Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma

IKWUSA ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa a na-arụ n’ụwa taa. Ebe ị bụ ohu Jehova, o doro anya na ị ghọtara na mmadụ iso na-eme ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ihe ùgwù. Ma mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri ndị ọsụ ụzọ na ndị nkwusa ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

Gịnị ga-enyere gị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?

Ọ na-esiri ụfọdụ ndị nkwusa ike ịhụ onye ha ga-ezi ozi ọma mgbe ha nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị anaghị anọ n’ụlọ. Ọ bụrụgodị na a hụ ha n’ụlọ, o nwere ike ịbụ na ha achọghị ịnụ ozi ọma ma ọ bụkwanụ na ha achọdịghị iji anya ahụ anyị. E nwekwara ndị nkwusa ike na-agwụ n’ihi na ebe ha na-ekwusa ozi ọma buru ezigbo ibu, bụrụkwa ebe ndị mmadụ na-ege ntị nke ọma, ma ha ana-eche ma hà ga-arụchali ebe ahụ. Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ ụmụnna ekwusaala ozi ọma ruo ọtụtụ afọ karịa otú ha tụrụ anya ya. N’ihi ya, ike na-agwụzi ha.

Ò kwesịrị iju anyị anya na e nwere nsogbu ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma? Mbanụ. A sị ka e kwuwe, anyị bi n’ụwa “ajọ onye ahụ” bụ́ Ekwensu na-achị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụ anya na ikwusa eziokwu na-enye ndụ agaghị adị mfe.—1 Jọn 5:19.

N’agbanyeghị nsogbu i nwere n’ikwusa ozi ọma, ka obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka imeri ya. Oleekwanụ ihe ị ga-eme ka i nwee ike ijikwu ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma? Ka anyị leba anya n’aro ụfọdụ.

NA-ENYERE NDỊ NKWUSA ỌHỤRỤ AKA

Kwa afọ, a na-eme ọtụtụ puku ndị ọhụrụ baptizim, ha aghọọ Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụ na ọ dịbeghị anya e mere gị baptizim, o doro anya na i nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka ndị na-ekwusa ozi ọma kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ bụrụ na i kwusaala ozi ọma ọtụtụ afọ, ọ́ gaghị adị mma ka i nye aka zụọ ndị ọhụrụ? I mee otú ahụ, ọ ga-aba ezigbo uru.

Jizọs maara na e kwesịrị ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe ka ha nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma nke ọma. N’ihi ya, ọ kụziiri ha otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma. (Luk 8:1) Taakwa, e kwesịrị ịkụziri ndị ọhụrụ otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma nke ọma.

Anyị ekwesịghị iche na ọ bụrụhaala na onye ọhụrụ na-aga ozi ọma, ọ ga-amụta otú e si ezi ozi ọma nke ọma. E kwesịrị inwe onye ga-eji obiọma na ndidi kụziere ya otú ọ ga-esi na-ezi ozi ọma nke ọma. E kwesịrị ịkụziri onye nkwusa ọhụrụ (1) otú ọ ga-esi na-akwado ihe ọ ga-ekwu n’ozi ọma, (2) otú ọ ga-esi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, ma ndị nọ n’ụlọ ma ndị na-aga n’ụzọ, (3) otú ọ ga-esi na-enye ndị mmadụ akwụkwọ, (4) otú ọ ga-esi gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, nakwa (5) otú ọ ga-esi na-amalite ọmụmụ Baịbụl. O doro anya na onye nkwusa ọhụrụ ga-amụta otú e si ezi ozi ọma nke ọma ma ọ bụrụ na ọ na-eleru anya ala ma na-eme ihe a na-akụziri ya. (Luk 6:40) Obi ga-adịkwa ya mma na e nwere onye ya na ya so nke ga-enyere ya aka ma ọ́ dị mkpa. Onye nkwusa ọhụrụ ga-emekwa nke ọma ma ọ bụrụ na a na-aja ya mma ma na-atụrụ ya aro ndị ga-enyere ya aka.—Ekli. 4:9, 10.

