Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amụma nke 3. Ọrịa

Amụma nke 3. Ọrịa

Amụma nke 3. Ọrịa

“Ndị mmadụ . . . ga na-arịa ọrịa ọjọọ.”—LUK 21:11, Contemporary English Version.

● Bonzali bụ onye ọrụ ahụ́ ike nke bi n’otu mba dị n’Afrịka nke agha obodo kparala aka ọjọọ. Ọrịa Mabọg * nọ na-egbusị ndị na-egwupụta ọla n’obodo ya. Ọ nọkwa na-agbalị ike ya niile ịgwọ ha. Ọ rịọrọ ndị ọrụ ahụ́ ike nọ n’obodo mepere emepe ka ha bịa nyere ya aka, ma ha abịaghị ozugbo ahụ. Ha mechara bịa mgbe ọnwa anọ gaferela, ma ya abụrụ na Bonzali anwụọla. O si n’aka ndị ahụ ọ na-agwọ bute ọrịa Mabọg.

GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? Ọrịa ndị dị ka oyi ịba mmadụ n’ahụ́, afọ ọsịsa, ọrịa o biri n’ájá ọcha, ụkwara nta, na ịba so n’ọrịa ndị kacha egbu ndị mmadụ. N’otu afọ na-adịbeghị anya, ọrịa ndị a gburu ihe dị ka nde mmadụ iri na narị puku asaa. Ihe ọ pụtara bụ na ọrịa ndị ahụ gburu ihe dị ka otu puku mmadụ na narị abụọ n’otu awa ọ bụla n’afọ ahụ.

GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? Ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa na-ebuwanye ibu, n’ihi ya, e kwesịrị inwekwu ndị na-arịa ọrịa. E nwekwuola ndị nwere ike ibute ọrịa.

IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? N’eziokwu, ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa ebukwuola nnọọ ibu. Ma, ụmụ mmadụ amụtakwuola otú e si achọpụta ọrịa, otú e si eme ka ọrịa ghara ịgbasa, nakwa otú e si agwọ ọrịa. Ebe ọ dị otú ahụ, ọ̀ bụ na ọrịa ndị na-arịa ụmụ mmadụ ekwesịghị ibelata? Kama ibelata, ọ na-aka njọ.

GỊNỊ KA I CHERE? Ndị mmadụ hà na-arịa ọrịa ọjọọ dị ka Baịbụl buru n’amụma?

Ala ọma jijiji, ụkọ nri, na ọrịa bụ ihe ndị a na-anaghị ahụ anya, ma ha na-echi ọtụtụ nde mmadụ ọnụ n’ala. Ọtụtụ nde ndị ọzọ na-ata ahụhụ n’ihi na mmadụ ibe ha na-emekpọ ha ọnụ. Ndị na-echi ọtụtụ n’ime ndị a ọnụ n’ala bụ ndị kwesịrị inyere ha aka. Ka anyị hụ ihe Baịbụl buru n’amụma na ọ ga-eme.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Onye ọrịa Mabọg na-arịa na-enwe oké ahụ́ ọkụ, ọbara na-agbakwa ya n’ime ahụ́. Ọrịa a na ọrịa Ebola yiri.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Ọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ịhụ ebe ọdụm ma ọ bụ anụ ọzọ tagburu mmadụ, ma ọ na-awụkwa akpata oyi n’ahụ́ ịhụ ebe ọrịa ọjọọ gburu mmadụ ma na-ahụ ka ọ ka na-egbukwa ọtụtụ ndị ọzọ.”—MICHAEL OSTERHOLM BỤ́ ỌKACHAMARA N’IHE BANYERE ỌRỊA NA-EFE EFE.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 6]

© William Daniels/Panos Pictures