Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Zere Mkpakọrịta Ọjọọ!

Zere Mkpakọrịta Ọjọọ!

Maka Ndị Na-eto eto

Zere Mkpakọrịta Ọjọọ!

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere, werekwa ya na ị na-ahụ ka ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị a kọrọ akụkọ ha: Daịna, Shikem, Jekọb, Simiọn, na Livaị

Ihe a kọrọ: Shikem dinara Daịna, ụmụnne ya ndị nwoke ejiri iwe gaa megwara.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JENESIS 34:1-31.

Olee ihe ndị i chere Daịna na ndị enyi ya ọ na-aga ahụ na Kenan na-eme?

․․․․․

Olee ụdị okwu ‘na-eru n’obi’ i chere Shekem nọ “na-agwa” Daịna?

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Jekọb mgbe ọ na-abara Simiọn na Livaị mba n’amaokwu nke 30?

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Gịnị ka i chere mere Daịna ji agakarị na nke ụmụ agbọghọ Kenan ahụ? (Dị ka ihe atụ, olee ihe i chere jikọrọ ya na ha? Gịnị ka i chere ọ hụrụ na nke ndị Kenan ọ na-ahụghị n’ụlọ ha?)

․․․․․

Olee àgwà ọma ndị ọ ga-abụ na Daịna hụrụ n’ahụ́ Shikem? (Gụgharịa amaokwu nke 3, nke 12, na nke 19.)

․․․․․

Olee otú Baịbụl si gosi na Daịna achọghị ka ya na Shikem dinaa? (Gụgharịa amaokwu nke 2.)

․․․․․

Ì chere na ọ dị mma na Simiọn na Livaị gara gbuo ndị bi na Shikem n’ihi ihe e mere nwanne ha nwaanyị? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Ihe mere ị ga-eji kpachara anya mgbe ị na-ahọrọ ndị gị na ha na-akpa.

․․․․․

Ihe mere ị ga-eji jide onwe gị, ya bụrụgodị na o nwere ezigbo ihe mere ị ga-eji wee iwe

․․․․․

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.

Gịnị ka i nwere ike ime ka ndị na-ejighị iwu Chineke kpọrọ ihe ghara ịrata gị ka gị na ha nwee mmekọahụ?

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤKWA MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ bụrụ na i nweghị Baịbụl, gwa Ndịàmà Jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị agụọ ya n’asụsụ bekee na www.watchtower.org na www.ps8318.com