GỊ NA ONYE GỊ NA YA SO AGA OZI ỌMA KPARỊTAWA ỤKA

N’agbanyeghị mbọ niile ị na-agba ka i zie ndị mmadụ ozi ọma, o nwere mgbe ụfọdụ ị ga-aga ozi ọma, ya abụrụ na o nweghị ezigbo ihe gị na mmadụ kwurịtara ma e wepụ nke gị na onye gị na ya so gaa ozi ọma kwurịtara. Cheta na Jizọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya “abụọ abụọ” ka ha gaa kwusaa ozi ọma. (Luk 10:1) Ka mmadụ abụọ na-arụ n’ozi ọma, onye nke ọ bụla ga na-agba ibe ya ume, na-enyekwara ibe ya aka. N’ihi ya, anyị na nwanna gaa ozi ọma, anyị kwesịrị iji oge ahụ ‘na-agbarịta ibe anyị ume.’—Rom 1:12.

Olee ihe ndị unu nwere ike ikwurịta? È nwere ihe mere mgbe ị gara ozi ọma n’oge na-adịbeghị anya nke gbara gị ume? È nwere ihe tọrọ gị ụtọ ị mụtara mgbe naanị gị na-amụ ihe ma ọ bụ mgbe gị na ndị ezinụlọ gị na-amụ ihe? È nwere ihe ị nụrụ n’ọmụmụ ihe gbara gị ume? Oge ụfọdụ, onye gị na ya na-arụ nwere ike ịbụ onye ị na-amachaghị. I nwere ike ịjụ ya otú o si bata n’ọgbakọ. Gịnị mere obi ji sie ya ike na ihe a bụ nzukọ Jehova? Olee ihe ùgwù ndị o nwere ma ọ bụ ihe ndị merela ná ndụ ya? I nwekwara ike ịkọrọ ya ihe ndị merela ná ndụ gị. Ma ndị mmadụ hà gere ntị n’ozi ọma ma ọ bụ na ha egeghị, gị na mmadụ ịrụ n’ozi ọma ga-eme ka unu na-agbarịta ibe unu ume.—1 Tesa. 5:11.

NA-AMỤ IHE NKE ỌMA

Ihe ga-enyere anyị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma bụ ịna-amụ ihe nke ọma. “Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ebipụta isiokwu dị iche iche anyị nwere ike ịmụ. (Mat. 24:45) N’ihi ya, e nwere ọtụtụ isiokwu i nwere ike ịmụ. Otu ihe mmadụ nwere ike ịmụ bụ: Olee ihe ndị mere ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke ji dị ezigbo mkpa? E dere ụfọdụ n’ime ha n’igbe bụ́ “Gịnị Mere Ị Ga-eji Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma?”

Ichebara ihe ndị dị n’igbe ahụ echiche ga-enyere gị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Gbalịa mee nchọnchọ ka ị hụ ihe ndị ọzọ mere ikwusa ozi ọma ji dị mkpa. Chebara ihe ndị ahụ na amaokwu Baịbụl ndị na-akwado ha echiche. Ime otú ahụ ga-eme ka i jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

NA-ANABATA ARO NDỊ A NA-ATỤRỤ ANYỊ

Nzukọ Jehova na-atụrụ anyị aro ndị ga-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, e wezụga ozi ụlọ n’ụlọ, anyị nwere ike iji akwụkwọ ozi ma ọ bụ ekwentị zie ndị mmadụ ozi ọma. Anyị nwekwara ike izi ha ozi ọma n’okporo ámá, n’ebe ndị mmadụ na-achụ nta ego, ma ọ bụ n’ebe ọzọ ndị mmadụ na-anọkarị. Anyị nwekwara ike izi ndị mmadụ ozi ọma mgbe anyị na-anọghị n’ozi. Ihe ọzọ anyị nwere ike ime bụ ịhazi ihe anyị na-eme ka anyị nwee ike ịga kwusaa ozi ọma n’ókèala a na-adịghị ezikarị ozi ọma na ya.

Ị̀ na-anabata aro ndị a na-atụrụ anyị? Ị̀ na-agbalị ime ihe ndị ahụ a tụrụ n’aro? Obi dị ọtụtụ ndị merela otú ahụ ụtọ. Legodị atọ n’ime aro ndị ahụ.

