Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee ebe Paradaịs Baịbụl kwuru okwu ya dị?

Olee ebe Paradaịs Baịbụl kwuru okwu ya dị?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Olee ebe Paradaịs Baịbụl kwuru okwu ya dị?

▪ Jizọs kwere otu nwoke nọ n’ọnụ ọnwụ nke ji obi ike gosi okwukwe n’ebe ọ nọ nkwa, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Olee ebe nwoke ahụ ga-anọ? Paradaịs ọ̀ ga-adị n’eluigwe, n’ụwa, ka ọ̀ bụ n’agbata eluigwe na ụwa, bụ́ ebe ụmụ mmadụ ga-anọ chere ikpe?

O nwere mgbe nne na nna mbụ anyị bi na Paradaịs. Baịbụl gwara anyị, sị: “Jehova bụ́ Chineke kụkwara ubi n’Iden, n’ebe ọwụwa anyanwụ, ọ bụ n’ebe ahụ ka o mere ka mmadụ ahụ ọ kpụrụ nọrọ . . . Jehova bụ́ Chineke wee kpọrọ mmadụ ahụ mee ka o biri n’ogige Iden ka ọ na-akọ ihe na ya ma na-elekọta ya.” (Jenesis 2:8, 15) Mgbe e si na Hibru sụgharịa okwu ndị ahụ n’asụsụ Grik, a sụgharịrị okwu a kpọrọ “ubi” pa·raʹdei·sos na Grik, bụ́ ebe e si nweta okwu Igbo bụ́ “paradaịs.”

Dị nnọọ ka di na nwunye na-ewusakwu ụlọ ha ma ha mụọ ọtụtụ ụmụ, otú ahụ ka a tụrụ anya na mgbe ụmụ mmadụ na-amụba, nne na nna anyị ga-eme ka Paradaịs ahụ buo ibu karịa otú ogige Iden ahụ hà. Chineke gwara ha, sị: “Jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu.”—Jenesis 1:28.

N’ihi ya, nzube Onye kere anyị bụ ka ụmụ mmadụ biri ma mụọ ụmụ na Paradaịs n’ụwa ebe a. Ha ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ụwa mara mma ka ubi, ọ gaghị adịkwa mkpa ka e nwee ebe ili ozu ọ bụla. E mere ụwa ka ọ bụrụ ebe mmadụ niile ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ihe e ji chọọ ụwa anyị a mma ji eme anyị ezigbo obi ụtọ! E kere anyị ka anyị biri n’ụwa mara mma.

Nzube Chineke ọ̀ gbanweela? Mba. N’ihi na Jehova mesiri anyị obi ike, sị: “Otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị. Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ.” (Aịzaya 55:11) Ihe karịrị puku afọ atọ e kechara mmadụ, Baịbụl kwuru banyere “Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya,” na ‘o keghị ya n’efu,’ kama na ọ “kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.” (Aịzaya 45:18) Uche Chineke agbanwebeghị. Ụwa ka ga-abụ paradaịs.

Ọ dị mma ịmara na ọtụtụ amaokwu Baịbụl kwuru banyere Paradaịs na-akọwa otú ndụ ga-adị n’ụwa. Dị ka ihe atụ, amụma Aịzaya kwuru, sị: “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha.” (Aịzaya 65:21) Olee ebe a na-ewu ụlọ ma na-akọ ubi vaịn? Olee ebe a na-eri mkpụrụ osisi? Ọ bụ n’ụwa. Ilu 2:21 kwuru hoo haa, sị: “Ọ bụ ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa.”

Jizọs kwukwara banyere paradaịs elu ụwa. N’eziokwu, o kwekwara nkwa paradaịs eluigwe, ma, ọ bụ maka mmadụ ole na ole a họọrọ. (Luk 12:32) Mgbe ha nwụrụ, a na-akpọlite ha n’ọnwụ ịga Paradaịs eluigwe ka ha soro Kraịst chịa Paradaịs elu ụwa. (Mkpughe 5:10; 14:1-3) Ndị ahụ ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe ga-ahụ na a chịrị Paradaịs elu ụwa otú kwesịrị ekwesị ma lekọta ya otú Chineke chọrọ.

Jizọs maara na nke a bụ uche Chineke maka ụwa. A sị ka e kwuwe, ya na Nna ya nọ n’eluigwe mgbe e kere ubi Iden. Ohere dịịrị mmadụ niile nwere okwukwe n’oge a ịdị ndụ n’ọdịnihu na paradaịs elu ụwa. (Jọn 3:16) Jizọs kwere onye ọ bụla dị otú ahụ nkwa, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:43.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 25]

© FORGET Patrick/SAGAPHOTO.COM/Alamy