Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ụwa Na-adị Ndị Ogbenye Ọnụ Ntụ?

Olee Otú Ụwa Na-adị Ndị Ogbenye Ọnụ Ntụ?

Olee Otú Ụwa Na-adị Ndị Ogbenye Ọnụ Ntụ?

ỌNWỤ na-akụrụ ndị ogbenye ọnụ ntụ aka n’ụzọ. Ha anaghị enweta nri na mmiri na-ezuru ha, ha enweghịkwa ezigbo ebe obibi, ego ọgwụ ma ọ bụ ego ha ga-eji ziga ụmụ ha akwụkwọ. Ihe ruru otu ijeri mmadụ n’ụwa bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ya bụ, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ọnụ ọgụgụ ndị niile bi n’Afrịka. Ma, ọtụtụ ndị bi ná mba ndị dị ka Frans na Amerịka ahụtụbeghị onye bụ́ ogbenye ọnụ ntụ. Ka anyị gụgodị banyere ụfọdụ ndị ogbenye ọnụ ntụ.

Mbarushimana na nwunye ya na ụmụ ya ise bi na Ruwanda, nke dị n’Afrịka. Ịba gburu nwa ha nke isii. Mbarushimana sịrị: “Papa m keere mụ na ụmụnne m ise ala ya. Nke m ketara dị nnọọ obere nke na akpọọrọ m ndị ezinụlọ m bịa biri n’obodo mepere emepe. Ihe mụ na nwunye m na-arụ bụ ibu akpa okwute na ájá. Windo adịghị n’ụlọ anyị bi. Ebe anyị si enweta mmiri bụ n’otu olulu mmiri dị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Ọ na-abụkarị otu ugbo ka anyị na-eri nri n’ụbọchị. Ma, n’ụbọchị anyị na-enwetaghị ọrụ, anyị anaghị eri ihe ọ bụla. N’ụbọchị anyị na-enweghị nri, anaghị m anọ n’ụlọ n’ihi na obi anaghị ekwe m ịnọ na-ele ụmụ m mgbe ha na-ebe ákwá ka e nye ha nri.”

Victor na Carmen na-arụzi akpụkpọ ụkwụ. Ha na ụmụ ha ise bi n’otu ime ime obodo dị na Bolivia. Ha bi n’otu ọnụ ụlọ ha na-akwụ ụgwọ ya. Ọ bụ ụlọ ájá merela ochie, ọ na-ehi mmiri, o nweghịkwa ọkụ eletrik. Ụlọ akwụkwọ nwa Victor na-aga enweghị oche ga-ezuru ụmụ akwụkwọ niile, n’ihi ya, Victor rụụrụ nwa ya oche ka o nwee ike na-aga akwụkwọ. Di na nwunye ahụ na-eji ụkwụ aga ihe ruru kilomita iri tupu ha eruo ebe ha ga-akpata nkụ ha ji esi nri na mmiri ha na-aṅụ. Carmen sịrị: “Anyị enweghị ebe a na-aga mposi. Ebe anyị na-aga mposi bụ n’akụkụ mmiri, ọ bụkwa ebe ahụ ka ndị mmadụ na-asa ahụ́ ma na-ekpofu ihe. Nke a na-eme ka ụmụ anyị na-arịakarị ọrịa.”

Francisco na Ilídia bi n’otu ime obodo dị na Mozambik. Ha nwere ụmụ ise, ma mgbe otu n’ime ha rịara ịba, ndị ụlọ ọgwụ jụrụ inye ya ọgwụ, ya anwụọ. Di na nwunye a na-akọ osikapa na poteto n’obere ala ha nwere. Ma, ọ bụ naanị ọnwa atọ ka ọ na-anọ gwụ. Francisco sịrị: “Mgbe ụfọdụ, mmiri anaghị ezo nke ọma n’afọ, mgbe ụfọdụkwa, ndị ohi ezuru ihe ndị anyị kọrọ. Ihe m na-ejizi akpatatụ obere ego bụ igbutu osisi achara ma resị ya ndị na-arụ ụlọ. Mụ na nwunye m na-ejikwa ụkwụ aga ihe ruru awa abụọ gaa kpata nkụ n’ime ọhịa. Anyị na-ebute otu ùkwù nkụ otu ùkwù nkụ. Anyị jiri otu sie nri n’otu izu, anyị eree nke ọzọ ere.”

Ọtụtụ ndị ekwuola na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na otu onye n’ime mmadụ asaa ọ bụla bụ ogbenye ọnụ ntụ otú ahụ Mbarushimana, Victor, na Francisco bụ, ebe ọtụtụ ijeri ndị ọzọ nwekasịrị ego ahụ́. Ụfọdụ ndị agbalịala idozi nsogbu a. Isiokwu na-esonụ ga-eleba anya ná mgbalị ndị ha mere na olileanya ndị ha nwere.

[Foto dị na peeji nke 2, 3]

Ebe Carmen na ụmụ ya abụọ na-ekute mmiri