Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee ihe mere Chineke ji nye ụmụ mmadụ onyinye ndụ ebighị ebi?

Olee ihe mere Chineke ji nye ụmụ mmadụ onyinye ndụ ebighị ebi?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Olee ihe mere Chineke ji nye ụmụ mmadụ onyinye ndụ ebighị ebi?

▪ Baịbụl kwuru na Chineke nyere anyị ohere inweta “ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:40) Ma, gịnị kpaliri ya inye anyị olileanya a? Ọ̀ bụ naanị n’ihi ikpe ziri ezi ya?

Ikpe ziri ezi bụ imeso mmadụ ihe otú e kwesịrị isi mesoo ya. Ànyị kwesịrị nnọọ ịdị ndụ? Mba. Baịbụl kwuru, sị: “E nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe, nke na-adịghịkwa emehie.” (Ekliziastis 7:20) Mmehie nwere ụgwọ ọrụ. Chineke dọrọ nwoke mbụ, bụ́ Adam, aka ná ntị na n’ụbọchị o mehiere na ọ ga-anwụrịrị. (Jenesis 2:17) Pọl onyeozi mechara si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ya mere, ọ bụrụ na ụmụ Adam niile kwesịrị ịnwụ anwụ n’ezie, olee ihe mere Chineke ji nye ha ohere ịdụ ndụ ebighị ebi?

Ohere ịdị ndụ ebighị ebi bụ “onyinye e nyere [ụmụ mmadụ] n’efu.” Ọ na-egosi otú ịhụnanya Chineke na obiọma ya na-erughịrị mmadụ dịruru ukwuu ma na-eru onye ọ bụla chọrọ ya aka. Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke, a na-akpọkwa ha ndị ezi omume, nke bụ́ onyinye e nyere n’efu, site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ site ná ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.”—Ndị Rom 3:23, 24.

Ọ bụ ezie na anyị niile kwesịrị ọnwụ, Chineke họọrọ inye ndị hụrụ ya n’anya ndụ ebighị ebi. Nke ahụ ọ̀ bụ ikpe na-ezighị ezi? Baịbụl kwuru, sị: “Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Tụfịakwa! N’ihi na ọ gwara Mozis, sị: ‘Onye ọ bụla m kpebiri imere ebere ka m ga-emere ebere, onye ọ bụla m kpebikwara igosi ọmịiko ka m ga-egosi ọmịiko.’ . . . Ònye n’ezie, ka ị bụ na ị ga na-asa Chineke okwu?”—Ndị Rom 9:14-20.

N’ebe ụfọdụ n’ụwa, onye ọrụ gọọmenti ma ọ bụ ọkàikpe nwere ike ịgbaghara onye omekome nke a tụrụ mkpọrọ ọrụ ahụhụ. Ọ bụrụ na onye omekome ahụ erube isi n’iwu ndị e nyere ya ma kpawa ezi àgwà, ọkàikpe ma ọ bụ onyeisi ala nwere ike ịgbaghara ya site n’ibelata afọ ole ọ ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụkwanụ gbaghara ya kpamkpam. Mgbaghara a nwere nnọọ ike ịbụ amara na-erughịrị onye ahụ.

N’otu aka ahụ, Jehova nwere ike ikpebi ịghara inye ndị mmehie niile ntaramahụhụ kwesịrị ha. Kama nke ahụ, n’ihi ịhụnanya ya, o nwere ike inye ndị hụrụ ya n’anya ma na-erube isi n’iwu ya ndụ ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

Ịhụnanya kachanụ Jehova gosiri anyị bụ izite Ọkpara ya ka ọ taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị. Jizọs kwuru banyere Nna ya, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Jehova na-anabatakwa ndị niile hụrụ ya n’anya ma na-eme uche ya, n’agbanyeghị ụdị ndị ha bụ́bu. N’ihi ya, olileanya ndụ ebighị ebi bụ nnọọ obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke gosiri anyị, bụ́ ịhụnanya ya na-enweghị atụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Ọ bụ nnọọ obiọma na-erughịrị mmadụ, bụ́ ịhụnanya ya na-enweghị atụ