Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ejila Onwe Gị Atụnyere Ndị Ọzọ

Ejila Onwe Gị Atụnyere Ndị Ọzọ

Nke 2

Ejila Onwe Gị Atụnyere Ndị Ọzọ

GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZI? “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya, mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye ọzọ.”—Ndị Galeshia 6:4.

OLEE IHE MERE O JI ESI IKE? Anyị na-ejikarị onwe anyị atụnyere ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ ndị anyị ka nwee ihe, ma mgbe mgbe, ọ na-abụ ndị ka anyị ike, ndị ka anyị nwee ihe, ma ọ bụ ndị ka anyị nwee nkà. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ na-arụpụta ihe na-adịghị mma. Anyị na-ekwere ụgha bụ́ na ihe na-egosi otú mmadụ baruru n’uru bụ ihe o nwere na ihe ọ ga-emeli. Anyị nwekwara ike ịmalite inwere ndị ọzọ anyaụfụ ma ọ bụ nwee mmụọ ịmarịta aka.—Ekliziastis 4:4.

OLEE IHE I NWERE IKE IME? Gbalịa ile onwe gị anya otú Chineke si ele gị. Ka otú o si were gị bụrụ otú i si were onwe gị. “Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova * na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Samuel 16:7) Otú Jehova si amata uru ị bara abụghị iji gị atụnyere onye ọzọ, kama ọ bụ ịmata ihe dị gị n’obi, inyocha echiche na ebumnobi gị. (Ndị Hibru 4:12, 13) Jehova maara ihe ndị ị na-agaghị emeli, ọ na-agbakwa gị ume ka ị ghara ịchọwa ime ihe ndị ahụ. Ọ bụrụ na ihe i ji amata uru ị bara bụ iji onwe gị atụnyere ndị ọzọ, ma ọ́ bụghị na ị ga-adị mpako, ya abụrụ na o nweghị mgbe ị ga-enwe afọ ojuju. N’ihi ya, jiri obi umeala kweta na ị gaghị abụ ọkacha mma n’ihe niile.—Ilu 11:2.

Olee kpọmkwem ihe i kwesịrị ime iji baa uru n’anya Chineke? Onye amụma ya o nyere ike mmụọ nsọ, bụ́ Maịka, dere, sị: “Gị mmadụ, ọ gwawo gị ihe dị mma. Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” (Maịka 6:8) Ọ bụrụ na i soro ndụmọdụ ahụ, Chineke ga-elekọta gị. (1 Pita 5:6, 7) Nke a ó kwesịghị ime ka anyị nwee afọ ojuju?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Aha a kpọrọ Chineke na Baịbụl.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ihe Jehova ji ama uru anyị bara bụ ihe dị anyị n’obi