Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amụma nke 6. Ikwusa Ozi Ọma N’ụwa Niile

Amụma nke 6. Ikwusa Ozi Ọma N’ụwa Niile

Amụma nke 6. Ikwusa Ozi Ọma N’ụwa Niile

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—MATIU 24:14.

● Vaiatea bi n’otu agwaetiti dị n’ime ime obodo Tuamotu, nke dị n’Oké Osimiri Pasifik. Ọ bụ ezie na Tuamotu nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ agwaetiti iri asatọ ndị dịcha anya n’ibe ha, ndị bi na ha dị naanị ihe dị ka puku mmadụ iri na isii. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndịàmà Jehova agaala ebe ahụ zie Vaiatea na ndị agbata obi ya ozi ọma. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ndịàmà Jehova chọrọ izi mmadụ niile ozi ọma Alaeze Chineke, n’agbanyeghị ebe ha bi.

GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? A na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ebe niile n’ụwa. Naanị n’afọ 2010, Ndịàmà Jehova ji ihe karịrị otu ijeri awa na narị nde isii kwusaa ozi ọma na narị ala abụọ na iri atọ na isii. Ihe nke a pụtara bụ na otu Onyeàmà ji ihe dị ka nkeji iri atọ kwusaa ozi ọma kwa ụbọchị n’afọ ahụ. N’ime afọ iri gara aga, akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ha bipụtara ma kesaa karịrị ijeri iri abụọ.

GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? O ruola ọtụtụ puku afọ e kwusawara ozi ọma.

IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? N’eziokwu, e nweela ọtụtụ ndị kwusarala ozi ọma. Ma, ọtụtụ n’ime ha kwusara ya obere oge, ebe ndị ha kwusara ya ebughịkwa ibu. Ma, Ndịàmà Jehova haziri ozi ọma ha na-ekwusa ahazi, nke mere ha ji ekwusara ya ọtụtụ narị nde mmadụ n’ebe niile n’ụwa. N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị ọchịchị kacha kpaa ike n’ụwa, bụ́ ndị obi tara mmiri, akpagbuola Ndịàmà mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ha ka na-ekwusa ozi ọma a. * (Mak 13:13) Ihe ọzọ bụ na a naghị akwụ Ndịàmà Jehova ụgwọ maka ozi ọma ha na-ekwusa. Ha na-eji oge ha aga ekwusara ndị mmadụ ozi ọma, ha anaghịkwa ere akwụkwọ ha ere. Ọ bụ onyinye si ndị mmadụ n’obi ka ha ji akwado ọrụ ha.

GỊNỊ KA I CHERE? À na-ekwusa ‘ozi ọma alaeze ahụ’ n’ụwa niile? Ọ̀ ga-abụ na mmezu amụma a na-egosi anyị na ihe ga-adị mma n’oge na-adịghị anya n’ọdịnihu?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ị chọọ ịmatakwu banyere nke a, kirie vidio atọ bụ́ “Faithful Under Trials,” “Purple Triangles,” na “Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault.” Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ekesa ha.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ, si n’ụzọ ọ bụla anyị nwere ike na-ekwusara ya ndị mmadụ, ruo mgbe Jehova ga-asị na o zuola.”—2010 YEARBOOK OF JEHOVAH’S WITNESSES.