Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’Ekpere

Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’Ekpere

Ṅomie Okwukwe Ha

Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’Ekpere

HANA nọ na-agbakeri ala, na-akwado maka njem ha na-aga ime, na-agbalị ichefu ụwa ya. Oge ahụ kwesịrị ịbụ oge obi ụtọ; Elkena, bụ́ di ya, na-akpọ ezinụlọ ya aga njem a a na-eme kwa afọ ịga fee ofufe n’ụlọikwuu dị na Shaịlo. Jehova zubere ka oge ahụ bụrụ oge aṅụrị. (Diuterọnọmi 16:15) O doro anya na kemgbe Hana bụ nwata, ọ na-atọ ya ụtọ ịga ememme ndị ahụ. Ma, ihe agbanweerela ya n’afọ ndị na-adịbeghị anya.

Chineke ejirila di hụrụ ya n’anya gọzie ya. Ma, Elkena nwere nwunye ọzọ. Aha ya bụ Penina, o yikwara ka mkpa ya ọ̀ bụ imewa Hana obi. Penina chọpụtadịrị otú ọ ga-esi jiri ememme ndị a a na-eme kwa afọ na-akpatara Hana obi mgbawa. Olee otú o si eme ya? Ma ọ bụkwanụ, olee otú okwukwe Hana nwere na Jehova si nyere ya aka idi ihe yiri mgbe mgbe ka ọ̀ bụ ihe mmadụ na-agaghị edili? Ọ bụrụ na i nwere nsogbu ndị na-anapụ gị ọṅụ ná ndụ, akụkọ Hana nwere nnọọ ike ịtọ gị ụtọ.

“Gịnịkwa Mere na Obi Adịghị Gị Mma?”

Baịbụl gwara anyị nnukwu nsogbu abụọ Hana nwere. O nwechaghị ihe o nwere ike ime banyere nke mbụ, o nwetụghịkwa ihe o nwere ike ime banyere nke abụọ. Nke mbụ bụ na a lụrụ ha abụọ, nwunye di ya akpọọkwa ya asị. Nke abụọ abụrụ na ọ bụ nwaanyị aga. Ọnọdụ ahụ bụ ọnọdụ tara akpụ nye nwaanyị ọ bụla chọrọ ịmụ ụmụ; ma n’oge Hana nakwa n’omenala obodo ha, ọ bụ ihe na-akpata oké iru uju. Ezinụlọ ọ bụla na-enwe obi ike na ụmụ ha ga-eme ka ámá ha ghara ichi. O yiri ka ịbụ nwaanyị aga ọ̀ na-akpata oké nkọcha na ihere.

O nwere ike ịbụ na Hana gaara edili nsogbu ya ma e wezụga Penina. Ọ dịghị mgbe nsogbu na-anaghị adị n’ezinụlọ ebe a lụrụ ihe karịrị otu nwaanyị. Ịma aka, esemokwu, na obi mgbawa na-adịkarị n’ezinụlọ dị otú ahụ. Ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị dị nnọọ iche n’ụkpụrụ Chineke tụrụ n’ogige Iden nke bụ́ ịlụ otu nwaanyị. * (Jenesis 2:24) N’ihi ya, Baịbụl kọrọ nsogbu dị n’ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị, akụkọ dị mwute ọ kọkwara banyere ezinụlọ Elkena gosiri na nke a bụ eziokwu.

Elkena hụrụ nnọọ Hana n’anya. Akụkọ ọdịnala ndị Juu kwuru na o bu ụzọ lụọ Hana, lụọkwa Penina ka afọ ole na ole gasịrị. Otú o sina dị, Penina, bụ́ onye na-emere nnọọ Hana anyaụfụ, chọtara ọtụtụ ụzọ ọ ga-esi mesie nwunye di ya ike. Ihe Penina ji ka Hana bụ na ọ na-amụ ụmụ. Penina mụrụ ọtụtụ ụmụ, nwa nke ọ bụla ọ mụrụ mekwara ka isi buwekwuo ya. Kama imetere Hana ebere ma kasie ya obi n’ihi ihe ọjọọ ahụ dabaara ya, Penina ji ya na-eme ya obi ọjọọ. Baịbụl kwuru na Penina kpasuru Hana iwe nke ukwuu “iji mee ka obi ghara iru ya ala.” (1 Samuel 1:6) Penina ma ụma na-eme ihe ọ na-eme. Ọ chọrọ imewa Hana obi, o mekwara ya.

