Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ònye bụ Gọg nke Megọg e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Ezikiel?

Kemgbe ọtụtụ afọ, akwụkwọ anyị na-ekwu na Gọg nke Megọg bụ aha e nyere Setan bụ́ Ekwensu mgbe a chụpụchara ya n’eluigwe. Ihe mere e ji kwuo otú ahụ bụ na akwụkwọ Mkpughe kwuru na ọ bụ Setan ga-abụ onyeisi ndị ga-alụso ndị Chineke ọgụ n’ụwa niile. (Mkpu. 12:1-17) N’ihi ya, anyị cheburu na Gọg bụ aha ọzọ a kpọrọ Setan n’amụma ahụ e buru.

Ma, e nwere ajụjụ ụfọdụ e kwesịrị ichebara echiche banyere ihe ahụ a kọwara. Maka gịnị? Chegodị echiche: Mgbe Baịbụl na-ekwu banyere oge a ga-ebibi Gọg, Jehova kwuru banyere Gọg, sị: “M ga-ewere gị nye nnụnụ na-eri anụ, ụdị nnụnụ ọ bụla, na anụ ọhịa ka ị bụrụ nri ha.” (Ezik. 39:4) Jehova sịkwara: “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na m ga-enye Gọg otu ebe n’ebe ahụ, ya bụ, ebe ili ozu n’Izrel . . . Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli Gọg na ìgwè ndị agha ya niile.” (Ezik. 39:11) Ma, olee otú ‘nnụnụ ndị na-eri anụ na anụ ọhịa’ ga-esi rie Setan ebe ọ bụ mmụọ? Olee otú a ga-esi ‘lie’ ya n’ụwa? Baịbụl mere ka o doo anya na a ga-atụba ya n’abis ruo otu puku afọ, ọ bụghị na a ga-eri ya ma ọ bụ lie ya.—Mkpu. 20:1, 2.

Baịbụl kwuru na a ga-atọpụ ya ma otu puku afọ ahụ gachaa, na “ọ ga-agakwa ka o duhie mba ndị dị na nkuku anọ nke ụwa, bụ́ Gọg na Megọg, ka o wee kpọkọta ha maka ibu agha ahụ.” (Mkpu. 20:8) Oleekwanụ otú Setan ga-esi duhie Gọg ma ọ bụrụ na ọ bụ yanwa bụ Gọg? N’ihi ya, “Gọg” e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Ezikiel na Mkpughe abụghị Setan.

Ònyezi bụ Gọg nke Megọg? Iji zaa ajụjụ a, anyị kwesịrị ịchọpụta onye Baịbụl kwuru ga-alụso ndị Chineke ọgụ. Baịbụl ekwughị naanị banyere ọgụ ‘Gọg nke Megọg’ ga-alụso ndị Chineke, kama o kwukwara banyere ọgụ “eze ugwu” na ‘ndị eze ụwa’ ga-alụso ha. (Ezik. 38:2, 10-13; Dan. 11:40, 44, 45; Mkpu. 17:14; 19:19) Ihe a ọ̀ bụ ọgụ dị iche iche? Ọ dị ka ọ bụghị. Ọ dị ka ọ̀ bụ otu ọgụ ahụ ka Baịbụl kpọrọ aha dị iche iche. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl gwara anyị na mba niile nke ụwa ga-eso lụso ndị Chineke ọgụ ikpeazụ a ga-eme ka agha Amagedọn malite.—Mkpu. 16:14, 16.

Mgbe anyị tụlere amaokwu Baịbụl ndị kwuru banyere ọgụ ikpeazụ a ga-alụso ndị Chineke, o doro anya na Gọg nke Megọg abụghị Setan. Kama, ọ bụ ọtụtụ mba ndị gbakọrọ aka ọnụ. Ọ̀ bụ “eze ugwu” ga-edu ha? Anyị amaghị. Ma, o yiri ka ọ ga-abụ ya n’ihi ihe Jehova kwuru banyere Gọg. Ọ sịrị: “Ị ga-esi n’ala gị bịa, site n’ime ime ebe ugwu, gị na ọtụtụ ndị so gị. Ha niile na-agba ịnyịnya. Ha bụ ìgwè mmadụ, ee, ọtụtụ ndị agha.”—Ezik. 38:6, 15.

Daniel onye amụma, bụ́ onye ya na Ezikiel dịkọrọ ndụ, kwuru banyere eze ugwu, sị: “A ga-enwe akụkọ ga-enye ya nsogbu, nke ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ na ebe ugwu, ọ ga-ejikwa ọnụma gawa ka o kpochapụ ọtụtụ ndị ma laa ha n’iyi. Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya nke dị ka obí eze n’agbata nnukwu oké osimiri na ugwu nsọ nke Ihe Ịchọ Mma; ọ ga-abịarukwa ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.” (Dan. 11:44, 45) Ihe a bụ nnọọ ụdị ihe akwụkwọ Ezikiel kwuru na Gọg ga-eme.—Ezik. 38:8-12, 16.

Gịnịzi ga-eme ma a lụsochaa ndị Chineke ọgụ ikpeazụ? Daniel gwara anyị, sị: “N’oge ahụ, Maịkel [bụ́ Jizọs Kraịst] ga-ebili [n’Amagedọn], bụ́ nnukwu onyeisi ahụ nke guzo ọtọ [kemgbe afọ 1914] n’ihi ụmụ ndị gị. A ga-enwekwa oge ahụhụ [ya bụ, oge oké mkpagbu] nke a na-enwetụbeghị kemgbe e nwere mba ruo n’oge ahụ. N’oge ahụ, ndị gị ga-alanahụ, onye ọ bụla e dere aha ya n’akwụkwọ.” (Dan. 12:1) Mkpughe 19:11-21 kọkwara na Jizọs, bụ́ onye nnọchiteanya Chineke, ga-eme ụdị ihe a.

Ma ònye ka a kpọrọ “Gọg na Megọg” ná Mkpughe 20:8? Ọ bụ ndị niile nupụụrụ Jehova isi ma lụso ndị na-efe ya ọgụ mgbe a ga-ele ụmụ mmadụ ule ikpeazụ ná ngwụcha otu puku afọ ahụ. Ha ga-egosi na ha nwere ụdị obi ọjọọ ahụ ‘Gọg nke Megọg’ nwere, ya bụ, mba ndị ahụ ga-alụso ndị Chineke ọgụ obere oge tupu Amagedọn amalite. Otú ahụ e bibiri mba ndị ahụ n’Amagedọn ka a ga-ebibikwa Gọg na Megọg. (Mkpu. 19:20, 21; 20:9) N’ihi ya, ọ dabara adaba na a kpọrọ ndị ahụ niile nupụụrụ Chineke isi ná ngwụcha otu puku afọ ahụ “Gọg na Megọg.”

Ebe ọ bụ na anyị na-amụsi Okwu Chineke ike, anyị na-atụsi anya ike ịmata onye ga-abụ “eze ugwu” ahụ n’ọdịnihu. N’agbanyeghị onye ga-edu mba niile lụso ndị Chineke ọgụ, ihe abụọ doro anyị anya bụ: (1) A ga-emeri Gọg nke Megọg na ndị agha ya, bibiekwa ha. (2) Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst ga-azọpụta ndị na-efe Chineke, meekwa ka ha baa n’ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe ha ga-ebi n’udo, obi eruokwa ha ala.—Mkpu. 7:14-17.