Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Maara Na Adam na Iv Ga-emehie?

Chineke Ọ̀ Maara Na Adam na Iv Ga-emehie?

Chineke Ọ̀ Maara Na Adam na Iv Ga-emehie?

ỌTỤTỤ ndị na-eji ezi obi ajụ ajụjụ a. Mgbe e kwuwere banyere ihe mere Chineke ji kwere ka mmebi iwu dịrị, a na-echeta mmehie di na nwunye mbụ ahụ mere n’Iden. Okwu ahụ bụ́ na ‘Chineke maara ihe niile’ nwere nnọọ ike ime ka ụfọdụ ndị kwubie na ọ ga-abụrịrị na Chineke bu ụzọ mara na Adam na Iv ga-enupụrụ ya isi.

Ọ bụrụ n’ezie na Chineke maara na di na nwunye a zuru okè ga-emehie, olee ihe ọ ga-apụta? Ọ ga-apụta na ọ bụ Chineke kpatara ọtụtụ ihe ọjọọ. Ọ ga-eyi ka ọ hụghị anyị n’anya, na ọ bụghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi, nakwa na ọ naghị eme ihe n’eziokwu. Ụfọdụ ga-eche na ọ bụ onye obi tara mmiri ma ọ bụrụ na ọ hapụrụ ụmụ mmadụ mbụ ahụ ka ha banye n’ihe o bu ụzọ mara na ọ ga-akpata ọdachi. Ọ ga-adị ka ọ̀ bụ Chineke kpatara ihe ọjọọ na ahụhụ niile ụmụ mmadụ tarala—ma ọ bụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, na aka ya dị na ya. Ụfọdụ ndị ga-echedị na Onye Okike anyị bụ onye iberiibe.

Ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere Jehova Chineke ọ̀ na-egosi na ọ bụ ụdị onye ahụ? Iji nweta azịza ya, ka anyị tụlee ihe Baịbụl kwuru banyere ihe ndị Jehova kere na ụdị onye ọ bụ.

“Ha Dị Nnọọ Mma”

Akwụkwọ Jenesis kwuru banyere ihe ndị Chineke kere, bụ́ nke gụnyere mmadụ abụọ mbụ ahụ dịrị ndụ n’ụwa, sị: “Chineke hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.” (Jenesis 1:31) E kere Adam na Iv ka ha zuo okè, bụ́ nke dabara n’ụdị ụwa ha bi na ya. Ahụ́ ha zuru okè. Ebe ọ bụ na ha “dị nnọọ mma” mgbe e kechara ha, n’ezie ha ga-akpali àgwà ọma a chọrọ ha n’aka. E kere ha “n’onyinyo Chineke.” (Jenesis 1:27) N’ihi ya, ha nwere ike igositụ àgwà Chineke ndị dị ka amamihe, ịhụnanya na-adịgide adịgide, ikpe ziri ezi, na ịdị mma. Ịtụgharị uche n’àgwà ndị ahụ ga-enyere ha aka ime mkpebi ndị ga-abara ha uru ma mee Nna ha nke eluigwe obi ụtọ.

Jehova mere ka mmadụ abụọ ahụ nwere ọgụgụ isi, bụ́ ndị zuru okè, nwee ikike ikpebiri onwe ha ihe ha chọrọ ime. N’ihi ya, e keghị ha otú ha ga-emerịrị uche Chineke—dị ka ụfọdụ robọt. Chee echiche banyere ya. Olee onyinye nke ga-aka amasị gị—nke mmadụ ji obi ya niile nye gị ka ọ̀ bụ nke o nyere gị iji mezuo iwu? Azịza ya doro anya. N’otu aka ahụ, a sị na Adam na Iv ji obi ha niile họrọ irubere Chineke isi, nrubeisi ha gaara aka amasị ya. Ikike e nyere di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ ikpebiri onwe ha ihe ha chọrọ ime mere ka ha nwee ike iji ịhụnanya rubere Jehova isi.—Diuterọnọmi 30:19, 20.

Onye Ezi Omume, Onye Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi na Onye Dị Mma

Baịbụl mere ka anyị mara àgwà dị iche iche nke Jehova. Àgwà ndị a mere ka ọ ghara inwe ihe ọ bụla jikọrọ ya na mmehie. Abụ Ọma 33:5 kwuru na Jehova “hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya.” N’ihi ya, Jems 1:13 kwuru, sị: “A pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” Ebe Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-echebara ụmụ mmadụ echiche, ọ dọrọ Adam aka ná ntị, sị: “I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.” (Jenesis 2:16, 17) E nyere di na nwunye mbụ ahụ ohere ịhọrọ ndụ ebighị ebi ma ọ bụ ọnwụ. Chineke ọ́ gaghị abụ onye ihu abụọ ma ọ bụrụ na ọ dọọ ha aka ná ntị ka ha ghara ime otu mmehie mgbe o burula ụzọ mara na ha ga-enupụrụ ya isi ma daba ná nsogbu? Ebe Jehova “hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya,” ọ gaghị agwa ha họrọ ihe ọ maara na-adịghị adị.