O yiri ka oge na-akacha adabara Penina ime nke ahụ ọ̀ bụ mgbe ha na-akwado ịga fee ofufe na Shaịlo kwa afọ. Elkena na-ekenye nke ọ bụla n’ime ọtụtụ ụmụ Penina—“ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile”—òkè n’àjà ndị ọ chụụrụ Jehova. Ma, Hana na-enweghị nwa na-enweta naanị otu òkè. Penina jizi nke a na-akpasu Hana iwe ma na-echetara ya na ọ bụ nwaanyị aga nke na nwaanyị a na-ebe nnọọ ákwá ma jụdị iri nri. Elkena hụrụ nnọọ na Hana ọ hụrụ n’anya nọ ná mwute nakwa na o kweghị eri nri, n’ihi ya, ọ nwara ịkasi ya obi. Ọ jụrụ ya, sị: “Hana, gịnị mere i ji na-akwa ákwá, gịnị mere na ị naghị eri nri, gịnịkwa mere na obi adịghị gị mma? N’ebe ị nọ, ọ̀ bụ na akaghị m ụmụ ndị ikom iri mma?”—1 Samuel 1:4-8.

E kwesịrị ịja Elkena mma na ọ chọpụtara na ihe na-ewute Hana bụ na ọ mụtaghị nwa. O dokwara anya na obi dị Hana ụtọ na Elkena na-emesi ya nnọọ obi ike na ọ hụrụ ya n’anya. * Ma, Elkena ekwughị ihe ọ bụla banyere ịkpọasị Penina, ọ dịkwanụghị ihe Baịbụl kwuru gosiri na Hana gwara ya maka ya. Ikekwe, Hana hụrụ na ịgba omume Penina n’anwụ ga-eme ka ọnọdụ nke ya ka njọ. Elkena ọ̀ ga-agbanwe nnọọ ọnọdụ ahụ? Nke ahụ ó nweghị ike ime ka asị Penina kpọrọ ya ka njọ, ọ̀ bụkwa na ụmụ na ndị ohu nwaanyị anyaụfụ a agaghị eso ya mesiwezie Hana ike? Ihe ndị a ga-eme nnọọ ka Hana na-adịkwu ka onye a jụrụ ajụ n’ezinụlọ ya.

Ma Elkena ọ̀ maara arụrụala niile Penina na-arụ ma ọ̀ bụ na ọ maghị, Jehova Chineke maara ha niile. Okwu ya gwara anyị ihe niile merenụ, si otú ahụ na-adọ onye ọ bụla nwere ihe yiri obere ekworo na ịkpọasị aka ná ntị. N’aka nke ọzọ, obi kwesịrị iru ndị aka ha dị ọcha na ndị na-eme udo, dị ka Hana, ala ịmata na Chineke nke ikpe ziri ezi na-edozi okwu niile n’oge nakwa n’ụzọ nke ya. (Diuterọnọmi 32:4) Ikekwe Hana maara nke ahụ, n’ihi na ọ bụ Jehova ka o besaara ákwá ka o nyere ya aka.

