Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ndị Agadi Ga-abụghachi Ụmụ Okoro na Agbọghọ

Mgbe Ndị Agadi Ga-abụghachi Ụmụ Okoro na Agbọghọ

Bịaruo Chineke Nso

Mgbe Ndị Agadi Ga-abụghachi Ụmụ Okoro na Agbọghọ

ÒNYE n’ime anyị ka nsogbu ndị ha na nká na-eso, ya bụ, ahụ́ ndọlị, ahụchaghị ụzọ, anụghị ihe, na ụkwụ ịma jijiji, na-amasị? I nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Olee ihe mere Chineke ga-eji kee anyị ịgbasi ike n’oge okoro na agbọghọ, ma e mesịa, anyị atụwa ụjọ nsogbu ndị ha na nká na-eso?’ Obi ga-adị gị ụtọ ịmata na nke ahụ abụghị ihe Chineke bu n’obi kee anyị. Kama nke ahụ, n’ihi ịhụnanya ya, o bu n’obi iwepụrụ anyị ịka nká! Ka anyị tụlee ihe a gwara nna ochie bụ́ Job, nke dị na Job 33:24, 25.

Tụlee ọnọdụ Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova hụrụ n’anya. Job amaghị na Setan amaala ikwesị ntụkwasị obi ya aka n’ihu Chineke, na-ekwu na Job na-efe Chineke naanị n’ihi ihe ndị ọ na-enweta n’aka Chineke. Jehova kwere ka Setan lee Job ule n’ihi na Chineke nwere obi ike n’ebe Job nọ, marakwa na Ya ga-ewepụli ihe ọjọọ ọ bụla Setan wetaara Job. Setan wee “mee ka etuto ọjọọ too Job, malite n’ọbụ ụkwụ ya ruo n’opu isi ya.” (Job 2:7) Ikpuru kpuchiri Job ahụ́, akpụkpọ ahụ́ ya kpọkwara nkụ, jie oji, ma na-adapụsị. (Job 7:5; 30:17, 30) Ì nwere ike iji anya nke uche gị hụ ahụhụ Job nọ na ya? N’agbanyeghị nke ahụ, Job nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ma kwuo, sị: “Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!”—Job 27:5.

Ma, o nwere nnọọ otu ihe Job mejọrọ. Mgbe o yiri ya ka ọnwụ ya ọ̀ na-erukwu nso, ‘ịkpọ mkpụrụ obi nke ya onye ezi omume kama ịkpọ Chineke onye ezi omume’ dịwaziri ya mkpa gabiga ókè. (Job 32:2) Chineke si n’ọnụ Elaịhu dọọ Job aka ná ntị. Ma, Elaịhu zikwara Job ozi na-akasi obi Chineke ziri ya, nke bụ́: “Napụta [Job] ka ọ ghara ịgbada n’olulu [ili]! Enwetawo m ihe mgbapụta! Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata; Ka ọ laghachi otú ọ dị n’oge o nwere ike okorobịa.” (Job 33:24, 25) Ọ ga-abụrịrị na okwu ndị ahụ mere nnọọ ka Job nwee olileanya. Ọ gaghị atara ahụhụ nwụọ. Ọ bụrụ na Job echegharịa, Chineke ga-anara ihe mgbapụta ọ ga-enye maka onwe ya ma mee ka o nwere onwe ya ná nsogbu ya. *

Job ji obi umeala nabata mgbazi a gbaziri ya ma chegharịa. (Job 42:6) Ọ ga-abụ na Jehova nabatara ihe mgbapụta maka mmehie Job, kwere ka o kpuchie mmehie ya ma mee ka Chineke nwee ike ịgwọ ya ma kwụghachi ya ụgwọ. Jehova ‘gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya.’ (Job 42:12-17) Cheedị otú ahụ́ si ruo Job ala mgbe ọrịa ọjọọ ya lara, ya adị nnọọ ka ahụ́ ya ọ̀ “dị ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata,” a gọziekwa ya n’ụzọ ndị ọzọ!

Ihe mgbapụta Chineke naara maka mmehie Job bara uru ruo naanị nwa oge ebe ọ bụ na Job ka bụ mmadụ na-ezughị okè, mechaakwa nwụọ. Anyị nwere ihe mgbapụta nke ka nnọọ nke ahụ mma. Jehova ji ịhụnanya ya nye Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka anyị. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Ndị niile nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’elu ala. N’ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ, Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ kwụsị ịka nká. Ọ́ gaghị adị mma ka ị matakwuo banyere otú i nwere ike isi dị ndụ ruo mgbe ndị agadi ga-ahụ ka ‘ahụ́ ha dị ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ha bụ nwata’?

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’Eprel:

Job 16-37

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Okwu bụ́ “ihe mgbapụta” e dere ebe a pụtara “mkpuchi.” (Job 33:24) O nwere ike ịbụ na ihe mgbapụta a chọrọ n’aka Job bụ àjà e ji anụmanụ chụọ, bụ́ nke Chineke ga-anabata iji kpuchie mmehie Job.—Job 1:5.