Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Mee nke Ọma n’Ọrụ Ikwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ

Otú Ị Ga-esi Mee nke Ọma n’Ọrụ Ikwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ

Ememme Ngụsị Akwụkwọ nke Klas nke 126 nke Gilied

Otú Ị Ga-esi Mee nke Ọma n’Ọrụ Ikwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ

ÌGWÈ mmadụ ọṅụ juru obi zukọrọ n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York, maka otu ememme pụrụ iche. Saturday, March 14, 2009, bụ ụbọchị ememme ngụsị akwụkwọ nke klas nke 126 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. A na-aga iziga ndị gụsịrị akwụkwọ na ya ná mba iri abụọ na abụọ ịga kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.

Ụmụ akwụkwọ ahụ ka natasịrị ọzụzụ kpụ ọkụ n’ọnụ si na Baịbụl were ọnwa ise, nke a haziri iji nyere ha aka ịbụ Ndị Kraịst na-eme nke ọma n’ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ. Ụbọchị ememme ngụsị akwụkwọ a bụ ụbọchị ikpeazụ klas ha ga-anọkọta ọnụ nụrụ ezigbo ndụmọdụ banyere otú ha ga-esi eme nke a.

Anthony Morris, bụ́ onyeisi oche ememme a nke so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na ọ bụ n’afọ 1943 ka Ụlọ Akwụkwọ Gilied malitere ịzụ ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ. Kemgbe ahụ, ndị gụsịrị akwụkwọ na ya arụọla ọrụ buru ibu n’ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa dum.

Ọkà okwu ahụ kwuru na n’agbanyeghị na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ledara ndịozi Jizọs anya dị ka ‘ndị na-amaghị ihe na ndị na-amụtaghị akwụkwọ hie nne,’ ndị mmegide ahụ hụrụ na nkwuwa okwu ndịozi ahụ nwere bụ n’ihi na ha na Jizọs nọrọ. (Ọrụ 4:13, Bible Nsọ nke Union Version) Ọzụzụ ụmụ akwụkwọ ahụ natara na-enyere ha aka inwe nkwuwa okwu.

Robert Ciranko, bụ́ onye na-enyere Kọmitii Ide Ihe nke Òtù Na-achị Isi aka, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Unu Abụla Ndị Na-ele Anya n’Ihu.” O kwuru na n’oge na-adịghị anya, ụmụ akwụkwọ ahụ ga-ezute ndị omenala ha dị nnọọ iche na nke ha. Ma, ikwusara ha ozi ọma agaghị abụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ nsogbu ma ọ bụrụ na ha elee ihe anya otú Jehova si ele ya. Otú e si dee Ọrụ 10:34 n’asụsụ Grik bụ, “Chineke abụghị onye na-ele anya n’ihu,” ya bụ, ọ naghị anabata otu ihu ma jụ nke ọzọ. “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.” (Ọrụ 10:35) Nwanna Ciranko kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu elee ihe anya otú Chineke si ele ya ma were onye ọ bụla unu hụrụ n’ebe e kenyere unu ọrụ dị ka onye Chineke nwere ike ịnabata, unu ga-eme nke ọma dị ka ndị na-ekwusara ya ozi ọma n’ala ọzọ.”

“Unu Nwere Ihe Niile Dị Unu Mkpa”

Samuel Herd, bụ́ onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi malitere okwu ya site n’ikwu, sị: “Ụfọdụ na-ele kamel anya dị ka anụ jọrọ njọ, ma, ọ bụ anụ dị nnọọ mma maka ọzara.” N’otu aka ahụ, ndị ọhụrụ a na-aga ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ nwere ihe niile dị ha mkpa iji mee nke ọma n’ebe a ga-ekenye ha ọrụ. Ọ dị ụzọ ihe ise ga-enyere ha aka.

1. Ịhụ Jehova n’anya. (Matiu 22:37, 38) Ụmụ akwụkwọ ahụ egosila na ha kpebisiri ike ijere Jehova ozi.

2. Ihe ọmụma ha nwere enwe banyere Okwu Chineke. Kamel na-echekwa nri n’abụba dị ná mkpumkpu azụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ naghị akwụsị iri ihe n’ihi nke ahụ o chekwara maka a dịghị ama ama. N’otu aka ahụ, ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ ekwesịghị ịdabere naanị n’ihe ha mụtara n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, kama ha kwesịrị ịnọgide na-eri nri ime mmụọ.

3. Ịhụ ndị mmadụ n’anya. (Matiu 22:39) Ụmụ akwụkwọ a na-enwe ọmịiko n’ahụ́ ndị mmadụ.