“Ihu Ya Agbarụghịkwa Agbarụ Ọzọ”

N’isi ụtụtụ, ezinụlọ ahụ dum nọ na-agbakeri ala. Mmadụ niile nọ na-akwado maka njem ahụ, ma ụmụaka. Iji ruo Shaịlo, ezinụlọ ahụ ga-aga ihe ruru kilomita iri atọ n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu. * Ha jiri ụkwụ, njem ahụ ga-ewe ha otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. Hana maara ihe nwunye di ya ga-eme. Ma, Hana asịghị ka ya nọrọ n’ụlọ. O si otú ahụ gosi ndị na-efe Chineke ma n’oge ochie ma n’oge a ihe nlereanya magburu onwe ya. O nweghị mgbe ọ ga-ezi ezi anyị ikwe ka àgwà ọjọọ ndị ọzọ metụta ofufe anyị na-efe Chineke. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka nke ahụ mee, ngọzi ndị na-agba anyị ume ịnọgide na-atachi obi ga-akwa nnọọ anyị.

Mgbe ezinụlọ ahụ buru ibu mesịrị njem malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede n’okporo ụzọ dị rịgọ rịgọ bụ́ ugwu ugwu, ha rutewere Shaịlo. Ha hụrụ obodo ahụ n’elu ugwu nke ọ fọrọ obere ka ugwu ndị ka ya elu gbaa ya gburugburu. Ka ha na-erute nso, o nwere ike ịbụ na Hana chere nnọọ echiche banyere ihe ọ ga-agwa Jehova n’ekpere. Ozugbo ezinụlọ ahụ rutere, ha riri nri. Hana hapụrụ ha ozugbo o nwetara ohere ime otú ahụ ma gaa n’ụlọikwuu Jehova. Nnukwu Onye Nchụàjà Ilaị nọ n’ebe ahụ, nọrọ ọdụ n’ebe dịdebere ọnụ ụzọ ụlọ nsọ. Ma, ebe uche Hana dị bụ n’ebe Chineke ya nọ. Obi siri ya ike na Chineke ga-anụ ekpere ya n’ụlọikwuu ebe a. Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ọzọ ga-aghọtali ọnọdụ ya, Nna ya nke eluigwe ga-aghọtali ya. Obi jọrọ ya nnọọ njọ, ya amalitekwa ibe ákwá.

Ka ahụ́ nọ na-ama Hana jijiji n’ihi ákwá ahụ ọ na-ebe, ọ gwawara Jehova okwu n’obi ya. Egbugbere ọnụ ya nọ na-emegharị ka ọ na-achọ otú ọ ga-esi kọwaa ihe na-anyịgbu ya. O kpekwara ekpere ruo ogologo oge, na-agwa Nna ya ihe dị ya n’obi. Ma, ihe o mere abụghị naanị ịgwa Chineke ka o meere ya ihe ahụ na-akpasi ya mkpa ike nke bụ́ ịmụta nwa. Ihe na-agụ Hana abụghị naanị inweta ihe n’aka Chineke, kama, ọ chọkwara inye ihe o nwere ike inye. O kwere nkwa, kwuo na ọ bụrụ na ya amụta nwa nwoke, ya ga-enye nwa ahụ ka o jiri ndụ ya jeere Jehova ozi.—1 Samuel 1:9-11.

Hana si otú ahụ gosi ndị ohu Chineke ezi ihe nlereanya n’ihe banyere ekpere. Jehova na-agba nnọọ ndị ya ume iji obi ha niile agwa ya okwu, n’ezoghị ọnụ, na-agwa ya mkpa ha otú nwa tụkwasịrị nna ya hụrụ ya n’anya obi na-eme. (Abụ Ọma 62:8; 1 Ndị Tesalonaịka 5:17) Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee okwu ndị a na-akasi obi banyere ikpegara Jehova ekpere: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.

