbọ mmiri bufee ya osimiri n’oge udu mmiri n’India

Avery Bristow na nwunye ya bụ́ Lovenia nwere ụgbọala ha ji mere ụlọ. Nwanna Avery kwuru, sị: “Ebu m ụlọ m na-agagharị otú ahụ mbe na-ebu okpokoro ya agagharị.” Ndị ha na ha so na-asụ ụzọ bụ Nwanna Harvey Conrow na nwunye ya bụ́ Anne. Hanwa nwekwara ụgbọala ha ji mere ụlọ. Ma, ihe ha ji machie ahụ́ ya bụ akwụkwọ siri ike. Mgbe ọ bụla ha mechara buru ụgbọala ha gawa ebe ọzọ, akwụkwọ ahụ ha ji machie ahụ́ ụgbọala ahụ na-adapụsị. Avery kwuru, sị: “O nweghị onye hụtụrụla ụdị nnukwu ụgbọala ahụ. A hụtụbeghịkwa ụdị ya kemgbe ahụ.” Ma Avery kwuru na ya ahụtụbeghị ndị nwere obi ụtọ ka Nwanna Conrow na nwunye ya na ụmụ ha ndị nwoke abụọ. Harvey Conrow dere, sị, “O nweghị ihe kọrọ anyị. Obi ruru anyị ala n’ozi anyị na-ejere Jehova. O lekọtakwara anyị.” Ha anọ mechara gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied, e ziga ha Peruu ka ha gaa jewe ozi ala ọzọ.

Nwanna Giusto Battaino na ezinụlọ ya sụkwara ụzọ n’oge ahụ. Mgbe ọ matara na nwunye ya bụ́ Vincenza adịla ime, ha rụgharịrị nnukwu ụgbọala ha ka ọ bụrụ ụlọ. O yiri họtel mara ezigbo mma ma e jiri ya tụnyere ụlọikwuu ha bibu na ya. Mgbe ha mụrụ  nwa ha nwaanyị, ha ka nọkwa na-asụ ụzọ, nke bụ́ ozi na-atọ ha ụtọ. Ndị ha na-ezi ozi ọma bụ ndị Ịtali bi n’Amerịka.

Ọtụtụ ndị gere ntị n’ozi ọma. Ma, ndị ogbenye na ndị na-enweghị ọrụ anaghị enyekarị ego ma e nye ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Kama inye ego, ha na-enye ụdị ihe dị iche iche. Ndị ọsụ ụzọ abụọ dere ihe iri isii na anọ ndị nwere mmasị nyere ha. Ihe ndị ahụ ha dere “dị ka ihe e depụtachara n’ebe a na-ere ihe.”

Otu nwanna aha ya bụ Fred Anderson hụrụ otu nwoke bụ́ onye ọrụ ugbo. Nwoke ahụ chọrọ ka e nye ya akwụkwọ anyị, ma o nweghị ego. O nyere nwanna ahụ enyo anya mama ya maka akwụkwọ ahụ. N’ugbo ọzọ, otu nwoke chọrọ ịgụ akwụkwọ anyị kwuru, sị: “Enweghị m enyo anya m ga-eji agụ ya.” Nwanna Anderson nyere ya enyo anya ahụ onye agbata obi ya nyere. Mgbe o kpuuru ya, ọ gụtara ihe e dere n’akwụkwọ ahụ. Obi tọrọ nwoke ahụ ụtọ, ya enye onyinye maka akwụkwọ ahụ na enyo anya ahụ.

Nwanna Herbert Abbott nwere obere ngịga a na-etinye ọkụkọ n’ụgbọala ya. Ọkụkọ e nyere ya ruo atọ ma ọ bụ anọ, ya agaa ree ha n’ahịa, jiri ego o retara ha gbajuo ụgbọala ya mmanụ. O kwuru na o nwere mgbe ego na-akọ ha. Ma, o meghị ka ha kwụsị ozi ha. O kwukwara na ọ bụrụhaala na mmanụ dị n’ụgbọala ha, ha na-agawa ozi ọma, nwee okwukwe na Jehova, tụkwasịkwa ya obi.

Ihe nyeere ndị Jehova aka n’oge ahụ tara akpụ bụ na ha tụkwasịrị ya obi ma kpebisie ike ịna-ejere ya ozi. Dị ka ihe atụ, e nwere otu ụbọchị mmiri na-ezosi ike. Ozugbo Nwanna Maxwell Lewis na nwunye ya bụ́ Emmy si n’ụgbọala ha pụta, ha hụrụ ka otu osisi dakwasịrị ya, tiwaa ya abụọ. Maxwell dere, sị: “Ihe ndị a abụrụghị anyị nsogbu. Anyị weere ha ka ihe ndị na-eme eme. O nweghịkwa mgbe anyị chere echiche ịkwụsị ozi anyị na-eje. Ihe a ga-arụ buru ibu. Anyị chọkwara ịna-arụ ya.” Maxwell na Emmy atụghị ụjọ ọ bụla. Ezigbo ndị enyi ha nyeere ha aka ha arụzie ụgbọala ahụ ha ji mere ụlọ.

N’oge anyị a tara akpụ, ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova na-ejikwa obi ha niile ewepụta onwe ha na-ejere Jehova ozi. A sị ka e kwuwe, anyị na-eme ka ndị ọsụ ụzọ mbụ ahụ. Anyị kpebisiri ike ịna-ekwusa ozi ọma ruo mgbe Jehova ga-asị na o zuola.

^ para. 3 Nke a na-akpọ Ozi Alaeze Anyị ugbu a.

^ para. 5 N’oge ahụ, ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ anaghị arụ ọrụ ego. Ha na-enweta akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’ọnụ ala. Ha nye ya ndị mmadụ, ha ejirizie ego e nyere ha na-egbo mkpa ha.