Nke mbụ bụ aro gbara n’Ozi Alaeze Anyị gbasara otú anyị ga-esi na-amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Mgbe otu nwanna nwaanyị a na-akpọ April gụchara ya, ọ gwara mmadụ atọ ya na ha na-arụkọ ọrụ ka ha na ya mụwa Baịbụl. Obi dị ya ezigbo ụtọ na ha atọ kwetara, malitekwa ịbịa ọmụmụ ihe.

Nke abụọ bụ gbasara inye ndị mmadụ magazin. A gbara anyị ume ka anyị na-achọ ndị ga-enwe mmasị n’isiokwu gbara na magazin anyị. Otu onye nlekọta sekit n’Amerịka kwuru na n’otu ebe, o nyere ndị isi ụlọ ahịa niile na-ere taya Teta! kwuru gbasara taya. Ya na nwunye ya wegakwaara ihe karịrị otu narị ndị dọkịta nọ na sekit ya Teta! kwuru gbasara ndị dọkịta. Nwanna ahụ kwuru, sị: “Anyị ji oge ndị ahụ anyị gara inye magazin ahụ gwa ha ndị anyị bụ, gwakwa ha gbasara akwụkwọ anyị. Kemgbe anyị na ha matachara, ọ na-abụzi anyị gụrụ gụrụ, anyị agaa leta ha.”

Aro nke atọ gbasara iji ekwentị ezi ndị mmadụ ozi ọma. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Judy degaara isi ụlọ ọrụ anyị akwụkwọ ma kwuo na obi dị ya ụtọ maka otú e si gbaa ụmụnna ume ka ha jiri ekwentị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. O kwuru na mama ya dị iri afọ asatọ na isii ahụ́ na-adịghị na-esizi otú a ezi ndị mmadụ ozi ọma mgbe niile nakwa na obi dị ya ezigbo ụtọ n’ihi na ọ na-eji ekwentị amụrụ otu nwaanyị dị afọ iri itoolu na abụọ Baịbụl.

Aro ndị a na-atụrụ anyị n’akwụkwọ anyị na-abara anyị uru. Na-eme ihe ndị a a tụrụ aro ha. Ha ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

KPEBIE IME IHE Ị GA-EMELI

Ihe na-egosi na anyị na-eme nke ọma n’ozi anyị abụghị akwụkwọ ole anyị nyere ndị mmadụ, mmadụ ole anyị na-amụrụ ihe, ma ọ bụ mmadụ ole anyị nyeere aka ka ha ghọọ Ndịàmà Jehova. Chegodị banyere Noa. A gụpụ ndị ezinụlọ ya, mmadụ ole ka o nyeere aka ịbịa fewe Jehova? Ma, o doro anya na o mere nke ọma n’ozi ọma o kwusara. Ihe dị mkpa bụ ka anyị jiri obi anyị niile na-ejere Jehova ozi.—1 Kọr. 4:2.

Ọtụtụ ndị nkwusa achọpụtala na ihe ga-enyere ha aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma bụ ikpebi ime ihe ndị ha ga-emeli. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ? E kwuru ụfọdụ n’ime ha n’igbe bụ́ “Kpebie Ime Ihe Ị Ga-emeli.”

Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ozi ị na-ejere ya baa uru. I mee ihe ahụ i kpebiri, obi ga-adị gị ezigbo ụtọ n’ihi na ị ma na i mere ihe niile i nwere ike ime iji kwusaa ozi ọma.

O doro anya na ọ bụghị mgbe niile ka ikwusa ozi ọma na-adị mfe. Ma, e nwere ihe ndị ị ga-eme ka i nwee ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Gị na onye gị na ya na-arụ n’ozi ọma na-agbarịta ibe unu ume, na-amụ ihe nke ọma, na-emekwa ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-atụrụ anyị n’aro, kpebiekwa ime ihe ndị ị ga-emeli. Nke kacha mkpa bụ icheta na Chineke enyela gị ihe ùgwù iso ná Ndịàmà ya na-ekwusa ozi ọma. (Aịza. 43:10) Obi ga-adị gị ezigbo ụtọ ka i ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.