Ịdị mma Jehova dịkwa ukwuu. (Abụ Ọma 31:19) Mgbe Jizọs na-akọwa Chineke, o kwuru, sị: “Ònye n’etiti unu ka nwa ya nwoke ga-arịọ achịcha—ọ gaghị enye ya nkume, ka ọ̀ ga-enye ya? Ma ọ bụ, ma eleghị anya, ya arịọ azụ̀—ọ gaghị enye ya agwọ, ka ọ̀ ga-enye ya? Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya ihe ọma karị!” (Matiu 7:9-11) Chineke na-enye ndị o kere eke “ihe ọma.” Otú e si kee ụmụ mmadụ na otú e si kee Paradaịs ahụ Chineke kwadebeere ha gosiri na Chineke dị mma. Ezi Onye Ọchịchị dị otú ahụ ọ̀ ga-enwe obi ọjọọ nke na ọ ga-akwadebere ụmụ mmadụ ebe obibi mara mma nke ọ maara na a ga-anapụ ha? Ee e. Ọ bụghị Onye Okike anyị dị mma ma bụrụ onye ezi omume kpatara nnupụisi ụmụ mmadụ.

“Onye Naanị Ya Maara Ihe”

Akwụkwọ Nsọ gosikwara na Jehova bụ onye “naanị ya maara ihe.” (Ndị Rom 16:27) Ndị mmụọ ozi Chineke nọ n’eluigwe hụrụ ọtụtụ ihe gosiri amamihe ya na-enweghị atụ. Ha malitere “iti mkpu otuto” mgbe Jehova kere ihe n’ụwa. (Job 38:4-7) O doro anya na ndị mmụọ a nwere ọgụgụ isi nwere ezigbo mmasị n’ihe ndị mere n’ogige Iden. Chineke nke maara ihe ọ̀ ga-ekechazi eluigwe na ụwa dị ebube, keekwa ọtụtụ ihe ndị mara mma n’ụwa, ma nọrọ n’ihu ụmụ ya bụ́ ndị mmụọ ozi kee ndị abụọ pụrụ iche bụ́ ndị ọ maara na ha ga-enupụrịrị ya isi ma daba ná nsogbu? O doro anya na ime ụdị atụmatụ ahụ nke ga-akpata ọdachi ga-abụ ime iberiibe.

Ma, mmadụ ka nwere ike ịjụ, sị, ‘Ma olee otú Chineke onye kacha nwee amamihe ga-esi ghara ịma?’ N’ezie, otu ihe e ji mara amamihe dị ukwuu nke Jehova bụ na o nwere ike ịnọ “ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ.” (Aịzaya 46:9, 10) Ma, ọ bụghị iwu na ọ ga-eji ikike a rụọ ọrụ mgbe niile, dị nnọọ ka ọ na-abụghị iwu na ọ ga-eji ike ya niile arụ ọrụ mgbe niile. Ebe Jehova bụ onye maara ihe, ọ bụghị ihe niile ga-eme n’ọdịnihu ka ọ na-achọ ibu ụzọ mara. Ọ na-eji ikike ahụ eme ihe mgbe o kwesịrị ekwesị na mgbe ọnọdụ chọrọ ka o mee otú ahụ.

E nwere ike iji otu ihe ndị nkà na ụzụ mepụtara n’oge a mee ihe atụ nke otú Chineke ga-esi ghara iji ikike o nwere ịma ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu amata ihe niile. Onye na-ele egwuregwu bọl dị na vidio nwere ike ịhọrọ ibu ụzọ lee ebe ngwụcha egwuregwu ahụ iji mata ndị meririnụ. Ma, ọ bụghị iwu na ọ ga-eme otú ahụ. Ònye ga-ata ya ụta ma ọ bụrụ na ọ họrọ ịmalite n’isi lechaa egwuregwu ahụ? N’otu aka ahụ, o doro anya na Onye Okike anyị họọrọ ịhapụ ibu ụzọ mata ihe ndị ga-emenụ. Kama, ọ họọrọ ichere iji hụ otú ụmụ ya ndị nọ n’elu ala ga-esi akpa àgwà ka oge na-aga.

Dị ka anyị kwuru ná mmalite, amamihe Jehova mere ka ọ ghara ike mmadụ abụọ mbụ ahụ ka robọt a rụrụ ime ihe ọ bụla a gwara ya. Kama, o kere ha ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ha ga-eme. Ọ bụrụ na ha ahọrọ ime ihe ziri ezi, ha ga-enwe ike igosi na ha hụrụ Chineke n’anya, na-ekele ya ma na-erubere ya isi, si otú ahụ wetakwuoro onwe ha na Jehova, bụ́ Nna ha nke eluigwe, obi ụtọ.—Ilu 27:11; Aịzaya 48:18.

