Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ọjọọ Ga-akwụsịrịrị!

Ihe Ọjọọ Ga-akwụsịrịrị!

Ihe Ọjọọ Ga-akwụsịrịrị!

CHINEKE enyela anyị Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee, nke kọọrọ anyị ihe ndị mere ndị mmadụ ji eme ihe ọjọọ. Chineke nyekwara anyị ikike ịhọrọ ime ihe masịrị anyị na inwe njide onwe onye, bụ́ nke mere ka anyị nwee ike ịhọrọ ịghara ime ihe ọjọọ. (Diuterọnọmi 30:15, 16, 19) Ebe e sirila otú ahụ kwadebe anyị, anyị nwere ike ịchọpụta ọchịchọ ọjọọ ọ bụla anyị nwere ma mee ihe dị mkpa iji wepụ ya n’obi anyị. N’ikpeazụ, anyị izere ime ihe ọjọọ ga-ewetara anyị na ndị nọ anyị nso obi ụtọ.—Abụ Ọma 1:1.

Ma, n’agbanyeghị otú anyị si agbasi mbọ ike n’otu n’otu ịghara ime ihe ọjọọ, ụmụ mmadụ ibe anyị ka na-eme ihe ọjọọ n’ebe niile n’ụwa. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Mara nke a, na n’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” Iji gosi ihe mere oge a ji ‘taa akpụ,’ ọ gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya; zere ndị dị otú a.”—2 Timoti 3:1-5.

Ikekwe, ị hụrụ okwu bụ́ “n’oge ikpeazụ” n’amụma ahụ e depụtaghachiri n’elu. Olee ihe i chere ọ pụtara? Mgbe ọ bụla e kwuru “oge ikpeazụ,” ndị mmadụ na-aghọtakarị na ọ na-egosi na ihe na-abịa ná njedebe. Olee ihe ọ ga-abụ? Ka anyị hụ nkwa ndị Chineke kwere n’Okwu ya.

A ga-ebibi ndị ajọ omume kpamkpam.

“N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”ABỤ ỌMA 37:10, 11.

“Jehova na-eche ndị niile hụrụ ya n’anya nche, ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile n’iyi.”ABỤ ỌMA 145:20.

Mmegbu ga-akwụsị.

“Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka, nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi ha ná mmegbu nakwa n’ihe ike.”ABỤ ỌMA 72:12, 14.

“A ga-emekwa ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”NDỊ ROM 8:21.

A ga-egboro ndị mmadụ mkpa anụ ahụ́ ha.

“Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” MAỊKA 4:4.

“Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya. N’ihi na dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ; ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.”AỊZAYA 65:21, 22.

A ga-enwe ikpe ziri ezi.

“Ya mere, ọ̀ bụ na Chineke agaghị eme ka ndị ọ họọrọ, bụ́ ndị na-etiku ya ehihie na abalị, nweta ikpe ziri ezi . . . ? Ana m asị unu, Ọ ga-eme ka ha nweta ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ.” LUK 18:7, 8.

“Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya, ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi.” ABỤ ỌMA 37:28.

Ezi omume ga-anọchi anyaukwu.

“Ọ bụ ezi omume ka ndị bi n’elu ala ga-amụta.”AỊZAYA 26:9.

“E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.”2 PITA 3:13.

Ndị Mmadụ Na-agbanwe Ndụ Ha—Ọbụna Ugbu A

O doro anya na nkwa ndị dị otú ahụ ga-eme anyị niile obi ụtọ. Ma, gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ha ga-emezu? N’ezie, e nwere ihe akaebe anyị nwere ike ịhụ ugbu a na-egosi na nkwa Chineke ga-emezu. Gịnị bụ ihe akaebe ahụ? Ọ bụ na ọtụtụ nde mmadụ taa gburugburu ụwa enweela ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị dị ka ịchọ naanị ọdịmma onwe ha, ime omume rụrụ arụ, ma ọ bụ ime ihe ike ma mụta ịkwụwa aka ọtọ, ime udo, na ime omume obiọma. Taa, Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị karịrị nde asaa, bụ ụmụnna zuru ụwa ọnụ ndị meririla ịkpa ókè agbụrụ, nke mba na mba, nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na nke dị n’etiti ndị bara ọgaranya na ndị ogbenye, bụ́ ndị kpatarala oké ịkpọasị, ime ihe ike, na mwụfu ọbara kemgbe ụwa. * Na ndị mmadụ na-eme mgbanwe ndị dị otú ahụ taa na-eme ka obi sie anyị ike na nkwa ndị Chineke kwere ga-emezu n’ụzọ ka ukwuu n’ọdịnihu.