Ma, ụmụ mmadụ anaghị aghọta ihe ka Jehova, ha adịghịkwa ọmịiko ka ya. Ka Hana nọ na-ebe ákwá ma na-ekpe ekpere, otu olu mere ka ọ kụja. Ọ bụ olu Ilaị, nnukwu onye nchụàjà, bụ́ onye na-ele ya kemgbe. Ilaị kwuru, sị: “Ruo ole mgbe ka ị ga na-eme ka onye mmanya na-egbu? Mee ka mmanya pụọ gị n’anya.” Ilaị hụrụ mgbe ọnụ Hana na-emegharị, mgbe ọ na-ebe ákwá, na otú ihu si gbarụọ ya. Kama ịjụ ya ihe na-eme ya, o kwubiri na mmanya na-egbu ya.—1 Samuel 1:12-14.

Cheedị otú ọ ga-esi wute Hana, n’oge ahụ ọ nọ ná nchegbu, mmadụ ibo ya ebubo na-enweghị isi—onye bokwaranụ ya ebubo ahụ abụrụ onye nọ n’ọkwá a na-akwanyere ùgwù! N’agbanyeghị nke ahụ, o gosikwara nnọọ ezi ihe nlereanya n’inwe okwukwe. O kweghị ka ezughị okè mmadụ metụta ofufe ọ na-efe Jehova. O ji nkwanye ùgwù zaa Ilaị okwu ma kọwaara ya ọnọdụ ya. Ikekwe, Ilaị jizi ihere na olu dị ala, sị: “Laa n’udo, ka Chineke Izrel meekwara gị ihe ị rịọrọ ya.”—1 Samuel 1:15-17.

Olee otú Hana ịgwa Jehova obi ya na ife ya n’ụlọikwuu ya ebe ahụ si metụta ya? Akụkọ ahụ kwuru, sị: “Nwaanyị ahụ wee laa ma riwe ihe, ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.” (1 Samuel 1:18) Obi ruru Hana ala. E nwere ike ikwu na o bunyere Nna ya nke eluigwe, bụ́ onye ka ya nnọọ ike, ibu ahụ na-anyịgbu ya. (Abụ Ọma 55:22) Ọ̀ dị nsogbu karịrị Jehova? Ọ dịghị nke karịrị ya—ma mgbe ahụ, ma ugbu a, ruokwa mgbe ebighị ebi!

Mgbe ihe na-enye anyị nsogbu n’obi, ya adị anyị ka anyị agaghị edilikwa ya, ma ọ bụ obi ajọọ anyị njọ, anyị kwesịrị iso ihe nlereanya Hana ma jiri obi anyị niile gwa Onye Baịbụl kpọrọ “Onye na-anụ ekpere” okwu. (Abụ Ọma 65:2) Ọ bụrụ na anyị ejiri okwukwe mee nke ahụ, anyị nwekwara ike ịchọpụta na “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile” ga-anọchi obi ọjọọ na-eme anyị.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

“Ọ Dịghịkwa Oké Nkume nke Dị Ka Chineke Anyị”

N’ụtụtụ echi ya, Hana so Elkena gaghachi n’ụlọikwuu ahụ. Ọ ga-abụ na ọ kọọrọla ya arịrịọ ya na nkwa o kwere, n’ihi na Iwu Mozis kwuru na di nwere ike ịkagbu nkwa nwunye ya kwere n’agwaghị ya agwa. (Ọnụ Ọgụgụ 30:10-15) Ma, nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi emeghị otú ahụ. Kama nke ahụ, ya na Hana fekọrọ Jehova ọnụ n’ụlọikwuu ahụ tupu ha alawa.

Olee nnọọ mgbe Penina chọpụtara na ọ gaghị akpasulikwa Hana iwe? Akụkọ ahụ ekwughị, ma okwu bụ́ “ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ” na-egosi na obi siri Hana ike malite mgbe ahụ gawa. Ma, Penina chọpụtara n’oge na-adịghị anya na omume obi ọjọọ ya anaghịzi emetụ ya n’ahụ́. Baịbụl akpọghị ya aha ọzọ.