4. Mmụọ iwepụta onwe onye. (Abụ Ọma 110:3) Mgbe ike gwụrụ onye na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, Jehova na-eme ka o nwee ume nke ukwuu.—Aịzaya 40:29.

5. Ike okorobịa na agbọghọbịa. Dị nnọọ ka kamel na-eburu onye o bu gafee ọzara, o nwere ike ịdị mkpa ka onye na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ “buru” Onye Kraịst ibe ya nọ ná nsogbu ime mmụọ. Nke ahụ chọrọ ume dị ukwuu, ma ndị a na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ nwere ike okorobịa na agbọghọbịa.

Ihe Ndị Ọzọ E Mere n’Ihe Omume Ahụ

Michael Burnett, bụ́ onye nkụzi Gilied, kwuru na almọnd so n’ọmarịcha onyinye Jekọb zigaara otu onye ọchịchị Ijipt. (Jenesis 43:11) Almọnd anaghị ebu ibu, ma o nwere ọtụtụ ihe na-edozi ahụ́. Ụmụ akwụkwọ a ataala ọtụtụ almọnd ihe atụ n’oge ọmụmụ ihe ha. Otu n’ime ihe ndị ha mụtara ha kwesịrị iji gaa ebe e zigara ha bụ mkpa ọ dị inwe afọ ojuju n’ihe Jehova na-enye ha na ịmụta inwe mmasị n’ebe ha na-aga.

Mark Noumair, onye bụ́kwa onye nkụzi Gilied, kọwara na Okwu Chineke dị ka “akpa nke jupụtara n’amamihe.” (Job 28:18) Ọ dị anyị mkpa ịna-emeghe akpa a ma jiri ihe ndị dị na ya na-ebi ndụ. Ọ bụrụ na ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ adịghị otú ụmụ akwụkwọ a tụrụ anya ya, ha nwere ike icheta Pọl onyeozi. Ndị na-eso ụzọ Jizọs zigara ya n’obodo ya, ya anọrọ n’ebe ahụ ruo afọ itoolu. Kama Pọl ichewe na ebe ya bụ ‘arịa Onyenwe anyị họọrọ’ na e kwesịrị ikenye ya ọrụ n’ebe ọzọ, ọ rụsiri ọrụ ike n’ebe ọ bụla ọ nọ. (Ọrụ 9:15, 28-30) Ịsọpụrụ ndị Jehova họọrọ iduzi ọgbakọ ya nwere ike isiri anyị ike. Onye ọzọ mere ihe ahụ Pọl mere bụ Jọnatan. Ebe ọ bụ na Jọnatan ghọtara na Devid bụ eze Jehova họọrọ, o ji obi ya kwado ya.

N’isiokwu bụ́ “Ndị Ohu Chineke Na-ekwu Okwu n’Atụghị Egwu,” ụmụ akwụkwọ ahụ mere ihe ngosi ndị gosiri ihe ndị mere mgbe ha na-ekwusa ozi ọma n’oge agụmakwụkwọ ha. Ọtụtụ n’ime ha na ndị mmadụ malitere ịmụ Baịbụl. N’isiokwu sochiri ya, bụ́ “Ndị Nzukọ Jehova Kwadebere,” a gbara mmadụ atọ kwusarala ozi ọma ogologo oge n’ala ọzọ ajụjụ ọnụ na ya. Onye nke ọ bụla n’ime ha kọwara otú o sirila mụta irubere nzukọ Chineke isi.

“Bụrụ Onye Ji Obi Ụtọ Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ”

Gerrit Lösch, bụ́ onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi, kwuziri okwu bụ́ isi n’ihe omume a nke isiokwu ya bụ, “Bụrụ Onye Ji Obi Ụtọ Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ala Ọzọ.” O kwuru na ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-eme bụ́ ndị e chere na ha “na-atọ ụtọ” anaghị enye ezi obi ụtọ. (Ilu 14:13; Ekliziastis 2:10, 11) Ime uche Chineke na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ na-adịgide adịgide, ọ bụ ezie na ime ya anaghị adị mfe mgbe niile. Agụmakwụkwọ Gilied bụ ọrụ siri ike, ma o mere ka ụmụ akwụkwọ a nwee obi ụtọ dị ukwuu.

E nwere ọtụtụ ihe na-eso eme ka ezi Ndị Kraịst nwee obi ụtọ. Ha na-efe Chineke bụ́ onye obi ụtọ. (Abụ Ọma 33:12; 1 Timoti 1:11) Ha bi na paradaịs ime mmụọ, Baịbụl kwekwara nkwa na n’oge na-adịghị anya, ụwa ga-aghọ paradaịs a na-ahụ anya. Ha amatala nzube nke ndụ, nke bụ́ ijere Jehova ozi na inye ya otuto. Ihe ọzọ bụ na Jehova na Jizọs hụrụ ha n’anya.

