Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Jeremaya kwuru na Rechel na-akwara ụmụ ya ákwá. Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?
Jeremaya 31:15 kwuru, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘A na-anụ olu ákwá arịrị na ákwá dị ilu na Rema; Rechel na-akwara ụmụ ya ákwá. O kweghị ka a kasie ya obi n’ihi ụmụ ya, n’ihi na ha anọkwaghị.’ ”
Rechel bu ụmụ ya abụọ ụzọ nwụọ. N’ihi ya, ihe Jeremaya dere otu puku afọ Rechel nwụchara nwere ike ịdị ka o meghị eme.
Aha ọkpara Rechel bụ Josef. (Jen. 30:
Anyị kwesịrị icheta na Josef bụ́ ọkpara Rechel mechara mụọ Manase na Ifrem. (Jen. 41:
Tupu e dee akwụkwọ Jeremaya, ndị Asiria emeriela alaeze ebe ugwu Izrel, dọrọkwa ọtụtụ n’ime ndị bi n’ebe ahụ n’agha. Ma, ọ ga-abụ na ụfọdụ ndị Ifrem gbagara Juda n’oge ahụ. N’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị Babịlọn meriri Juda na Benjamin, bụ́ alaeze abụọ dị n’ebe ndịda Izrel ma dọrọ ha n’agha. A kpọọrọ ọtụtụ n’ime ha gaa Rema, nke dị ihe dị ka kilomita asatọ ma e si n’ebe ugwu Jeruselem gawa ya. (Jere. 40:1) O nwere ike ịbụ na e gburu ụfọdụ n’ime ha n’ebe ahụ, ya bụ, n’ókèala Benjamin, bụ́ ebe e liri Rechel. (1 Sam. 10:2) N’ihi ya, mgbe Jeremaya kwuru na Rechel na-ebere ụmụ ya ákwá, o nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu gbasara uju a na-eruru ụmụ Benjamin niile e gburu ma ọ bụkwanụ ndị e gburu na Rema. O nwekwara ike ịbụ na Jeremaya na-ekwu gbasara ákwá ndị nne niile nọ n’Izrel bere n’ihi ndị Chineke e gburu ma ọ bụ dọrọ n’agha.
Nke ọ bụla ọ sọrọ ya bụrụ, ihe Jeremaya kwuru gbasara ákwá Rehab kwaara ụmụ ya gosiri ihe ga-eme mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, ya bụ, mgbe Jizọs dị obere, Eze Herọd achọọ igbu ya. Eze Herọd nyere iwu ka e gbuo ụmụaka niile bụ́ ndị nwoke na Betlehem, malite ná ndị gbara afọ abụọ gbadaa. Betlehem dị n’ebe ndịda Jeruselem. N’ihi ya, ụmụaka ndị ahụ e gburu anọghịzi, ya bụ, ha nwụrụ. Chegodị otú obi dị ụmụ nwaanyị ndị ahụ e gburu ụmụ ha. E nwere ike ikwu na a nụrụ ákwá ha na Rema, nke dị nso n’ebe ugwu Jeruselem.
N’ihi ya, ma n’oge Jeremaya ma n’oge Jizọs nọ n’ụwa, otú o si bụrụ na Rechel na-akwara ụmụ ya ákwá bụ na ndị nne bụ́ ndị Juu ruru uju n’ihi ụmụ ha e gburu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị nọ “n’ala ndị iro,” ya bụ, ndị nwụrụ anwụ, nwere ike ịlọta mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ.