Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Jizọs na Nna Ya Si Bụrụ Otu?

Olee Otú Jizọs na Nna Ya Si Bụrụ Otu?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee Otú Jizọs na Nna Ya Si Bụrụ Otu?

Jizọs kwuru, sị: “Mụ na Nna m bụ otu.” (Jọn 10:30) Ụfọdụ na-ekwu ihe e dere n’amaokwu a iji gosi na Jizọs na Nna ya so na chi atọ n’ime otu. Ọ̀ bụ ihe Jizọs bu n’obi kwuo okwu a?

Ka anyị leba anya n’amaokwu ndị bu ya ụzọ. N’amaokwu 25, Jizọs kwuru na ya rụrụ ọrụ n’aha Nna ya. Malite n’amaokwu 27 ruo 29, o kwuru banyere atụrụ ihe atụ, bụ́ ndị Nna ya nyere ya. Ndị na-ege Jizọs ntị agaraghị aghọta ụzọ ihe abụọ a o kwuru ma ọ bụrụ na ya na Nna ya bụ otu onye. Kama nke ahụ, ihe Jizọs na-ekwu bụ, ‘Mụ na Nna m dị nnọọ n’otu nke na o nweghị onye nwere ike ịnapụ m atụrụ ndị ahụ, otú ahụ ọ na-enweghị onye nwere ike ịnapụ ha Nna m.’ Ọ dị nnọọ ka ebe nwata na-agwa onye iro nna ya, sị, ‘Ị lụso nna m ọgụ, ọ bụ m ka ị lụsoro ọgụ.’ O nweghị onye ga-aghọta na nwata ahụ na nna ya bụ otu onye. Ma, mmadụ niile ga-aghọta na nwata ahụ na nna ya dị nnọọ n’otu.

Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, bụkwa “otu” n’echiche bụ́ na ha nwere nnọọ otu nzube na otu ụkpụrụ. Jizọs adịghị ka Setan bụ́ Ekwensu na di na nwunye mbụ, bụ́ Adam na Iv, n’ihi na o nwetụbeghị mgbe ọ chọrọ ịhapụ ịnọ n’okpuru Chineke. Jizọs kwuru, sị: “Ọkpara ahụ apụghị ime otu mkpụrụ ihe n’uche nke aka ya, kama ọ bụ naanị ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme. N’ihi na ihe ọ bụla Onye ahụ na-eme, ọ bụ ya ka Ọkpara ya na-emekwa.”—Jọn 5:19; 14:10; 17:8.

Ma, Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ịdị n’otu apụtaghị na e nweghị ihe dị iche n’etiti ha abụọ. Ha bụ ndị abụọ. Onye nke ọ bụla nwere àgwà nke ya. Jizọs nwere echiche nke ya na ikike ịhọrọ ihe ọ ga-eme, nweekwa ihe ndị ọ gabigarala ná ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ họọrọ ime uche Nna ya kama ime nke ya. Na Luk 22:42, Jizọs kwuru, sị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.” Okwu ndị a agaraghị apụta ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na uche ya enweghị ike ịdị iche na nke Nna ya. Ọ bụrụ na Jizọs na Nna ya bụ nnọọ otu onye, gịnị mere Jizọs ji kpekuo Chineke ekpere ma jiri ịdị umeala n’obi kweta na o nwere ihe ndị naanị Nna ya maara ya na-amaghị?—Matiu 24:36.

Ọtụtụ okpukpe na-efe chi ndị e kwuru na ha na ndị ezinụlọ ha na-ese okwu ma na-alụ ọgụ. Dị ka ihe atụ, n’akụkọ ifo ndị Gris, chi bụ́ Cronus kwaturu nna ya, bụ́ Uranus, n’ọchịchị ma rie ụmụ nke ya. Nke a dị nnọọ iche n’ịdị n’otu dị n’etiti Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, n’ihi ezi ịhụnanya ha nwere n’etiti onwe ha! Ịdị n’otu a na-emekwa nnọọ ka anyị hụ ha n’anya! N’ezie, anyị nwere nnọọ ohere ọma na-enweghị atụ anyị na Ndị abụọ a kachanụ n’eluigwe na ala ịdị n’otu. Jizọs kpere ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M na-arịọ arịrịọ . . . ka ha niile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu, ka anyị na ha wee dị n’otu.”—Jọn 17:20, 21.

Ya mere, mgbe Jizọs sịrị, “Mụ na Nna m bụ otu,” ọ naghị ekwu banyere Atọ n’Ime Otu dị omimi, kama ọ na-ekwu banyere ịdị n’otu pụrụ iche, bụ́ mmekọrịta kacha chie anya nwere ike ịdị n’etiti otu onye na ibe ya.