Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe E Kere Eke Na-egosi Amamihe Chineke

Ihe E Kere Eke Na-egosi Amamihe Chineke

Ihe E Kere Eke Na-egosi Amamihe Chineke

“Ọ bụ ya na-ezi anyị ihe karịa anụ ọhịa nke ụwa, na-emekwa ka anyị mara ihe karịa anụ ufe nke eluigwe.”—JOB 35:11.

NNỤNỤ nwere ikike dị ịtụnanya. Otú ha si efe n’elu na-amasị ndị na-arụ ụgbọelu. Ụdị nnụnụ ụfọdụ na-efe ọtụtụ puku kilomita fefere oké osimiri na-enweghị ihe ịhụwa ama wee feruo ebe ha na-aga n’efughị ụzọ.

Ikike ọzọ pụrụ iche nnụnụ nwere, bụ́ nke na-egosikwa amamihe Onye kere ha, bụ otú ha si akpọrịta òkù na otú ha si eji ubé ha agwarịta ibe ha okwu. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Otú Nnụnụ Si Agwarịta Ibe Ha Okwu

Ụdị nnụnụ ụfọdụ na-amalite ịgwa ibe ha okwu ọbụna mgbe ha ka nọ n’ime àkwá. Dị ka ihe atụ, nne nnụnụ kwel na-eyi àkwá asatọ ma ọ dịkarịa ala, ọ na-eyi otu kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na àkwá niile ahụ esoro otú e si yie ha, abalị asatọ ga-agafe tupu ha niile abụchaa. Ọ ga-esiri nne ha ike ilekọta ndị nke gbasirila ike, bụ́ ndị bụrụ kemgbe abalị asaa, ma n’otu mgbe ahụ na-ekpu otu nke na-abụbeghị. Kama ime otú ahụ, àkwá ahụ niile na-abụ tupu awa isii agafee. Olee otú nke a si ekwe omume? Dị ka ndị na-eme nchọpụta kwuru, otu isi ihe na-eme ka o kwe omume bụ na nnụnụ kwel ndị nọ n’ime àkwá na-agwa ibe ha okwu, o nwekwara otú ha si ekwekọrịta ka ha bụọ otu mgbe.

Mgbe nnụnụ toro, ọ bụ nke oké na-ebekarị ubé. Ọ na-ebe ubé karịchaa n’oge oké ji esi nke nne iji gosi ebe bụ́ nke ya ma ọ bụ iji dọta nke nne. Nke ọ bụla n’ime ọtụtụ puku ụdị nnụnụ dị iche iche nwere ubé nke ha, nke a na-enyekwara ndị nke nne aka ịmata oké nnụnụ ndị bụ́ ụdị ha.

Ọ bụ n’isi ụtụtụ nakwa n’oge mgbede ka nnụnụ na-ebekarị ubé, o nwekwara ezi ihe mere o ji dịrị otú ahụ. Ifufe anaghị efesi ike n’oge ahụ, ụzụ anaghị adịkarịkwa. Ndị na-eme nchọpụta chọpụtara na a na-anụkarị ubé nnụnụ nke ọma okpukpu iri abụọ n’ụtụtụ nakwa n’oge mgbede karịa ka a na-anụ ya n’ehihie.

Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị nke oké na-ebekarị ubé, ma ndị nke oké ma ndị nke nne nwere ubé dị iche iche ha na-ebe, bụ́ ndị nwechara ihe ha pụtara. Dị ka ihe atụ, otu ụdị nnụnụ nke yiri nza nwere ubé itoolu ọ na-ebe. Ha na-ebe otu ụdị ubé iji gwa ibe ha banyere ihe ize ndụ si n’elu na-abịa, dị ka ihe atụ, ma ọ bụrụ na nnụnụ na-eri nnụnụ ibe ya na-efegharị n’elu. Ma, ha na-ebe ụdị ubé ọzọ iji gwa ibe ha na o nwere ihe ize ndụ si n’ala na-abịa.

Onyinye Ka Mma

N’ezie, amamihe Jehova kenyere n’ime nnụnụ dị ịtụnanya. Ma, a bịa n’ikwurịta okwu, ụmụ mmadụ enweghị atụ. Job 35:11 kwuru na Chineke kere ụmụ mmadụ ka ha “mara ihe karịa anụ ufe nke eluigwe.” Ọ bụ naanị ụmụ mmadụ nwere ikike nke iji olu okwu na mmegharị ahụ́ akọwara ibe ha ihe a na-anaghị ahụ anya na ihe siri ike nghọta.

O yiri ka e kenyere ụmụaka ikike ịmụta ọtụtụ asụsụ siri ike mmụta karịa ihe ọ bụla ọzọ e kere eke. Otu akwụkwọ dị n’Ịntanet bụ́ American Scientist kwuru, sị: “Ụmụaka ndị ka na-amụ ije na-enwe ike ịmụta asụsụ ọbụna mgbe ndị mụrụ ha na-anaghị agwa ha okwu; ụmụaka ndị ntị chiri na-echepụta asụsụ ogbi nke ha ma ọ bụrụ na a kụzighịrị ha asụsụ ndị ogbi n’ụlọ.”

Ikike anyị nwere iji ọnụ ma ọ bụ aka mee ka ndị ọzọ mara ihe dị anyị n’obi bụ onyinye magburu onwe ya Chineke nyere anyị. Ma, onyinye ka nke ahụ nke e nyere ụmụ mmadụ bụ ikike anyị nwere ịgwa Chineke okwu n’ekpere. N’eziokwu, Jehova bụ́ Chineke gwara anyị ka anyị na-agwa ya okwu. Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, sịrị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.”—Ndị Filipaị 4:6.

Jehova chọrọ ka anyị si na Baịbụl, bụ́ akwụkwọ ya nke amamihe jupụtara, mata ihe anyị ga-eme mgbe anyị chọrọ ime mkpebi ndị siri ike. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịmata otú anyị ga-esi tinye ndụmọdụ dị n’ime ya n’ọrụ. Onye so dee Baịbụl bụ́ Jems kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha; ọ ga-enye onye ahụ amamihe.”—Jems 1:5.

Olee Otú Obi Dị Gị n’Ihi Nke A?

Olee otú obi na-adị gị mgbe ị nụrụ ubé dị ụtọ nnụnụ na-ebe ma ọ bụ mgbe ị nụrụ ka nwatakịrị kwuru okwu mbụ ya? Ị̀ na-ahụ amamihe Chineke n’ihe ndị o kere eke?

Mgbe ọbụ abụ bụ́ Devid tụgharịrị uche n’otú e si kee ya, ọ gwara Chineke, sị: “M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube. Ọrụ gị dị ebube, dị ka mkpụrụ obi m maara nke ọma.” (Abụ Ọma 139:14) Mgbe i ji obi ekele na-atụle amamihe Chineke bụ́ nke a na-ahụ n’ihe e kere eke, okwukwe i nwere n’ebe ọ nọ na o nwere ike inye gị ezi ndụmọdụ ga-esikwu ike n’ezie.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Ikike anyị nwere ikwurịta okwu bụ onyinye Chineke nyere anyị

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 4]

© Dayton Wild/Visuals Unlimited