Akwụkwọ Nsọ gosiri na e nwere ọtụtụ mgbe Chineke na-achọghị ibu ụzọ mara ihe ga-eme ruo mgbe ha mere. Dị ka ihe atụ, mgbe Ebreham bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi na-achọ ịchụ nwa ya n’àjà, Jehova gwara ya, sị: “Ugbu a ka m matara na ị na-atụ egwu Chineke n’ihi na ị jụghị inye m nwa gị nke ị mụrụ naanị ya.” (Jenesis 22:12) N’aka nke ọzọ, o nwekwara mgbe àgwà ọjọọ nke ụfọdụ ndị ‘kpasuru Chineke iwe.’ Ọ̀ gaara ewute ya ma à sị na o bu ụzọ mara ihe ha ga-eme?—Abụ Ọma 78:40, 41; 1 Ndị Eze 11:9, 10.

N’ihi ya, anyị kwesịrị nnọọ ikwubi na Chineke anyị, onye naanị ya maara ihe, ejighị ikike ya nke ibu ụzọ mara ihe ga-eme n’ọdịnihu mata na nne na nna mbụ anyị ga-emehie tupu ha emehie. Ọ dịghị iberiibe nke na ọ ga-eme ihe ọ maara na-agaghị aba uru, jiri ikike o nwere ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu mata ihe ọjọọ ga-esi n’ihe ọ chọrọ ime pụta ma mee ihe ọ maara ga-akpata nsogbu.

“Chineke Bụ Ịhụnanya”

Ọ bụ onye iro Chineke bụ́ Setan malitere nnupụisi ahụ n’Iden, bụ́ nke kpataara anyị ihe ọjọọ, tinyere mmehie na ọnwụ. Setan si otú ahụ bụrụ “ogbu mmadụ.” O gosikwara na ọ bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.” (Jọn 8:44) Ebe ya onwe ya bu ihe ọjọọ n’obi, ọ na-agba mbọ ime ka e chee na Onye Okike anyị nke hụrụ anyị n’anya bukwa ihe ọjọọ n’obi. Ọ ga-atọ ya ụtọ ibulara Jehova ụta maka mmehie ụmụ mmadụ.

Ihe kacha mee ka Jehova ghara ibu ụzọ mara ma Adam na Iv hà ga-emehie bụ ịhụnanya ya. Ịhụnanya bụ àgwà bụ́ isi Chineke nwere. Jọn nke Mbụ 4:8 kwuru, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” Ịhụnanya na-akpali mmadụ ime ihe ọma, ọ bụghị ihe ọjọọ. Ọ na-eme ka mmadụ na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma. N’ezie, ịhụnanya Jehova Chineke nwere n’ebe di na nwunye mbụ ahụ nọ mere ka ọ chọọ imere ha ihe ga-akacha abara ha uru.

Ọ bụ ezie na ụmụ Chineke nọ n’elu ụwa nwere ike ịhọrọ ime ihe ọjọọ, Chineke anyị hụrụ anyị n’anya achọghị ichewe na ndị ahụ zuru okè o kere ga-eme ihe ọjọọ, ọ chọghịkwa inyowe ha enyowe. O nyere ha ihe niile dị ha mkpa ná ndụ ma gwa ha ihe niile ha kwesịrị ịma. Chineke kwesịrị nnọọ ịtụ anya ka ha jiri ịhụnanya rubere ya isi, ọ bụghị inupụrụ ya isi. Ọ maara na Adam na Iv ga-ekwesịli ntụkwasị obi, otú ahụ ndị na-ezudịghị okè, dị ka Ebreham, Job, Daniel, na ọtụtụ ndị ọzọ, mechara kwesị.

Jizọs kwuru, sị: “N’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.” (Matiu 19:26) Nke ahụ na-akasi anyị obi. Ịhụnanya Jehova, na àgwà ya ndị ọzọ bụ́ isi, dị ka ikpe ziri ezi, amamihe, na ike, na-eme ka obi sie anyị ike na mgbe oge ya ruru, ọ ga-ewepụli ihe niile mmehie na ọnwụ kpatara, nakwa na ọ ga-ewepụ ha.—Mkpughe 21:3-5.

O doro anya na Jehova ebughị ụzọ mara na di na nwunye mbụ ahụ ga-emehie. Ọ bụ ezie na nnupụisi mmadụ na ahụhụ ọ kpatara wutere Chineke, ọ maara na ọnọdụ a na-agaghị adịgide adịgide agaghị egbochi mmezu nke nzube ebighị ebi ya maka ụwa na ụmụ mmadụ bi na ya. Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụtakwuo banyere nzube ahụ na otú i nwere ike isi rite uru ná mmezu ya dị ebube? *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 23 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nzube Chineke maka ụwa, gụọ isi nke 3 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Jehova ekeghị mmadụ abụọ mbụ ahụ ka robọt a rụrụ ime ihe ọ bụla a gwara ya

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

Chineke maara na Adam na Iv ga-ekwesịli ntụkwasị obi