Ka ọnwa ole na ole gachara, obi iru ala Hana ghọziri oké ọṅụ. Ọ dịla ime! N’oge a Hana na-aṅụrị ọnụ, o chefutụghị ebe ngọzi ya si bịa. Mgbe ọ mụrụ nwata nwoke ahụ, ọ gụrụ ya Samuel, nke pụtara “Aha Chineke,” bụ́kwa nke nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu banyere ịkpọ aha Chineke, dị ka Hana mere. N’afọ ahụ, o soghị Elkena na ezinụlọ ha gaa Shaịlo. Ya na nwa ahụ nọrọ n’ụlọ afọ atọ, bụ́ mgbe a napụrụ ya ara. O mesiziri onwe ya obi ike maka ụbọchị ya na nwa ya ọ hụrụ n’anya ga-ahapụ ibe ha.

Ọ gaghị adịrị Hana mfe ịhapụ nwa ya. N’ezie, Hana maara na a ga-elekọta Samuel anya nke ọma na Shaịlo, ikekwe ndị ga-elekọta ya ga-abụ ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ nnọọ nwata, oleekwa nne na-anaghị achọ ka ya na nwa ya nọrọ? Ka o sina dị, Hana na Elkena ji obi ụtọ, ọ bụghị mwute, kpọta nwata ahụ. Ha chụrụ àjà n’ụlọ Chineke, nyefeekwa Ilaị Samuel, chetara ya nkwa ahụ Hana kwere.

Hana kpeziri ekpere Chineke hụrụ na o ruru eru itinye n’Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee. Ka ị na-agụ okwu ya nke e dere na 1 Samuel 2:1-10, ị ga-ahụ na ihe niile o kwuru gosiri otú okwukwe ya siruru ike. O kelere Jehova maka ụzọ magburu onwe ya o si eji ike ya eme ihe—maka ike na-enweghị atụ o nwere iweda ndị mpako ala, ịgọzi ndị a na-akpagbu, na ịkpata ọnwụ ma ọ bụdị idebe mmadụ ndụ. O toro Nna ya maka ịdị nsọ, ikpe ziri ezi, na ikwesị ntụkwasị obi ya na-enweghị atụ. Hana nwere ezi ihe mere ọ ga-eji kwuo, sị: “Ọ dịghịkwa oké nkume nke dị ka Chineke anyị.” Jehova kwesịrị nnọọ ntụkwasị obi, ọ naghị agbanwe agbanwe, ọ bụkwaara ndị niile a na-akpagbu na ndị niile e wedara n’ala na-akpọku ya maka enyemaka ebe mgbaba.

Ọ bụụrụ obere nwa ahụ bụ́ Samuel ngọzi inwe nne nwere okwukwe siri ike otú ahụ na Jehova. Ọ bụ ezie na agụụ ịhụ nne ya gụrụ ya nnọọ ka ọ na-eto, ọ dịghị mgbe o chere na e chefuola ya. Kwa afọ, Hana na-abịa Shaịlo, wetara ya obere uwe elu na-enweghị aka ọ ga-eji na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ. Uwe ahụ Hana ji aka ya na-adụrụ nwa ya gosiri nnọọ na ọ hụrụ nwa ya n’anya. (1 Samuel 2:19) Anyị nwere nnọọ ike iji anya nke uche anyị hụ ebe ọ na-eyiwe nwatakịrị ahụ uwe ọhụrụ ahụ, na-adịda ya aka iji gbatịa ya, ma jiri obi ụtọ na-ele nwata ahụ anya ma na-agba ya ume. Ọ bụụrụ Samuel ngọzi inwe ụdị nne ahụ, o tolitekwara ghọọrọ nne na nna ya na Izrel dum ngọzi.

