Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onyeikpe nke Na-akwụsi Ike n’Ihe Ziri Ezi

Onyeikpe nke Na-akwụsi Ike n’Ihe Ziri Ezi

Bịaruo Chineke Nso

Onyeikpe nke Na-akwụsi Ike n’Ihe Ziri Ezi

Ọnụ Ọgụgụ 20:2-13

ỤMỤ mmadụ bụ́ ndị ikpe nwere ike ikpe ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ ikpe mkpegbu, ma Jehova Chineke anaghị eme otú ahụ, n’ihi na ọ bụ onye “hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) Ọ bụ ezie na ọ na-enwe ndidi, ọ naghị anabata ihe ọjọọ. Ọ na-akwụsi ike n’ihe ziri ezi. Ka anyị tụlee ihe o mere mgbe e nwere esemokwu na nnupụisi, dị ka e dere ya n’Ọnụ Ọgụgụ isi 20.

Mgbe ọ fọrọ obere ka njem ụmụ Izrel n’ala ịkpa gwụchaa, mmiri kọrọ ha. * Ha malitere isesa Mozis na Erọn okwu, sị: “Gịnị mere unu ji dubata ọgbakọ Jehova n’ala ịkpa a ka anyị na anụ na-eburu anyị ibu nwụọ n’ime ya?” (Amaokwu nke 4) Ha ji iwe kwuo na ala ịkpa ahụ bụ ‘ebe ọjọọ’ nke na-enweghị “osisi fig na osisi vaịn na osisi pọmigranet,” bụ́ nnọọ mkpụrụ osisi ụmụ Izrel ledoro Ala Nkwa ahụ welatara ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, kwuokwa na “mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa.” (Amaokwu nke 5; Ọnụ Ọgụgụ 13:23) Ha na-ata Mozis na Erọn ụta maka na ala ịkpa ahụ adịghị ka ala ahụ na-eme nri ndị nna ha bụ́ ndị ntamu jụrụ ịbanye!

Jehova ajụghị ndị ntamu ahụ. Kama nke ahụ, o nyere Mozis iwu ka o mee ụzọ ihe atọ: ka o were mkpara ya, kpọkọta ụmụ Izrel ma ‘gwa nkume ahụ dị elu okwu n’ihu ha ka ọ gbapụta mmiri.’ (Amaokwu nke 8) Mozis mere ihe abụọ ndị mbụ e nyere ya n’iwu, ma o meghị nke atọ. Kama iji okwukwe gwa nkume ahụ dị elu okwu, o ji iwe gwa ụmụ Izrel, sị: “Nụrụnụ, unu ndị nnupụisi! Ọ̀ bụ na nkume a dị elu ka anyị ga-esi mee ka mmiri gbapụtara unu?” (Amaokwu nke 10; Abụ Ọma 106:32, 33) Mozis kụziri nkume ahụ dị elu mkpara ya ugboro abụọ, “mmiri dị ukwuu wee malite ịgbapụta.”—Amaokwu nke 11.

Mozis na Erọn si otú a mee mmehie dị oké njọ. Chineke sịrị ha: “Unu nupụrụ isi n’iwu m.” (Ọnụ Ọgụgụ 20:24) Isi a Mozis na Erọn nupụụrụ Chineke mere ka ha ghọọ ihe ahụ ha kpọrọ ụmụ Izrel, ya bụ, ndị nnupụisi. Ikpe Chineke mara ha doro anya: Mozis na Erọn agaghị edu ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ. Ikpe a o kpere ha ọ̀ bụ ikpe mkpegbu? E nwere ihe ndị mere ọ na-ejighị bụrụ ikpe mkpegbu.

Nke mbụ, Chineke agwaghị Mozis ka ọ gwa ụmụ Izrel okwu, ma ya fọkwa ịkpọ ha ndị nnupụisi. Nke abụọ, Mozis na Erọn enyeghị Chineke otuto. Chineke kwuru, sị: ‘Unu edoghị m nsọ.’ (Amaokwu nke 12) Mgbe Mozis sịrị “ọ̀ bụ na nkume a dị elu ka anyị ga-esi mee ka mmiri gbapụtara unu,” o kwuru okwu ka à ga-asị na ọ bụ ya na Erọn rụrụ ọrụ ebube ahụ mere ka mmiri gbapụta, ọ bụghị Chineke. Nke atọ, ikpe a mara ha kwekọrọ n’ikpe ndị Chineke kpere n’oge gara aga. Chineke ekweghị ka ọgbọ mbụ nupụụrụ ya isi banye n’ala Kenan, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka o mere Mozis na Erọn. (Ọnụ Ọgụgụ 14:22, 23) Nke anọ, Mozis na Erọn bụ ndị ndú ụmụ Izrel. Chineke na-atụ anya ka ndị o nyere ọrụ ka ukwuu rubere ya isi karị.—Luk 12:48.

Jehova na-akwụsi ike n’ihe ziri ezi. Ebe ọ bụ na ọ hụrụ ikpe ziri ezi n’anya, o nweghị ike ikpe ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ ikpe mkpegbu. O doro anya na anyị kwesịrị ịtụkwasị Onyeikpe dị otú a obi ma na-akwanyere ya ùgwù.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Mgbe ụmụ Izrel pụsịrị n’Ijipt, ha dị njikere ịbanye n’ala Kenan, bụ́ ala Chineke kwere Ebreham ná nkwa. Ma, mgbe ndị nledo iri weghachiri ozi ọjọọ, ụmụ Izrel tamuru ntamu megide Mozis. N’ihi ya, Jehova kpebiri na ha ga-anọ n’ala ịkpa ahụ iri afọ anọ, bụ́ oge ọ ga-ewe ọgbọ nnupụisi ahụ ịnwụcha.