Ọkà okwu ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na ị mụta inwe afọ ojuju n’ihe i nwere, ị ga-enwe obi ụtọ n’ozi ọma ị na-ekwusa n’ala ọzọ.” Ịhụ ndị ọzọ n’anya na ịbụ onye ndị ọzọ hụrụ n’anya bụ ihe ọzọ na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ya mere, na-ekpuchiri ndị ọzọ mmehie ha kama ime ka ọ pụta ìhè. Na-emere ndị ọzọ ihe ọma, na-enyere ndị na-adịghị ike aka, na-akọrọ ndị ọzọ ihe ọma ndị meere gị. (Abụ Ọma 41:1, 2; Ọrụ 20:35) Ịgbasi mbọ ike n’ọrụ ikwusa ozi ọma na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ.—Luk 11:28.

Nwanna Lösch pịachiri okwu ya site n’ikwu, sị: “Gaa n’ebe e kenyere gị ọrụ dị ka onye ji obi ụtọ na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, na-ewepụtatụ oge iji tụrụ ndụ ma lekwasị anya n’ito Chineke anyị bụ́ onye obi ụtọ, bụ́ Jehova, na n’ime ka ndị ọzọ nweekwa obi ụtọ.”

Mgbe Anthony Morris gụchara ozi ekele si mba dị iche iche, o nyere ụmụ akwụkwọ ahụ diplọma ha. Mgbe nke ahụ gachara, otu onye nke nọchiri anya klas nke 126 gụrụ akwụkwọ ozi klas ahụ degaara Òtù Na-achị Isi. Ha ji ya kelee ha maka inye ha ohere ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied.

Mgbe onyeisi oche na-ekwu okwu mmechi ya, o kwuru na “nkwonkwo na akwara njikọ” nke na-ejikọ ahụ́ mmadụ na-anọchi anya ụzọ na ndokwa “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ji enye ndị Jehova nri na ntụziaka. (Ndị Kọlọsi 2:18, 19; Matiu 24:45) Ọ bụrụ na ndị a gụsịrị akwụkwọ na Gilied erubere nnọọ ndị nnọchianya Chineke họpụtara isi, ha ga-ejezu ozi ha.—2 Timoti 4:5.

[Igbe dị na peeji nke 30]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Mba ole ha si: 6

Mba ole e zigara ha: 22

Ole ụmụ akwụkwọ dị: 56

Mmadụ ole bụ di na nwunye: 28

Nkezi afọ ndụ ha: 32.8

Nkezi afọ ole ha nọrọla n’eziokwu: 17.9

Nkezi afọ ole ha kwusarala ozi ọma oge niile: 13.5

EBE NDỊ E KENYERE NDỊ KLAS A ỌRỤ

E kenyere ndị a gụsịrị akwụkwọ ọrụ na Benin, Bolivia, Bulgaria, Burkina Faso, Cameroon, Costa Rica, Ghana, Guatemala, Honduras, Kenya, Liberia, Madagascar, Mozambique, Nicaragua, Panama, Paraguay, Peru, Romania, Sierra Leone, South Africa, Togo, na Uganda.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Klas nke 126 n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied

E nyere ahịrị ndị dị na foto a nọmba malite n’ihu laa azụ, aha ha malitekwara n’aka nri gaa n’aka ekpe n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Kirchhoff, K.; Nichols, C.; Guzmán, Y.; Coil, H.; Becker, O.; De Simone, A. (2) Manzanares, A.; Bouvier, E.; Peddle, J.; Mason, H.; Braz, J. (3) Lee, J.; Forte, A.; Boucher, T.; Marsh, A.; Leighton, S.; Glover, M. (4) Kambach, H.; Jones, T.; Ferreira, A.; Morales, J.; Chicas, S.; Davis, B.; Dormanen, E. (5) Dormanen, B.; Nichols, J.; Pacho, T.; Titmas, L.; Bouvier, E.; Kirchhoff, A. (6) Leighton, G.; Pacho, A.; Van Campen, B.; Manzanares, A.; Rivard, A.; Lee, Y.; Titmas, L. (7) Boucher, M.; Coil, K.; Marsh, C.; Guzmán, J.; Jones, W.; Kambach, J. (8) Glover, A.; Ferreira, G.; Mason, E.; Forte, D.; Davis, N.; Chicas, O.; Rivard, Y. (9) Braz, D.; Van Campen, D.; Morales, A.; De Simone, M.; Becker, M.; Peddle, D.