Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọpụta Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa E Dere na Baịbụl

Ịchọpụta Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa E Dere na Baịbụl

Ịchọpụta Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa E Dere na Baịbụl

ỌTỤTỤ narị afọ gara aga, e nwechaghị ihe ndị e ji ede ihe otú e nwere ha ugbu a. A na-ehicha ma ọ bụ asachapụ ihe ndị na-adịkwaghị mkpa e dere n’ibé akpụkpọ anụ na ihe ndị ọzọ e ji ede ihe ma dee ihe ọzọ na ha. A na-ehichapụdị ihe odide Baịbụl e dere n’akpụkpọ anụ ka e nwee ike iji ha dee ihe ọzọ.

Otu ihe odide Baịbụl dị mkpa e hichapụrụ ma dee ya ihe ọzọ bụ Codex Ephraemi Syri rescriptus, rescriptus a pụtakwaranụ “ide ihe n’ihe e derela ede.” Ihe odide codex a bara ezigbo uru n’ihi na o so n’ihe odide kacha ochie ndị a ka nwere taa, bụ́ ndị nwere akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ihi ya, o so n’ihe odide ndị kacha mma e nwere ike iji chọpụta ma Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst e nwere taa ò ziri ezi.

Na narị afọ nke iri na abụọ Oge Anyị, e hichapụrụ ihe odide Akwụkwọ Nsọ dịbu na codex a a rụpụtara na narị afọ nke ise ma dekwasịzie ya nsụgharị Grik nke okwuchukwu iri atọ na asatọ ọkà mmụta onye Siria, bụ́ Ephraem, kwuru. Oge mbụ ndị ọkachamara hụrụ na e nwere ihe odide Baịbụl dị n’okpuru ihe odide a bụ ná ngwụcha narị afọ nke iri na asaa. N’ime afọ ole na ole sochirinụ, a gbalịrị ịchọpụtatụ ihe mbụ e dere n’ihe odide ahụ. Ma, o siri ezigbo ike ịchọpụtacha ihe e dere na ya n’ihi otú o si sie ike ịhụcha ihe ndị ahụ e hichara ehicha, otú ọtụtụ peeji ya si jọọ njọ n’anya, na otú ihe ikpeazụ e dere na ya si nọchie ndị nke mbụ. A wụrụ kemikal n’ihe odide ahụ iji mee ka ihe odide Baịbụl dịbu na ya pụta ìhè ma kwe ọgụgụ, ma o nwechaghị isi. N’ihi ya, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta Baịbụl kwubiri na ọ dịghị otú a ga-esi gụta ihe odide niile mbụ ahụ dịbu na ya.

N’agbata afọ 1840 na 1843, Konstantin von Tischendorf, bụ́ onye Germany bụ́ aka ochie na nkà mmụta asụsụ, malitere ịmụ codex ahụ. Tischendorf ji afọ abụọ chọpụtachaa ihe e deburu n’ihe odide ahụ. Olee ihe nyeere ya aka ime ihe a ndị ọzọ na-emelighị?

Tischendorf maara otú e si agụ otu ụdị aka akwụkwọ ndị Gris nke ọma, bụ́ mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo e dere iche iche. * Ebe ọ bụ na ọ na-ahụ ụzọ nke ọma, ọ chọpụtara na ọ bụrụ nnọọ na ya edewe akpụkpọ anụ ahụ nso n’ọkụ, na ya ga-enwe ike ịhụ ihe mbụ e dere na ya. Ndị ọkà mmụta na-eji ụdị ọkụ pụrụ iche ndị na-eme ka a hụzie ihe nke ọma eme ụdị nchọpụta a n’oge a.

Tischendorf bipụtara ihe ndị ọ hụrụ ma ọ bụ ndị ọ gụtara na Codex Ephraemi n’afọ 1843 na 1845. Nke a mere ka a mara ya dị ka ọkaibe n’ịgụ aka akwụkwọ ndị Gris.

Codex Ephraemi dị ihe dị ka sentimita iri atọ n’ogologo na sentimita iri abụọ na ise n’uhie, ọ bụkwa ihe odide kacha ochie nwere naanị otu kọlụm na peeji ọ bụla. N’ime narị peeji abụọ na itoolu ya e nwere taa, otu narị na iri anọ na ise n’ime ha bụ akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ niile dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ma e wezụga Ndị Tesalonaịka nke Mbụ na Jọn nke Abụọ. Peeji ndị nke ọzọ bụ nsụgharị Grik nke akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru.

N’oge a, e dewere codex a n’Ọ́bá Akwụkwọ Mba, nke dị na Paris, France. A maghị ebe e si nweta ihe odide ahụ, ọ bụ ezie na Tischendorf chere na e si n’Ijipt nweta ya. Ndị ọkà mmụta weere Codex Ephraemi dị ka otu n’ime ihe odide anọ dị mkpa nke Baịbụl Grik e dere n’otu ụdị aka akwụkwọ ndị Gris. Atọ ndị nke ọzọ bụ ihe odide Sinaitic, nke Alexandrine, na nke Vatican 1209. E dere ha niile na narị afọ nke anọ na nke ise Oge Anyị.

E nwere ọtụtụ ụzọ dị ịtụnanya e si chekwaara anyị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, tinyere ihe ndị e dere n’akpụkpọ anụ bụ́ ndị e hichapụrụ ma dee ihe ọzọ na ha. Ọ bụ ezie na onye na-ejighị ihe odide Baịbụl dị na Codex Ephraemi kpọrọ ihe nwara ihichapụ ya, ihe e dere na ya alaghị n’iyi. Nke a mere ka anyị kwetakwuo ihe a Pita onyeozi kwuru: “Okwu Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi.”—1 Pita 1:25.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ihe a kacha jiri mara Tischendorf bụ nchọta ọ chọtara nsụgharị Grik nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke so ná ndị kacha ochie a chọtatụrụla. Ọ chọtara ya n’Ebe Obibi Ndị Nọn nke St. Catherine, nke dị n’ala ala Ugwu Saịnaị. Ihe a na-akpọ ihe odide ahụ bụ Codex Sinaiticus.

[Ihe osise/Foto dị na peeji nke 16]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Codex Ephraemi Syri rescriptus, ihe odide dị mkpa e hichapụrụ ma dee ihe ọzọ n’elu ya nke Tischendorf gụtara (1815-1874)

IHE ODIDE AKWỤKWỌ NSỌ DỊBU NA YA

OKWUCHUKWU GRIK E DEKWASỊRỊ N’ELU YA

[Ebe E Si Nweta Ya]

© Bibliothèque nationale de France

[Foto dị na peeji nke 17]

Codex Sinaiticus, nke a chọtara n’Ebe Obibi Ndị Nọn nke St. Catherine

[Foto dị na peeji nke 17]

Tischendorf