E chefughịkwanụ Hana. Jehova ji mkpụrụ nke afọ gọzie ya, ọ mụkwaara Elkena ụmụ ise ndị ọzọ. (1 Samuel 2:21) Ma eleghị anya, ngọzi kachanụ Hana nwetara bụ ezi mmekọrịta dị n’etiti ya na Nna ya, bụ́ Jehova, bụ́ nke nọ na-esiwanye ike ka oge na-aga. Ka otu ihe ahụ meere gị, ka ị na-eṅomi okwukwe Hana.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Iji ghọta ihe mere Chineke ji kwe ka ndị ya lụọ ihe karịrị otu nwaanyị ruo oge ụfọdụ, gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Ọ̀ Kwadoro Nwoke Ịlụ Ihe Karịrị Otu Nwaanyị?” na peeji nke 30 nke Ụlọ Nche July 1, 2009.

^ par. 10 Ọ bụ ezie na akụkọ ahụ kwuru na Jehova ‘mechiri akpa nwa Hana,’ ọ dịghị ihe na-egosi na Chineke na-ewesa nwaanyị a dị umeala n’obi ma kwesị ntụkwasị obi iwe. (1 Samuel 1:5) Mgbe ụfọdụ, Baịbụl na-ekwu na ọ bụ Chineke kpatara ọnọdụ ụfọdụ n’ihi na o kwere ka ha dịrị ruo oge ụfọdụ.

^ par. 13 Njem ahụ dịruru ogologo otú ahụ n’ihi na o yiri ka obodo Elkena, bụ́ Rema, ọ̀ bụ otu ebe ahụ a maara dị ka Arimatia n’oge Jizọs.

[Igbe dị na peeji nke 17]

Ekpere Abụọ Pụrụ Iche

Ekpere abụọ Hana kpere, bụ́ ndị e dere na 1 Samuel 1:11 na 2:1-10, nwere ọtụtụ ihe pụrụ iche dị na ha. Ka anyị tụlee naanị ole na ole n’ime ha:

▪ Hana kpegaara “Jehova nke ụsụụ ndị agha” ekpere nke mbụ ya. Ọ bụ ya bụ onye mbụ Baịbụl kwuru turu Jehova aha ahụ. Aha ahụ pụtara narị ugboro abụọ na iri asatọ na ise n’ime Baịbụl, ọ na-egosikwa na Chineke na-achị ọtụtụ ìgwè ụmụ ya ndị bụ́ mmụọ.

▪ Ị̀ hụrụ na mgbe Hana kpere ekpere ya nke abụọ abụghị mgbe ọ mụrụ nwa ya nwoke, kama ọ bụ mgbe ya na Elkena nyefere ya ka o jewere Chineke ozi na Shaịlo? N’ihi ya, ihe mere Hana ji nwee oké ọṅụ abụghị na ọnụ emechiela nwunye di ya, bụ́ Penina, kama na Jehova agọziela ya.

▪ Mgbe Hana kwuru, sị, “E buliwo mpi m elu n’ezie n’ime Jehova,” o nwere ike ịbụ na o bu oké ehi n’obi, bụ́ anụ siri ike e ji ebu ibu nke na-eji mpi ya akpa ike. Ihe Hana na-ekwu bụ: ‘Jehova, i meela ka m sie ike.’—1 Samuel 2:1.

▪ E weere ihe Hana kwuru banyere “onye [Chineke] tere mmanụ” dị ka amụma. Ọ bụ otu okwu ahụ ka a sụgharịrị “mesaya,” ọ bụkwa Hana bụ onye mbụ na Baịbụl ji okwu ahụ kwuo banyere eze e tere mmanụ ga-achị n’ọdịnihu. —1 Samuel 2:10.

▪ Nne Jizọs, bụ́ Meri, kwughachiri ihe ụfọdụ Hana kwuru ihe dị ka otu puku afọ ka nke ahụ gasịrị mgbe ọ na-eto Jehova.—Luk 1:46-55.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ime Hana na-atụghị kpataara ya oké nchegbu, Penina mekwara ihe niile o nwere ike ime iji mee ka obi jọkwuo Hana njọ

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Ì nwere ike iṅomi ihe nlereanya Hana nke isi n’ala ala obi kpee ekpere?

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọ bụ ezie na Ilaị ghọtahiere Hana, Hana eweghị iwe