Ma, olee ihe na-eme ka ndị mmadụ mee mgbanwe ndị dị otú ahụ? Azịza ya dị ná nkwa ọzọ Baịbụl kwere, nke Aịzaya onye amụma dere. O dere, sị:

“Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọ, agụ owuru na nwa ewu ga-amakpukọkwa, nwa ehi na nwa ọdụm tojuru etoju na anụ mara abụba ga-anọkọkwa; nwatakịrị ga na-edukwa ha. . . . Ọbụna ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka oké ehi. Nwa na-aṅụ ara ga-egwurikwa egwu n’elu ọnụ ebe agwọ ubí nọ; nwatakịrị a kwụsịrị ara ga-atụkwasịkwa aka ya n’ọnụ ebe agwọ ọjọọ nọ. Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́, ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum; n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.”—Aịzaya 11:6-9.

Amụma a ọ̀ na-ekwu naanị banyere oge ụmụ anụmanụ na ụmụ mmadụ ga-ebi n’udo? Mba, ọ na-ekwu banyere ihe karịrị nke ahụ. Ị̀ hụrụ na ngwụcha ngwụcha amaokwu ndị ahụ gosiri ihe na-akpata mgbanwe ahụ: “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa”? Ihe ọmụma Chineke ọ̀ na-agbanwe àgwà ụmụ anụmanụ? Ọ naghị agbanwe ya. Ma o nwere ike ịgbanwe ụmụ mmadụ, ọ na-emekwa otú ahụ! Amụma a na-ekwu na ndị na-akpabu àgwà ka anụmanụ ga-ahapụ àgwà ndị ahụ ma nwee àgwà yiri nke Kraịst n’ihi ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi na itinye ya n’ọrụ.

Were Pedro dị ka ihe atụ. * O kweere na ya na-alụ ọgụ ime ka e nwee ikpe ziri ezi mgbe o sonyeere òtù na-eyi ọha egwu. Mgbe a zụchara ya, e nyere ya iwu ka ọ gaa gbakasịa otu ogige ndị uwe ojii. Mgbe ọ na-akwadebe ime nke ahụ, a nwụchiri ya. Pedro nọrọ ọnwa iri na asatọ n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ ebe ọ nọgidere na-agba ọchịchị mgba okpuru. Ka nke a na-eme, Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ nwunye Pedro Baịbụl. Mgbe a hapụrụ Pedro, ọ malitekwara ịmụ Baịbụl, ihe ndị ọ mụtara banyere Jehova Chineke kpalikwara ya ime ezigbo mgbanwe n’àgwà ya na n’otú o si ele ndụ anya. Pedro kwuru, sị: “M kelere Jehova na ọ dịtụghị onye m gburu n’afọ niile ahụ m bụrụ onye na-eyi ọha egwu. Ugbu a, m na-eji mma agha nke mmụọ nsọ Chineke, bụ́Baịbụl, ezisara ndị mmadụ ozi banyere ezi udo na ikpe ziri ezi—ozi ọma Alaeze Chineke.” Pedro gadịrị n’ogige ndị uwe ojii ahụ ọ kpara nkata ịgbakasị izi ha ozi udo na nke ụwa ime ihe ike na-agaghị adị na ya.

Ike Okwu Chineke na-akpa n’ahụ́ ndị mmadụ kwesịrị ime ka anyị niile nwekwuo okwukwe ná nkwa Chineke kwere nke bụ́ na ihe ọjọọ niile ga-akwụsịrịrị. N’ezie, ndị mmadụ agaghị anọgide na-eme ihe ọjọọ ruo mgbe ebighị ebi, kama nke ahụ, ha ga-agbanwe. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ewepụ onye malitere ihe ọjọọ, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye a na-anaghị ahụ anya na-achịkwa ihe na-eme n’ụwa. Baịbụl kwuru, sị: “Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ma, a ga-ewepụ ya n’oge na-adịghị anya. A ga-ewepụkwa ndị gbara isi akwara nọgide na-eme omume ọjọọ. Ọ ga-amagbu nnọọ onwe ya ịdị ndụ n’oge ahụ!

Olee ihe mmadụ ga-emerịrị iji jide n’aka na ọ ga-adị ndụ n’oge ahụ? Cheta na ọ bụ “ihe ọmụma Jehova” mere ndị mmadụ ji na-agbanwe ndụ ha taa nakwa na ọ bụ ya ga-eme ka e nwee mgbanwe zuru ụwa ọnụ n’oge na-adịghị anya. Site n’ịmụta Baịbụl nke ọma na ime ihe ndị ị mụtara eme—dị ka Pedro mere—ị ga-enwekwa olileanya ibi n’ụwa nke ‘ezi omume ga-ebi n’ime ya.’ (2 Pita 3:13) N’ihi ya, anyị na-agba gị ume ka i jiri ohere a ka nwere mata Chineke na Jizọs Kraịst nke ọma, n’ihi na nke ahụ nwere ike ime ka i nwee ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 21 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 25 Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Ị ga-enwekwa olileanya ibi n’ụwa nke ‘ezi omume ga-ebi n’ime ya.’—2 PITA 3:13