Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

Mụta Ihe n’Okwu Chineke

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị iji nweta azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa?

Ụwa bụ ebe obibi ụmụ mmadụ. Mgbe Chineke kechara ndị mmụọ ozi ka ha biri n’eluigwe, o kere ụmụ mmadụ ka ha biri n’ụwa. (Job 38:4, 7) N’ihi ya, Jehova tinyere mmadụ mbụ na paradaịs mara mma nke a kpọrọ Iden ma nye ya na ụmụ ọ ga-amụ n’ọdịnihu olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa.—Jenesis 2:15-17; gụọ Abụ Ọma 115:16.

Ogige Iden ahụ dị n’otu ebe na-ebughị ibu n’ụwa. Di na nwunye mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, ga-amụ ụmụ. Ka ezinụlọ ha na-amụba, ha ga-akọ ihe n’ụwa ma mee ka ọ bụrụ paradaịs. (Jenesis 1:28) Ọ dịghị mgbe a ga-ebibi ụwa.—Gụọ Abụ Ọma 104:5.

2. Gịnị mere ụwa abụghị paradaịs ugbu a?

Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, n’ihi ya, a chụpụrụ ha n’Iden. Paradaịs ahụ funahụrụ ha, o nwebeghịkwa onye nwere ike iweghachi ya. Baịbụl kwuru, sị: “E nyefewo ụwa n’aka onye ajọ omume.”—Job 9:24; gụọ Jenesis 3:23, 24.

Ma, Jehova echefubeghị ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ, ọ ga-emezurịrị ya. (Aịzaya 45:18) Ọ ga-eme ka ụmụ mmadụ maliteghachi ịdị ndụ otú o bu n’obi kee ha.—Gụọ Abụ Ọma 37:11.

3. Olee otú Chineke ga-esi mee ka udo dịghachi n’ụwa?

Chineke ga-eburịrị ụzọ bibie ndị ajọ omume ka ụmụ mmadụ nwee ike ibi n’udo. N’agha Amagedọn, ndị mmụọ ozi Chineke ga-ebibi ndị niile na-emegide Chineke. A ga-atụ Setan mkpọrọ otu puku afọ, ma ndị hụrụ Chineke n’anya ga-alanahụ, ha ga-ekporikwa ndụ mgbe ihe niile ga-adị ọhụrụ n’ụwa.—Gụọ Mkpughe 16:14, 16; 20:1-3; 21:3, 4.

4. Olee mgbe ahụhụ ga-akwụsị?

N’ime otu puku afọ ahụ, Jizọs ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa ma mee ka ụwa bụrụghachi paradaịs. Ọ ga-agbagharakwa ndị hụrụ Chineke n’anya mmehie ha. Jizọs ga-esi otú ahụ wepụ ọrịa, ịka nká, na ọnwụ.—Gụọ Aịzaya 11:9; 25:8; 33:24; 35:1.

Olee mgbe Chineke ga-ewepụ ihe ọjọọ n’ụwa? Jizọs kwuru banyere “ihe ịrịba ama” nke ga-egosi mgbe ọgwụgwụ na-eru nso. Ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a na-akpa ndụ ụmụ mmadụ aka ọjọọ ma na-egosi na anyị bizi ‘n’ọgwụgwụ usoro ihe a.’—Gụọ Matiu 24:3, 7-14, 21, 22; 2 Timoti 3:1-5.

5. Olee ndị ga-ebi na Paradaịs ahụ a ga-enwe n’ọdịnihu?

Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya ma na-ezi ha ụzọ ịhụnanya Chineke. (Matiu 28:19, 20) N’ụwa niile, Jehova na-akwadebe ọtụtụ nde mmadụ maka ịdị ndụ n’ụwa mgbe ihe niile ga-adị ọhụrụ. (Zefanaya 2:3) N’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, ndị mmadụ na-amụta otú ha ga-esi bụrụkwuo ezigbo ndị di na ndị nna na otú ha ga-esi bụrụkwuo ezigbo ndị nwunye na ndị nne. Ụmụaka na ndị nne na nna na-amụkọ ihe ọnụ banyere ihe mere ha ga-eji kwere na ọdịnihu ga-aka mma.—Gụọ Maịka 4:1-4.

N’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị ga-ahụ ndị hụrụ Chineke n’anya ma chọọ ịmụta otú ha ga-esi na-eme ihe dị ya mma.—Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 3 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.